Mgbe Okwu Ghọrọ Ngwá Ọgụ
“O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha.”—ILU 12:18.
“N’IZU ole na ole ka agbamakwụkwọ ahụ gasịrị, o bidoro,” ka Elaine na-ekwu.a “Okwu ọjọọ, okwu mwetu ala, na mgbalị imenye m ihere. Mụ na di m ahaghị. Uche ya dị nkọ na ire ya dị nkọ pụrụ ịrọgọ na ịgbagọ ihe ọ bụla m kwuru.”
N’oge nile ọ nọ na di, e dowo Elaine n’okpuru ụdị iti ihe zoro ezo nke na-adịghị ahapụ apa ọ bụla, nke na-ewetakwa ọmịiko dị nta. Ọ bụ ihe mwute na ọnọdụ ya akabeghị mma ka oge na-agafe. “Anyị alụwo di na nwunye ugbu a ruo ihe karịrị afọ 12,” ka ọ na-ekwu. “Ọ dịghị ụbọchị na-agafe ọ ghara ịkatọ m ma gwakasịa m okwu ahụ, na-eji okwu obi ọjọọ, nke rere ure.”
Bible adịghị ekwu okwu gabiga otú ihe dị mgbe ọ sịrị na ire pụrụ ịbụ “ihe ọjọọ nke na-adịghị eguzo n’otu ebe . . . [nke] jupụtara n’ire agwọ na-eweta ọnwụ.” (Jemes 3:8; tụlee Abụ Ọma 140:3.) Nke a bụ nnọọ eziokwu n’alụmdi na nwunye. “Onye ọ bụla sịrị na ‘mkpara na okwute pụrụ ịkụji m ọkpụkpụ ma ọ dịghị ihe okwu ga-eme m ma ọlị’ amaghị ihe ọ na-ekwu,” ka otu nwunye aha ya bụ Lisa na-ekwu.—Ilu 15:4.
Ndị bụ di pụkwara ịbụ ndị e ji okwu iwe agwakasị ahụ. “Ị̀ maara otú ọ na-adị iso nwanyị na-akpọ gị mgbe nile onye ụgha, onye iberibe ma ọ bụ ihe ndị ka njọ biri?” ka Mike, onye alụmdi na nwunye ya na Tracy nke dịworo afọ anọ na-eche ihu n’ịgba alụkwaghịm, na-ajụ. “Apụghị m ikwughachi ihe ndị ọ na-agwa m n’ihu ndị nwere ezi àgwà. Ọ bụ ya mere apụghị m ịgwa ya okwu na ihe mere m ji anọte aka n’ọrụ. Ọ ka ịlọta n’ụlọ mma nke ukwuu.”—Ilu 27:15.
Ọ bụ ezi ihe mere Pọl onyeozi ji gwa ndị Kraịst okwu ntụziaka, sị: “Ka e wepụ . . . iti mkpu na nkwulu nile . . . n’etiti unu.” (Ndị Efesọs 4:31) Ma gịnị bụ “nkwulu”? Pọl setịpụrụ ya iche n’ebe “iti mkpu” (Grik, krau·geʹ) dị, nke na-enye echiche nke nanị iweli olu. “Nkwulu” (Grik, bla·sphe·miʹa) na-ezo aka karị n’ihe dị n’ozi ahụ. Ọ bụrụ na ọ bụ nke mmegbu, obi ọjọọ, mweda n’ala, ma ọ bụ mkparị, mgbe ahụ ọ bụ nkwulu—ma ọ̀ pụtara ná mkpu ma ọ bụ n’okwu a takwụnyere ná ntị.
Ọnyá nke Okwu
Usoro nke okwu obi ọjọọ pụrụ ime ka alụmdi na nwunye ghara isi ike, dị nnọọ ka mmali mmiri pụrụ irichapụ nkume siri ike. “Ka ọ na-esiwanye ike ma na-adịte anya,” ka Dr. Daniel Goleman na-ede, “ka ihe ize ndụ ya na-aka ukwuu. . . . Àgwà nkatọ na nlelị ma ọ bụ ịkpọasị bụ mgbaàmà nke ihe ize ndụ n’ihi na ha na-egosi na di ma ọ bụ nwunye amawo onye òtù ya ikpe n’obi.” Ka ịhụnanya na-adalata, di na nwunye na-aghọ, dị ka otu akwụkwọ si kwuo ya, “ndị nọ n’ọlụlụ n’iwu, ma ọ bụghị ná mmetụta uche.” Ka oge na-aga, ha pụrụ ịghọ ndị na-anọghị n’ọlụlụ ma ọlị.
Otú ọ dị, ịgwakasị mmadụ okwu pụrụ imetụta ihe karịrị alụmdi na nwunye n’onwe ya. Otu ilu Bible na-asị: “Ma e ji ihe mwute nke obi tigbuo mmụọ mmadụ.” (Ilu 15:13) Nchekasị na-esite ná mwụkwasị nke okwu na-emerụ ahụ pụrụ imebi ihe dị ukwuu n’ahụ ike mmadụ. Dị ka ihe atụ, otu nnyocha Mahadum Washington (U.S.A.) mere kpughere na nwanyị a na-ekwutọ mgbe nile pụrụ ịdị na-adabakarị n’ụkwara na azụzụ, nsogbu akpa mamịrị, ọrịa ọkọ ọtụ, na nsogbu afọ.
Ọtụtụ ndị nwunye nagideworo iti ihe ma nke okwu ọnụ ma nke nkịtị na-ekwu na okwu pụrụ imerụ ahụ karịa aka ọkpọ. “Nchifịa ahụ sitere n’ọra ya ga-emesịa laa ma pụọ n’anya,” ka Beverly na-ekwu, “ma agaghị m echezọ ma ọlị ajọ ihe ndị o kwuru banyere otú m dị, otú m si esi nri, otú m si elekọta ụmụ.” Ọ dịkwa Julia nnọọ otú ahụ. “Ama m na ọ na-ada ka mụ amaghị ihe m na-ekwu,” ka ọ na-ekwu, “ma ọ ga-akara m mma ka o tie mụ ihe nke ahụ agaa kama mụ na uche m ịgba mgba a ọtụtụ hour.”
Ma n’ihi gịnị ka ụfọdụ ji awakpo ma na-agwagbu onye ha sịrị na ha hụrụ n’anya n’okwu? Isiokwu na-esonụ na-atụle ajụjụ a.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha ụfọdụ n’usoro isiokwu ndị a.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]
“Ọ ga-akara m mma ka o tie mụ ihe nke ahụ agaa kama mụ na uche m ịgba mgba a ọtụtụ hour”
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]
“Ị̀ maara otú ọ na-adị iso nwanyị na-akpọ gị mgbe nile onye ụgha, onye iberibe, ma ọ bụ ihe ndị ka njọ biri?”