Ikpughe Mkpọrọgwụ nke Nkwulu
“Ọnụ site n’ihe nke obi nwebigara ókè na-ekwu okwu.”—MATIU 12:34.
IHE dị ka puku afọ abụọ gara aga, Jisọs Kraịst kwuru okwu ndị dị n’elu. Ee, okwu mmadụ na-egosipụtakarị mmetụta na nzube ya ndị kasị mie emi. Ha pụrụ ikwesị otuto. (Ilu 16:23) N’aka nke ọzọ, ha pụrụ ịbụ nke aghụghọ.—Matiu 15:19.
Otu nwanyị kwuru banyere di ya: “O yiri ka iwe ọ̀ na-abịa ya na mberede, isokwa ya biri na-adịkarị ka ịgabiga ala ogbunigwe—ị maghị ma ọlị ihe ga-akpalite ọnụma.” Richard na-akọwa ọnọdụ yiri nke ahụ n’ebe nwunye ya nọ. “Lydia na-ekekarị ọgụ,” ka ọ na-ekwu. “Ọ dịghị nnọọ ekwu okwu; ọ na-agbaghepụkarị ọnụ n’okwu esemokwu, na-atụ m aka ka m bụ nwata.”
Ee, arụmụka pụrụ ibilite ọbụna n’alụmdi na nwunye kasị mma, di na nwunye dum na-ekwukwa ihe ndị ha na-emesịa kwaara ụta. (Jemes 3:2) Ma nkwulu n’alụmdi na nwunye karịrị nke ahụ; ọ na-agụnye okwu nlelị na nkatọ ndị e bu n’uche iji chịkwaa, ma ọ bụ jikpaa, di ma ọ bụ nwunye mmadụ. Mgbe ụfọdụ, a na-eji ọdịdị aghụghọ nke ịdị nwayọọ ekpuchi okwu na-emerụ ahụ. Dị ka ihe atụ, ọbụ abụ bụ́ Devid kọwara otu nwoke nke na-ekwu okwu nwayọọ nwayọọ, ma n’ime bụrụ ajọ anụ: “Ha bụ okwu ire ụtọ, bụ́ okwu ọnụ ya nke dị ka mmiri ara rahụrụ arahụ, ma nanị agha ka obi ya bụ: okwu ya nile dị nro karịa mmanụ, ma okwu ahụ bụ mma agha a mịpụtara amịpụta.” (Abụ Ọma 55:21; Ilu 26:24, 25) Ma ọ bụ nke obi ọjọọ doro anya ma ọ bụ nke nzuzo, okwu obi ọjọọ pụrụ ibibisị alụmdi na nwunye.
Ụzọ O Si Amalite
Gịnị na-eme ka mmadụ jiri nkwulu mee ihe? N’ozuzu ya, a pụrụ ịhụ mmalite nke okwu dị otú ahụ n’ihe mmadụ na-ahụ ma na-anụ. N’ọtụtụ ala a na-anabata akaje, mkparị, na mmenye ihere, ọbụna na ha na-abụ ihe ọchị.a Usoro mgbasa ozi, nke gosikarịworo ndị bụ nwoke “n’ezie” dị ka ndị na-achị ọchịchị ma na-akpa ike, pụrụ imetụta ndị bụ di karịsịa.
N’otu aka ahụ, ọtụtụ ndị na-ekwu okwu mwetu ala bụ ndị a zụlitere n’ụlọ ebe a na-awụpụ iwe, iro, na nlelị nke nne ma ọ bụ nna mgbe nile. Ya mere, site na nwata, ha ghọtara na ụdị akparamàgwà a dị otú o kwesịrị.
Nwa a zụlitere na gburugburu ọnọdụ dị otú a pụrụ ịmụta ihe karịrị usoro okwu; ọ pụkwara ịmịkọrọ echiche gbagọrọ agbagọ banyere onwe ya na ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na a gwara nwata okwu obi ọjọọ, ọ pụrụ itolite na-enwe mmetụta nke abaghị uru, ọbụna bụrụ onye a kpasuru inwe ọnụma. Ma gịnị ma ọ bụrụ na nwa ahụ nanị na-anụchara ka nna ya ji okwu na-eti nne ya ihe? Ọbụna ma ọ bụrụ na nwa ahụ dị nnọọ ntakịrị, ọ pụrụ ịmụta nleda anya nna ya nwere maka ndị inyom. Nwata nwoke pụrụ ịmụta site n’àgwà nna ya na ọ dị nwoke mkpa ịdị na-achịkwa ndị inyom nakwa na ụzọ isi nweta nchịkwa bụ imenye ha ụjọ ma ọ bụ imerụ ha ahụ.
Nne ma ọ bụ nna na-ewe iwe pụrụ ịzụlite nwa na-ewe iwe, onye n’aka nke ya pụrụ itolite ịghọ “ọkà n’ọnụma” nke “na-ejehie hie nne.” (Ilu 29:22, ntụaka ala ala peji nke NW) A pụrụ isi otú a bufee ihe nketa nke okwu na-emerụ ahụ site n’otu ọgbọ gaa n’ọzọ. Ọ bụ ezi ihe mere Pọl ji dụọ ndị nna ọdụ, sị: “Akpasula ụmụ unu iwe.” (Ndị Kọlọsi 3:21) N’ụzọ pụtara ìhè, okwu Grik a sụgharịrị ‘ịkpasu iwe,’ dị ka Theological Lexicon of the New Testament na-ekwu, pụrụ inye echiche nke “ịkwadebe na ijikere maka ọgụ.”
Ee, mmetụta nne ma ọ bụ nna adịghị eme ka o zie ezi ịwakwasị ndị ọzọ, n’okwu ọnụ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ; ma ọ na-enye aka ịkọwa ụzọ ọnọdụ obi nke na-achọkarị ikwu okwu obi ọjọọ pụrụ isi gbamie mkpọrọgwụ. Nwa okorobịa nwere ike ọ gaghị eti nwunye ya ihe n’ụzọ nkịtị, ma ọ̀ na-eti ya ihe site n’okwu ya na ọnọdụ uche ya? Nnyocha onwe onye pụrụ ikpughere mmadụ na ọ mụtawo nleda anya nna ya nwere maka ndị inyom.
O doro anya na ụkpụrụ ndị dị n’elu pụkwara imetụta ndị inyom. Ọ bụrụ na nne ji okwu na-eti di ya ihe, nwa nwanyị pụrụ imeso di ya n’otu ụzọ ahụ mgbe ọ lụrụ di. Otu ilu Bible na-asị: “Ọ ka mma ibi n’ọzara, kama iso nwanyị nwere ire na-elu ilu ma na-ewe iwe biri.” (Ilu 21:19, The Bible in Basic English) Ka o sina dị, ọ dị nwoke mkpa karịsịa ịkpachara anya n’okwu a. N’ihi gịnị?
Ike Ndị Mmegbu
Di na-enwekarị ike ka ukwuu n’alụmdi na nwunye karịa ka nwunye na-enwe. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ na-enwe ike ọkpụkpụ aka ka ukwuu mgbe nile, na-eme ka iyi egwu ọ bụla nke mmerụ ahụ nkịtị dịkwuo ụjọ.b Ọzọkwa, nwoke na-enwekarị nkà ọrụ ka mma, nkà ibiri onwe onye karị, na uru ego ka ukwuu. N’ihi nke a, ọ ga-adịkarị nwanyị e ji okwu ọnụ na-eti ihe ka e ji ya n’ọnyà, ọ nọrọkwa nanị ya. Ọ pụrụ ikwenye n’okwu Eze Solomọn maara ihe: “Mụ onwe m wee lachachi hụ mmegbu nile a na-emegbu n’okpuru anyanwụ: ma, lee, anya mmiri nke ndị a na-emegbu, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere; ma n’akụkụ ndị na-emegbu ha ka ike dị, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere.”—Eklisiastis 4:1.
Nwunye pụrụ inwe mgbagwoju anya ma di ya na-esi n’otu imebiga ihe ókè aga n’ọzọ—nwee ezi àgwà n’otu oge, na-eme nkatọ na nke ọzọ. (Tụlee Jemes 3:10.) Ọzọkwa, ọ bụrụ na di ya na-egbo mkpa ihe onwunwe nke ọma, nwunye a na-agwa okwu obi ọjọọ pụrụ inwe obi amamikpe maka iche na ọ dị ihe na-agajọ n’alụmdi na nwunye ahụ. Ọ pụrụ ọbụna ịta onwe ya ụta maka àgwà di ya. “Dị ka nwunye a na-eti ihe n’ụzọ nkịtị,” ka otu nwanyị na-ekwupụta, “m na-echebu mgbe nile na ọ bụ m na-akpata ya.” Nwunye ọzọ kwuru, sị: “E dubara m n’ikweta na ọ bụrụ na m gbalịsikwuo ike ịghọta ya na ‘inwere ya ndidi’ na m ga-achọta udo.” Ọ bụ ihe mwute na mmejọ ahụ na-agakarị n’ihu.
Ọ bụ ihe mwute n’ezie na ọtụtụ ndị bụ di na-eji ike ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi site n’ịchị nwanyị ha kweworo nkwa ịhụ n’anya na iji kpọrọ ihe. (Jenesis 3:16) Ma gịnị ka a pụrụ ime banyere ọnọdụ dị otú ahụ? “Achọghị m ịpụ,” ka otu nwunye na-ekwu, “nanị ihe m chọrọ bụ ka ọ kwụsị iti m ihe.” Mgbe afọ itoolu nke alụmdi na nwunye gasịrị, otu di kwetara, sị: “Amatara m na m nọ ná mmekọrịta nke iji okwu eti ihe, na m bụkwa onye nke na-eti ihe. Achọrọ m n’ezie ịgbanwe, ọ bụghị ịpụ.”
E nwere enyemaka maka ndị alụmdi na nwunye ha bụ nke okwu na-emerụ ahụ na-akpa aka ọjọọ, dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ihe àmà na-egosi na ọ dịkwa otú ahụ na narị afọ mbụ. The New International Dictionary of New Testament Theology na-ekwu na “nye ndị Gris ọ bụ otu n’ime nkà ndị e nwere ná ndụ ịma ka e si akparị ndị ọzọ ma ọ bụ anagide mkparị a kparịrị gị.”
b Mwakpo okwu ọnụ pụrụ ịbụ ihe mgbakwasị ụkwụ gaa n’ime ihe ike n’ebe obibi. (Tụlee Ọpụpụ 21:18.) Otu onye ndụmọdụ nke ndị inyom a na-eti ihe kwuru, sị: “Nwanyị ọ bụla bịara maka iwu nchekwa megide iti ihe, iti mma, ma ọ bụ mpịgbu nke na-etinye ndụ ya n’ihe ize ndụ enwewo, tinyere ndị ahụ, ogologo ahụmahụ na nke na-egbu mgbu nke iti ihe na-abụghị nke nkịtị.”
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 16]
Ọ bụ ihe mwute n’ezie na ọtụtụ ndị bụ di na-eji ike ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi site n’ịchị nwanyị ha kweworo nkwa ịhụ n’anya na iji kpọrọ ihe
[Foto dị na peeji nke 17]
Ụzọ nne na nna ya si emeso ibe ha na-emetụtakarị nwata