Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 7/15 p. 10-15
  • Ikesa Ísìsì Ụtọ Nke Ihe Ọmụma Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikesa Ísìsì Ụtọ Nke Ihe Ọmụma Chineke
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ime Ka Ụzọ nke Njem Mmeri ahụ Na-esi Ísì Ụtọ
  • Ísì Ụtọ nke Ndụ ma ọ bụ Ísìsì nke Ọnwụ
  • Ndị E Nyere Ikike Ịbụ Mmadụ Ndị Na-ekesa ísìsì Ụtọ
  • ‘Ijegharị n’Ọṅụ Agha’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Ihe Ọmụma Chineke Dị Ihe A Kpọrọ Mmadụ Mkpa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 7/15 p. 10-15

Ikesa Ísìsì Ụtọ Nke Ihe Ọmụma Chineke

“Ekele dịrị Chineke, onye na-edugharị anyị n’ọṅụ agha n’ime Kraịst mgbe nile, na-esitekwa n’aka anyị egosi ísìsì nke ọmụma ya n’ebe nile.”—2 NDỊ KỌRINT 2:14

1. ísìsì ụtọ dị aṅaa ka anyị na-atụle n’ebe a, oleekwa otú e kwesịrị isi lee ihe ùgwù nke ikesa ya anya?

MAA ísìsì! M-m-m-m! Ị na-anụ ísìsì ụtọ ahụ? Ihe anyị na-ekwu okwu ya n’ebe a abụghị ísìsì ụtọ nke okooko osisi ndị na-agbawapụta agbawapụta, kama nke ahụ, ọ bụ banyere ísìsì ụtọ nke ihe atụ nke na-ekupụta site n’ihe odide kasị mma dị n’elu ala. Ihe odide ndị a esịteghị n’aka ndị madụ nkịtị, kama ha bụ ụyọkọ okooko osisi ihe atụ ahụ nke sitere ná mmụọ nke Onye ahụ nke kekwara okooko osisi ndị na-esi ísì ọma ndị e ji chọọ elu ala mma. Ihe ùgwù nke ikesa ísìsì ụtọ nke a nke ihe ọmụma Chineke bụ akụ dị ukwuu. Ee, ọ bụ ije ozi nke bara uru n’ụzọ pụrụ iche—nke ọ na-abụghị mmadụ nile nwere ya, nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ha na-adịghị ekerịta.

2. Olee mgbe ndị na-eso ụzọ Kraịst malitere ikesa ísìsì ụtọ nke ihe atụ, gịnịkwa si na ya pụta?

2 E nyere ndị na-eso ụzọ Kraịst akụ nke a dị oké ọnụ ahịa mgbe ha malitere ịrụsi ọrụ ike n’ijere Jehova Chineke ozi n’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33 nke Oge Anyị. N’ịbụ ndị jupụtara ná mmụọ nsọ, ha malitere ikesa ísìsì ụtọ nke ihe atụ, na-akọwa “oké ọrụ nile nke Chineke.” (Ọrụ 2:1-4, 11) Site n’aka ha, ísìsì ụtọ nke ihe ọmụma Chineke ga-eruru ndị ọzọ, ọ bụghị nanị ndị Juu anụ ahụ e biri úgwù, kamakwa ruoro mba nile, ebo nile, ndị nile, na asụsụ nile bụ́ ndị a na-ebighị úgwù. (Ọrụ 10:34, 35) Ezi ndị na-eso ụzọ lere ije ozi nke a anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa karịa akụ ihe onwunwe nile ụmụ mmadụ na-ekpokọbara onwe ha.

3. Ruo n’ókè ha aṅaa ka a na-arụ ọrụ nkesa nke ísìsì ụtọ nke ihe ọmụma Chineke, oleekwa ajụjụ ọ dị mkpa ka anyị jụọ onwe anyị?

3 Taa, a na-arụ oké ọrụ ahụ nke ikesa ísìsì ụtọ nke ihe ọmụma Chineke n’elu ala dum—n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-emetụbeghị ya mbụ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. O metụtara ịgbara ihe nile a kpọrọ mmadụ àmà banyere Alaeze Chineke ahụ e guzobeworo ugbu a n’okpuru Eze ya ọ họpụtara, bụ́ Jisọs Kraịst. (Matiu 6:10; Ọrụ 1:8) Ị̀ na-ele ọrụ nke ịkpọsa Eze ahụ na Alaeze ya anya dị ka akụ dị oké ọnụ ahịa? Jisọs Kraịst, bụ́ onye malitere nkwusa nke Alaeze ahụ, ghọtara ya n’ụzọ dị otú ahụ, o setịpụkwara ihe nlereanya a ga-agbaso.—Matiu 4:17; 6: 19-21.

Ime Ka Ụzọ nke Njem Mmeri ahụ Na-esi Ísì Ụtọ

4. Dị ka 2 Ndị Kọrint 2:14 si kwuo, olee otú Chineke si na-edu ndị ozi ya no n’elu ala, ọ̀ bụkwa n’ihe omume oge ochie dị aṅaa ka okwu Pọl na-ezo aka?

4 N’ihi gịnị ka ijere Chineke ozi ji bụrụ ihe a ga-ewe n’ihe dị oké ọnụ ahịa? Otu n’ihe kpatara ya bụ na ọbụna ugbu a, ndị ahụ na-ejere Jehova ozi nwere ihe ùgwù kwesịrị ịrịba ama nke ịbụ ndị Chineke na-eduzi n’otu nnukwu njem mmeri. Dị ka nsụgharị New International Version si dee ya, 2 Ndị Kọrint 2:14 na-asị: “Ekele dịrị Chineke, onye na-edu anyị mgbe nile na njem mmeri n’ime Kraịst, na-esitekwa n’aka anyị na-ekesa n’ebe nile ísìsì ụtọ nke ihe ọmụma ya [“na-eme ka ihe ọmụma anyị nwere banyere ya na-agbasa n’ụwa nile dị ka ọmarịcha ihe na-esi ísì ụtọ!” Phillips].” O yiri ka okwu ahụ Pọl onye ozi kwuru ọ̀ na-ezo aka n’otu omenala oge ochie nke inwe njem mmeri.a

5, 6. (a) Gịnị na-eme n’oge a na-aga njem mmeri na Rom oge ochie, ọ̀ bụkwa gịnị ka ísìsì ụtọ ahụ bụ ihe àmà ya nye ndị dị iche iche? (b) Gịnị bụ nkọwa ime mmụọ nke ihe atụ ahụ dị na 2 Ndị Kọrint 2:14-16?

5 N’oge ọchịchị nke mba Rom, otu n’ime ùgwù kasị ukwuu nnọkọ ndị omeiwu bụ Senate pụrụ ịkwanyere onye ọchịagha nke nwere mmeri bụ ikwe ka o mee ememe mmeri ya site n’ịga njem mmeri nke na-efu oké ego. Njem ndị Rom ahụ na-eji nwayọọ nwayọọ na-aga n’ogologo ụzọ Via Triumphalis, nakwa n’ụzọ mgbago ahụ gbagọrọ agbagọ nke na-eduje n’ụlọ nsọ Jupiter nke dị n’elu Ugwu Capitoline. A na-ejikarị ụdọ ígwè na-adọkpụrụ ndị eze, ndị isi, na ndị ọchịagha a dọtara n’agha na-aga tinyere ụmụ ha na ndị na-ejere ha ozi, a na-agbabakarịkwa ha ọtọ iji weda ha ala, menyekwa ha ihere.

6 Ka njem ahụ na-agabiga n’etiti obodo nke Rom ahụ, ọha ndị mmadụ na-aghasa okooko osisi n’ihu ụgbọ agha nke onye ahụ nwere mmeri, a na-ejikwa ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ na-eme ka ogologo ụzọ njem ahụ dum na-esi ísì ọma. Ísìsì ụtọ nke a bụ ihe nnọchianya nke ihe ùgwù na ndụ nke nọ ná nchebe karị nye ndị agha ahụ nwere mmeri. Ma ọ bụ ihe nnọchianya nke ọnwụ nye ndị ahụ a dọtara n’agha, bụ́ ndị a na-agbagharaghị, ndị a ga-egbu n’ọgwụgwụ nke njem ahụ. Nke a na-eme ka a ghọtakwuo nkọwa ime mmụọ Pọl nyere ihe atụ ahụ dị ná 2 Ndị Kọrint 2:14-16. Ihe onyinyo ahụ na-egosipụta Pọl na ndị Kraịst ibe ya dị ka ndị raara onwe ha nye ịnọ n’okpuru Chineke, “n’ime Kraịst,” ndị ha nile na-eso na njem mmeri nke Chineke, bụrụkwa ndị Ọ na-eduzi n’oké njem mmeri n’okporo ụzọ nke e mere ka ọ na-esi ísì ụtọ.

Ísì Ụtọ nke Ndụ ma ọ bụ Ísìsì nke Ọnwụ

7, 8. (a) Olee ụzọ Ndịàmà Jehova si na-ekesa ísìsì ụtọ nke ihe ọmụma Chineke? (b) Ka Ndịàmà ahụ nọ na-ekesa ísìsì ụtọ ihe atụ ahụ, gịnị bụ mmeghachi omume nke ndị ahụ a na-azọpụta? (eh) Mmeghachi omume dị aṅaa ka a na-enweta site n’ebe ndị ahụ na-ala n’iyi nọ?

7 Site n’ịgbasa ebe nile eziokwu Bible banyere Alaeze Chineke n’okpuru Kraịst, Ndịàmà Jehova na-ekesa, na-egosipụta, na-emekwa ka ọ pụta ìhè n’ebe nile, bụ́ ísìsì ụtọ nke ihe ọmụma nke Chineke amara ahụ, onye eziokwu ya meworo ka ha pụọ n’ohu nke okpukpe ụgha. Ha nọgidere na-azọ njem mmeri n’ije ozi Jehova. Onyinye ha nyere onwe ha ije ozi dị ka Ndịàmà ya na nke Eze ya yiri ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nye Jehova. Otú a, anyị pụrụ ịghọta ihe onyeozi ahụ bu n’uche mgbe ọ sịrị: “Anyị bụ ísìsì ụtọ nke Kraịst n’ebe Chineke nọ, n’etiti ndị a na-azọpụta, na n’etiti ndị na-ala n’iyi; n’ebe ndị a nọ ọ bụ ísìsì nke sitere n’ọnwụ wee duba n’ọnwụ; n’ebe ndị ahụ a na-azọpụta nọ ọ bụ ísìsì nke sitere ná ndụ wee duba ná ndụ [“ísìsì dị mkpa nke na-eweta ndụ,” The New English Bible; “ísìsì na-enye ume ọhụrụ nke ndụ n’onwe ya,” Phillips].” —2 Ndị Kọrint 2:15, 16.

8 Ndị nwere obi eziokwu, ndị yikwara atụrụ na-achọpụta ịdị ụtọ nke ihe ọmụma Jehova dị ka Ndịàmà ya na-ekesa ya. Nye ndị dị otú ahụ, ọrụ ịgba àmà ahụ nwere ísìsì nke ahụ ike na nke ndụ, nke ịdị ndụ, nke eziokwu na-enye ndụ. Ha na-enye Jehova na Eze ya ekele, bụ́ ndị ha na-esonyere na njem mmeri ha, na-etikwa mkpu n’olu dara ụda, sị: “Nzọpụta dịrị Chineke anyị, onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, dịkwara Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpughe 7:10) Ha na-ekuru ikuku nke eziokwu Alaeze, bụ́ ísìsì na-enye ume ọhụrụ nke ndụ, nke na-edujekwa ná ndụ. Ma Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya emerụwo ikike ịnụ ísìsì nke ndị ahụ nọgidere n’okpukpe ụgha, nke na ha na-apịchi aka n’imi ha, werekwa nleda anya na-ajụ ịnara eziokwu ahụ. Nye “ndị na-ala n’iyi,” eziokwu ahụ na ndị kwesịrị ntụkwasị obi ndị na-eweta ya na-ekesa ísìsì nke na-esite n’ọnwụ duba n’ọnwụ. Ma ọ bụkwanụ, dị ka nsụgharị New International Version si dee ya: “Nye otu ndị, anyị bụ ísìsì nke ọnwụ.” Nsụgharị Phillips sụgharịrị ya otú a: “Nye ndị nọ n’òtù nke abụọ ahụ, o yiri ísìsì na-egbu egbu nke mbibi.”

9. Olee ajụjụ Pọl na-ajụ ugbu a, ị̀ ga-esikwa aṅaa zaa, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

9 Mgbe ahụ, onyeozi ahụ jụrụ, sị, “Ma ònye ruru ime ihe ndị a?” (2 Ndị Kọrint 2:16) Ya bụ ikwu, sị, “ònyekwa pụrụ iru eru maka ọrụ yiri nke a?” (The Jerusalem Bible) “Maka ije ozi dị otú a, ọ̀ bụkwa onye ruru eru?” (Wey mouth) Azịza nke Akwụkwọ nsọ kwadoro bụ: Ndịàmà Jehova! Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụ nanị ndị raara onwe ha nye, nwere obi eziokwu, ndị na-eme ihe n’eziokwu, ndị na-adịghị achọkwa uru nke onwe ha, ndị na-ekwupụtakwa eziokwu, n’ụzọ doro anya n’enweghị ngwagbu ọ bụla nke okpukpe ụgha, bụ ndị ruru eru maka ọrụ nke a nke ikesa ísìsì ụtọ nke ihe ọmụma Chineke.—Ndị Kọlọsi 1: 3-6, 13; 2 Timoti 2:15.

10. N’ihi gịnị ka ndị ụkọchukwu na-erughj eru maka ọrụ nke ikesa ísìsì uto nke ihe ọmụma Chineke?’

10 Ndị ụkọchukwu Krisendọm, ndị ọ na-agụ agụụ inwe ọnọdụ ọma n’ebe ụwa nke a dị, erughị eru maka ije ozi nke a nke achọghị ọdịmma onwe onye. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ihi na ha erughị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ e gosiri site n’okwu Pọl: “Anyị adịghị ka ọha mmadụ, ndị weere ihe na-adịghị mma na-etigwa n’okwu Chineke: kama dị ka ndị sitere n’ịdị ọcha, kama dị ka ndị sitere na Chineke, ọ bụ n’ihu Chineke, n’ime Kraịst ka anyị na-ekwu.” (2 Ndị Kọrint 2:17) Ma ọ bụ, dị ka nsụgharị New International Version si dee ya: “N’ụzọ na-adịghị ka ọtụtụ ndị, anyị adịghị eji okwu Chineke atụ mgbere maka uru. Kama nke ahụ, anyị na-ekwu okwu n’ime Kraịst n’ihu Chineke, na-eji obi eziokwu, dị ka ndị Chineke zitere.”

11, 12. (a) N’ihi gịnị ka Ndịàmà ahụ na-abụghị ‘ndị na-eji okwu Chineke na-agba mgbere’ n’ihi ịnara onyinye afọ ofufo? (b) N’ụzọ na-eyighị ụdị Iso Ụzọ Kraịst a gwagburu agwagbu nke ọtụtụ ndị na-azụrụ, gịnị ka Ndịàmà Jehova na-eche n’ihu ndị mmadụ?

11 Ndịàmà Jehova bụ ndị Chineke zitere, ha na-arụkwa ọrụ ịgba àmà ha n’okpuru nlekọta Chineke. Ọ bụ ezie na ha na-ebipụtara ndị nwere mmasị akwụkwọ ndị bara uru na ihe ndị ọzọ ndị na-akọwa Okwu Chineke, na-ana-rakwa onyinye afọ ofufo iji kwadoo ọrụ nkwusa Aleze ahụ a na-arụ n’ụwa dum, ihe omume dị otú ahụ abụghị ịgba mgbere ma ọ bụ ịgwagbu Okwu Chineke. N’eziokwu, onyinye ndị ahụ bụ nanị ihe enyemaka iji mee ka ihe ọmụma nke Chineke rutekwara ndị ọzọ.

12 Ọtụtụ ndị taa, ma hà maara ma ọ bụ na ha amataghị, azụrụwo ụdị Iso Ụzọ Kraịst nke a gwagburu agwagbu, n’ihi na o kwekọrọ n’ọchịchọ onwe onye nke ha, ọ dịghị akpagidekwa ụzọ ndụ ha. Ha na-eche na Chineke na-anakwere ha n’ihi na ha na-ekwu na ha hụrụ ya n’anya n’ime obi ha. Otú ọ dị, mgbe e gosiri na Okwu Chineke megidere ihe ndị ha kweere na ha na omume ha, ha na-asụgharị Akwụkwọ nsọ isi iji wee bulie echiche nke onwe ha elu karịa nghọta ziri ezi nke Bible, (Matiu 15:8, 9; 2 Pita 3:16) Ma, Ndịàma Jehova na-ewepụta eziokwu dị ọcha nke a na-agwagbughịkwa agwagbu site na Bible, wee si otú a na-ewepụta ísìsì ụtọ nke Chineke na ndị na-efe ya ezi ofufe na-anara nke ọma. Ha na-esi otú a na-achụfusị omenala okpukpe nile na ihe ndị ga-egbochi ha inweta ezi ihe ọmụma nke Chineke.

13. Òle ndị, ma e wezụga ndị Kraịst e tere mmanụ, so na njem mmeri nke Chineke, gịnịkwa ka ha na-eme n’ebe ọ bụla ha jere?

13 N’eziokwu, iso na njem mmeri nke Chineke n’ime Kraịst bụ ihe ùgwù na-enweghị atụ nke ọ na-abụghị nanị ndị Kraịst e tere mmanụ na-enweta ya, kamakwa “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ na-enweta ya ọbụna ugbu a, n’ihi na mmeri nke Alaeze ahụ dị nso. (Mkpughe 7:4, 9; Jọn 10:16) Ka anyị nọ na-atụ anya mmeri ndị ọzo nke Eze anyị ahụ nke na-enwe mmeri, ebe ọ bụla anyị na-eje, anyị na-ekesa ihe ọmụma Chineke nke na-enye ndụ dị ka ihe na-esi ísì ụtọ ma ọ bụ ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke dị oké ọnụ ahịa, nye ndị ahụ agụụ eziokwu na ezi omume na-agụ obi ha. Lee nnọọ ihe ùgwù ọ bụụrụ ndị ahụ ruru eru ije ozi nke a!—Jọn 17:3; Ndị Kọlọsi 3:16, 17.

Ndị E Nyere Ikike Ịbụ Mmadụ Ndị Na-ekesa ísìsì Ụtọ

14. N’ihi gịnị ka ọ na-adighị ndị ahụ na-ekesa ísìsì ụtọ nke ihe ọmụma Chineke mkpa inwe asambodo inye ikike nke sitere n’aka ndị mmadụ?

14 Ma, ọ̀ dị mkpa ka ndị ahụ na-ekesa ísìsì ụtọ nke ihe ọmụma Chineke na nke Alaeze ya nwee akara mmụta diplọma na ọ bụ asambodo sitere n’aka ụmụ mmadụ? Ee e! Anyị abụworị ndị e nyere ọrụ, ma ọ bụ ndị a họpụtara, dị ka Ndịàmà nke Onye ahụ Kasị Ukwuu n’eluigwe na ala. Ya mere, ọ dịghị mkpa ka anyị laa azụ n’ịbanye n’ubi wee na-ekesa ísìsì ụtọ nke ozi ọma nke Alaeze Chineke. Buru n’uche na Jehova na-eduzi anyị. Jisọs jezuru ozi ya n’agbanyeghị ‘nkwugide nke ndị mmehie.’ (Ndị Hibru 12:3) Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ihe ndekọ Jisọs nke ozi ubi, dị ka ọ dị na Bible, ka bụkwa eziokwu, ọrụ ya n’ubi na-agbakwara ya àmà ọma, na-enyekwa ihe àmà iji kwadoo ya dị ka ezi onyeozi nke Jehova Chineke.

15. Olee ụzọ Pọl onyeozi si gosi na ọ dịghị ezi ndị Kraịst mkpa inwe “akwụkwọ ozi ime ka mmadụ mara [ha]”?

15 Pọl onyeozi merikwara ọnọdụ ima aka dị otú a n’oge ya site n’ikwu okwu ịrụ ụka nke a: “Ànyị na-amalite ọzọ ime ka mmadụ mara anyị? Ma ọ bụ mkpa akwụkwọ ozi ime ka mmadụ mara anyị [ọ̀] na-akpa anyị inye unu ma ọ bụ ịnara unu, dị ka ọ na-akpa ụfọdụ? Unu onwe unu bụ akwụkwọ ozi anyị, nke e deworo n’ime obi anyị, nke mmadụ nile maara na-agụkwa; ebe e mere ka unu pụta ìhè na unu bụ akwụkwọ ozi Kraịst, nke anyị jere ozi ya, nke a na-ejighị ink dee, kama ọ bụ mmụọ nke Cbineke dị ndụ ka e ji dee ya; ọ bụghị n’elu mbadamba nkume, kama ọ bụ n’elu mbadamba ihe dị iche, bụ́ obi nke anụ ahụ.”—2 Ndị Kọrint 3:1-3.

16. Ụdị akwụkwọ ozi dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova na-egosipụta dị ka ihe àmà akaebe nke na-egosi na ije ozi ha sitere n’aka Chineke?

16 Ndị ọchịchị ụwa adịghị anabata ọrụ e kenyere anyị dị ka Ndịàmà Jehova. Ma, ka ọrụ anyị nke ikesa ísìsì ụtọ nke ihe ọmụma Jehova gbaara onwe ya akaebe! A pụghị ihichapụ ọrụ nke a ehichapụ, ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị na-ajụ ịgụ akwụkwọ ihe àmà nke a nke ije ozi anyị. Ndị ụkọchukwu na-egosi akwụkwọ asambodo ndị ha nwetara site n’aka òtù ndị ndú okpukpe dị iche iche. Otú ọ dị, ihe ndị ahụ bụ mpempe akwụkwọ efu, okwu nke mmadụ. Ndịàmà Jehova, e wezụgakwa ihota okwu nkwado site n’Okwu Chineke, ha na-anọ dị ka ihe akaebe dị ndụ. Oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ, ndị e jiworo ozi ọma nke Alaeze ahụ rute, abụwokwa ndị a chịkọtara gaa n’aka nri nke Eze nke Jehova. (Matiu 25:33, 34) Ndị a nile bụ akwụkwọ ime ka a mara anyị, bụ́ akwụkwọ ozi nke anyị, dị ka Ndịàmà Jehova, na-ebu agagharị n’ebe nile n’obi anyị na n’uche anyị, ndị anyị pụkwara iji obi ike gosipụta. Ndị ahụ na-adịnyere ịbụ ọkaaka eluigwe na ala nke Jehova, ndị na-ekerekwa òkè n’ife Chineke ha na Ndịàmà Jehova bụ n’onwe ha, akwụkwọ ozi ime ka a mara mmadụ nke mmadụ nile na-apụghị izere ịgụ na ịmata.

17. Olee otú e si ede “akwụkwọ ozi Kraịst” nke anyị, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka Pọl ji sị na e dere ya n’elu obi mmadụ?

17 N’eziokwu, nke a na-eme ka ndị nọ n’okpukpe ụgha na-ewe iwe, na-enwekwa anyaukwu mgbe ha gụrụ ya. Otú o sina dị, oké ìgwè mmadụ ahu nke atụrụ ọzọ nke na-amụbawanye amụbawanye bụ akwụkwọ ozi ime ka a mara mmadụ nke sitere n’aka Jisọs Kraịst, bụ́ Onye ọzụzụ atụrụ Ọma ahụ, onye na-eji Ndịàmà Jehova nile na-eme ihe n’ọrụ ọzụzụ atụrụ ya. Anyị bụ mkpịsị akwụkwọ, ma ọ bụ ngwá ọrụ ndị bụ mmadụ, ndị ọ na-eji eme ihe iji dee akwụkwọ ozi nke a. Ọ bụghị ink ka e ji dee akwụkwọ ozi nke a, bụ́ nke a pụrụ ihichapụ ehichapụ, kama e dere ya site n’ike ọrụ, ma ọ bụ mmụọ, nke Chineke, bụ́ nke na-arụ ọrụ n’ime anyị. Ọ bụghị dị ka ọ dịrị n’ihe banyere Moses, bụ́ mgbe e jiri mkpịsị aka Chineke dee Iwu Iri ahụ n’elu mbadamba nkume abụọ. E dere akwụkwọ ozi nke anyị n’elu mbadamba obi anụ ahụ nke mmadụ, ebe ọ bụ na ije ozi ime mmụọ anyị na-eweta mgbanwe nke ucbe na nke obi n’ime ndị na-anara ozi ọma ahụ nke na-esi ísì ụtọ.

18. Ihe dị aṅaa ọ rụpụtara na-eme ka ndị natara ozi ọma ahụ bụrụ akwụkwọ ozi ime ka a mara mmadụ?

18 Ọrụ anyị ji Okwu Chineke na-arụ enwewo mmetụta n’ahụ ndị ji obi ekele na-anara ozi ọma ahụ, o wetawokwa mgbanwe ndị pụtara ìhè. Ọ pụtawo ìhè na mkpebi ha ijere Chineke ozi abụghị ọnọdụ e weere site ná mkpali mberede efu nke sitere n’oké mmetụta a kpaliri mgbe onye okwuchukwu na-ekwu okwu na-akpali akpali. Kama nke ahụ, ọ bụ mgbanwe na-adịgide adịgide nke ndụ ha, na-adabere n’eziokwu ndị na-agba ka ọnwa, ndị dị na Bible Nsọ. Ịhụnanya ha nwere maka ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, na-akpali ya ‘iyipụ mmadụ ochie ha ya na agụụ nke aghụghọ ya nile ma yikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ,’ nke na-egosipụta “mkpụrụ nke mmụọ nsọ,” (Ndị Efesọs 4: 20-24; Ndị Galetia 5:22, 23) N’ihi nke a, ihe na-esi na nke a apụta na-eme ka ha bụrụ akwụkwọ ozi ime ka a mara mmadụ. Ọ na-ekwu okwu n’ụzọ pụtara ìhè karịa akwụkwọ ozi ọ bụla e ji aka dee site n’aka anyị ma ọ bụ n’aka nzukọ ọ bụla ọzọ a na-ahụ anya, nke ọ pụrụ ịbụ ya zitere anyị.

19. Olee ụzọ Pọl si kọwaa iru eru nile nke “ndị na-eje ozi ọgbụgba ndụ ọhụrụ,” mmetụta dịkwa aṅaa ka ọrụ ha nweworo n’ahụ oké ìgwè mmadụ ahụ?

19 Ná 2 Ndị Kọrint 3:4-6 Pọl gara n’ihu ikwu, sị: “Ntụkwasị obi dị otú a ka anyị nwekwara site n’aka Kraịst n’ebe Chineke nọ: ọ bụghị na anyị ruru n’onwe anyị, ịgụ ihe ọ bụla dị ka ò sitere n’onwe anyị; kama iru eru anyị sitere na Chineke; onye mekwara anyị ka anyị ruo ịbụ ndị na-eje ozi ọgbụgba ndụ ọhụrụ.” Ọ bụ ezie na ọ bụ nanị ndị so n’ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ bụ “ndị na-eje ozi ọgbụgba ndụ ọhụrụ,” ọrụ ha enwewo mmetụta n’ahụ oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ, ọ ka ga-emetụtakwa ọtụtụ ndị ọzọ a na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ, bụ́ ndị a ka ga-achịkọta. Nke a bụ ntụkwasị obi nke Ndịàmà Jehova nile nwere site na Kraịst Jisọs n’ebe Jehova Chineke nọ. Ihe ahụ fọdụrụ ji obi ekele na-agba ndị oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ ume iji obi ha nile na-ekere òkè n’ije ozi nke ‘ide akwụkwọ ozi’ ahụ nke Jisọs Kraịst buru amụma ya na Matiu 24:14 na Matiu 28: 19, 20.

20. (a) Gịnị ka akụkọ ozi dị na Yearbook gosiri banyere ndị ahụ na-ekesa ísìsì ụtọ nke ihe ọmụma Chineke? (b) Gịnị ka anyị nile pụrụ ikwu banyere iru eru anyị maka ije ozi ahụ nke ide akwụkwọ ozi?

20 Nke ahụ bụ ihe ha meworo, dị ka ọ pụtara ìhè site n’akụkọ ozi dị na 1990 Yearbook nke e gosiri n’ime ya na Ndịàmà Jehova nọ na-ekesa ísìsì ụtọ nke ihe ọmụma Chineke na 212 mba dị iche iche. Ọnụ ọgụgụ ha karịrị 3,787,OOO ndị nkwusa na-arụsi ọrụ ike, nanị n’ime afọ gara aga, ha tinyekwara ihe dị ka 835,000,000 awa n’ikwusa ozi ọma nke a nke Alaeze ahụ. Ná Nri Anyasị Onyenwe Anyị nke afọ gara aga, e nwere 9,479,064 ndị bịaranụ. Ma ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ ma ndị so n’oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ pụrụ ikwu, sị: “Iru eru anyị sitere na Chineke.” Ma ọ bụ, dị ka nsugharị The Jerusalem Bible si dee ya: “Iru eru nile anyị sitere n’aka Chineke.”

21. Gịnị ka anyị nile kwesịrị ịdị na-eme, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

21 Ya mere, na-ekesa ísìsì dị ụtọ nke na-enye ndụ nke ihe ọmụma Chineke n’ebe nile! Mee ka ísìsì ụtọ nke ihe ọmụma Jehova jupụta ikuku nke ókèala ọgbakọ unu. Mgbe ahụ, dị ka onye Ọchịagha ọchịchị Chineke nke na-enwe mmeri, ọ ga-eduru gị gaa na njem mmeri ya ka Ndịàmà ya nile na-aga n’ihu n’ije ozi ebube nke a nke oge a!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Maka nkowa ndị ọzọ, lee akwụkwọ Insight on the Scriptures, Mpịakọta 2, peji 1128-1129, nke Watch-tower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ Ihe atụ dị aṅaa ka Pọl jiri mee ihe ná 2 Ndị Kọrint 2:14-16?

◻ Mmetụta dị aṅaa ka ikesa ísìsì ụtọ nke ihe ọmụma Chineke na-enwe n’ahụ ndị ọzọ?

◻ Ọ̀ bụ nanị òle ndị ruru eru maka ọrụ nke a, ò bụkwa n’ihi gịnị?

◻ N’ihi gịnị ka ọ na-adịghị mmadụ ndị ahụ na-ekesa ísìsì ụtọ mkpa inwe akwụkwọ ozi e ji aka dee ime ka a mara ha maka ọrụ ha?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya