Ị Pụrụ Inwe Ọganihu Ime Mmụọ
EZI uru pụrụ isi ike ịmata. Otú ahụ ka ọ dị diamọnd. Ọ bụ ezie na diamọnd a mụchara amụcha na-egbukepụ egbukepụ, diamọnd a na-amụchaghị amụcha adịghị egbukecha egbuke. Ka o sina dị, n’ime ime diamọnd ahụ a na-amụchaghị amụcha ka ọmarịcha ọla dị.
Ndị Kraịst yiri diamọnd a na-amụchaghị amụcha n’ọtụtụ ụzọ. Ọ bụ ezie na anyị ka nọ ebe dị anya site n’izu okè, anyị nwere uru dị anyị n’ime nke Jehova ji akpọrọ ihe. Dị ka diamọnd, anyị nile nwere àgwà anyị ndị pụrụ iche. Onye ọ bụla n’ime anyị pụkwara inwekwu ọganihu ime mmụọ ma ọ bụrụ na ọ bụ ọchịchọ obi anyị. A pụrụ ịmụcha ọdịdị mmadụ anyị, ka ha wee na-egbukepụkwu iji nye Jehova otuto.—1 Ndị Kọrint 10:31.
Mgbe a wasịrị ma mụchaa ya, a na-etinye diamọnd n’ebe na-ewelite ọdịdị mgbuke ya. N’otu aka ahụ, Jehova pụrụ iji anyị mee ihe n’ebe ma ọ bụ n’ọrụ dị iche iche ma ọ bụrụ na anyị ‘yikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.’—Ndị Efesọs 4:20-24.
Ọganihu ime mmụọ dị otú ahụ nwere ike ọ gaghị abịara onwe ya, dị nnọọ ka diamọnd a ka gwupụtara egwupụta na-adịghị egbukekarị egbuke dị ka ọla. Ọ pụrụ ịdị anyị mkpa iwepụ n’ime onwe anyị adịghị ike ụfọdụ jụrụ ịla ala, gbanwee àgwà anyị n’ebe ịnakwere ibu ọrụ dị, ma ọ bụ ọbụna dọgbuo onwe anyị n’ọrụ iji si na nanị otu ụzọ anyị si eme ihe n’ụzọ ime mmụọ pụta. Ma anyị pụrụ inwe ọganihu ma anyị chọọ n’ezie, ebe ọ bụ na Jehova Chineke pụrụ inye anyị “ọkịka nke ike.”—2 Ndị Kọrint 4:7; Ndị Filipaị 4:13.
Jehova Na-enye Ndị Ohu Ya Ume
Ịwa diamọnd na-ewe obi ike na-esite n’ihe ọmụma doro anya, ebe ọ bụ na ozugbo a wapụrụ otu akụkụ nke diamọnd a na-amụchaghị amụcha, ọ na-efukarị ọhịa. A ghaghị ịwapụ ihe dara oké ọnụ—mgbe ụfọdụ ihe ruru pasent 50 nke nkume ahụ a na-awaghị awa—iji nweta ọdịdị a chọrọ. Obi ike sitere n’ezi ihe ọmụma dịkwa anyị onwe anyị mkpa iji kpụzie ụdị onye anyị bụ na iji nwee ọganihu ime mmụọ. Karịsịa anyị aghaghị inwe obi ike na Jehova ga-enye anyị ike.
Otú ọ dị, ọ pụrụ ịdị anyị ka anyị erughị eru, ma ọ bụ anyị echee na anyị apụghị ime ihe karị. N’oge gara aga, ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi nwere ụdị mmetụta ahụ mgbe ụfọdụ. (Ọpụpụ 3:11, 12; 1 Ndị Eze 19:1-4) Mgbe Chineke kenyere ya ọrụ ịbụ “onye amụma dịịrị mba nile,” Jeremaịa tiri mkpu, sị: “Lee, amaghị m ikwu okwu, n’ihi na nwata ka m bụ.” (Jeremaịa 1:5, 6) Ma, n’agbanyeghị ịla azụ ya, Jeremaịa ghọrọ onye amụma nwere obi ike onye ziri ndị na-enweghị omume enyi ozi n’ezoghị ọnụ. Olee otú nke a si kwe omume? Ọ mụtara ịdabere na Jehova. Jeremaịa mesịrị dee, sị: “Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ nke na-atụkwasị Jehova obi, onye Jehova bụ ihe ntụkwasị obi ya.”—Jeremaịa 17:7; 20:11.
Taa, Jehova na-enyekwa ndị na-atụkwasị ya obi ume. Edward,a bụ́ nna nke ụmụ anọ onye na-adịghị ngwa n’inwe ọganihu ime mmụọ, hụrụ na nke a bụ eziokwu. Ọ na-akọwa, sị: “Abụwo m otu n’ime Ndịàmà Jehova ruo afọ itoolu, ma o yiri ka m kwụ otu ebe n’ụzọ ime mmụọ. Nsogbu bụ na enwere m nkwali dị nta, enweghịkwa m obi ike. Mgbe m kwagasịrị Spain, ahụrụ m onwe m n’otu obere ọgbakọ nwere nanị otu okenye na otu ohu na-eje ozi. N’ihi mkpa e nwere, okenye ahụ gwara m ka m mee ọtụtụ ihe omume. Ahụ mara m jijiji ka m na-ekwu okwu na ka m na-eme ihe omume ndị mbụ m ná nzukọ. Ma, amụtara m ịdabere na Jehova. Okenye ahụ na-aja m mma mgbe nile ma jiri akọ na-atụ aro maka imekwu nke ọma.
“N’otu oge ahụ, amụbara m ọrụ ozi ubi m ma na-edu ndú n’ụzọ ka mma n’ihe ime mmụọ n’ezinụlọ m. N’ihi ya, eziokwu ahụ pụtaara ezinụlọ m dum ihe ka ukwuu, afọ jukwara m nke ukwuu karị. Abụ m ugbu a ohu na-eje ozi, m na-arụsikwa ọrụ ike ịzụlite àgwà nke onye nlekọta ndị Kraịst.”
‘Yipụnụ Mmadụ Ochie Ahụ’
Dị ka Edward chọpụtara, ọganihu ime mmụọ na-achọ ịtụkwasị Jehova obi. Ịzụlite “mmadụ ọhụrụ” dị ka nke Kraịst dịkwa mkpa. Olee otú a pụrụ isi mee nke a? Nzọụkwụ mbụ bụ ‘iyipụ’ omume ndị ahụ bụ akụkụ nke mmadụ ochie. (Ndị Kọlọsi 3:9, 10) Dị nnọọ ka a na-aghaghị iwepụsị ezughị okè, dị ka ihe ndị ọzọ a na-egwute n’ala, site na diamọnd a na-amụchaghị amụcha iji mee ka ọ bụrụ ọla na-egbuke egbuke, otú ahụ ka ọ dị mkpa iwepụsị àgwà ndị “nke ụwa” iji mee ka mmadụ ọhụrụ anyị na-egbukepụ egbukepụ.—Ndị Galetia 4:3.
Otu àgwà dị otú ahụ bụ adịghị njikere ịnakwere ibu ọrụ n’ihi egwu nke na a ga-achọ ihe dị ukwuu n’aka anyị. N’eziokwu, ibu ọrụ pụtara ịrụ ọrụ, ma ọ bụ ọrụ na-eju afọ. (Tụlee Ọrụ 20:35.) Pọl kwetara na nsọpụrụ Chineke na-achọ ka anyị “na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ, na-agbasikwa mgba ike.” Anyị ji ọṅụ eme otú ahụ, ka o kwuru, “n’ihi na anyị elewo anya Chineke dị ndụ,” onye ọ na-adịghị mgbe ọ na-echezọ ọrụ anyị rụrụ n’ihi ndị Kraịst ibe anyị na ndị ọzọ.—1 Timoti 4:9, 10; Ndị Hibru 6:10.
Diamọnd ụfọdụ na-enwe “ntụpọ” ndị mere mgbe a na-emepụta ha ma chọọ ka e jiri nlezianya hụ maka ha. Otú ọ dị, site n’enyemaka nke ngwá ọrụ a na-akpọ polariscope, onye ahụ na-amụcha ya pụrụ ịchọta ntụpọ ahụ ma nwee ike ịrụ nkume ahụ ọrụ nke ọma. Ikekwe anyị na-enwe ntụpọ ime, ma ọ bụ adịghị ike n’àgwà anyị, n’ihi nzụlite anyị ma ọ bụ ahụmahụ na-akpaghasị uche. Gịnị ka anyị pụrụ ime? Nke mbụ, ọ dị anyị mkpa ikweta nsogbu ahụ n’onwe anyị ma kpebie imeri ya ruo n’ókè ọ pụrụ ikwe mee. Anyị kwesịrị n’ezie ibutu onwe anyị ibu arọ n’ihu Jehova n’ekpere, ikekwe na-achọkwa enyemaka ime mmụọ site n’aka onye okenye ndị Kraịst.—Abụ Ọma 55:22; Jemes 5:14, 15.
Ntụpọ dị otú ahụ dị n’ime metụtara Nicholas. “Nna m bụ onye aṅụrụma, ọ kpatakwaara mụ na nwanne m nwanyị nhụjuanya dị ukwuu,” ka ọ na-akọwa. “Mgbe m gụsịrị akwụkwọ, esonyere m òtù ndị agha, ma o weghị oge àgwà nnupụisi m wee tinye m ná nsogbu. Ndị isi agha tụrụ m mkpọrọ n’ihi ire ọgwụ ọjọọ, n’oge ọzọkwa agbafuru m. N’ikpeazụ, ahapụrụ m ọrụ agha, ma m ka nwere nsogbu. Ọ bụ ezie na ndụ m ghasara aghasa n’ihi iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na n’ihi aṅụrụma, enwere m mmasị na Bible ma nwee ọchịchọ inwe nzube ná ndụ. Ka e mesịrị, ezutere m Ndịàmà Jehova, gbanwee ụzọ ndụ m, ma nabata eziokwu.
“Ma, o were ọtụtụ afọ tupu m mee ihe banyere otu ntụpọ m nwere n’ụdị mmadụ m. Enwere m ajọ mkpọrọmasị maka ịbụisi ma na-enwe ahụ ntakasị mgbe e nyere m ndụmọdụ ọ bụla. Ọ bụ ezie na m chọrọ ka Jehova jiri m mee ihe n’ụzọ nile, adịghị ike a jighachiri m azụ. N’ikpeazụ, site n’enyemaka nke ndị okenye abụọ nwere nghọta, ekwetara m nsogbu m ma malite itinye ndụmọdụ ịhụnanya ha sitere n’Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ. Ọ bụ ezie na obere iwe na-ebilite mgbe ụfọdụ, achịkwawo m ọdịdị nnupụisi m ugbu a. Enwere m obi ekele dị ukwuu maka ụzọ ndidi Jehova si emeso m na maka enyemaka ịhụnanya nke ndị okenye ahụ. N’ihi ọganihu ime mmụọ m, ahọpụtawo m n’oge na-adịbeghị anya ịbụ ohu na-eje ozi.”
Dị ka Nicholas chọpụtara, ịgbanwe àgwà ndị gbamiri mkpọrọgwụ adịghị mfe. Anyị pụrụ iche ihe ịma aka yiri nke ahụ ihu. Ikekwe iwe na-ewekarị anyị. Anyị pụrụ ibu iwe n’obi, ma ọ bụ na-eji nnwere onwe akpọrọ ihe gabiga ókè. N’ihi ya, a pụrụ ịkpara ọganihu ndị Kraịst anyị ókè. Ndị na-amụcha diamọnd na-enwe ahụmahụ yiri nke ahụ n’ebe nkume ndị ha na-akpọ naats dị. Ndị a n’ezie bụ nkume abụọ a gbazere ịghọ otu mgbe a na-emepụta diamọnd ahụ. N’ihi ya naats nwere usoro uto abụọ na-emegiderịta onwe ha ndị na-eme ka ịwa ha dị ka ájá ya si dị sie oké ike. N’ọnọdụ nke anyị, anyị na-ahụ ka “ájá” nke mmụọ ọchịchọ obi na-alụso “ájá” nke anụ ahụ na-ezughị okè ọgụ. (Matiu 26:41; Ndị Galetia 5:17) Mgbe ụfọdụ, anyị pụrụ ịchọ ịchịli nnọọ aka n’ọgụ ahụ, na-ekwu na ezughị okè n’ụdị mmadụ anyị adịghị nnọọ mkpa. ‘E kwuwerị,’ ka anyị pụrụ ịsị, ‘ezinụlọ m na ndị enyi m ka hụrụ m n’anya.’
Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị ga-ejere ụmụnna anyị ozi, wetakwara Nna anyị nke bi n’eluigwe otuto, ọ dị anyị mkpa ka e mee ‘ka anyị dị ọhụrụ na mmụọ nke uche anyị,’ site n’iyikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ. Mgbalị ahụ ruru ya, dị ka Nicholas na ndị ọzọ a na-apụghi ịgụta ọnụ na-agba àmà ya. Onye na-amụcha diamọnd maara na otu ntụpọ pụrụ imebi diamọnd ahụ dum. N’otu aka ahụ, site n’ileghara akụkụ na-adịghị ike n’ụdị mmadụ anyị anya, anyị pụrụ imebi ọdịdị ime mmụọ anyị. Ma nke ka njọ, adịghị ike ka njọ pụrụ iduje anyị n’ọdịda ime mmụọ.—Ilu 8:33.
Dị ka “Ọkụ” n’Ime Anyị
Onye na-amụcha diamọnd na-achọ inweta mgbukepụ dị n’ime dịamọnd. A na-eme nke a site n’ịhazi akụkụ ya nile ka ha wee wepụta ihe a na-akpọ mmetụta eke na ogwurugwu. N’ime diamọnd ahụ, ìhè ahụ nwere àgwà dị iche iche na-egbukepụ ihu na azụ, na-emepụta mgbukepụ nke na-eme ka diamọnd na-egbu mara mara. N’otu aka ahụ, mmụọ Chineke pụrụ ịdị ka “ọkụ” n’ime anyị.—1 Ndị Tesalọnaịka 5:19; Ọrụ 18:25; Ndị Rom 12:11.
Ma gịnị ma ọ bụrụ na anyị ahụ na ọ dị mkpa ka a kwalie anyi n’ụzọ ime mmụọ? Olee otú a pụrụ isi mee nke a? Ọ dị anyị mkpa ‘iche echiche n’ụzọ nile anyị.’ (Abụ Ọma 119:59, 60) Nke a ga-agụnye ịmata ihe ndị ahụ na-eme ka anyị ghara inwe ọganihu ime mmụọ ngwa ngwa wee kpebie ọrụ ọchịchị Chineke ndị ọ dị anyị mkpa ịchụsosikwu ike. Anyị pụrụ ime ka nghọta ime mmụọ mikwuo emi site n’ọmụmụ ihe onwe onye na ekpere siri ike. (Abụ Ọma 119:18, 32; 143:1, 5, 8, 10) Ọzọkwa, site n’iso ndị na-arụsi ọrụ ike n’okwukwe na-akpakọrịta, anyị ga-emesiwanyekwu mkpebi anyị ike iji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi.—Taịtọs 2:14.
Louise, otu nwanyị bụ́ onye Kraịst na-akatabeghị ahụ, kwetara, sị: “Atụlere m ịsụ ụzọ oge nile ruo afọ abụọ tupu m tinye aha m dị ka ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye nkwusa Alaeze oge nile. O nweghị ihe nọ na-akwụsị m, ma enwere m nanị otu ụzọ m si eme ihe, emeghịkwa m nnọọ mgbalị ọ bụla isi na ya pụta. Mgbe ahụ na mberede nna m nwụrụ. Aghọtara m otú ndụ si bụrụ ihe na-esighị ike nakwa na mụ ejighị nke m na-eme ihe n’ụzọ kasị mma. N’ihi ya agbanwere m ụzọ m si ele ihe ime mmụọ anya, mụbawanye ozi m, ghọọkwa ọsụ ụzọ oge nile. Ihe kasị nyere m aka na nke a bụ ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị ime mmụọ m ndị na-akwado nhazi ije ozi ubi na ndị na-esonyekwara m n’ozi mgbe nile. Amụtawo m na ma ọ dị mma ma ọ dị njọ, anyị na-ekerịta abamuru na ihe mgbaru ọsọ nile nke ndị anyị na ha na-akpa.”
Mmụchapụ Dị Ka E Ji Ígwè
Diamọnd bụ ihe ndị kasị sie ike na-adịrị onwe ha n’elu ala. N’ihi ya, ọ na-ewe otu diamọnd iji waa ọzọ. Nke a pụrụ ichetara ndị mmụta Bible ilu nke na-asị: “Ígwè na-amụcha ígwè; otú a ka mmadụ na-amụcha ihu enyi ya.” (Ilu 27:17) Olee otú e si ‘amụcha’ ihu mmadụ? Otu onye pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịmụcha ikike ọgụgụ isi na ọdịdị ime mmụọ nke onye ọzọ, dị nnọọ ka a pụrụ iji mpekele ígwè mụchaa ihu mma e jikwa otu ígwè ahụ mee. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị adaa mbà n’obi n’ihi mmechuihu ụfọdụ, agbamume sitere n’aka onye ọzọ pụrụ ịbụ ihe na-ewuli nnọọ elu. Mgbarụ ihu anyị pụrụ isi n’ụzọ dị otú a gbanwee ghọọ nke ka mma, a pụrụ inyeghachikwa anyị ume ndụ maka ije ozi n’ịnụ ọkụ n’obi ọhụrụ. (Ilu 13:12) Ndị okenye ọgbakọ karịsịa pụrụ inye aka n’ịmụcha anyị site n’inye agbamume sitere n’Akwụkwọ Nsọ na ndụmọdụ maka imeziwanye ihe. Ha na-eso ụkpụrụ ahụ Solomọn dere, sị: “Nye onye maara ihe mmụta, ọ ga-amarakwa ihe karị: mee ka onye ezi omume mara ihe, ọ ga-atụkwasị ihe mmụta n’amamihe ya.”—Ilu 9:9.
N’ezie, ọzụzụ ime mmụọ na-ewe oge. Ruo ihe karịrị afọ iri, Pọl onyeozi so Timoti kerịta ahụmahụ na ụzọ izi ihe ya. (1 Ndị Kọrint 4:17; 1 Timoti 4:6, 16) Ọzụzụ dị ogologo Mosis nyere Joshua n’ime oge dị afọ 40 baara mba Israel uru ruo ogologo oge. (Joshua 1:1, 2; 24:29, 31) Elaịsha sonyeere Elaịja onye amụma ruo ikekwe afọ 6, na-anata ezi ntọala maka ozi nke ya nke ga-adịru ihe dị ka afọ 60. (1 Ndị Eze 19:21; 2 Ndị Eze 3:11) Site n’iji ndidi na-enye ọzụzụ na-aga n’ihu, ndị okenye na-eso ihe nlereanya Pọl, Mosis, na Elaịja.
Ịja mma bụ otu akụkụ dị oké mkpa nke inye ọzụzụ. Okwu ịja mma n’ezi obi maka ihe omume ndị e meziri emezi ma ọ bụ ọrụ kwesịrị otuto pụrụ ịkwali ndị ọzọ ịchọ ijere Chineke ozi n’ụzọ zuru ezu karị. Ịja mma na-ewulite obi ike nke, n’aka nke ọzọ, na-enye ihe nkwali iji merie adịghị ike. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 11:2.) Agbamume ịga n’ihu n’eziokwu na-abịakwa site n’ikeresi òkè ike n’ọrụ nkwusa Alaeze na ọrụ ndị ọzọ nke ọgbakọ. (Ọrụ 18:5) Mgbe ndị okenye nyere ụmụnna nwoke ibu ọrụ kwekọrọ n’ọganihu ime mmụọ ha, nke a na-enye ndị ikom a ahụmahụ bara uru, o yikwara ka ọ pụrụ iwusi ọchịchọ ha ike ịnọgide na-enwe ọganihu ime mmụọ.—Ndị Filipaị 1:8, 9.
Ezi Ihe Mere A Ga-eji Na-enwe Ọganihu Ime Mmụọ
A na-ele diamọnd anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Nke a bụ otu ihe ahụ banyere ndị na-esonyere ezinụlọ zuru ụwa ọnụ nke ndị na-efe Jehova ofufe. N’eziokwu, Chineke n’onwe ya na-akpọ ha “ihe a na-achọsi ike” ma ọ bụ “ihe dị oké ọnụ ahịa” nke mba nile. (Hagaị 2:7, nkọwa ala ala peji NW) N’afọ gara aga, 375,923 ghọrọ Ndịàmà Jehova e mere baptism. Iji nwee ohere maka uto a, ọ dị mkpa ‘ime ka ụlọikwuu saa mbara.’ Site n’inwe ọganihu ime mmụọ—na site n’iru eru maka ihe ùgwù ije ozi ndị Kraịst—o kwere omume ikere òkè n’ịhụ maka mmụbawanye a.—Aịsaịa 54:2; 60:22.
N’adịghị ka ọtụtụ diamọnd dị oké ọnụ ahịa ndị a na-etinye n’ime ụlọ ndebe ihe, ndị a na-adịghị ahụkebekwa, abamuru ime mmụọ anyị pụrụ igbukepụ nke ọma. Ka anyị na-amụchakwa ma na-egosipụta àgwà ndị Kraịst anyị mgbe nile, anyị na-ewetara Jehova Chineke otuto. Jisọs gbara ụmụazụ ya ume, sị: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ, ka ha we hụ ọrụ ọma nile unu, wee too Nna unu Nke bi n’eluigwe.” (Matiu 5:16) N’ezie, nke ahụ na-enye anyị ezi ihe mere a ga-eji nwee ọganihu ime mmụọ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E ji aha ndochianya mee ihe n’isiokwu a.