Ezi Ndị Kraịst Nile Aghaghị Ịbụ Ndị Na-ezisa Ozi Ọma
“Rụọ ọrụ nke onye na-ezisa ozi ọma [ma ọ bụ, onye ozi ala ọzọ].”—2 TIMOTI 4:5.
1. Gịnị bụ ozi ọma nke ndị na-ezisa ozi ọma na narị afọ mbụ kwusara?
GỊNỊ ka ọ pụtara taa ịbụ onye na-ezisa ozi ọma? Ị̀ bụ otu onye? Okwu ahụ bụ́ “onye na-ezisa ozi ọma” sitere n’okwu Grik ahụ bụ eu·ag·ge·li·stesʹ, nke pụtara “onye na-ekwusa ozi ọma.” Malite n’oge e guzobere ọgbakọ ndị Kraịst na 33 O.A, ozi ọma ndị Kraịst mere ka ụzọ Chineke ga-esi weta nzọpụta pụta ìhè, kpọsaakwa na Jisọs Kraịst ga-alaghachi ma e mesịa ịmalite ọchịchị Alaeze ya n’elu ihe a kpọrọ mmadụ.—Matiu 25:31, 32; 2 Timoti 4:1; Ndị Hibru 10:12, 13.
2. (a) Olee ụzọ ihe dị n’ime ozi ọma ahụ siworo baa ụba n’oge anyị a? (b) Ibu ọrụ dị aṅaa na-adịkwasị ezi ndị Kraịst nile taa?
2 Malite na 1914 gaa n’ihu, ihe àmà malitere ịpụta na ihe ịrịba ama ahụ nke Jisọs nyeworo banyere nlaghachi ya na ọnụnọ ya a na-adịghị ahụ anya na-enwe mmezu. (Matiu 24:3-13, 33) Ọzọkwa, ozi ọma pụrụ ịgụnye okwu ahụ bụ́ “alaeze Chineke dị nso.” (Luk 21:7, 31; Mak 1:14, 15) N’ezie, oge eruwo mgbe amụma Jisọs nke e dekọrọ na Matiu 24:14 ga-enwe mmezu dị ukwuu: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” Ya mere, ugbu a izisa ozi ọma gụnyere iji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa nguzobe nke Alaeze Chineke na ngọzi nile ndị ọ ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi n’oge na-adịghị anya. E nyere ndị Kraịst nile iwu ịrụ ọrụ nke a na ‘ime ndị na-eso ụzọ.’—Matiu 28:19, 20; Mkpughe 22:17.
3. (a) Ihe ọzọ dị aṅaa ka okwu ahụ bụ “onye na-ezisa ozi ọma” pụtara? (Lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 1, peji nke 770, kọlum nke 2, paragraf nke 2.) (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka nke a na-ewelite?
3 Tụkwasị n’ikwusa ozi ọma ahụ n’ozuzu ya, Bible na-eji okwu ahụ bụ́ “onye na-ezisa ozi ọma” na-eme ihe n’ụzọ pụrụ iche banyere ndị ahụ na-ahapụ ókèala obodo ha ije kwusaa ozi ọma n’ógbè ndị a na-arụbeghị ọrụ ọ bụla na ha. Na narị afọ mbụ, e nwere ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ na-ezisa ozi ọma, ndị dị ka Filip, Pọl, Banabas, Saịlas, na Timoti. (Ọrụ 21:8; Ndị Efesọs 4:11) Ma gịnị banyere oge anyị a pụrụ iche kemgbe 1914? Ndị Jehova n’oge a hà ewepụtawo onwe ha dị ka ndị obodo nakwa ndị ozi ala ọzọ na-ezisa ozi ọma?
Ọganihu Kemgbe 1919
4, 5. Gịnị bụ olileanya nke ọrụ izisa ozi ọma n’oge na-adịghị anya mgbe 1914 gasịrị?
4 Mgbe Agha Ụwa Mbụ kwụsịrị na 1918, ndị ohu Chineke nwetara ahụmahụ nke mmegide rịrị elu site n’aka ma ndị si n’ezi ofufe dapụ ma ndị ụkọchukwu nke Krisendọm na ndị ọchịchị enyi ya. N’ezie, ezi izisa ozi ọma nke ndị Kraịst fọrọ nke nta ka ọ kwụsị na June 1918 mgbe a mara ndị ndú nke òtù Watch Tower Society dị na United States ikpe ịga mkpọrọ 20 afọ n’ihi ebubo ụgha dị iche iche. Ndị iro Chineke hà enwewo ihe ịga nke ọma n’iweta nkwusa nke ozi ọma ahụ ná ngwụsị?
5 N’ụzọ a na-atụghị anya ya, na March 1919 a tọhapụrụ ndị ndú Society ahụ ma mesịa kachapụ ebubo ụgha ndị ahụ mere ha ji gaa mkpọrọ. Site ná nnwere onwe ọhụrụ ha, ndị Kraịst a matara na a ka nwere ọtụtụ ọrụ a ga-arụ tupu a chịkọta ha ná nkwụghachi ụgwọ ha nke eluigwe dị ka ndị nketakọ n’Alaeze nke Chineke.—Ndị Rom 8:17; 2 Timoti 2:12; 4:18.
6. Olee ụzọ ọrụ izisa ozi ọma siworo nwee ọganihu n’agbata 1919 na 1939?
6 Laa azụ na 1919, e nwere ihe na-erughị 4,000 ndị nyere akụkọ ozi nke òkè ha keere n’ịgbasa ozi ọma ahụ. N’ime iri afọ abụọ na-esonụ, ọtụtụ ndị ikom wepụtara onwe ha dị ka ndị ozi ala ọzọ na-ezisa ozi ọma, e zigakwara ụfọdụ ná mba ndị dị n’Africa, Esia, na Europe. Ka ọ na-erula 1939, mgbe 20 afọ nke ikwusa Alaeze ahụ gasịrị, Ndịàmà Jehova amụbawo karịa 73,000. Ịrị elu nke a dị ukwuu, nke a rụzuru n’agbanyeghị mkpagbu dị ukwuu, yiri ihe weere ọnọdụ n’afọ ndị mbụ nke ọgbakọ ndị Kraịst.—Ọrụ 6:7; 8:4, 14-17; 11:19-21.
7. N’afọ ndị 47 O.A. na 1939, ọnọdụ dị aṅaa yiri ibe ha ka e nwere n’ihe banyere ọrụ izisa ozi ọma nke ndị Kraịst?
7 Otú o sina dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke Ndịàmà Jehova n’oge ahụ jupụtara ná mba ndị Protestant na-asụ Bekee. N’eziokwu, ihe karịrị 75 pasent nke 73,000 ndị nkwusa Alaeze sitere n’Australia, Britain, Canada, New Zealand, nakwa United States. Dịkwa ka ọ dị n’ihe dị ka afọ 47 O.A., ọ dị otu ihe dị mkpa iji gbaa ndị na-ezisa ozi ọma ume ilebakwu anya ná mba ndị ahụ dị n’ụwa a na-adịghị arụkarị ọrụ na ha.
8. Ka ọ na-erule 1992, gịnị ka Ụlọ Akwụkwọ Gilead rụzuworo?
8 Ihe mgbochi na mkpagbu nile nke oge agha apụghị ịkwụsị mmụọ nsọ Jehova dị ike ịkpali ndị ohu ya ịkwadebe maka mmụba dị ukwuu karị. Na 1943, ka Agha Ụwa nke Abụọ kpụ ọkụ n’ọnụ, nzukọ Chineke guzobere ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead ná nzube nke ịgbasa ozi ọma n’ụzọ sara mbara karị. Ka ọ na-erule March 1992, ụlọ akwụkwọ nke a ezipụwo 6,517 ndị ozi ala ọzọ gaa 171 mba dị iche iche. Tụkwasị na nke ahụ, e nyere ndị ikom ọzụzụ ilekọta alaka ụlọ ọrụ dị iche iche nke Watch Tower Society ná mba ndị ọzọ. Ka ọ na-erule 1992, n’ime 97 ndị nhazi Kọmitii Alaka, e nyewo 75 ọzụzụ na Gilead.
9. Ihe omume ndị dị aṅaa na-enye ọzụzụ kerewooro òkè n’ọganihu nke ọrụ izisa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ?
9 E wezụga Ụlọ Akwụkwọ Gilead, ihe omume inye ọzụzụ ndị ọzọ emewo ka ndị Jehova nwee ngwá ọrụ ịmụba na imeziwanye ọrụ izisa ozi ọma ha. Dị ka ihe atụ, Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na-enwe ihe omume n’ọgbakọ nile nke Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa. Ndokwa nke a, tinyere Nzukọ Ije Ozi ahụ a na-enwe kwa izu, enyewo ọtụtụ nde ndị nkwusa Alaeze ọzụzụ ịdị irè n’ozi ihu ọha. E nwekwara Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze, nke na-enye ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ọzụzụ bara uru ka ndị a nwee ike ilekọta ọgbakọ ndị ahụ na-amụba amụba nke ọma karị. Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ enyeworo ọtụtụ ndị na-ezisa ozi ọma oge nile aka ịdị irè karị n’ọrụ nkwusa ha. N’oge na-adịbeghị anya karị, a malitewo Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi ná mba dị iche iche iji nyere ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-alụbeghị nwunye aka ịghọ Timoti ndị nke oge a.
10. Gịnị siworo n’ọzụzụ mara mma nke a na-enye site ná nzukọ Chineke pụta? (Tinye ihe ọmụma dị n’igbe.)
10 Gịnị siworo n’ọzụzụ nile ndị a pụta? Na 1991, Ndịàmà Jehova ruru ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ihe karịrị nde ndị nkwusa Alaeze anọ na-arụsi ọrụ ike na 212 mba. Otú ọ dị, n’adịghị ka ọnọdụ ahụ e nwere na 1939, ihe karịrị 70 pasent nke ndị a sitere n’ala ndị Katọlik, okpukpe Orthodox, ndị na-abụghị ndị Kristian, ma ọ bụ n’ala ndị ọzọ, bụ́ ebe asụsụ Bekee na-abụghị asụsụ bụ isi.—Lee igbe bụ́ “Mmụba Kemgbe 1939.”
Gịnị Kpatara Ọganihu Ahụ
11. Ònye ka Pọl onyeozi kwuru na inwe ihe ịga nke ọma ya dị ka onye na-eje ozi si n’aka?
11 Ndịàmà Jehova adịghị anara otuto maka mmụba nke a. Kama nke ahụ, ha na-ele ọrụ ha anya n’ụzọ ahụ Pọl onyeozi si lee ya, dị ka ọ kọwara n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọrint. “Gịnịkwa bụ Apọlọs? Gịnị bụkwa Pọl? Ndị na-eje ozi, ndị unu si n’aka ha kwere; dị ka Onyenwe anyị nyekwara ha abụọ n’otu n’otu. Mụ onwe m kụrụ osisi, Apọlọs kwọsara ya mmiri; ma ọ bụ Chineke na-eme ka ọ na-aba ụba. Ya mere onye na-akụ abụghị ihe ọ bụla, onye na-akwọsa mmiri abụghịkwa ihe ọ bụla; kama Chineke, onye na-eme ka ọ na-aba ụba. N’ihi na anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ: unu bụ ubi Chineke, bụrụkwa ụlọ Chineke na-ewu.”—1 Ndị Kọrint 3:5-7, 9.
12. (a) Òkè dị aṅaa ka Okwu Chineke na-ekere n’ihe ịga nke ọma nke izisa ozi ọma ndị Kraịst? (b) Ònye ka a họpụtaworo dị ka Isi nke ọgbakọ ndị Kraịst, gịnịkwa bụ otu ụzọ dị mkpa isi gosipụta na anyị doro onwe anyị n’okpuru ịchịisi ya?
12 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na mmụba ahụ pụrụ iche nke Ndịàmà Jehova na-enwe bụ n’ihi ngọzi Chineke. Ọ bụ ọrụ Chineke. N’ịghọta eziokwu nke a, ha nọgidere na-atụkwasị uche ha n’ịmụ Okwu Chineke n’ụzọ chiri anya. Ha na-eme ka ihe ọ bụla ha na-akụzi n’ọrụ izisa ozi ọma ha dabere na Bible. (1 Ndị Kọrint 4:6; 2 Timoti 3:16) Isi ihe ọzọ kpatara ọganihu ha n’izisa ozi ọma bụ nghọta zuru ezu ha nwere banyere Onye ahụ nke Chineke họpụtara dị ka Isi nke ọgbakọ ahụ, bụ́ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. (Ndị Efesọs 5:23) Ndị Kraịst narị afọ mbụ gosipụtara nke a site n’inye ndị ahụ Jisọs họpụtara dị ka ndị ozi nkwado. Ndị ikom ndị a, ha na ndị okenye ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ Jerusalem, mejupụtara òtù na-achị isi nke ndị Kraịst narị afọ mbụ. Site n’eluigwe, Onyenwe anyị Jisọs Kraịst jiri ìgwè ndị Kraịst nke a tozuru okè mee ihe idozi ihe iseokwu dị iche iche na inye ntụziaka n’ọrụ izisa ozi ọma. Nkwado Pọl ji ịnụ ọkụ n’obi nye ndokwa Chineke nke a mere ka e nwee ịrị elu n’ọgbakọ ndị o letara. (Ọrụ 16:4, 5; Ndị Galetia 2:9) N’otu aka ahụ taa, site n’ijigidesi Okwu Chineke aka ike na iji ịnụ ọkụ n’obi na-akwado ntụziaka sitere n’aka Òtù Na-achị Isi, a na-emesi ndị Kraịst na-ezisa ozi ọma obi ike na ha ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ozi ha.—Taịtọs 1:9; Ndị Hibru 13:17.
Ịgụ Ndị Ọzọ ná Ndị Ka Mma
13, 14. (a) Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl onyeozi nyere dị ka e dekọrọ ná Ndị Filipaị 2:1-4? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa icheta ndụmọdụ nke a mgbe a na-ekere òkè n’ọrụ izisa ozi ọma?
13 Pọl onyeozi gosipụtara ezi ịhụnanya maka ndị na-achọ eziokwu, o gosipụtaghịkwa àgwà nke ịka elu ma ọ bụ ịkpọasị agbụrụ. Otú a, ọ pụrụ inye ndị kwere ekwe ibe ya ndụmọdụ ka ha ‘na-agụ ndị ọzọ ná ndị ka mma.’—Ndị Filipaị 2:1-4.
14 N’otu ụzọ ahụ, ezi ndị Kraịst na-ezisa ozi ọma taa adịghị enwe àgwà nke na ha ka ndị ọzọ mma mgbe ha na-emeso ndị sitere n’agbụrụ na n’ọdịnala dị iche iche ihe. Otu onye n’ime Ndịàmà Jehova sitere United States, nke e kenyere ịrụ ọrụ dị ka onye ozi ala ọzọ n’Africa, kwuru, sị: “Amaara m kpọmkwem na anyị akaghị ha. Ọ pụrụ ịbụ na anyị nwere ego na ihe a na-akpọ agụmakwụkwọ bụ isi karịa ha, ma ha [ndị obodo ahụ] nwere àgwà ndị karịrị nke anyị.”
15. Olee ụzọ ndị e kenyere ọrụ n’ala ọzọ pụrụ isi gosipụta ezi nkwanye ùgwù maka ndị ga-aghọ ndị na-eso ụzọ?
15 N’ezie, site n’igosipụta ezi nkwanye ùgwù maka ndị ahụ anyị na-eso ekerịta ozi ọma ahụ, anyị ga-eme ka ọ dịrị ha mfe ịnakwere ozi Bible. Ọ na-enyekwa aka mgbe onye ozi ala ọzọ na-ezisa ozi ọma gosiri na obi dị ya ụtọ ibi n’etiti ndị ahụ e kenyeworo ya ọrụ inyere aka. Otu onye ozi ala ọzọ nke nwere ihe ịga nke ọma, bụ́ onye nọworo 38 afọ gara aga n’Africa kọwara, sị: “Ana m enwe mmetụta dị omimi n’ime onwe m na ebe a bụ obodo m, na ndị a nọ n’ọgbakọ ebe e kenyere m ọrụ bụ ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị. Mgbe m laghachiworo na Canada n’oge ezumike, ahụ adịghị eru m ala n’ezie. N’izu ikpeazụ ma ọ bụ ihe dị ka ya m ga-anọ na Canada, ọ na-agụsi m agụụ ike ịlaghachi. Otú ahụ ka ọ na-adịkarị m. Ana m agwa ndị m na-eduziri ọmụmụ Bible nakwa ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị otú obi si dị m ụtọ ịlaghachi, ha na-enwekwa ekele na m chọrọ iso ha nọrọ.”—1 Ndị Tesalonaịka 2:8.
16, 17. (a) Ihe ịma aka ndị dị aṅaa ka ndị ozi ala ọzọ na ndị obodo na-ezisa ozi ọma nakwewooro iji wee dị irè n’ozi ha karị? (b) Ahụmahụ dị aṅaa ka otu onye ozi ala ọzọ nwere n’ihi ikwu okwu n’asụsụ ndị obodo ahụ?
16 Mgbe ha chọtara otu ìgwè buru ibu na-asụ asụsụ ala ọzọ n’ókèala ndị ha na-arụ, ụfọdụ emewo mgbalị ịmụta asụsụ ahụ, na-egosipụta site na nke a na ha na-agụ ndi ọzọ ná ndị ka ha mma. “N’ebe ndịda Africa,” ka otu onye ozi ala ọzọ kwuru, “mgbe ụfọdụ a na-enwe mmetụta enweghị ntụkwasị obi n’etiti ndị a zụlitere n’Africa na ndị a zụlitere na Europe. Ma anyị ikwu okwu n’asụsụ obodo ahụ na-ewepụ mmetụta nke a ngwa ngwa.” Ikwu okwu n’asụsụ nke ndị ahụ anyị na-ezisara ozi ọma bụ ihe inyeaka dị ukwuu iji rute n’obi ha. Ọ chọrọ ịrụsi ọrụ ike na iji obi umeala nọgidesie ike. Otu onye ozi ala ọzọ nọ n’otu mba dị n’Esia kwuru: “Ịnọgide na-emejọ ihe ma bụrụ onye a na-achị ọchị maka ihe ndị ọ mejọrọ pụrụ ịbụ ule. Ọ pụrụ iyi ihe dị mfe karị ịkwụsị.” Otú ọ dị, inwe ịhụnanya maka Chineke na ndị agbata obi ya nyeere onye ozi ala ọzọ nke a aka ịnọgide.—Mak 12:30, 31.
17 N’ụzọ kwere nghọta, a na-akpali mmasị ndị mmadụ mgbe onye ozi ala ọzọ na-agbalị ikerịta ozi ọma ahụ n’asụsụ nke ndị ọ na-agwa okwu. Mgbe ụfọdụ ọ na-arụpụta ngọzi ndị a na-atụghị anya ha. Otu nwanyị na-eje ozi ala ọzọ ná mba Africa bụ́ Lesotho na-agwa otu nwanyị ọzọ okwu n’asụsụ Sesotho, bụ́ onye na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ na-akpa ákwà. Otu onye minista ndị gọọmenti sitere ná mba Africa ọzọ na-eme njem nlegharị anya n’ogige ahụ wee nụpere nkwurịta okwu ahụ. Ọ bịara nso wee jaa ya mma n’ụzọ na-ekpo ọkụ, mgbe ahụ ọ malitere ịgwa onye minista gọọmenti ahụ okwu n’asụsụ nke ya. “Gịnị mere na ị bịaghị ná [mba m] ma na-arụ ọrụ n’etiti ndị obodo anyị, ebe ọ bụ na ị makwaara asụsụ Swahili?” ka ọ jụrụ. N’ụzọ akọ, onye ozi ala ọzọ ahụ zaghachiri, sị: “Nke ahụ ga-adị nnọọ mma. Ma abụ m otu onye n’ime Ndịàmà Jehova, ka ọ dịkwa ugbu a, iwu mba unu megidere ọrụ anyị.” “Biko,” ka ọ zaghachiri, “unu echela na anyị nile na-emegide ọrụ unu. Ọtụtụ n’ime anyị na-akwado Ndịàmà Jehova. Eleghị anya otu ụbọchị unu ga-enwe ike izi ihe n’etiti ndị obodo anyị n’enweghị ihe mgbochi.” Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, onye ozi ala ọzọ ahụ nwere obi ụtọ ịmata na e nyewo Ndịàmà Jehova nnwere onwe ife ofufe ná mba ahụ.
Ịdị Njikere Ileghara Ihe Ndị Ruuru Gị
18, 19. (a) N’ụzọ dị aṅaa dị mkpa ka Pọl si mee mgbalị iṅomi Onyenwe ya, bụ́ Jisọs Kraịst? (b) Kọọ otu ahụmahụ (nke dị na paragraf ma ọ bụ nke gị) iji gosi ịdị mkpa nke izere ihe ọ bụla ga-akpatara ndị ahụ anyị so na-ekerịta ozi ọma ahụ mkpọbi ụkwụ.
18 Mgbe Pọl onyeozi dere, sị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi m, dị ka mụ onwe m bụkwa onye na-eṅomi Kraịst,” ọ nọwo nnọọ na-atụle mkpa ọ dị izere ime ihe ga-akpọbi ndị ọzọ ụkwụ, na-asị: “Ma ùnu na-eri ihe, ma ùnu na-aṅụ ihe, ma ùnu na-eme ihe ọ bụla, na-emenụ ihe nile ka e wee nye Chineke otuto. Unu aghọla ndị na-eme ndị Juu, ma ọ bụ ndị Grik, ma ọ bụ nzukọ Chineke, ka ha sụọ ngọngọ: dị ka mụ onwe m na-emekwa ihe na-atọ mmadụ nile n’ihe nile, n’achọghị uru nke aka m, kama uru nke mmadụ nile, ka e wee zọpụta ha.”—1 Ndị Kọrint 10:31-33; 11:1.
19 Ndị na-ezisa ozi ọma dị ka Pọl, bụ́ ndị dị njikere iji ihe chụọ àjà maka ọdịmma nke ndị ahụ ha meere nkwusa, nwetara ọtụtụ ngọzi. Dị ka ihe atụ, n’otu mba Africa, otu di na nwunye na-eje ozi ala ọzọ gara n’otu ụlọ oriri ndị obodo maka nri pụrụ iche iji mee ememe ịgba afọ nke agbamakwụkwọ ha. Na mbụ, ha bu n’uche ikwu ka e nwetara ha mmanya wine na ihe oriri, ebe ọ bụ na a katọghị iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na-emeru ihe n’ókè na Bible. (Abụ Ọma 104:15) Ma mgbe ahụ di na nwunye nke a kpebiri na ha agaghị eme otú ahụ, a dịghị ama ama ọ kpasuo ndị obodo ahụ iwe. “Mgbe oge ụfọdụ gasịrị,” ka onye ahụ bụ di chetara, “anyị zutere otu nwoke na-esi nri n’ụlọ oriri ahụ, anyị wee malitere ya ọmụmụ Bible. Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, ọ gwara anyị, sị: ‘Ì chetara mgbe ị bịara n’ụlọ oriri anyị maka nri pụrụ iche? Anyị nile nọ n’azụ ọnụ ụzọ na-ekiri gị. Ị hụla, ndị ozi ala ọzọ nke chọọchị gwara anyị na ọ dị njọ anyị ịṅụ mmanya. Ma, mgbe ha bịara n’ụlọ oriri ahụ, ha kwuru ka e nwetara ha mmanya wine. Ya mere, anyị kpebiri na ọ bụrụ na unu ekwuo ka e butere unu mmanya na-aba n’anya, anyị agaghị ege unu ntị mgbe unu ga-abịa ikwusara anyị ozi ọma.’” Taa, nwoke ahụ na-esi nri na ụfọdụ ndị ọzọ rụrụ ọrụ n’ụlọ oriri ahụ bụ Ndịàmà e mere baptism.
A Ka Nwere Ọrụ Dị Ukwuu A Ga-arụ
20. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị nọgidesie ike dị ka ndị na-ezisa ozi ọma na-anụ ọkụ n’obi, ihe ùgwù dịkwa aṅaa na-enye ọṅụ ka ọtụtụ ndị na-anakwere?
20 Ka ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a na-abịaru nso, ọtụtụ ka nwere ọchịchọ ịnụ ozi ọma ahụ, ọ bụkwa ihe dị ngwa karịa mgbe ọ bụla nye onye Kraịst ọ bụla ịnọgidesi ike dị ka onye na-ezisa ozi ọma na-ekwesị ntụkwasị obi. (Matiu 24:13) Ị̀ pụrụ ịmụba òkè ị na-ekere n’ọrụ nke a site n’ịghọ onye na-ezisa ozi ọma n’ụzọ pụrụ iche dị ka Filip, Pọl, Banabas, Saịlas, na Timoti? Ọtụtụ na-eme ihe yiri nke ahụ site n’isonye n’òtù ndị ọsụ ụzọ na iwepụta onwe ha maka ije ozi n’ebe ndị e nwere mkpa ka ukwuu.
21. N’ụzọ dị aṅaa ka e megheworo ‘ọnụ ụzọ dị ukwuu nke ịrụ ọrụ’ nye ndị Jehova?
21 N’oge na-adịbeghị anya, ubi buru ibu maka izisa ozi ọma emeghewo ná mba ndị dị n’Africa, Esia, na Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, ebe a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova na mbụ. Dị ka ọ dị n’ọnọdụ Pọl onyeozi, ‘e meghewo ọnụ ụzọ dị ukwuu’ nye ndị Jehova. (1 Ndị Kọrint 16:9) Dị ka ihe atụ, ndị ozi ala ọzọ na-ezisa ozi ọma, bụ́ ndị bịarutere ná mba Africa bụ Mozambique n’oge na-adịbeghị anya, apụghị iduzichara ọnụ ọgụgụ nke ndị na-achọ ịmụ Bible ihe. Lee aha obi ụtọ anyị pụrụ inwe na a nabatawo ọrụ nke Ndịàmà Jehova n’iwu ala ahụ na February 11, 1991!
22. Ma à na-arụ ókèala anyị ọrụ nke ọma ma ọ bụ na a dịghị, gịnị ka anyị nile na-aghaghị ikpebi ime?
22 Ná mba ebe anyị nọworo na-enwe nnwere onwe ife ofufe, ụmụnna anyị anọgidewokwa na-enwe ịrị elu. Ee, ebe ọ bụla anyị bi, a ka nwere ‘ọrụ dị ukwuu a ga-arụ n’ime Onyenwe anyị.’ (1 Ndị Kọrint 15:58) Ebe ọ bụ na ọ dị otú ahụ, ka anyị nọgide jiri oge fọdụrụ na-eme ihe amamihe dị na ya ka onye ọ bụla n’ime anyị ‘na-arụ ọrụ nke onye na-ezisa ozi ọma, na-ejezukwa ozi anyị.’—2 Timoti 4:5; Ndị Efesọs 5:15, 16.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Gịnị bụ onye na-ezisa ozi ọma?
◻ Olee ụzọ ihe dị n’ime ozi ọma ahụ si baa ụba mgbe 1914 gasịrị?
◻ Olee ụzọ ọrụ izisa ozi ọma siworo gaa n’ihu kemgbe 1919?
◻ Isi ihe ndị dị aṅaa kerewooro òkè n’inwe ihe ịga nke ọma nke ọrụ izisa ozi ọma?
[Igbe dị na peeji nke 19]
Mmụba Kemgbe 1939
Tụlee ihe atụ ndị sitere na kọntinent atọ ebe e zigara ndị ozi ala ọzọ e nyere ọzụzụ na Gilead. Laa azụ na 1939, e nwere nanị 636 ndị nkwusa Alaeze bụ́ ndị nyere akụkọ ozi site n’Ọdịda Anyanwụ Africa. Ka ọ na-erule 1991, ọnụ ọgụgụ nke a arịwo elu karịa 200,000 ná mba 12 nke Ọdịda Anyanwụ Africa. Ndị ozi ala ọzọ ekerewokwa òkè n’ịrị elu nke a pụrụ iche ná mba ndị dị n’Ebe Ndịdị Kọntinent America. Otu bụ Brazil, bụ́ nke nwere ịrị elu sitere na 114 ndị nkwusa Alaeze na 1939 ruo n’ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 335,039 n’April 1992. Mmụba yiri nke ahụ malitere mgbe ndị ozi ala ọzọ bịara ná mba ndị dị n’Esia. N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, a kpagburu obere ọnụ ọgụgụ nke Ndịàmà Jehova nọ na Japan nke ukwuu, ọrụ ha kwụsịkwara. Mgbe ahụ, na 1949, ndị ozi ala ọzọ 13 bịara inye aka iji hazigharịa ọrụ ahụ. N’afọ ije ozi ahụ, ihe na-erughị ndị obodo iri bụ́ ndị nkwusa nyere akụkọ ozi ubi maka Japan dum, ma n’April 1992 ngụkọta nile nke ndị nkwusa ruru 167,370.
[Igbe dị na peeji nke 21]
Krisendọm na Nsogbu Asụsụ
Ụfọdụ n’ime ndị ozi ala ọzọ nke Krisendọm mere mgbalị dị ukwuu ịmụta asụsụ ala ọzọ, ma ọtụtụ tụrụ anya ka ndị obodo na-ekwu okwu n’asụsụ Europe ha. Dị ka Geoffrey Moorhouse si kọwaa n’akwụkwọ ya bụ́ The Missionaries:
“Ihe bụ nsogbu bụ na, ọtụtụ mgbe e lere ịmụta asụsụ ndị obodo anya dị ka nanị ụzọ isi sụgharịa Akwụkwọ nsọ. Nanị mgbalị dị nta ka e tinyere, ma ọ̀ bụ site n’aka ndị mmadụ n’otu n’otu ma ọ bụ site n’aka òtù ndị ahụ were ha n’ọrụ, iji hụ na ndị ozi ala ọzọ pụrụ ikwu okwu n’asụsụ nke ndị obodo n’ụzọ dị were were nke mmadụ abụọ pụrụ nnọọ ịghọta nke ọma. Onye ozi ala ọzọ ọ bụla na-amụta asụsụ ndị obodo n’elu n’elu . . . Karia nke ahụ, ọtụtụ nwere nkwurịta okwu n’usoro ikwu okwu nzuzu na nke na-eme ihere nke a na-akpọ pidgin English, bụ́ nke chọrọ kpam kpam ka ndị Africa mụta ụkpụrụ nke asụsụ Bekee nke onye ọbịa. N’ịbụ ihe jọgburu onwe ya, nke a bụ ngosipụta ọzọ nke agbụrụ ịka ibe ya.”
Na 1922, ụlọ akwụkwọ School of Oriental and African Studies nke dị na London bipụtara otu akụkọ ozi banyere nsogbu nke asụsụ. “Anyị chere,” ka akụkọ ozi ahụ sịrị, “na ọ̀tụ̀tụ̀ nkezi ịdị irè nke ndị ozi ala ọzọ nwere n’ịsụ asụsụ ndị obodo . . . dị ala n’ụzọ dị mwute na ọbụna n’ụzọ dị ize ndụ.”
Ndị ozi ala ọzọ nke Watch Tower Society anọgidewo na-ewere ịmụta asụsụ nke ndị obodo dị ka ihe a na-aghaghị ime, bụ́ nke na-enye aka ịkọwa ihe ịga nke ọma ha na-enwe n’ubi ozi ala ọzọ.