Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi
Ezi Ụmụnna Anyị:
Otú Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, si hụ ụmụ mmadụ n’anya enweghị atụ. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) A naghị agbagha ya agbagha na Jehova bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Ma, o nweghị ebe Baịbụl kwuru na “Chineke bụ ike.” Otú o si achị gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya. N’eziokwu, otú a o si hụ anyị n’anya mere ka ọ na-agụkwu anyị agụụ ịna-efe ya.
Obi dị anyị ụtọ na Jehova anaghị amanye anyị ka anyị na-efe ya. Ọ bụghị onye ọchịchị aka ike. Jehova chọrọ ka ihe mere anyị ji na-efe ya bụrụ n’ihi na anyị ji obi anyị niile hụ ya n’anya. Ọ bụrụ na ihe mere anyị ji na-efe ya bụ n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, ọ pụtara na anyị chọrọ ka ọ na-achị anyị, nakwa na anyị kweere na ọchịchị ya dị mma. Ihe ndị merela kemgbe e kere ụwa na-egosi na ọchịchị ya enweghị atụ.
Jehova amanyeghị Adam na Iv ka ha rubere ya isi. Kama, o nyere ha ohere ka ha jiri aka ha kpebie ihe ha ga-eme. Ọ bụrụ n’eziokwu na ha hụrụ Jehova n’anya, ha gaara egosi na obi dị ha ụtọ maka ihe niile o meere ha. Ha agaaraghị ekwe enupụrụ Chineke isi otú Setan chọrọ.
Mgbe Mozis na-agwa ụmụ Izrel okwu ikpeazụ tupu ya anwụọ, ọ sịrị ha: “Lee, ana m edebe n’ihu gị taa ndụ na ihe ọma, nakwa ọnwụ na ihe ọjọọ.” (Diut. 30:15) Ọ bụ ụmụ Izrel ga-eji aka ha ekpebi otú ha ga-esi ebi ndụ. Jọshụa gwakwara ụmụ Izrel, sị: “Ọ bụrụ na ọ dị njọ n’anya unu ife Jehova, họrọnụ taa onye unu ga-efe.” Ụmụ Izrel zara Jọshụa, sị: “Tụfịakwa! Anyị agaghị ahapụ Jehova gaa fee chi ọzọ.” (Jọsh. 24:15, 16) Anyịnwa ‘agaghịkwa ahapụ’ Jehova gaa fewe chi ọzọ. Ihe mere anyị agaghị eme otú ahụ bụ n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya.
Anyị bụ́ Ndị Kraịst ma ihe ọ pụtara ma e kwuo na mmadụ nweere onwe ya ikpebi ihe ọ ga-eme. Ọ bụ eziokwu na Chineke nyere ndị okenye ikike ịdụ mmadụ ọdụ, ma ọ bụkwanụ ịdọ onye mmehie aka ná ntị, ma nke ahụ apụtaghị na ọ bụ ha na-atụrụ ndị ọzọ ihe ha ga na-eme. Ọ pụtaghịkwa na ndị okenye ga na-eme ka à ga-asị na ọ bụ ha ka a na-efe. Pọl onyeozi dere n’akwụkwọ ozi ya, sị: “Ọ bụghị na anyị bụ ndị nwe okwukwe unu, kama anyị bụ ndị ọrụ ibe unu maka ọṅụ unu, n’ihi na ọ bụ okwukwe unu mere unu ji guzosie ike.”—2 Kọr. 1:24.
Obi na-adị anyị ụtọ ma anyị jiri obi anyị mee ihe n’ihi na anyị chọrọ ime ya, ọ bụghị n’ihi na a manyere anyị amanye mee ya. Jehova na-agwa anyị ka anyị jiri maka na anyị hụrụ ya n’anya na-eme ihe dị mma. Ihe Pọl kwuru n’otu n’ime akwụkwọ ozi o ji ike mmụọ nsọ dee gosiri na ọ bụ ihe anyị kwesịrị ibu n’obi na-eme ihe ọma. Ọ sịrị: “Ọ bụrụkwa na m na-enye ihe niile m nwere iji zụọ ndị ọzọ, ọ bụrụkwa na mụ enyefee ahụ́ m, ka m wee nyaa isi, ma enweghị m ịhụnanya, ọ baghịrị m uru ọ bụla.”—1 Kọr. 13:3.
Obi na-atọ Jehova ezigbo ụtọ ka ọ na-ahụ ka ọtụtụ nde ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị ji obi ha niile na-efe ya n’ihi na ha hụrụ ya n’anya. Ihe a ha na-eme na-emekwa ka ndị ọzọ na-eto Jehova.
Jehova hụkwara ndị ohu ya niile n’anya, ma unu ụmụaka, ma unu ndị na-eto eto. Obi dị ya ụtọ na unu hụrụ ya n’anya kama ịhụ ụwa na ihe ndị dị n’ụwa n’anya. Anyịnwa hụkwara unu n’anya nke ukwuu.—Luk 12:42, 43.
N’afọ gara, unu ụmụnna anyị, ma ndị nwoke, ma ndị nwaanyị, ma ndị na-eto eto, mere ihe gosiri na unu hụrụ Jehova n’anya. Unu ji awa dị otu ijeri, narị nde asaa na iri nde anọ na asatọ, narị puku isii na iri puku itoolu na asaa, na narị anọ na iri anọ na asaa kwusaa ozi ọma. Mmadụ dị nde asaa, narị puku asaa na iri puku asatọ na abụọ, na narị atọ na iri anọ na isii so kwusaa ozi ọma n’ụwa niile. Obi dị anyị ụtọ na e mere mmadụ dị narị puku abụọ na iri puku isii na asatọ, na narị asaa na iri asaa na asaa baptizim iji gosi na ha ararala onwe ha nye Jehova. Ọtụtụ ndị na-eto eto sokwa ná ndị a e mere baptizim. Ihe nke a pụtara bụ na e mere ihe dị ka puku mmadụ ise na otu narị na iri isii na asatọ baptizim n’izu ọ bụla. Nke a na-eme anyị obi ụtọ.
N’oge ọgwụgwụ a, e nwere ọtụtụ nsogbu na-abịara ndị ohu Chineke, ma ihe isi ike, ma mkpagbu, ma ọrịa. E nwekwara ndị nká na-anaghịzi ekwe mee ihe ndị ha na-emebu. Ma, anyị kpebisiri ike na o nweghị ihe ga-eme ka anyị ‘laa azụ’ ma ọ bụ ‘daa mbá.’ Anyị hụrụ unu niile n’anya nke ukwuu.—Hib. 10:39; 2 Kọr. 4:16.
Ụmụnna unu,
Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova