Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g20 nke 3 p. 12-13
  • Gosi Ndị Ọzọ Na Ị Hụrụ Ha n’Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gosi Ndị Ọzọ Na Ị Hụrụ Ha n’Anya
  • Teta!—2020
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nsogbu Egosighị Ndị Ọzọ na Ị Hụrụ Ha n’Anya Nwere Ike Ịkpata
  • Amaokwu Baịbụl Ga-enyere Gị Aka
  • Ihe I Nwere Ike Ime
  • Ha Kwụsịrị Ịkpọ Ndị Ọzọ Asị
    Teta!—2020
  • Ịkpọasị Bụ Ọrịa, Ì Bu Ya?
    Teta!—2020
  • M Chọburu Ime Ka A Kwụsị Ikpe Ikpe Na-ezighị Ezi
    Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
  • Olee Mgbe Ịkpọasị Na-agaghị Adịkwa n’Ụwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2020
g20 nke 3 p. 12-13
Ebe otu nwaanyị onye India na-enyere nwaanyị ọzọ merela agadi aka na-ebugotere ya ihe.

Gosi Ndị Ọzọ Na Ị hụrụ Ha n’Anya

Nsogbu Egosighị Ndị Ọzọ na Ị Hụrụ Ha n’Anya Nwere Ike Ịkpata

Ọ naghị adịrị ndị kpọrọ ndị ọzọ asị mfe ịkwụsị ịkpọ ha asị. Onye na-arịa ọrịa na-agba mbọ tupu ọrịa ya akwụsị, ọ na-ewekwa oge. Otú ahụ ka ọ dịkwa onye kpọrọ ndị ọzọ asị. Ọ na-agba mbọ tupu ya akwụsị ya, ọ na-ewekwa oge. Gịnị ka i nwere ike ime iji wepụ ịkpọasị n’obi gị?

Amaokwu Baịbụl Ga-enyere Gị Aka

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe otu nwoke onye Eshia na-emepere otu nwoke onye ojii bu kọfị ụzọ. 2. Ebe nwoke onye ojii ahụ na-ebunye ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ kọfị, ma nwaanyị onye India ahụ e kwuburu gbasara ya.

“Yirinụ ịhụnanya dị ka uwe, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.”—NDỊ KỌLỌSI 3:14.

Olee ihe amaokwu a na-akụziri anyị? Imere ndị ọzọ ihe ọma na-eme ka anyị na ha dị n’otu. Ọ bụrụ na gị ana-emere ndị ọzọ ihe ọma, ị ga-eji nwayọọ nwayọọ kwụsị ịkpọ ha asị. Ị na-ahụkwu ndị ọzọ n’anya, ị gaghịzi akpọ ha asị n’obi gị ma ọ bụ na-ele ha anya ka ndị na-enweghị ihe ha bụ.

Ihe I Nwere Ike Ime

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe otu nwaanyị onye India na-enyere nwaanyị ọzọ merela agadi aka na-ebugotere ya ihe. 2. Ebe nwaanyị ahụ a na-enyere aka buteere onye agbata obi ya biskiiti, ya bụ, nwoke onye Eshia ahụ e kwuburu gbasara ya.

Chee gbasara ihe ọma i nwere ike imere ndị si n’otu agbụrụ ị na-ele anya ọjọọ. Ọ bụghị iwu na ọ ga-abụ ihe buru oké ibu. Gbalịa mee otu ma ọ bụ karịa n’ime ihe ndị a:

Ntakịrị ihe ọma ọ bụla i meere mmadụ ga-eme ka ị kwụsịtụ ịkpọ ya asị

  • Kpaso ha àgwà ọma. I nwere ike biliere otu n’ime ha n’oche ma ị nọrọ n’ụgbọala ọhaneze ma ọ bụkwanụ mepeere ha ụzọ ma ha gafewe.

  • Gị na ha kparịtatụ ụka, ọ bụrụgodi na ha anaghị asụ asụsụ gị nke ọma.

  • Nweere ha ndidi ma ha mee ihe ị na-aghọtaghị.

  • Ha kwuwe gbasara nsogbu ndị ha nwere, gosi na ọ na-ewute gị.

Akụkọ Mere Eme: Nazaré (Gini-Bisaụ)

“O nwere mgbe m kpọrọ ndị mbịarambịa asị. A gwara m na ọtụtụ ndị mbịarambịa na-aghara gọọmentị ụgha iji nweta ihe n’aka ha nakwa na ọtụtụ n’ime ha bụ ndị omekome. Ihe a mere ka o siere m ike ịnabata ha. Ma, ewereghị m ya na m kpọrọ ha asị n’ihi na ọ bụ otú ọtụtụ ndị si ele ha anya.

“Ma ka oge na-aga, m chọpụtara na ọ bụ asị ka m kpọrọ ndị mbịarambịa. Ihe Baịbụl kwuru nyeere m aka ịhụ ha n’anya. Ugbu a, anaghịzi m eze ha eze. Kama, m na-ekele ha, mụ na ha ana-ekwurịtakwa. M na-agbalị ịmata onye ọ bụla n’ime ha. Ugbu a, anaghịzi m ele ha anya ọjọọ. Ahụ́ na-erukwa m ala ma mụ na ha nọrọ.”

“M chọburu ime ka a kwụsị ikpe ikpe na-ezighị ezi”

Rafika Morris.

Rafika sonyeere òtù na-agba ọchịchị mgba okpuru iji mee ka a kwụsị mmegbu. Ma mgbe ọ gara mgbakọ Ndịàmà Jehova, ọ chọpụtara na Ndịàmà Jehova dị n’otu, nke bụ́ ihe ọ na-achọ kemgbe.

Lee vidio isiokwu ya bụ Rafika Morris: M Chọburu Ime Ka A Kwụsị Ikpe Ikpe Na-ezighị Ezi. Chọọ vidio a na jw.org/ig.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya