Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 6/1 p. 20-23
  • Ibu Ibu Ọrụ Maka Nlekọta Ezinụlọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ibu Ibu Ọrụ Maka Nlekọta Ezinụlọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nlekọta Ime Mmụọ na nke Anụ Ahụ
  • “Mgbe Ị Na-anọdụ n’Ụlọ Gị”
  • Na-eme Mgbanwe, Na-anọgidesikwa Ike
  • Inyere “Ụmụ Mgbei” Aka
  • Ịzulite Ezinụlọ Siri Ike N’ụzọ Ime Mmụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ndị Nne na Nna, Gboonụ Mkpa Ezinụlọ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Kụziere Ụmụ Gị Ịhụ Jehova n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Na-amụchinụ Okwu Chineke Anya Dị Ka Ezinụlọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 6/1 p. 20-23

Ibu Ibu Ọrụ Maka Nlekọta Ezinụlọ

“NDỊ bụ́ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Site n’okwu ndị ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, Pọl onyeozi debere ibu ọrụ maka nlekọta ezinụlọ n’ebe o kwesịrị ịdị—n’ubu nke nna.

N’ihe ka n’ọtụtụ ezinụlọ, ọ bụghị nanị nna na-elekọta ụmụ ya. Nwunye ya, bụ́ nne ụmụ ya, na-eji obi ụtọ soro di ya na-ekerịta ibu ahụ. N’ihi ya, Eze Solomọn kwuru, sị: “Nwa m, nụrụ ịdọ aka ná ntị nke nna gị, ahapụkwala iwu nne gị.”—Ilu 1:8.

Nlekọta Ime Mmụọ na nke Anụ Ahụ

Ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya adịghị amara ụma leghara ha anya. N’ezie, ndị Kraịst ime otú ahụ ga-apụta ịjụ okwukwe ha, dị ka anyị ga-ekwubi site n’okwu ndị Pọl gwara Timoti: “Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ebughị ụzọ cheere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha, ma nke kachasị ndị ezinụlọ nke aka ya, ọ gọnarịwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” (1 Timoti 5:8) Ndị Kraịst maara na ịzụlite ụmụaka “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị” chọrọ ihe karịrị nnọọ ichere ha ihe na-akpa ha n’ụzọ anụ ahụ.

Tụlee agbamume Mosis nyere mba Israel mgbe ha mara ụlọikwuu n’ọzara Moab, kpọmkwem tupu ha abanye n’Ala Nkwa ahụ. N’ebe ahụ, o gwaghachiri ha iwu Chineke ma tụziere ha, sị: “Unu ga-edokwa okwu ndị a n’obi unu na n’ime mkpụrụ obi unu.” (Deuterọnọmi 11:18) Tupu mgbe ahụ, o chetaworo ha na ha kwesịrị iwere obi, mkpụrụ obi, na ike ha nile, hụ Jehova n’anya, na-agbakwụnye: “Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị.” (Deuterọnọmi 6:5, 6) Ọ dị mkpa ka ndị nne na nna bụ́ ndị Israel kwe ka okwu nke Iwu Chineke bamie n’ime obi ha. N’obi ndị jupụtara ná nghọta ime mmụọ, ndị nne na nna bụ́ ndị Israel pụrụ irubere okwu Mosis ndị sochirinụ isi n’ụzọ dị irè: “Ị ga-ejisikwa ike izi ha [okwu nke Iwu Chineke] ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.”—Deuterọnọmi 6:7; 11:19; tụlee Matiu 12:34, 35.

Rịba ama na ndị bụ́ nna “ga-ezikwa” ụmụ ha okwu ndị ahụ, ‘kwuokwa okwu banyere ha.’ Merriam-Webster’s Collegiate Dictionary na-akọwa ‘izi ihe’ dị ka “ịkụzi na ime ka e nwee mmetụta site n’ikwughachi ihe ma ọ bụ inye ndụmọdụ ugboro ugboro.” Mgbe nne na nna kwuru okwu banyere Iwu Chineke kwa ụbọchị—ụtụtụ, ehihie, na abalị—nke a ziri ụmụ ha ihe dị ukwuu. Ka ndị na-eto eto hụrụ ịhụnanya nne na nna ha nwere n’ebe Iwu Chineke dị, a kpaliri ha onwe ha kwa ịmalite ịnọ Jehova nso. (Deuterọnọmi 6:24, 25) N’ụzọ na-adọrọ mmasị, Mosis tụziiri ndị bụ́ nna kpọmkwem ịkụziri ụmụ ha ihe ‘mgbe ha nọdụrụ n’ụlọ ha.’ Nkụzi dị otú ahụ bụ akụkụ nke nlekọta ezinụlọ. Ma gịnị banyere taa?

“Mgbe Ị Na-anọdụ n’Ụlọ Gị”

“Ọ dịghị mfe,” ka Janet, bụ́ onye Kraịst mụrụ ụmụ anọ, na-akọwa.a “Nnọgidesi ike dị gị mkpa,” ka Paul, bụ́ di ya, na-ekweta. Dị ka ọtụtụ Ndịàmà ọzọ bụ́ ndị nne na nna, Paul na Janet na-agbalị isoro ụmụ ha na-amụ Bible ọ dịkarịa ala otu ugbo n’izu. “Anyị na-agbalị inwe nkwurịta okwu Bible nke ezinụlọ anyị ná mgbede Monday ọ bụla n’oge a kara aka,” ka Paul na-akọwa, na-ekweta, sị: “Ma ọ dịghị adabacha mgbe nile.” Dị ka onye okenye a họpụtara ahọpụta n’ọgbakọ ya, a kpọwo ya mgbe ụfọdụ ilebara okwu ndị chọrọ ime ihe ngwa ngwa anya. Ụmụ ya abụọ kasị okenye na-eje ozi dị ka ndị ozi oge nile. Ha na-achọpụta na uhuruchi bụ oge ndị na-arụpụta ihe maka ịkpọtụrụ ndị mmadụ n’ozi. N’ihi ya, dị ka ezinụlọ, ha agbanwewo oge ọmụmụ ihe ezinụlọ ha. “Mgbe ụfọdụ anyị na-enwe ọmụmụ ihe anyị ozugbo anyị risịrị nri anyasị,” ka Paul na-akọwa.

Ọ bụ ezie na ndị nne na nna na-eji amamihe na-egosi ịdị njikere ime mgbanwe n’iyi oge ọmụmụ ihe ezinụlọ ha, ha na-agbalị ịnọgide na-enwechi ya anya. “Ọ bụrụ na a ghaghị ịgbanwe oge ọmụmụ ihe anyị,” ka nwa ha nwanyị bụ́ Clare na-ekwu, “Papa na-amapawa oge ọhụrụ ahụ mgbe nile n’ibo friji, ka anyị nile wee nwee ike ịmara mgbe ọ ga-abụ.”

Ịgbakọta maka ọmụmụ Bible ezinụlọ chiri anya na-enyekwa ndị bụ́ ụmụaka nọ n’ezinụlọ ohere ọma isoro nne na nna ha kerịta nchegbu na nsogbu ha. Ọmụmụ ihe dị otú ahụ na-aga nke ọma mgbe ọ na-abụghị nke a na-adịghị agbanwetụ agbanwe nke na nanị ihe ụmụaka ga-eme bụ ịgụpụta azịza nye ajụjụ ndị ahụ a jụrụ n’akwụkwọ ọmụmụ Bible ha ji eme ihe. “Ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị bụ ebe a na-enwe nkwurịta okwu,” ka Martin onye ji ụmụ nwoke abụọ na-ekwu. “Mgbe unu gbakọtara ọnụ otu ugbo n’izu iji kwurịta otu isiokwu Akwụkwọ Nsọ, ị na-achọpụta otú ezinụlọ gị si eme n’ụzọ ime mmụọ,” ka ọ na-ekwu. “Ụdị ihe nile na-apụta ná nkwurịta okwu ahụ. Ị na-amata ihe na-eme n’ụlọ akwụkwọ, n’ụzọ na-akpalikwa mmasị karị, ị na-achọpụta àgwà ndị ụmụ gị na-azụlite.” Nwunye ya, bụ́ Sandra, na-ekwenye ma na-eche na ya onwe ya kwa na-erite uru dị ukwuu site n’ọmụmụ ihe ezinụlọ ahụ. “Ka di m na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ,” ka ọ na-akọ, “ana m amụta ihe dị ukwuu site n’ige ntị n’otú ụmụ m si aza ajụjụ ya.” Mgbe ahụ Sandra na-eme ka okwu ya kwekọọ ná mkpa dịnụ iji nyere ụmụ ya aka. Ọ na-anụ ụtọ ọmụmụ ihe ahụ karị n’ihi na ọ na-ekere òkè n’ụzọ dị irè. Ee, oge ọmụmụ ihe ezinụlọ na-enyere nne na nna aka ịmata echiche ụmụ ha.—Ilu 16:23; 20:5.

Na-eme Mgbanwe, Na-anọgidesikwa Ike

Mgbe oge ọmụmụ ihe ezinụlọ gị ruru, ị pụrụ ịchọpụta na otu nwatakịrị pụrụ ịdị nkọ ma nwee mmasị, ebe onye nke ọzọ ga-achọ ka e kpeere ya ire iji tụkwasị uche ma rite uru. Otu nne bụ́ onye Kraịst na-ekwu, sị: “Nke ahụ bụ ndụ ezinụlọ! Ị maara ihe i kwesịrị ime dị ka nne ma ọ bụ nna. Ya mere mgbe ị nọgidere na-eme ya, Jehova na-enye aka ma weta ụgwọ ọrụ.”

Ogologo oge onye na-eto eto ga-etinyeru uche n’ihe pụrụ ịdịgasị nnọọ iche dị ka afọ ndụ ya si dị. Nne ma ọ bụ nna nke nwere nghọta na-eburu nke a n’uche. Otu di na nwunye nwere ụmụ ise, ndị afọ ndụ ha bụ malite na 6 ruo na ndị nke 20. Nna ha, bụ́ Michael, na-asị: “Nye nke kasị nta ohere ibu ụzọ zaa ajụjụ. Nyezie ụmụaka totụworo eto ohere itinye ihe ma webata isi ihe ndị ha kwadebeworo.” Ụzọ a nke imeso ụmụ ha ihe n’ụzọ nghọta na-eme ka nne na nna nwee ike ịkụziri ụmụ ha abamuru nke ichebara ndị ọzọ echiche. “Otu n’ime ụmụ anyị nwoke pụrụ ịghọta,” ka Martin na-ekwu, “ma nwa okoro nke ọzọ ga-achọ enyemaka dị ukwuu iji ghọta. Ana m achọpụta na oge ọmụmụ ihe na-aghọ ebe a na-enye ọzụzụ maka igosipụta ndidi ndị Kraịst na mkpụrụ ndị ọzọ nke mmụọ nsọ.”—Ndị Galetia 5:22, 23; Ndị Filipaị 2:4.

Dị njikere ịgbanwe gaa n’ikike na n’ọ̀tụ̀tụ̀ uto dịgasị iche nke ụmụ gị. Simon na Mark, bụ́ ndị nọ n’afọ iri na ụma ugbu a, chọpụtara na mgbe ha dị nta karị, ọ tọrọ ha ụtọ isoro nne na nna ha mụọ akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. “Nna anyị na-eme ka anyị mee akụkụ dị iche iche dị nnọọ ka ihe nkiri,” ka ha na-echeta. Nna ha na-echeta ibido aka n’ala na igbusa ikpere n’ala iji soro ụmụ ya mee ihe ngosi ilu nke onye Sameria ahụ bụ́ ezi onye agbata obi. (Luk 10:30-35) “Ọ dị irè ma dị ụtọ nke ukwuu.”

Ọtụtụ ụmụaka na-emegide usoro nke ọmụmụ ihe ezinụlọ. Nke a ò kwesịrị igbochi nne na nna iduzi ọmụmụ ihe ahụ mgbe e mere atụmatụ ya? Ọ dịghị ma ọlị. “Uche gbagọrọ agbagọ bụ ihe e kekọtaworo n’obi nwata,” ka Ilu 22:15 na-ekweta. Otu nne nanị ya na-azụ ụmụ chere na ya na-ada dị ka onye nduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ mgbe, n’ọtụtụ oge, ihe ndọpụ uche yiri ka ọ na-agbaghasị nnọkọ ahụ. Ma ọ nọgidesiri ike. Ugbu a ụmụ ya na-akwanyere ya ùgwù dị ukwuu, ha ewerewokwa ịhụnanya na nchegbu ọ na-egosi site n’ịnọgidesi ike n’iduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ a na-enwechi anya kpọrọ mkpa.

Inyere “Ụmụ Mgbei” Aka

Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye ‘ga-azụ ìgwè atụrụ Chineke.’ (1 Pita 5:2, 3) Nleta ndị a na-eme site n’oge ruo n’oge n’ezinụlọ nke ndị nọ n’ọgbakọ ha na-enye ha ohere ịja nne na nna ndị na-ebu ibu ọrụ ndị Kraịst ha mma. N’ubu ònye ka ibu ọrụ nke izi ụmụ nke ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ ihe dịkwasịrị? Echezọla mgbe ọ bụla na ibu ọrụ nke inye ụmụ ntụziaka na-adịkwasị n’ubu nne ma ọ bụ nna.

Ịdị akọ ndị Kraịst ga-enyere ndị okenye aka izere ọnọdụ ndị na-emebi ihe nke pụrụ ibilite ma ọ bụrụ na ha ga-eweghara ọrụ nke nne ma ọ bụ nna nke na-anọghị ya. Ọ bụ ezie na ụmụnna nwoke abụọ pụrụ inwe ike ileta nwanna nwanyị bụ́ onye Kraịst bụ́ nne nanị ya na-azụ ụmụ, ha ga-akpachara anya mgbe nile n’ihe ha na-edokwa n’ụdị nke nkwado nye ndokwa ọmụmụ ihe ezinụlọ. Site n’oge ruo n’oge, ịkpọ ụmụ (nakwa, n’ezie, nne ahụ nke nanị ya na-azụ ụmụ) òkù isonye n’ọmụmụ ihe ezinụlọ nke onye okenye ahụ pụrụ ịdị na-ewuli elu ma baa uru. Otú ọ dị, echezọla mgbe ọ bụla na Jehova bụ Nna ukwu anyị nke eluigwe. Ọ nọ ya n’ezie iduzi na inyere nne ahụ aka mgbe ọ na-eduziri ụmụ ya ọmụmụ ihe, n’agbanyeghị na ọ na-eme otú ahụ nanị ya.

Gịnị banyere ọnọdụ ebe onye na-eto eto ji ihe ime mmụọ kpọrọ mkpa, ma nne na nna ya adịghị egosi nchegbu ọ bụla maka ibu ọrụ ime mmụọ ha? Ọ dịghị ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi mkpa ma ọlị inwe nkụda obi. “N’aka gị [Jehova Chineke] ka onye na-ahụju anya na-ahapụ onwe ya,” ka ọbụ abụ ahụ bụrụ. “Onye na-enyere nwa mgbei aka ka Ị bụworo.” (Abụ Ọma 10:14) N’aka nke ha, ndị okenye na-ahụ n’anya n’ọgbakọ ga-eme ike ha nile iji gbaa ndị nne na nna ume ka ha na-elekọta ụmụ ha anya. Ha pụrụ ịtụ aro nkwurịta okwu ezinụlọ ma jezie iji tụọ aro ndị bara uru banyere otú e si amụkọ ihe ọnụ. N’ezie, ha agaghị eweghara ibu ọrụ nke nne na nna ahụ, bụ́ ndị ọ dị n’ubu ha n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ.

Nkwado dị ukwuu dị ụmụ ndị nne na nna ha na-anakwereghị okwukwe mkpa. Ime ka ha sonye n’ọmụmụ ihe ezinụlọ gị pụrụ ịba uru ma ọ bụrụ na nne na nna ha nabatara nke ahụ. Robert, bụ́ onye toworo eto ugbu a nke nwere ezinụlọ nke aka ya, so nne na nna ya jee nzukọ ndị Kraịst mgbe ọ dị nanị afọ atọ. O jiri mmasị na-echeta nzukọ ndị ahụ ọbụna mgbe nne na nna ya kwụsịrị iso ọgbakọ ndị Kraịst na-akpakọ. Mgbe ọ dị afọ iri, o zutere otu nwa okoro bụ́ Onyeàmà bụ́ onye kpọọrọ ya gaa nzukọ. Nne na nna nke nwa okoro ahụ bụ́ Onyeàmà ji ọṅụ lekọta Robert anya dị ka nwa mgbei n’ụzọ ime mmụọ, e mesịakwa ha duziere ya ọmụmụ ihe. N’ihi nlekọta ịhụnanya a, o nwere ọganihu dị ngwa, ugbu a ọ na-enwekwa ọṅụ ije ozi dị ka onye okenye n’ọgbakọ.

Ọbụna mgbe nne na nna megidere ọganihu nke ụmụ ha, ụmụ ahụ anọghị nanị ha. Jehova nọgidere na-abụ Nna nke eluigwe kwesịrị ntụkwasị obi. “Nna nke ụmụ mgbei, . . . ka Chineke bụ n’ebe obibi Ya dị nsọ,” ka Abụ Ọma 68:5 na-ekwu. Ụmụ mgbei n’ụzọ ime mmụọ maara na ha pụrụ ichigharịkwuru ya n’ekpere, ọ ga-anagidekwa ha. (Abụ Ọma 55:22; 146:9) Nzukọ Jehova nke yiri nne na-eji ịdị uchu arụzu ibu ọrụ ya isi nri ime mmụọ dị ụtọ nke a na-ekesa site ná mbipụta ya dị iche iche nakwa ná nzukọ nke ihe karịrị ọgbakọ ndị Kraịst 85,000 gburugburu ụwa. N’ihi ya, n’inwe enyemaka ime mmụọ site n’aka Nna anyị, bụ́ Jehova, na nzukọ ya nke yiri nne, ọbụna “ụmụ mgbei” ga-enweta ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ọmụmụ Bible.

Ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst bụ́ ndị na-eduziri ụmụ ha ọmụmụ Bible ezinụlọ chiri anya kwesịrị ịja mma. Ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ bụ́ ndị na-anọgidesi ike n’ịzụ ụmụ ha na-eto eto n’ụzọ Jehova kwesịrị nlebara anya na otuto pụrụ iche n’ihi mgbalị ha. (Ilu 22:6) Ndị nile na-enwe nchegbu n’ebe ndị bụ́ ụmụ mgbei n’ụzọ ime mmụọ nọ maara na nke a na-eme Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, obi ụtọ. Ilekọta mkpa ime mmụọ ezinụlọ bụ ibu ọrụ dị arọ. Ma ‘ike agwụla gị n’obi, n’ihi na ị ga-enweta ihe ubi mgbe oge ya ruru, ma ị daghị mbà.’—Ndị Galetia 6:9.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A gbanwewo aha ụfọdụ.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ọmụmụ ihe ezinụlọ na-enye ụmụaka ndị nọ n’ezinụlọ ohere ọma iji soro nne na nna ha kerịta nchegbu ha

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 20]

Harper’s

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya