-
Na-ekwenye Ekwenye, Adịla Na-esi ỌnwụỤlọ Nche—2008 | Mach 15
-
-
2 Pọl onyeozi gbara anyị ume, sị: “Meenụ ka mmadụ niile mara na unu nwere ezi uche [ma ọ bụ na unu na-ekwenye ekwenye].”a (Fil. 4:5) Kraịst Jizọs bụ Onyenwe anyị nakwa Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst. (Efe. 5:23) Ọ dị nnọọ oké mkpa ka onye ọ bụla n’ime anyị gosi na ya nwere ezi uche, ya bụ́, na-ekwenyere ntụziaka Kraịst, gharakwa ịdị na-esi ọnwụ ka ndị ọzọ na-eme ihe ọ chọrọ mgbe niile!
-
-
Na-ekwenye Ekwenye, Adịla Na-esi ỌnwụỤlọ Nche—2008 | Mach 15
-
-
a E nweghị otu mkpụrụ okwu nke a pụrụ iji sụgharịa nnọọ kpọmkwem okwu Pọl onyeozi ji mee ihe n’ebe a. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Otu n’ime ihe ọ pụtara bụ mmadụ ịghara isi ọnwụ inweta ihe ruuru ya, ọ pụtakwara mmadụ ichebara ndị ọzọ echiche nakwa iji obiọma na-emeso ndị ọzọ ihe.” Ya mere, otu ihe okwu ahụ pụtara bụ mmadụ ikwenye ekwenye na inwe ezi uche, mmadụ ịghara isi ọnwụ ịhụ na e mezuru ihe niile e dere n’iwu ma ọ bụ na-achọ mgbe niile ka e mee ihe otú o si chọọ.
-