Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g20 nke 3 p. 10-11
  • Na-emeta Ndị Si Ebe Dị Iche Iche Enyi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-emeta Ndị Si Ebe Dị Iche Iche Enyi
  • Teta!—2020
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nsogbu Emetaghị Ndị Si Ebe Dị Iche Iche Enyi Nwere Ike Ịkpata
  • Amaokwu Baịbụl Ga-enyere Gị Aka
  • Otú Imeta Ndị Si Ebe Dị Iche Iche Enyi Si Enye Aka
  • Ihe I Nwere Ike Ime
  • Ha Kwụsịrị Ịkpọ Ndị Ọzọ Asị
    Teta!—2020
  • Gosi Ndị Ọzọ Na Ị Hụrụ Ha n’Anya
    Teta!—2020
  • M̀ Kwesịrị Imetakwu Ndị Enyi?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Imejụ Agụụ Anyị Na-enwe Maka Ndị Enyi
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2020
g20 nke 3 p. 10-11
Ebe ụmụ nwaanyị anọ si n’agbụrụ dị iche iche nọ na-akparịta ụka, ụmụ ha ejiri ihe ndị e ji egwuri egwu na-egwu egwuregwu.

Na-emeta Ndị Si Ebe Dị Iche Iche Enyi

Nsogbu Emetaghị Ndị Si Ebe Dị Iche Iche Enyi Nwere Ike Ịkpata

Ọ bụrụ na anyị anaghị akpa ndị si n’agbụrụ anyị na-ele anya ọjọọ nso, o nwere ike ime ka anyị kpọkwuo ha asị. Ọ bụrụkwa na ọ bụ naanị ndị si n’agbụrụ anyị ka anyị na-emeta enyi, o nwere ike ime ka anyị chewe na ọ bụ otú ndị agbụrụ anyị si eche echiche na otú ha si akpa àgwà kacha mma.

Amaokwu Baịbụl Ga-enyere Gị Aka

“Megheenụ obi unu.” —2 NDỊ KỌRỊNT 6:13.

Olee ihe amaokwu a na-akụziri anyị? “Obi” anyị e kwuru okwu ya ebe a nwere ike ịpụta ịhụ mmadụ n’anya. Ọ bụrụ na ọ bụ naanị ndị anyị na ha si n’otu agbụrụ ka anyị hụrụ n’anya, ọ ga-eme ka obi anyị mechie. Iji zere ya, anyị kwesịrị ịna-emeta ndị si ebe dị iche iche enyi.

Otú Imeta Ndị Si Ebe Dị Iche Iche Enyi Si Enye Aka

Ọ bụrụ na anyị amatakwuo ndị ọzọ, anyị ga-aghọta ihe mere otú ha si eme ihe ji dị iche na nke anyị. Ka anyị na ha na-adịkwu ná mma, anyị ga-echefu na ha si n’agbụrụ ọzọ. Anyị ga-ejikwu ha kpọrọ ihe, ihe na-eme ha obi ụtọ ana-eme anyị obi ụtọ, ihe na-ewute ha ana-ewutekwa anyị.

Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwaanyị aha ya bụ Nazaré. Ọ kpọburu ndị mbịarambịa nọ n’obodo ha asị. O kwuru ihe nyeere ya aka ịkwụsị ya. Ọ sịrị: “Mụ na ha na-anọkọ, na-arụkọkwa ọrụ. M chọpụtara na ha dị nnọọ iche n’ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara ha. Ọ bụrụ na i meta ndị si n’agbụrụ ọzọ enyi, ị ga-akwụsị iwere ha ka ndị ajọ mmadụ. Ị ga-ahụ ha n’anya, jirikwa ha kpọrọ ihe.”

Lezie Anya ma Ị Họrọwa Ndị Gị na Ha Ga-abụ Enyi

Ụfọdụ ndị họọrọ ịna-ebi ndụ otú ga-emerụ ha na ndị ọzọ ahụ́. N’ihi ya, anyị kwesịrị ilezi anya ma anyị họrọwa ndị anyị na ha ga-abụ enyi. Ọ bụrụ na anyị ahapụ imeta ndị ọjọọ, na-anaghị akwụwa aka ọtọ na ndị na-eme omume rụrụ arụ enyi, ọ pụtaghị na anyị kpọrọ ha asị. Anyị ekwesịghị imeta ndị dị otú ahụ enyi n’agbanyeghị na anyị agaghị achọ ime ha ihe ọjọọ ma ọ bụ ịnapụ ha ihe ruuru ha.—Ilu 13:20.

Ihe I Nwere Ike Ime

Na-achọ otú gị na ndị si n’obodo ọzọ, agbụrụ ọzọ ma ọ bụ ndị na-asụ asụsụ ọzọ ga-esi na-akpakọrịta. I nwere ike

  • Ịgwa ha ka ha kọọrọ gị gbasara onwe ha.

  • Ịkpọ ha ka ha soro gị rie nri.

  • Ige ntị ma ha gwawa gị gbasara onwe ha, chọpụtakwa ihe ndị ha ji kpọrọ ihe.

Ọ bụrụ na ị gbalịa chọpụta ihe ndị mere ná ndụ ha, ị ga-aghọta ihe mere ha ji akpa àgwà otú ha si akpa. O nwere ike ime ka ị hụ ha na ndị agbụrụ ha ndị ọzọ n’anya.

Akụkọ Mere Eme: Kandasamy na Sookammah (Kanada)

“Anyị biri na Saụt Afrịka mgbe e nwere ịkpa ókè agbụrụ n’ebe ahụ. A chụgara ndị si agbụrụ dị iche iche ka ha gaa biri ebe dị iche iche. Nke a mere ka ọtụtụ agbụrụ kpọ ibe ha asị. Anyị abụghị ndị ọcha. Anyị ejighịkwa anya ahụ ndị ọcha n’ihi na ụfọdụ n’ime ha ejighị anyị kpọrọ ihe. N’oge ahụ, anyị eleghị ya anya ka ịkpọ mmadụ asị. Kama anyị weere ya na ọ bụdị anyị ka ha kpọrọ asị.

“Ihe nyeere anyị aka ịkwụsị ya bụ na anyị gbalịrị meta ndị si ebe dị iche iche enyi. Ka anyị na ndị ọcha malitere mekọwa ihe, anyị chọpụtara na e nwere ọtụtụ ebe anyị na ha si yie. Otú ihe si dịrị ha ka o si dịrị anyị, nsogbu anyị na nke ha yikwara.

“Anyị jidị oge ahụ kpọọ otu di na nwunye bụ́ ndị ọcha ka ha biri n’ụlọ anyị. Ha biri ogologo oge n’ụlọ anyị. Anyị matara ha nke ọma. Ọ dịghị anya, anyị na ha abụrụ enyi, hụkwa na o nweghị ndị ka ibe ha. Nke ahụ mere ka anyị kwụsị ile ndị ọcha niile anya ọjọọ.”

Ezigbo ụmụnna

Ebe Johny na Gideon na-ekele ụmụaka n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova.

N’agbanyeghị na Johny na Gideon esighị n’otu agbụrụ, e nweekwa mgbe ha nọ n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche, ha abụọ ghọrọ ezigbo enyi.

Lee vidio bụ́ Johny na Gideon Bụbu Ndị Iro, Ugbu A Ha Bụzi Ụmụnna. Chọọ vidio a na jw.org/ig.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya