Olileanya—Ihe Nchebe Dị Mkpa N’ime Ụwa Nke Dị Egwu
Otu nwa okoro na-eto eto onye Korea chọrọ inyere nne ya aka ime ka otu nwa akwụkwọ kọleji kweta n’ụzọ o si dị mkpa inwe olileanya maka ọdịnihu. N’icheta otu ihe atụ nke ọ nụworo ná nzukọ ndị Kraịst, ọ jụrụ nwa akwụkwọ ahụ ma ọ̀ ga-aza ya otu ajụjụ siri ike. O kwetara. Ọ sịrị: “Ọ dị ezinụlọ abụọ. Ha abụọ dachara ogbenye. Mmiri na-ezosi ike, uko ụlọ nke ezinụlọ abụọ ahụ na-ehicha mmiri. Otu ezinụlọ nọ n’ezigbo mwute, ha mekwara mkpesa dị ukwuu banyere ebe ndị ahụ mmiri si ehi. Ma ezinụlọ nke ọzọ nwere obi ụtọ na aṅụrị ka ha na-emechi ebe ndị uko ụlọ ha puru epu. N’ihi gịnị ka e ji nwee ọdịiche dị ukwuu otú a n’etiti ezinụlọ abụọ ahụ?” N’ịbụ onye a kpaliri mmasị ya, nwa agbọghọ ahụ na-eto eto zaghachiri na ya amaghị. “Ọ dị mma,” ka nwa okoro ahụ sịrị, “ezinụlọ nke abụọ ahụ nwere obi ụtọ n’ihi na ha ka natasịrị nnọọ ozi site n’aka gọọment obodo ahụ na a ga-enye ha ụlọ ọhụrụ. N’ihi ya ha nwere olileanya. Nke ahụ bụ ọdịiche dịnụ!”
AJỤJỤ ahụ siri ike nke nwa okoro ahụ bụ ihe atụ nke otu eziokwu dị mfe: Olileanya na-agbanwe echiche anyị na-enwe banyere ndụ, ọtụtụ mgbe n’agbanyeghị ọnọdụ anyị. Dị ka ezinụlọ abụọ ahụ ọ kọwara, ihe ka ọtụtụ n’ime anyị aghaghị ịtachi obi n’ọnwụnwa dị iche iche ná ndụ—nsogbu ahụ ike, nsogbu ego, nsogbu ezinụlọ, mpụ, na ọtụtụ ọnwụnwa na mkparị ndị ọzọ a na-apụghị ịgụta ọnụ. Ọtụtụ mgbe, anyị apụghị ime ka nsogbu ndị ahụ gabiga dịkwa ka anyị na-apụghị ime ka oké ifufe na égbè eluigwe pụọ na gburugburu ebe anyị bi. Ya mere anyị pụrụ inwe mmetụta nke enweghị olileanya, nke ndị a hapụrụ nanị ha—n’ụzọ dị mkpirikpi, nke ndị na-enweghị enyemaka. Iji mee ka ọnọdụ ahụ ka njọ, ọ pụrụ ịbụ na a kụziworo anyị na chọọchị na ọdịnihu bụ nke olileanya na-adịghị na ya maka ihe ka ọtụtụ ná ndị mmehie, na ọ pụrụ ịgụnye ịbụ ndị a tara ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi.
E kwuwo na ihe ndị na-akpata ịbụ onye dara mbà n’obi bụ enweghị enyemaka tinyere enweghị olileanya. Ma anyị pụrụ iwepụ kpam kpam otu n’ime ihe ndị ahụ; ọ dịghị onye n’ime anyị nke kwesịrị ịtụfu olileanya. Olileanya n’onwe ya kwa pụrụ ịbụ ihe agha kasị mma iji wezụga ihe nke ọzọ ahụ, bụ́ mmetụta nke enweghị enyemaka. Ọ bụrụ na anyị nwere olileanya, anyị pụrụ ịtachi obi n’ọnwụnwa dị iche iche nke ndụ na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịdị jụụ na afọ ojuju kama ịnọgide na-adọlị n’oké nhụjuanya. Ee, olileanya bụ ihe nchebe dị mkpa.
Nzọrọ dị otú ahụ ọ̀ na-eme ka i nwee ihe ịrụ ụka? Olileanya ò siri ike nke ukwuu n’ezie nke na ọ na-eme ka e nwee ọdịiche ahụ buru ibu? Olileanya a pụrụ ịdabere na ya ọ̀ dị adị maka onye ọ bụla n’ime anyị?
Dị Ka Okpu Agha
Nkà mmụta ọgwụ na ahụ ike amalitewo ịghọta ike dị ịrịba ama nke olileanya. Otu onye lanarịrị Oké Mgbukpọ ndị Nazi Dr. Shlomo Breznitz, nke bụ onye ọkà n’ihe banyere oké nchegbu, kwuru na n’ihe banyere ihe kasị ná nsogbu nke ndụ, “oké nchegbu na-esite n’otú anyị si ewere ihe isi ike ndị nsogbu na-eweta, ọ bụghị nsogbu ndị ahụ n’onwe ha. Olileanya na-ebelata ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị ike ha.” Otu isiokwu dị na The Journal of the American Medical Association kwuru n’ụzọ siri ike na olileanya bụ “ọgwụ dị ike.” Magazin bụ American Health kọrọ, sị: “E nwere ọtụtụ ihe atụ nke ndị ọrịa, karịsịa ndị na-arịa ọrịa cancer, ndị ọnọdụ ha na-aka njọ ná mberede mgbe otu ihe mere ka ha tụfuo olileanya—ma ọ bụ ndị na-enwe ọganihu ná mberede mgbe ha chọtara ihe dị ọhụrụ ha ga-adị ndụ maka ya.”—Tụlee Ilu 17:22.
Ndị mmụta Bible amatawo eri ogologo oge ọdịmkpa nke olileanya. Ná 1 Ndị Tesalọnaịka 5:8, Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst ume, sị: “Ka anyị nwee anya udo, yikwasịsịa . . . okpu agha, bụ́ ile anya nzọpụta.” Olee otú “ile anya nzọpụta,” si dị ka okpu agha?
Tụlee ihe okpu agha na-eme. Onye agha nke oge Bible na-eyi okpu agha nke ọla ma ọ bụ ígwè, nke e kpukwasịrị n’elu okpu ákwà siri ike, ajị anụ, ma ọ bụ nke akpụkpọ anụ. Okpu agha nke a na-ekpuchi isi ya pụọ n’akụ́ ndị na-efegharị efegharị, osisi ndị na-efegharị efegharị, na mma agha na-ebekasị ahụ. Mgbe ahụ, ma eleghị anya ndị agha ole na ole jụrụ ikpukwasị okpu agha ma ọ bụru na ọ dị nke ha nwere. Otú ọ dị, ikpu okpu agha apụtaghị na onye agha ahụ bụ onye siri ike nke na a pụghị imeri ya ma ọ bụ na ọ dịghị ihe na-emetụ ya n’ahụ mgbe e tiri ya ihe n’isi; kama nke ahụ, okpu agha ahụ na-eme ka e jide n’aka na ihe ka n’ihe e tiri onye ahụ na-akụchapụ kama imerụ onye ahụ ahụ n’ụzọ pụrụ ịkpata ọnwụ.
Dị ka okpu agha na-echebe isi, otú a ka olileanya na-echebe uche. Ọ pụrụ ịbụ na olileanya agaghị ekwe ka anyị wezụga nsogbu nke ọ bụla ma ọ bụ ihe ndọla azụ n’akụkụ dị ka à ga-asị na ọ bụghị ihe ọ bụla. Ma olileanya na-eme ka nsogbu ndị dị otú ahụ dịtụ mfe ma na-enye aka ime ka e jide n’aka na ha agaghị abụ ihe mmerụ ahụ nye ahụ ike uche, nke mmetụta uche, ma ọ bụ nke ime mmụọ anyị.
O doro anya na nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Abraham kpuru okpu agha ihe atụ nke a. Jehova gwara ya ka o jiri nwa ya nwoke ọ hụrụ n’anya, bụ́ Aịsak chụọ àjà. (Jenesis 22:1, 2) Lee ka ọ ga-esiworịị bụrụ ihe dị mfe Abraham ịdaba n’ọnọdụ nke enweghị olileanya, bụ́ mmetụta nke pụrụ idujeworịị ya n’inupụrụ Chineke isi. Gịnị chebere uche ya pụọ ná mmetụta dị otú ahụ? Olileanya rụrụ ọrụ bụ isi. Dị ka Ndị Hibru 11:19 si kwuo, “ọ na-agụ na Chineke pụrụ ime ka [Aịsak] si ọbụna ná ndị nwụrụ anwụ bilie.” N’otu aka ahụ, olileanya Job ná mbilite n’ọnwụ nyere aka ichebe uche ya pụọ n’ịdị ilu, bụ́ nke pụrụ idujeworịị ya ịkọcha Chineke. (Job 2:9, 10; 14:13-15) Jisọs Kraịst mgbe ọ na-eche ọnwụ nke na-afụ ụfụ ihu, nwere ikike na nkasi obi n’olileanya na-enye ọṅụ maka ọdịnihu. (Ndị Hibru 12:2) Inwe obi ike na Chineke agaghị eme ihe ọjọọ mgbe ọ bụla, na ọ gaghị ada mgbe ọ bụla n’imezu okwu ya, bụ ntọala nke ezi olileanya.—Ndị Hibru 11:1.
Ihe Ndabere Maka Ezi Olileanya
Dị ka okwukwe, ezi olileanya dabeere n’ihe bụ ezie, ihe dị adị, eziokwu. Nke a pụrụ ịbụrụ ụfọdụ ndị ihe ijuanya. Dị ka otu onye na-ede ihe odide si kwuo ya, “ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ yiri ka ha na-eche na olileanya bụ nanị ụdị dị nzuzu nke ịgọnarị eziokwu.” Ma, ezi olileanya abụghị olileanya a na-ejighị n’aka nke na ihe ga-adị mma, nkwenye na-adịghị atọ ụtọ e kwenyere na anyị ga-enweta ihe ọ bụla anyị chọrọ ma ọ bụ na ọbụna obere nsogbu ndị anyị nwere bụ ndị a ga-egboro anyị. Ndụ nwere ụzọ o si e ji ihe mere eme n’ezie emenyụ ọmarịcha nkwenkwe ụgha ndị a.—Eklisiastis 9:11.
Ezi olileanya dị iche. Ọ na-abịa site n’ihe ọmụma, ọ bụghị site n’ihe mmadụ chọrọ. Tụlee ezinụlọ nke abụọ n’ajụjụ ahụ siri ike a kpọtụrụ aha ná mmalite. Olee olileanya ha gaara enwe ma ọ bụrụ na gọọment ha abụrụwo nke a maara dị ka nke na-adịghị emezu nkwa ya dị iche iche? Kama nke ahụ, nkwa ahụ, tinyere ihe àmà ya nke ịbụ ihe a pụrụ ịdabere na ya, pụrụ inye ezinụlọ ahụ ihe mgbakwasị ụkwụ siri ike maka olileanya.
N’otu aka ahụ, Ndịàmà Jehova taa nwere olileanya nke nwere nkekọ chiri anya n’ebe otu ọchịchị dị—Alaeze Chineke. Alaeze nke a bụ ihe bụ isi n’ozi Bible. Ruo ọtụtụ puku afọ ọ bụwo isi iyi nke olileanya maka ndị inyom na ndị ikom, dị ka Abraham. (Ndị Hibru 11:10) Chineke na-ekwe nkwa na site n’Alaeze ya, ọ ga-eweta ná njedebe usoro ihe ochie nke a rụrụ arụ nke ụwa ma webata nke ọhụrụ. (Ndị Rom 8:20-22; 2 Pita 3:13) Olileanya nke Alaeze a bụ ezie, ọ bụghị nrọ. Isi iyi ya—Jehova Chineke, bụ́ Eze Onyenwe eluigwe na ala—bụ onye a na-apụghị ịchụpụ n’ọkwá, n’ekwubigaghị okwu ókè. Nanị ihe dị anyị mkpa bụ inyocha ihe okike Chineke anya na-ahụ iji hụ na ọ dị adị ma nwee ike zuru ezu imezu nkwa ya nile. (Ndị Rom 1:20) Nanị ihe dị anyị mkpa bụ inyochazi ihe ndekọ nke mmekọrịta dị iche iche nke ya na ihe a kpọrọ mmadụ iji hụ na ọ dịghị mgbe okwu ya na-agabiga n’emezughị.—Aịsaịa 55:11.
Otú ọ dị, ọ bụ ihe mwute na ihe ka ọtụtụ ná ndị na-ekwu na ha bụ ndị Kraịst echefuwo ezi olileanya ahụ. Onye ọkà mmụta okpukpe ahụ bụ́ Paul Tillich kwuru n’otu okwuchukwu e bipụtara n’oge na-adịbeghị anya, sị: “Ndị Kraịst [mbụ] mụtara ichere oge ọgwụgwụ. Ma nke nta nke nta ha kwụsịrị ichere. . . . Olileanya maka ọnọdụ ọhụrụ nke ihe dị iche iche n’ụwa ghọrọ nke na-adịghị ike, ọ bụ ezie na mmadụ kpere ekpere maka ya n’Ekpere Onyenwe anyị nke ọ bụla e kpere—Ka e mee uche gị n’ụwa dị ka e si eme ya n’eluigwe!”
Lee ihe ọdachi ọ bụ! Ọtụtụ nde, ọbụna ọtụtụ ijeri, nke ụmụ mmadụ ndị nọ n’oké mkpa nke olileanya enweghị nke ọ bụla, ma ọ dị kpọmkwem n’ebe ahụ n’ime Bible nke ha. Lee nnọọ ajọ mkpụrụ dị egwu nke a mịpụtaworo! N’enweghị ezi olileanya ichebe uche ha, ọ̀ bụ ihe ijuanya na obi nkoropụ nke “uche a jụrụ ajụ” edugawo ọtụtụ ndị n’iji omume rụrụ arụ na ime ihe ike juru ebe nile metọọ ụwa? (Ndị Rom 1:28) Ọ bụ ihe dị oké mkpa ka anyị ghara ịdaba mgbe ọ bụla n’ime otu ọnyà ahụ. Kama ịtụzụga okpu agha nke olileanya ahụ, ọ dị anyị mkpa mgbe nile imesiwanye ya ike.
Ụzọ Ị Ga-esi Wulite Olileanya Gị
Ụzọ kasị mma isi wulite olileanya bụ ịrịba ebe bụ isi iyi ya ama, bụ́ Jehova Chineke. Jiri ịdị uchu mụọ Okwu ya bụ Bible. Ndị Rom 15:4 na-ekwu, sị: “Ka ha hà, bụ́ ihe e dere n’akwụkwọ nsọ n’oge gara aga, e dere ha izi anyị ihe, ka anyị wee were ntachi obi na nkasi obi nke ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nwee olileanya.”
Ọzọ, anyị kwesịrị ijide n’aka na olileanya anyị maka ọdịnihu abụghị nanị echiche efu nkịtị. Ọ dị anyị mkpa ime ka ọ bụrụ ihe dị adị n’ezie n’uche anyị. Ị̀ na-enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala? Ọ̀ ga-amasị gị izute ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ mgbe e mere ka ha si n’ọnwụ bilie n’elu ala? Ọ bụrụ otú ahụ, ị̀ na-eji anya nke uche gị na-ahụ onwe gi n’ebe ahụ n’oge ahụ? Dị ka ihe atụ, Aịsaịa 65:21, 22 na-ekwu banyere onye ọ bụla iwu ụlọ nke aka ya nakwa ibi n’ime ya. Ị̀ pụrụ imechi anya gị ma jiri echiche gị hụ ka ị na-arụ ọrụ n’elu ụlọ ọhụrụ gị, na-akụnye osisi nke ikpeazụ? Cheedị nnọọ echiche banyere ilegharị anya gburugburu gị ịhụ ihe si n’atụmatụ ndị i mere na ndọgbu ị dọgburu onwe gị n’ọrụ pụta. Ụda obi ụtọ nke ọrụ iwu ihe owuwu na-adalata; ị na-enyocha mbara ala a chọrọ mma ka onyonyo oge ehihie na-eto ogologo gabiga ya. Ikuku na-eme ka osisi na-efegharị n’ụzọ dị nwayọọ ma na-eme ka ahụ jụọ gị oyi site n’okpomọkụ nke ọrụ gị. Ọchị nke ụmụaka, nke a gwakọtara ya na egwú ụmụ nnụnụ, na-erute ná ntị gị. Mkparịta ụka nke ndị ị hụrụ n’anya na-ebili site n’ụlọ nke dị n’okpuru gị.
Iji anya nke uche na-ahụ oge obi ụtọ dị otú ahụ abụghị izube ihe efu; kama nke ahụ, ọ bụ ịtụgharị uche n’amụma nke e ji n’aka na ọ ga-emezu. (2 Ndị Kọrint 4:18) Ka olileanya ahụ na-abụwanye ihe dị adị n’ezie nye gị, otú a ka olileanya gị na ị ga-anọ ebe ahụ na-esiwanye ike. Olileanya dị otú ahụ nke siri ike ma doo anya ga-echebe gị pụọ n’ịbụ onye “ihere ozi ọma ahụ” na-eme, bụ́ nke pụrụ ime ka i zere ọrụ nke isoro ndị ọzọ kerịta ya. (Ndị Rom 1:16) N’ụzọ megidere nke ahụ, ị ga-achọ ‘ịnya isi n’olileanya’ ahụ dị ka Pọl onyeozi mere, site n’iji obi ike na-esoro ndị ọzọ na-ekerịta ya.—Ndị Hibru 3:6.
E nwere ihe karịrị ọdịnihu ebighị ebi nke na-enye olileanya. E nwere isi iyi dị iche iche nke olileanya n’oge dị ugbu a kwa. N’ụzọ dị aṅaa? Otu nwa amaala Rom na narị afọ nke 5 O.A., nke aha ya bụ Cassiodorus kwuru, sị: “Onye na-enweta olileanya n’abamuru dị iche iche nke ọdịnihu bụ onye na-aghọta abamuru nke werewooro ọnọdụ.” Okwu amamihe n’ezie! Nkasi obi dị aṅaa ka anyị ga-achọta ná nkwa dị iche iche nke ngọzi ọdịnihu ma ọ bụrụ na anyị apụghị inwe obi ekele maka ngọzi ndị dị ugbu a?
Ekpere na-ewulitekwa olileanya kpọmkwem ugbu a. E wepụkwa ikpe ekpere maka ọdịnihu nke dị anya, anyị kwesịrị ikpe ekpere maka mkpa ndị anyị nwere ugbu a. Anyị pụrụ inwe olileanya ma na-ekpe ekpere maka mmekọrịta ka mma nke anyị na ndị òtù ezinụlọ anyị na ndị Kraịst ibe anyị, maka nri ime mmụọ na-esonụ anyị ga-eri, ọbụna ka anyị nweta ihe ndị na-akpa anyị n’ụzọ anụ ahụ. (Abụ Ọma 25:4; Matiu 6:11) Idebe olileanya dị otú ahụ n’aka Jehova ga-enyere anyị aka inwe ntachi obi site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị. (Abụ Ọma 55:22) Ka anyị na-atachi obi, ntachi obi anyị n’onwe ya ga-emekwa ka okpu agha nke olileanya anyị siwanye ike.—Ndị Rom 5:3-5.
Inwe Olileanya n’Ebe Ndị Mmadụ Nọ
Inwe echiche na-ezighị ezi yiri nchara na-ata okpu agha nke olileanya. Ọ na-erichapụ erichapụ, nwayọọ nwayọọ kwa ọ pụrụ ime ka okpu agha ahụ ghara ịba uru. Ị̀ mụtawo ịghọta ihe bụ echiche na-ezighị ezi na ịlụ ọgụ megide ya? Ekwela ka e duhie gị site n’echiche ahụ hiere ụzọ nke bụ na àgwà nke inyo ndị ọzọ enyo, nke ime nkatọ, nke enweghị nchekwube na ọgụgụ isi bụ otu ihe ahụ. N’ezie, inwe echiche na-ezighị ezi adịghị achọkebe ọgụgụ isi.
Ọ na-adịkarị mfe inwe àgwà nke enweghị olileanya banyere ndị mmadụ ibe anyị. Ụfọdụ, n’ihi ahụmahụ na-egbu mgbu ha nwere n’oge gara aga, na-atụfu olileanya nke ịnata enyemaka ma ọ bụ nkasi obi site n’aka ndị ọzọ ma ọlị kpam kpam. “Onye agwọ tara nke mbụ hụ isi ngwere ọ gbalaga” bụ ụkpụrụ na-edu ha. Ọbụna na ha pụrụ ịdị na-ala azụ ijekwuru ndị okenye ndị Kraịst maka inyere ha aka ná nsogbu ha.
Bible na-enyere anyị aka inwe echiche kwesịrị ekwesị karị n’ebe ndị mmadụ nọ. N’eziokwu, ọ bụ ihe amamihe na-adịghị na ya itinye olileanya anyị nile n’ebe ndị mmadụ nọ. (Abụ Ọma 146:3, 4) Ma n’ime ọgbakọ ndị Kraịst, ndị okenye na-eje ozi dị ka “onyinye dị iche iche” sitere n’aka Jehova. (Ndị Efesọs 4:8, 11) Ha bụ ndị Kraịst ji akọ na uche arụ ọrụ, ndị nwere ahụmahụ, bụ́ ndị ji obi eziokwu na-achọ ịbụ “ebe izonarị ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo.”—Aịsaịa 32:2.
Ọtụtụ ndị ọzọ n’ọgbakọ ndị Kraịst na-achọsi ike ịbụ isi iyi nke olileanya. Cheedị nnọọ echiche banyere ọtụtụ narị puku n’ime ha ndị nọ kpọmkwem ugbu a na-arụ ọrụ dị ka ndị nne, ndị nna, ụmụnne ndị inyom, ụmụnne ndị ikom, na ụmụaka nye ndị na-enwekwaghị ezinụlọ nke aka ha; chee echiche banyere ọtụtụ ndị ọzọ kwa na-eme dị ka ndị enyi “na-arapara n’ahụ karị nwanne” nye ndị nọ ná mkpagbu.—Ilu 18:24; Mak 10:30.
Ọ bụrụ na i kpewo ekpere nye Jehova maka enyemaka, atụfula olileanya gị. Ọ pụrụ ịbụ na ọ zaworị gị; a pụrụ inwe onye okenye ma ọ bụ onye Kraịst ọzọ tozuru òkè, bụ́ onye dị njikere kpọmkwem ugbu a inyere gị aka ozugbo i mere ka a mara mkpa gị. Olileanya kwesịrị ekwesị n’ebe ndị mmadụ nọ na-echebe anyị site n’iwezụga onwe anyị pụọ n’ebe onye ọ bụla ọzọ nọ na iwepụ onwe anyị iche, bụ́ nke pụrụ iduga n’àgwà ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, nke amamihe na-adịghị na ya.—Ilu 18:1.
N’ịga n’ihu, ọ bụrụ na anyị na onye Kraịst ibe anyị nwere nsogbu, ọ dịghị mkpa ka anyị jiri àgwà na-ezighị ezi nke olileanya na-adịghị na ya lebara ya anya. E kwuwerị, “ịhụnanya . . . na-ele anya ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 13:4-7) Gbalịa ile ụmụnna ndị ikom na ndị inyom bụ ndị Kraịst anya dị ka Jehova si ele ha—na-eji olileanya. Lekwasị anya n’àgwà ha ndị dị mma, tụkwasị ha obi, meekwa ka mgbalị gị nile bụrụ igbo mkpa ha. Olileanya dị otú ahụ na-echebe anyị pụọ n’oké iburịta iro na esemokwu, bụ́ ndị na-adịghị abara onye ọ bụla uru.
Achịlirịla ọnọdụ nke enweghị olileanya nke ụwa ochie nke a na-anwụ anwụ aka elu mgbe ọ bụla. Olileanya dị—maka ọdịnihu anyị na-adịru ebighị ebi na maka idozi ọtụtụ n’ime nsogbu ndị anyị nwere ugbu a. Ị̀ ga-ejide olileanya ahụ aka? Site n’iyikwasị olileanya nke nzọpụta dị ka okpu agha nke na-echebe echebe, ọ dịghị ohu Jehova nke na-enweghị enyemaka n’ezie—n’agbanyeghị otú ọnọdụ dịruru ná njọ. Ọ bụrụ na anyị ahapụghị ya n’onwe anyị, ọ dịghị ihe ọ bụla n’eluigwe ma ọ bụ n’elu ala nke pụrụ ịpụnara anyị n’ike olileanya ahụ nke Jehova nyeworo anyị.—Tụlee Ndị Rom 8:38, 39.