‘Ijegharị n’Ọṅụ Agha’
ỌṄỤ agha bụ nnukwu ememe e ji aṅụrị ọnụ mmeri e meriri onye iro. Otu n’ime nkwanye ùgwù kasị ukwuu ụlọ nzukọ Senate ndị Rom na-enye onye ọchịagha nwere mmeri bụ ikwe ka o mee ememe mmeri ya site n’ime njegharị dị otú ahụ nke na-efu nnukwu ego. Pọl onyeozi hotara njegharị ọṅụ agha ugbo abụọ n’ihe odide ya. Otú ọ dị, tupu anyị atụlee okwu ya, nwaa iji anya nke uche gị hụ njegharị dị otú ahụ. Jiri anya nke uche gị hụ ka ìgwè mmadụ guzo n’akụkụ okporo ụzọ ka ahịrị ahụ ji nwayọọ nwayọọ na-aga n’ogologo okporo ụzọ Via Triumphalis nakwa n’ụzọ mgbago ahụ gbagọrọ agbagọ nke na-eduje n’ụlọ nsọ Jupita nke dị n’elu Ugwu Capitoline nke Rom.
Onye ọkà mmụta bụ James M. Freeman dere, sị, “A na-ekesa ísìsì ụtọ ndị sitere ná mkpụrụ osisi ndị a na-esure ọkụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu n’ime ụlọ nsọ ndị ahụ nakwa n’ogologo okporo ụzọ, na-eme ka ikuku jupụta n’ísìsì ha. Ndị na-eso n’ahịrị ahụ bụ ụlọ nzukọ senate ahụ na ụmụ amaala a ma ama n’obodo, ndị na-eji ọnụnọ ha nọ n’ebe ahụ na-akwanyere onye ahụ nwere mmeri ùgwù. A na-eburu ihe ndị a kwatara n’agha ndị kasị dịrị oké ọnụ ahịa, dị ka ọlaedo, ọlaọcha, ụdị ngwá agha dị iche iche, ọkọlọtọ dị iche iche, ihe osise na ihe ọkpụkpụ ndị dị oké ọnụ ahịa, na ihe ọ bụla nke ma onye ahụ nwere mmeri ma onye e meriri emeri were n’ihe dị oké ọnụ ahịa, na-agagharị n’ihu ọha ebe obodo ahụ nke jupụtara ná mmadụ ga-ahụzu ha anya. A na-arụgidekwa ndị a dọtara n’agha iso na-aga ije n’ahịrị ngagharị ahụ. Onye ọchịagha ahụ, onye ọ bụ iji kwanyere ya ùgwù ka e ji nye iwu ime njegharị ahụ, na-anọkwasị n’ụgbọ ịnyịnya nke e wuru n’ụzọ dị iche, nke ịnyịnya anọ na-adọkpụ. A na-eji ọlaedo dụkwasị n’uwe mwụda ya, a na-ejikwa okooko osisi dụkwasị n’uwe elu ya. Ọ na-eji ùkwù ahịhịa laurel n’aka nri ya, jirikwa mkpanaka n’aka ekpe ya; a na-ejikwa okpu e ji ahịhịa laurel nke Delphi mee kpukwasị ya n’isi. N’etiti iti mkpu nke ndị agha na ịkụ aka nke ndị obodo, a na-eburu onye ahụ nwere mmeri gafee okporo ụzọ ndị ahụ nile ruo ụlọ nsọ nke Jupita, ebe a na-achụ àjà dị iche iche, mgbe e mesịrị, a na-enwekwa oké oriri ihu ọha n’ụlọ nsọ ahụ.”
Pọl jiri njegharị ọṅụ agha ahụ mee ihe atụ mgbe o dere akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara ndị Kraịst nọ na Kọrint n’afọ 55 nke Oge Anyị. Ọ sịrị: “Ekele dịrị Chineke, onye na-edugharị anyị n’ọṅụ agha n’ime Kraịst mgbe nile, na-esitekwa n’aka anyị egosi ísìsì nke ọmụma ya n’ebe nile. N’ihi na anyị bụ ísìsì ụtọ nke Kraịst n’ebe Chineke nọ, n’etiti ndị a na-azọpụta, na n’etiti ndị na-ala n’iyi; n’ebe ndị a nọ ọ bụ ísìsì nke sitere n’ọnwụ wee duba n’ọnwụ; n’ebe ndị ahụ a na-azọpụta nọ ọ bụ ísìsì nke sitere ná ndụ wee duba ná ndụ.”—2 Ndị Kọrint 2:14-16.
N’ebe a, a na-egosipụta Pọl na ndị Kraịst ndị ọzọ e tere mmanụ dị ka ndị raara onwe ha nye, doro onwe ha n’okpuru Chineke, “n’ime Kraịst.” A na-egosipụta ha dị ka ụmụ, ndị na-eje ozi, na ndị agha, ndị na-eso n’ahịrị ahụ nke Jehova na-eduzi, ndị ọ na-edurukwa gaa ná njegharị ọṅụ agha n’okporo ụzọ nke e mere ka ọ na-esi ísì ụtọ. (Lee Ụlọ Nche, July 15, 1990, peji 10-15.) Ojiji e jiri njem dị otú a maa atụ na-egosikwa na ndị ahụ ndị na-ajụ ozi ọma ahụ nke Alaeze Chineke nwere nanị olileanya nke bụ ọnwụ. Ma lee ka o si dị iche nye ndị na-eso ụzọ Jisọs e tere mmanụ! Ha nwere olileanya nke nzọpụta gaa ná ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe, ha na Kraịst. Gịnịkwanụ banyere ndị nọgidesiri ike n’iso ha, bụkwa ndị raara onwe ha nye Chineke? Ha nwere olileanya ahụ na-enye ọṅụ nke ịdị ndụ n’ime paradaịs elu ala, ebe Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.” (Mkpughe 21:1-4; Luk 23:43) Ị̀ bụ otu n’ime ìgwè ndị a nwere obi ụtọ?
A na-egosi ihe dị iche ná Ndị Kọlọsi 2:15, ebe Pọl dere, sị: “N’ịnapụsị ọchịchị nile na ịchịisi nile ihe nile ha nwere, [Chineke] gosiri ha n’ihu ọha dị ka ndị e meriri emeri, na-edugharị ha n’ọṅụ agha site na ya.” (NW) N’ebe a, a na-egosi ọchịchị na ịchịisi nile bụ ndị iro, ndị nọ n’okpuru Setan bụ Ekwensu, dị ka ndị a dọtara n’agha na ndị mkpọrọ ndị a na-edugharị n’ọṅụ agha. Jehova, bụ́ Onye Mmeri ahụ, na-agbaba ha ọtọ, na-egosikwa ha n’ihu ọha dị ka ndị e meriri emeri. E meriri ha “site na ya,” ya bụ, “osisi ịta ahụhụ” nke Jisọs. Ọnwụ ọ nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ ahụ nyere ihe ndabere maka iwepụ ‘ihe ahụ e ji aka dee n’akwụkwọ’ (ọgbụgba ndụ Iwu ahụ) wee meekwa ka o kwe mee ịtọhapụ ndị Kraịst site n’agbụ nke ike ọchịchịrị nile nke Setan. (Ndị Kọlọsi 2:13, 14, NW) Lee nnọọ ka anyị kwesịrị isi nwee ekele maka nnwere onwe ndị Kraịst dị otú ahụ!