Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 9/1 p. 8-13
  • Ndị Ntorobịa—Guzogidenụ Mmụọ nke Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Ntorobịa—Guzogidenụ Mmụọ nke Ụwa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịmata Mmụọ nke Ụwa
  • Ngosipụta Dị Iche Iche nke Mmụọ nke Ụwa
  • Ịjụ Mmụọ nke Ụwa
  • Igosipụta “Mmụọ Dị Iche”
  • Ị Na-eguzogide Mmụọ nke Ụwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ndị Ntorobịa—Gịnị Ka Unu Na-achụso?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Nọrọ Na Nche Megide Egwú Na-adịghị Ewuli Elu!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Nata Mmụọ Chineke, Ọ Bụghị Nke Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 9/1 p. 8-13

Ndị Ntorobịa—Guzogidenụ Mmụọ nke Ụwa

“Ma anyị onwe anyị anataghị mmụọ nke ụwa, kama ọ bụ Mmụọ Nke sitere na Chineke.”—1 NDỊ KỌRINT 2:12.

1, 2. (a) Ọdịiche dị aṅaa ka a pụrụ ịhụ n’etiti ndị na-eto eto nọ n’ụwa na ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova? (b) Olee ezigbo ịja mma a pụrụ ịja ihe ka ọtụtụ ná ndị ntorobịa bụ́ Ndịàmà?

“ỌGBỌ ụmụaka anyị bụ nke a kụdara mmụọ, nke a jụrụ ajụ, na nke na-enupụ isi.” Otú ahụ ka akwụkwọ akụkọ Australia bụ́ The Sun-Herald kwuru. Ọ gbakwụnyere, sị: “Ihe ndekọ ụlọikpe na-egosi ịrị elu dị pasent 22 [karịa nke afọ gara aga] n’ọnụ ọgụgụ ụmụaka a na-akpụpụ n’ụlọikpe maka ebubo ajọ mwakpo . . . Ụmụaka na-egbu onwe ha n’ọ̀tụ̀tụ̀ ruworo okpukpu atọ kemgbe agbata afọ ndị 1960 . . . Ọdịiche ahụ dị n’akparamàgwà dịzi ka nnukwu olulu nke ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị na-eto eto na-adabanye na ya site n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ, mmanya na-aba n’anya ma na-egbu onwe ha.” Otú ọ dị, ọnọdụ a adịghị nanị n’otu ala. N’ụwa nile, ndị mụrụ ụmụ, ndị nkụzi, na ndị ọkachamara n’ahụ ike uche na-eme mkpesa banyere ọnọdụ ndị na-eto eto.

2 Lee ọdịiche pụtara ìhè e nwere n’etiti ihe ka ọtụtụ ná ndị ntorobịa nke oge a na ezi ndị na-eto eto a na-ahụ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova! Ọ bụghị na ha zuru okè. Ha onwe ha na-alusokwa “agụụ ihe ọjọọ na-agụ nwa okorobịa” ọgụ. (2 Timoti 2:22) Ma dị ka otu ìgwè, ndị a na-eto eto ewerewo nguzo siri ike maka ihe ziri ezi ma jụ ikwenye ná nrụgide dị iche iche nke ụwa. Anyị ji obi anyị dum na-aja unu nile bụ́ ndị na-eto eto mma bụ́ ndị na-emeri n’agha ha na-alụso “omume aghụghọ nile” nke Setan! (Ndị Efesọs 6:11, nkọwa ala ala peji nke NW) Dị ka Jọn onyeozi, a na-akpali anyị ikwu, sị: “Ụmụ okorobịa [na ụmụ agbọghọbịa], edegaara m unu akwụkwọ, n’ihi na unu dị ike, okwu Chineke na-anọgidekwa n’ime unu, unu emeriwokwa ajọ onye ahụ.”—1 Jọn 2:14.

3. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “mmụọ” pụrụ ịpụta?

3 Otú o sina dị, iji nọgide na-emeri n’agha unu na-alụso ajọ onye ahụ, unu aghaghị ịgbalịsi ike iguzogide ihe Bible na-akpọ “mmụọ nke ụwa.” (1 Ndị Kọrint 2:12) Dị ka otu akwụkwọ na-akọwa Grik si kwuo, “mmụọ” pụrụ ịpụta “omume ma ọ bụ mmetụta nke na-ejupụta ma na-achịkwa mkpụrụ obi onye ọ bụla.” Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị chọpụta na mmadụ nwere obi ilu, ị pụrụ ịsị na o nwere “mmụọ” na-adịghị mma. “Mmụọ,” omume, ma ọ bụ echiche uche gị na-enwe mmetụta ná nhọrọ ndị ị na-eme; ọ na-enwe mmetụta n’omume na n’okwu gị. Ọ dị mma ịmara na ma ndị mmadụ n’otu n’otu ma ìgwè mmadụ nwere “mmụọ” ha pụrụ igosipụta. Pọl onyeozi degaara otu ìgwè ndị Kraịst akwụkwọ, sị: “Ka amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu.” (Faịlimọn 25) Oleezi ụdị mmụọ ụwa nke a na-egosipụta? Ebe ọ bụ na “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ,” Setan bụ́ Ekwensu, ọ pụghị ikwe omume na mmụọ nke ụwa ga-adị mma, ka ọ̀ pụrụ?—1 Jọn 5:19.

Ịmata Mmụọ nke Ụwa

4, 5. (a) Olee mmụọ nweworo mmetụta n’ahụ ndị nọ n’ọgbakọ Efesọs tupu ha aghọọ ndị Kraịst? (b) Ònye bụ “onyeisi nke ike nke mbara ikuku,” gịnịkwa bụ “ikuku” ahụ?

4 Pọl dere, sị: “Unu onwe unu ka O mekwara ka unu dị ndụ, mgbe unu nọ n’ọnwụ site ná ndahie nile unu na mmehie nile unu, nke unu jegharịrị n’ime ha n’oge gara aga n’ụzọ oge nke ụwa nke a, dị ka onyeisi nke ike nke [ikuku, NW] si chọọ, bụ́ mmụọ ahụ nke na-arụsi ọrụ ike n’ime ụmụ nke ekwenyeghị ekwenye ugbu a; ndị anyị onwe anyị nile bikwara obi n’etiti ha n’oge gara aga n’ime agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ anyị, na-eme ihe nile anụ ahụ anyị na echiche uche anyị chọrọ, bụrụkwa ụmụ nke iwe dị ka e si mụọ anyị, dị ka ndị fọdụrụ bụkwa.”—Ndị Efesọs 2:1-3.

5 Tupu ha amụta ụzọ ndị Kraịst, ndị Kraịst nọ n’Efesọs anọwo na-eso ụzọ “onyeisi nke ike nke mbara ikuku,” Setan bụ́ Ekwensu, n’amaghị ama. “Ikuku” ahụ abụghị ebe nkịtị nke Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya bi. Mgbe Pọl dere okwu ndị a, Setan bụ́ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya ka na-aga n’eluigwe. (Tụlee Job 1:6; Mkpughe 12:7-12.) Okwu ahụ bụ́ “ikuku” pụtara mmụọ, ma ọ bụ echiche uche, nke jupụtara n’ụwa Setan. (Tụlee Mkpughe 16:17-21.) Dị ka ikuku nke gbara anyị gburugburu, mmụọ a dị ebe nile.

6. Gịnị bụ “ike nke mbara ikuku,” e sikwa aṅaa eji ya eme ihe n’ahụ ọtụtụ ndị na-eto eto?

6 Ma gịnị bụ “ike nke mbara ikuku”? Ihe àmà na-egosi na nke a na-ezo aka ná mmetụta dị ukwuu nke “ikuku” a na-enwe n’ahụ ndị mmadụ. Pọl kwuru na mmụọ a “na-arụsi ọrụ ike n’ime ụmụ nke ekwenyeghị ekwenye.” Ya mere mmụọ nke ụwa na-akpata mmụọ nnupụisi, nrụgide ndị ọgbọ bụkwa otu ụzọ e si egosipụta ike a. “Mgbe ị nọ n’ụlọ akwụkwọ,” ka otu nwa agbọghọ bụ́ Onyeàmà na-ekwu, “onye ọ bụla na-agba gị ume mgbe nile inupụtụ isi. Ụmụaka na-akwanyere gị ùgwù karị ma ọ bụrụ na i mee ihe na-egositụ omume nnupụisi.”

Ngosipụta Dị Iche Iche nke Mmụọ nke Ụwa

7-9. (a) Kwuo ụzọ ụfọdụ e si na-egosipụta mmụọ nke ụwa n’etiti ndị na-eto eto taa. (b) Ọ̀ dịwo nke ọ bụla n’ime ihe ndị a ị hụrụ n’ógbè unu?

7 Gịnị bụ ngosipụta ụfọdụ nke mmụọ nke ụwa n’etiti ndị na-eto eto taa? Ọ bụ emeghị ihe n’eziokwu na nnupụisi. Otu akụkọ magazin na-ekwu na ihe karịrị pasent 70 nke ndị nọ na klas katụ ala nakwa ndị nọ na klas ikpeazụ na kọleji kwuru na ha aghọwo aghụghọ n’oge ha nọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu. Okwu njakịrị, okwu mkparị, na okwu na-adịghị ọcha bụkwa ihe a na-ahụkarị. N’eziokwu, n’otu oge, Job na Pọl onyeozi ji ihe ụfọdụ mmadụ pụrụ iwere dị ka okwu mkparị mee ihe iji gosipụta iwe ziri ezi. (Job 12:2; 2 Ndị Kọrint 12:13) Otú ọ dị, okwu mkparị jọgburu onwe ha a na-anụ n’ọnụ ọtụtụ ndị na-eto eto na-abụkarị ịkpọ iyi.

8 Imebiga ihe ókè n’ihe banyere ntụrụndụ bụkwa ngosipụta nke mmụọ nke ụwa. Ụlọ nkwari abalị, nnọkọ oké mkpọtụ,a na ụdị ndị ọzọ nke oriri oké mkpọtụ nke ndị ntorobịa bụ ihe na-ewu ewu n’etiti ndị na-eto eto. Imebiga ihe ókè n’ihe banyere ejiji na ọdịdị onwe onye bụkwa ihe a na-ahụkarị. Site n’uwe owoghoro ruo n’ihe na-ewu ewu ndị na-awụ akpata oyi, dị ka ịkpọpusị ahụ, ọtụtụ ndị ntorobịa nke oge a na-eme ka e jiri mmụọ nnupụisi nke ụwa mara ha. (Tụlee Ndị Rom 6:16.) Ihe ngosipụta ọzọ bụ ịchụbiga ihe onwunwe ókè. Dị ka otu akwụkwọ mmụta si kwuo, “ndị na-ere ahịa na-eji usoro ndị siri ike na ngosipụta nke ngwá ahịa awakpo ụmụaka n’esepụghị aka.” Ka ọ na-erule oge ndị ntorobịa nọ na United States ga-agụsị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu, ha ga-ahụwo mkpọsa ngwá ahịa TV dị 360,000. Ndị ọgbọ unu pụkwara ịrụgide unu ịzụ ya. Otu nwa agbọghọ dị afọ 14 na-ekwu, sị: “Onye ọ bụla na-ajụ mgbe nile, sị, ‘Olee ndị mere uwe oyi, kootu, ma ọ bụ uwe jean gị?’”

9 Eri oge Bible, egwú na-adịghị mma abụrụwo ngwá ọrụ Setan ji eme ihe iji kpalie akparamàgwà na-adịghị ọcha. (Tụlee Ọpụpụ 32:17-19; Abụ Ọma 69:12; Aịsaịa 23:16.) Mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na egwú ndị nwere okwu ndị na-akpali mmekọahụ—ma ọ bụrụ na e kwupụtaghị ha nke ọma—okwu rere ure, na ụda na-adachi ntị, bụ́ ndị na-akpali akpali bụ ihe na-ewu ewu. Mmekọahụ rụrụ arụ bụkwa ngosipụta ọzọ nke mmụọ adịghị ọcha nke ụwa a. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times na-akọ, sị: “Nye ọtụtụ ndị nọ n’afọ iri na ụma, mmekọahụ aghọọla ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe a chọrọ iji bụrụ ndị ndị ọgbọ ha na-anakwere . . . Ihe karịrị ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ndị nọ na klas ikpeazụ n’ụlọ akwụkwọ dị elu enwewo mmekọahụ.” Otu isiokwu dị na The Wall Street Journal hotara ihe àmà na-egosi na ụmụaka ndị nọ n’agbata afọ 8 na 12 “aghọwala ndị na-enwe mmekọahụ karị.” Otu onye ndụmọdụ ụlọ akwụkwọ nke lara ezumike nká n’oge na-adịbeghị anya na-ekwu, sị: “Anyị amalitewala ịhụ ụmụaka ole na ole dị ime bụ́ ndị nọ na klas nke isii n’elementrị.”b

Ịjụ Mmụọ nke Ụwa

10. Olee otú ụfọdụ ndị ntorobịa si n’ezinụlọ ndị Kraịst siworo daba n’inwe mmụọ nke ụwa?

10 N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst adabawo n’inwe mmụọ nke ụwa. “Ana m egosipụta àgwà dị mma n’ihu ndị mụrụ m na n’ihu ndị Kraịst ibe m,” ka otu nwa agbọghọ bụ́ onye Japan na-ekweta. “Ma anọkwa m na-ebi ụdị ndụ ọzọ.” Onye ntorobịa si Kenya na-ekwu, sị: “Ruo oge ụfọdụ ebiri m ụdị ndụ abụọ, nke gụnyere ịga nnọkọ oriri, egwú rock, na inwe ndị enyi ọjọọ. Amaara m na nke a ezighị ezi, ma anwara m ileghara ya anya, na-enwe olileanya na ọ ga-akwụsị ka oge na-aga. Ma ọ kwụsịghị. Ihe kara nnọọ njọ.” Onye ntorobịa ọzọ si Germany, na-ekwu, sị: “Ihe nile malitere site n’inwe ụdị ndị enyi na-ezighị ezi. Amaliteziri m ise sịga. Achọrọ m imesi ndị mụrụ m ike, ma nanị ihe m mere bụ imesi onwe m ike.”

11. Olee otú Keleb si nwee ike ịjụ isonyere ìgwè mmadụ mgbe ndị nledo iri welatara akụkọ ọjọọ?

11 Ma, a pụrụ iguzogide, ee ịjụ, mmụọ nke ụwa. Tụlee ihe atụ oge ochie banyere Keleb. Mgbe ndị nledo iri ahụ bụ́ ndị ụjọ welatara akụkọ ọjọọ banyere Ala Nkwa ahụ, ya na Joshua jụrụ ịbụ ndị a majara wee sonyere ìgwè mmadụ. Ha ji obi ike kwupụta, sị: “Ala ahụ nke anyị gabigaworo n’ime ya iledo ya, ala ahụ dị mma nke ukwuu nke ukwuu. Ọ bụrụ na ihe anyị atọọ Jehova ụtọ, Ọ ga-emekwa ka anyị baa n’ala nke a, Ọ ga-enyekwa anyị ya; bụ́ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru n’ime ya.” (Ọnụ Ọgụgụ 14:7, 8) Gịnị mere Keleb ji nwee ike iguzogide nrụgide nile ahụ? Jehova kwuru banyere Keleb, sị: “Mmụọ dị iche nọnyeere ya.”—Ọnụ Ọgụgụ 14:24.

Igosipụta “Mmụọ Dị Iche”

12. N’ihi gịnị ka mmadụ igosipụta “mmụọ dị iche” n’okwu ya ji dị mkpa?

12 Taa, ọ na-ewe obi ike na ume iji gosipụta “mmụọ dị iche,” ma ọ bụ echiche uche dị iche—nke dị iche na nke ụwa. Otu ụzọ unu pụrụ isi mee nke a bụ site n’izere okwu mkparị na nke ùgwù na-adịghị na ya. Ọ dị mma ịmara na e si na ngwaa Grik nke pụtara n’ụzọ nkịtị “ịdọkasị anụ ahụ dị ka nkịta,” weta okwu Bekee ahụ a sụgharịrị ịbụ “okwu mkparị.” (Tụlee Ndị Galetia 5:15.) Dị nnọọ ka ezé nkịta pụrụ ịtapụta anụ n’ọkpụkpụ, “ihe ọchị” dị n’ụdị mkparị pụrụ ịnapụ ndị ọzọ ùgwù ha. Ma Ndị Kọlọsi 3:8 na-agba unu ume ‘ịtụpụ ihe ndị a nile; bụ́ iwe, ọnụma, obi ọjọọ, nkwulu, ikwu okwu ihere na-esi n’ọnụ unu pụta.’ Ilu 10:19 na-ekwukwa, sị: “N’ọtụtụ okwu njehie adịghị akwụsị: ma onye na-egbochi egbugbere ọnụ ya abụọ bụ onye nwere uche.” Ọ bụrụ na mmadụ akparịa unu, nweenụ njide onwe onye ‘ịtụgharị ntị nke ọzọ,’ ikekwe na-eji ụzọ dị nro na ụzọ udo agwa onye ahụ kwutọrọ unu okwu mgbe nanị unu na ya nọ.—Matiu 5:39; Ilu 15:1.

13. Olee otú ndị ntorobịa pụrụ isi na-egosi echiche ziri ezi banyere ihe onwunwe?

13 Ụzọ ọzọ isi gosipụta “mmụọ dị iche” bụ site n’inwe echiche ziri ezi banyere ihe onwunwe. N’ezie, ọ bụ nnọọ ihe dị otú o kwesịrị bụ́ ịchọ inwe ihe ndị dị mma. Ihe àmà na-egosi na Jisọs Kraịst n’onwe ya nwere ma ọ dịkarịa ala otu uwe bụ́ ọkpọka. (Jọn 19:23, 24) Otú ọ dị, mgbe inwe ihe onwunwe ghọrọ nchegbu unu, unu ana-arịọkwa ndị mụrụ unu mgbe nile ịzụrụ unu ihe ha na-apụghị ịzụta n’ezie, ma ọ bụ mgbe unu chọrọ nnọọ iṅomi ndị ntorobịa ndị ọzọ, mgbe ahụ mmụọ nke ụwa pụrụ inwe ikike n’ebe unu nọ karịa otú unu pụrụ ịchọpụta. Bible na-ekwu, sị: “Ihe nile nke dị n’ụwa, bụ́ agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya, na oké okwu nke ibi obi, esiteghị ná Nna anyị, kama o sitere n’ụwa.” Ee, unu ekwela ka ike nke mmụọ ịhụ ihe onwunwe n’anya nke ụwa merie unu! Mụtanụ inwe afọ ojuju n’ihe unu nwere.—1 Jọn 2:16; 1 Timoti 6:8-10.

14. (a) Olee otú ndị Chineke n’oge Aịsaịa si gosi echiche na-ezighị ezi banyere ntụrụndụ? (b) Ihe ize ndụ ndị dị aṅaa ka ụfọdụ ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst zuteworo n’ụlọ nkwari abalị na nnọkọ oriri ndị a na-achịkwaghị achịkwa?

14 Idebe ntụrụndụ n’ọnọdụ ya dịkwa mkpa. Aịsaịa onye amụma kwupụtara, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ndị na-ebili n’isi ụtụtụ ịgbaso ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya; ndị na-anọ ogologo mgbe n’anyasị, mmanya vine ewee mee ka ahụ nwuru ha ọkụ. Ụbọ akwara na une na egwú otiti na ọjà na mmanya vine dịkwa n’ọṅụṅụ mmanya vine ha nile: ma ha adịghị elegide ọrụ Jehova anya, ha ahụghịkwa ihe aka Ya abụọ na-eme.” (Aịsaịa 5:11, 12) Ọ dị mwute ikwu na ụfọdụ ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst ekerewo òkè ná nnọkọ oriri a na-achịkwaghị achịkwa yiri nke ahụ. Mgbe a gwara otu ìgwè ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst ka ha kọwaa ihe na-eme n’ụlọ nkwari abalị, otu nwanna nwanyị na-eto eto kwuru, sị: “A na-alụ ọgụ mgbe nile. Anọtụwo m n’etiti ha.” Otu nwanna nwoke na-eto eto gbakwụnyere, sị: “Ịṅụ mmanya, ise siga, ihe ndị dị otú ahụ.” Nwanna nwoke ọzọ na-eto eto kwetara, sị: “Ndị mmadụ na-aṅụbiga mmanya ókè. Ha na-eme ka ndị iberibe! E nwekwara ọgwụ ọjọọ. Ọtụtụ ihe ọjọọ na-eme. Ọ bụrụ na i jee ebe ahụ ma na-eche na ọ gaghị emetụta gị, nke ahụ bụ ụgha.” Mgbe ahụ, e nwere ezi ihe mere Bible ji depụta oriri oké mkpọtụ, ma ọ bụ “oriri a na-achịkwaghị achịkwa,” dị ka otu n’ime “ọrụ nile nke anụ ahụ.”—Ndị Galetia 5:19-21; Byington; Ndị Rom 13:13.

15. Olee echiche ziri ezi Bible na-enye banyere ntụrụndụ?

15 Izere ntụrụndụ na-emerụ ahụ agaghị eme ka ị ghara ibi ndụ na-enye ọṅụ. Anyị na-efe “Chineke obi ụtọ,” bụ́ onye chọrọ ka ị nụ ụtọ oge ntorobịa gị! (1 Timoti 1:11, NW; Eklisiastis 11:9) Ma Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Onye ihe kọrọ ka onye na-ahụ ọṅụ [“ntụrụndụ,” Lamsa] n’anya ga-abụ.” (Ilu 21:17) Ee, ọ bụrụ na i mee ka ntụrụndụ bụrụ ihe kasị mkpa ná ndụ gị, ị ga-anọ n’ụkọ ime mmụọ. Ya mere gbasoo ụkpụrụ Bible n’ụdị ntụrụndụ ị na-ahọrọ. E nwere ọtụtụ ụzọ ị ga-esi nweta ọṅụ nke ga-ewuli gị elu ọ bụghịkwa ịkwada gị.c—Eklisiastis 11:10.

16. Olee otú ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst pụrụ isi na-egosi na ha dị iche?

16 Igosịpụta imeru ihe n’ókè n’ejiji na ọdịdị onwe onye unu, ịjụ ihe ndị na-ewu ewu nke ụwa, ga-akakwa unu akara dị ka ndị dị iche. (Ndị Rom 12:2; 1 Timoti 2:9) Otú ahụkwa ka ọ dị n’ilezi anya n’ụdị egwú unu na-ahọrọ. (Ndị Filipaị 4:8, 9) “Enwere m egwú m maara na m kwesịrị ịtụfu,” ka otu onye Kraịst na-eto eto na-ekwupụta, “ma ụda ya dị ụtọ nke ukwuu!” Onye ọzọ na-eto eto kwetakwara, sị: “Egwú bụụrụ m ọnyà n’ihi na enwere m mmasị n’ebe ọ dị. Ọ bụrụ na m achọpụta na ọ dị ihe na-adịghị mma na ya, ma ọ bụ ọ bụrụ na ndị mụrụ m emee ka m mara banyere ya, aghaghị m n’ezie ịmanye obi m ikwenyere uche m n’ihi na n’ime obi m egwú ahụ na-amasị m.” Ndị ntorobịa, unu abụla “ndị na-amaghị ihe nile [Setan] na-echepụta”! (2 Ndị Kọrint 2:11) O ji egwú eme ihe ná mgbalị ime ka ndị Kraịst na-eto eto gbakụta Jehova azụ! E nweela isiokwu ndị pụtara ná mbipụta dị iche iche nke Watch Tower bụ́ ndị na-ekwu banyere egwú rap, egwú rock nke na-ada oké ụda, na ụdị ndị ọzọ.d Otú ọ dị, ọ pụghị ikwe omume na mbipụta dị iche iche nke Watch Tower ga-ekwu okwu n’ụdị egwú ọhụrụ nile nke pụrụ ịpụta. Ya mere, unu aghaghị iji “izuzu” na “nghọta” mee ihe mgbe unu na-ahọrọ egwú.—Ilu 2:11.

17. (a) Gịnị bụ por·neiʹa, omume ndị dịkwa aṅaa ka ọ na-agụnye? (b) Gịnị bụ uche Chineke mgbe a bịara n’okwu metụtara omume?

17 N’ikpeazụ, ị ghaghị idebe onwe gị ọcha n’ụzọ omume. Bible na-agba ume, sị: “Gbanahụnụ ịkwa iko.” (1 Ndị Kọrint 6:18) Okwu Grik mbụ e ji mee ihe maka ịkwa iko, bụ́ por·neiʹa, na-ezo aka n’omume mmekọahụ nile na-ezighị ezi nke e ji akụkụ ahụ ndị e ji enwe mmekọahụ eme, n’abụghị ná nkekọ alụmdi na nwunye. Nke ahụ ga-agụnye iji ọnụ amị akụkụ ahụ nwoke na nwanyị na ịkpachara anya na-emetụ akụkụ ahụ ndị e ji enwe mmekọahụ aka. Ọtụtụ ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst etinyewo aka n’akparamàgwà dị otú ahụ, na-eche na ha anọghị na-akwa iko n’ezie. Otú ọ dị, Okwu Chineke na-ekwu n’ụzọ doro anya, sị: “Nke a bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ka e doo unu nsọ, ka unu ghara ịkwa iko; ka onye ọ bụla n’ime unu mata otú ọ ga-enwe nwunye nke aka ya n’odido nsọ na nsọpụrụ.”—1 Ndị Tesalọnaịka 4:3, 4.

18. (a) Olee otú onye ntorobịa pụrụ isi zere ịbụ onye mmụọ nke ụwa merụrụ? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 Ee, site n’enyemaka Jehova, ị pụrụ izere ịbụ onye mmụọ nke ụwa merụrụ! (1 Pita 5:10) Otú o sina dị, Setan na-ekpuchitekarị ọnyà ya ndị na-egbu egbu, ọ pụkwara iwe ezi nghọta mgbe ụfọdụ iji mata ihe ize ndụ. A kwadebere isiokwu anyị na-esonụ inyere ndị ntorobịa aka ịzụlite ike nghọta ha.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Nnọkọ ịgba egwú ndị na-adịrukarị abali nile. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Nnọkọ Oké Mkpọtụ Hà Bụ́ Mkpori Ndụ Na-adịghị Emeru Ahụ?” ná mbipụta Teta! (Bekee) nke December 22, 1997.

b Ụmụaka ndị dị ihe dị ka afọ 11.

c Iji nweta aro dị iche iche, lee peji nke 296-303 nke akwụkwọ bụ́ Questions Young People Ask—Answers That Work.

d Lee mbipụta Ụlọ Nche nke April 15, 1993.

Ajụjụ Maka Ntụleghachi

◻ Gịnị bụ “mmụọ nke ụwa,” oleekwa otú o si enwe “ike” n’ahụ ndị mmadụ?

◻ Gịnị bụ ngosipụta ụfọdụ nke mmụọ nke ụwa n’etiti ndị ntorobịa taa?

◻ Olee otú ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst pụrụ isi na-egosipụta “mmụọ dị iche” n’ihe banyere okwu na ntụrụndụ?

◻ Olee otú ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst pụrụ isi na-egosipụta “mmụọ dị iche” n’ihe banyere omume na egwú?

[Foto dị na peeji nke 9]

Ọtụtụ ndị ntorobịa na-egosi na ha nọ n’okpuru “ike” nke mmụọ nke ụwa site n’omume ha

[Foto dị na peeji nke 10]

Na-emenụ nhọrọ n’egwú ndị unu na-akpọ

[Foto dị na peeji nke 11]

Ọ na-ewe obi ike iji guzogide mmụọ nke ụwa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya