‘Ịbụ Ndị E Weliri Izute Onyenwe Anyị’—N’ụzọ Dị Aṅaa?
ỌGỤGỤ nke oge ọgwụgwụ ajọ usoro ihe dị ugbu a na-aga n’ihu n’alaghị azụ. Ná ngabiga nke hour ọ bụla, minit ọ bụla, sekọnd ọ bụla, anyị na-eru nso n’ihe omume ndị na-akpali akpali e buru n’amụma n’oge dị anya gara aga. Nnwogha ọ̀ bụ otu n’ime ndị a? Ọ bụrụ na ọ bụ, olee mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka ọ ga-esi were ọnọdụ?
Okwu ahụ bụ́ “nnwogha” adịghị n’ime Bible. Ma ndị kwere na ya na-akpọtụ uche n’okwu Pọl onyeozi kwuru ná 1 Ndị Tesalọnaịka 4:17 dị ka ihe ndabere nke nkwenkwe ha. Ka anyị nyochaa akụkụ akwụkwọ nsọ nke a site n’ọnọdụ dị ya gburugburu. Pọl dere, sị:
“Anyị achọghị ka unu ghara ịmara ihe banyere ndị na-ada n’ụra ọnwụ, ụmụnna anyị; ka o wee ghara iwute unu, ọbụna dị ka ọ na-ewute ndị fọdụrụ, ndị na-enweghị olileanya. N’ihi na a sị na anyị kwere na Jisọs nwụrụ sikwa n’ọnwụ bilie, otú a ndị e mere ka ha daa n’ụra ọnwụ site n’aka Jisọs, ọ bụkwa ndị a ka Chineke ga-ekuru ka ha so ya bịa. N’ihi na nke a ka anyị na-agwa unu n’okwu [Jehova, NW], na anyị onwe anyị, bụ́ ndị nọ ná ndụ, ndị a na-ahapụ ruo [ọnụnọ, NW] nke Onyenwe anyị, na anyị agaghị eburu ndị dara n’ụra ọnwụ ụzọ ma ọlị. N’ihi na Onyenwe anyị onwe ya ga-ewere oké ịkpọ òkù, were olu isi mmụọ ozi, werekwa opi nke Chineke, si n’eluigwe rịdata: ndị nwụrụ n’ime Kraịst ga-ebukwa ụzọ si n’ọnwụ bilie: mgbe ahụ anyị onwe anyị, bụ́ ndị nọ ná ndụ, ndị a na-ahapụ, anyị na ha ka a ga-ewelikọ n’igwe ojii, izute Onyenwe anyị n’ime mbara eluigwe: otú a ka anyị na Onyenwe anyị ga-anọkwa mgbe nile. Ya mere werenụ okwu ndị a na-akasirịta ibe unu obi.”—1 Ndị Tesalọnaịka 4:13-18.
Ọgbakọ ahụ dị na Tesalọnaịka ka dị nnọọ ọhụrụ mgbe Pọl degaara ndị Kraịst nọ n’ebe ahụ akwụkwọ ozi mbụ ya n’ihe dị ka afọ 50 O.A. Ndị nọ n’ọgbakọ ahụ na-enwe mwute na ụfọdụ ndị so n’ọnụ ọgụgụ ha “na-ada n’ụra ọnwụ.” Otú ọ dị, ihe Pọl dere ji olileanya nke mbilite n’ọnwụ kasie ndị Tesalọnaịka obi.
“Ọnụnọ” nke Kraịst
Ọ bụ ezie na o kwupụtara na a ga-akpọlite ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi nwụrụ n’oge ahụ n’ọnwụ, Pọl kwukwara, sị: ‘Ndị nọ ná ndụ, bụ́ ndị a hapụrụ ruo ọnụnọ nke Onyenwe anyị, agaghị ebu ndị dara n’ụra ọnwụ ụzọ ma ọlị.’ (Amaokwu nke 15) Ihe dị ịrịba ama, n’ezie, bụ ozuzo nke onyeozi ahụ zoro aka ‘n’ọnụnọ’ nke Onyenwe anyị. N’ebe a ihe odide nke asụsụ mbụ ji okwu Grik bụ́ pa·rou·siʹan mee ihe, nke pụtara n’ụzọ nkịtị “ịnọnyere.”
Mgbe onye isi ala nke Mba ọzọ letara otu mba, a na-amakarị ọkwa banyere ụbọchị nile nke ọnụnọ ya n’ebe ahụ. Nke a abụwo eziokwu n’ihe banyere ọnụnọ nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ụlọ Nche anọgidewo na-ewepụta ihe àmà nye ndị mmụta nke amụma Bible obi ha ziri ezi na ọnụnọ Jisọs n’ike Alaeze eluigwe malitere na 1914. Ihe ndị mere kemgbe afọ ahụ na-agba àmà banyere ọnụnọ Jisọs a na-adịghị ahụ anya. (Matiu 24:3-14) Ya mere site n’ikwu na ndị Kraịst ụfọdụ nọ ndụ n’oge ọnụnọ nke Onyenwe anyị ga-abụ ‘ndị e weliri n’igwe ojii izute Onyenwe anyị n’ime mbara eluigwe,’ Pọl bu n’uche na ndị ahụ nọ ndụ ga-ezute Kraịst, ọ bụghị ná mbara elu ala, kama n’ógbè eluigwe a na-adịghị ahụ anya ebe Jisọs na-anọdụ ala n’aka nri nke Chineke. (Ndị Hibru 1:1-3) Ma olee ndị ka ha bụ?
“Israel nke Chineke”
Akwụkwọ Nsọ na-ekwu ọtụtụ ihe banyere ndị Israel anụ ahụ, na-ekwukwa banyere “Israel nke Chineke” nke ime mmụọ. Ndị Juu na ndị Jentaịl kwere ekwe gaje imejupụta ọnụ ọgụgụ nke ìgwè nke a e tere mmanụ site ná mmụọ nsọ Chineke, ma ọ bụ ike ọrụ. (Ndị Galetia 6:16; Ndi Rom 11:25, 26; 1 Jọn 2:20, 27) Akwụkwọ Mkpughe na-egosi na ngụkọta ọnụ ọgụgụ nke Israel ime mmụọ bụ 144,000, bụ́ ndị e gosipụtara ka ha nile so Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, nọrọ n’Ugwu Zaịọn eluigwe. Ha na Kraịst ga-abụ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. (Mkpughe 7:1-8; 14:1-4; 20:6) Ndị so n’etiti ha ga-abụ ndị ahụ nọworo n’ọgbakọ ndị ahụ dị na Tesalọnaịka nakwa n’ebe ndị ọzọ, n’agbanyeghị agbụrụ ma ọ bụ mba ha si na ya pụta.—Ọrụ 10:34, 35.
Tupu onye ọ bụla na-ekwesị ntụkwasị obi nke so n’Israel ime mmụọ anata nkwụghachi ụgwọ eluigwe, ha aghaghị inwe otu ahụmahụ. Dị ka ọnwụ Jisọs n’elu osisi ịta ahụhụ bu ụzọ tupu mbilite n’ọnwụ ya gaa ná ndụ n’eluigwe, otú ahụ ndị Kraịst nwere olileanya eluigwe aghaghị ịnwụ tupu ha anata nkwụghachi ụgwọ ha. (1 Ndị Kọrint 15:35, 36) Nke ahụ ga-abụ eziokwu banyere ndị so n’Israel ime mmụọ bụ́ ndị nọ ndụ na narị afọ mbụ O.A. nakwa banyere ndị dị otú ahụ nọ ndụ taa.
Mgbe o hotasịrị ‘ọnụnọ nke Onyenwe anyị,’ Pọl rụtụrụ aka n’oge mgbe ndị Israel ime mmụọ kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị nwụworo anwụ ga-anata nkwụghachi ụgwọ eluigwe ha. O dere, sị: “Onyenwe anyị onwe ya ga-ewere oké ịkpọ òkù, were olu isi mmụọ ozi, werekwa opi nke Chineke, si n’eluigwe rịdata: ndị nwụrụ n’ime Kraịst ga-ebukwa ụzọ si n’ọnwụ bilie.” (Amaokwu nke 16) Ya mere, ozugbo ọnụnọ Jisọs dị ka Eze malitere, anyị ga-atụ anya ka mbilite n’ọnwụ gaa n’eluigwe malite, na-amalite site ná ndị ahụ so n’Israel ime mmụọ bụ́ ndị nwụwororị dị ka ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe. (1 Ndị Kọrint 15:23) Ha na-eje ozi ugbu a n’akụkụ Jisọs n’eluigwe. Ma olee banyere ndị Kraịst e tere mmanụ ọnụ ọgụgụ ha dị ole na ole bụ́ ndị ka nọ ndụ n’elu ala? Hà na-echere nnwogha ahụ?
‘Ịbụ Ndị E Weliri’—N’ụzọ Dị Aṅaa?
Mgbe o zosịrị aka n’ebe ndị Kraịst e tere mmanụ nọ, bụ́ ndị nwụworo anwụ, Pọl kwukwara, sị: “Mgbe ahụ anyị onwe anyị, bụ́ ndị nọ ná ndụ, ndị a na-ahapụ, anyị na ha ka a ga-ewelikọ n’igwe ojii, izute Onyenwe anyị n’ime mbara eluigwe: otú a ka anyị na Onyenwe anyị ga-anọkwa mgbe nile.” (Amaokwu nke 17) “Ndị nọ ná ndụ” ga-abụ ndị ahụ nọ ndụ n’oge ọnụnọ Kraịst. ‘A ga-eweli’ ha izute Onyenwe anyị Jisọs. Dịkwa ka ọ dị n’ọnọdụ ndị Kraịst oge mbụ kwesịrị ntụkwasị obi, ọnwụ dị mkpa nye ha dị ka mmadụ iji bụrụ ndị e jikọrọ ha na Kraịst n’eluigwe.—Ndị Rom 8:17, 35-39.
N’idegara ndị Kraịst nọ na Kọrint akwụkwọ, Pọl kwuru, sị: “Nke a ka m na-ekwu, ụmụnna m, na anụ ahụ na ọbara apụghị iketa alaeze Chineke; ihe na-ere ure eketaghịkwa ereghị ure. Lee, agwa m unu ihe omimi: Ọ bụghị anyị nile ga-ada n’ụra ọnwụ, ma a ga-enwo anyị nile, n’oge dịkarịsịrị nta, n’otu ntabi anya, mgbe a ga-afụ opi ikpeazụ: n’ihi na a ga-afụ opi, a ga-emekwa ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie n’apụghị ire ure, a ga-enwokwa anyị onwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 15:50-52) Mgbe ha nwụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi n’oge ọnụnọ Kraịst, nke ọ bụla n’ime ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ na-anata nkwụghachi ụgwọ eluigwe ya ozugbo ahụ. “N’otu ntabi anya,” a na-akpọlite ya n’ọnwụ dị ka mmụọ e kere eke ma ‘na-eweli’ ya izute Jisọs, ọ na-ejekwa ozi dị ka onye so na-achị achị n’Alaeze nke eluigwe. Ma gịnị banyere ndị ọzọ nile na-efe Jehova? Ka ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a na-eru nso, à ga-ewelikwa ha gaa n’eluigwe?
Nlanarị—Ma Ọ Bụghị Site ná Nnwogha
Ebe ọ bụ na ọnụnọ Jisọs dị ka eze malitere na 1914, anyị abamiwo ugbu a n’ime “mgbe ọgwụgwụ” nke ụwa nke a. (Daniel 12:4) Pọl dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọ dịghị unu mkpa, ụmụnna anyị, ka e degara unu akwụkwọ banyere oge ahụ nile na ụbọchị ahụ nile. N’ihi na unu onwe unu matara nke ọma na dị ka onye ohi na-abịa n’abalị, otú a ka ụbọchị nke [Jehova, NW] na-abịa. Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha, dị ka ime na-eme nwanyị nke dị ime; ha agaghị agbanarịkwa ya ma ọlị.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:1-3) Ma ndị Kraịst nọ na nche ga-agbanarị. N’ụzọ dị aṅaa?
Mkpu ahụ bụ́ “Udo na ntụkwasị obi” bụ ihe na-ebute ụzọ tupu oge ahụ Jisọs kpọrọ ‘oké mkpagbu.’ N’ịkọwa “oké ìgwè mmadụ” nke ndị na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala bụ́ paradaịs, akwụkwọ Mkpughe na-asị: “Ndị a bụ ndị na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta, ha sakwara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpughe 7:9, 14; Luk 23:43) Ee e, olileanya ha abụghị nke nnwogha. Kama nke ahụ, ha nwere olileanya nke ịlanarị kpọmkwem n’ebe a n’elu ala. Iji kwadebe maka ya, ha aghaghị ịnọgide na-amụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ. Olee ụzọ ị pụrụ isi mee nke a wee lanarị ọgwụgwụ nke usoro ihe a?
Ọ dị gị mkpa ‘inwe anya udo, iyikwasị ihe agha igbochi obi, bụ́ okwukwe na ịhụnanya; ya na okpu agha, bụ́ ile anya nzọpụta.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 5:6-8) Ugbu a bụ oge ịṅa ntị n’Okwu amụma nke Chineke, bụ́ Bible. Ka oge na-agabiga ruo n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a, ṅaa ntị ná ndụmọdụ Pọl: “Unu akpọla ibu amụma ihe efu; na-anwanụ ihe nile; jidesienụ ihe ọma ike.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:20, 21) Otú a, Ndịàmà Jehova na-anabata gị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, bụ́ ebe ị pụrụ isoro ha kere òkè n’ọmụmụ nke amụma Bible dị iche iche na akụkụ ndị ọzọ nke Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ.
Ka ị na-eto n’ezi ihe ọmụma na okwukwe, ị ga-aghọta mmezu nke nzube Jehova Chineke ikpochapụ ndị iro ya nile nọ n’eluigwe na n’elu ala na iweghachi ụwa ịghọ paradaịs. Site n’igosipụta okwukwe, ị pụrụ isokwa n’etiti ndị nlanarị nke oké mkpagbu ahụ, bụ́ ndị nwere ihe ùgwù nke ịnabata ọtụtụ nde ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ gaa ná ndụ n’elu ala. Leekwa ihe ọṅụ ọ ga-abụ ịdị ndụ n’okpuru Alaeze Chineke nke dị n’aka Jisọs Kraịst na ndị so ya na-achị achị, bụ́ ndị ‘a ga-eweliworị izute Onyenwe anyị’ site n’ịbụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ gaa ná ndụ n’ebe dị n’eluigwe!
Mgbe ahụ, nye ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi n’ozuzu ha, gịnị bụ ezi olileanya dabeere n’Akwụkwọ Nsọ? Ọ bụghị nnwogha. Kama nke ahụ, ọ bụ ndụ ebighị ebi n’elu ala n’okpuru ọchịchị nke Alaeze Chineke.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndị lanarịrị oké mkpagbu ahụ ga-anabata ndị a kpọlitere n’ọnwụ gaa ná ndụ n’elu ala bụ paradaịs n’okpuru ọchịchị nke Jisọs na ndị ahụ ‘e weliri’ gaa n’eluigwe