Ilekọta Ndị Agadi Ihe Ịma Aka Na Nkwụghachi Ụgwọ
SHINETSU, bụ́ onye Kraịst nke na-eje ozi, nọ na-enwe obi ụtọ dị ukwuu n’ọrụ e kenyere ya. Ezinụlọ ya nke dị mmadụ atọ gụnyere nne nwunye ya. Ha ji obi ụtọ na-arụ ọrụ n’otu obere ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova, na-akụziri ndị mmadụ Bible, ruo otu ụbọchị a gwara ya ka ọ tụlee ịkpọrọ nwunye ya na-ejegharị ileta ọgbakọ ndị ọzọ. Ọ ga-achọ n’aka ya ịdị na-agbanwe ebe obibi kwa izu. O nwere obi ụtọ n’olileanya dị otú ahụ, ma ònye ga-elekọta Nne?
Ọtụtụ ezinụlọ ga-emesị chee ihe ịma aka yiri nke ahụ ihu—ụzọ kasị mma isi lekọta ndị nne na nna na-eme agadi. Dị ka ọ na-adịkarị, a dịghị echere okwu ahụ oké echiche mgbe ndị nne na nna nwere ezi ahụ ike ma na-arụ ọrụ. Otú ọ dị, ụmụ obere ihe pụrụ ikpughe na ha na-eme agadi, dị ka aka ịma jijiji ka ha na-agbalị ịdụchi ihe ma ọ bụ ichezọ ihe ka ha na-agba mbọ icheta mgbe ha hụdebere ihe a na-achọ achọ. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe ọ na-abụ ihe mberede ma ọ bụ ọrịa na-eme ka mmadụ mata ihe ndị bụ mkpa ha. A ghaghị ime ihe.
Ná mba ụfọdụ ndị nne na nna ahụ ka sitụrụ ike na-ahọrọ isoro ndị ha na-alụ biri nanị ha n’oge agadi ha kama isoro ụmụ ha biri. Ná mba ndị ọzọ, dị ka n’ọtụtụ mba Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa nakwa Africa, ọ bụ ọdịnala ha ndị agadi isoro ụmụ ha biri, karịsịa nwa ha nwoke nke mbụ. Nke a bụ eziokwu karịsịa ma ọ bụrụ na otu n’ime ndị nne na nna ahụ bụ onye na-adịghị enwe ike ibili n’elu àkwà. Dị ka ihe atụ, na Japan, n’ime ndị dị 65 afọ ma ọ bụ karịa ma bụrụ ndị na-adịghị enwe ike ibili n’elu àkwà, ihe dị ka 240,000 bụ ndị ezinụlọ ha nọ n’ụlọ na-elekọta.
Ibu Ọrụ Omume Ọma na nke Akwụkwọ Nsọ
Ọ bụ ezie na anyị na-ebi n’ime ọgbọ nke ọtụtụ ghọworo “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya,” “ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ,” o doro anya na anyị nwere ibu ọrụ omume ọma na nke Akwụkwọ Nsọ n’ebe ndị agadi nọ. (2 Timoti 3:1-5) Tomiko, bụ́ onye na-elekọta nne ya meworo agadi, nke na-arịa ọrịa aka ịma jijiji, kwupụtara mmetụta ibu ọrụ nke omume ọma o nwere mgbe o kwuru banyere nne ya, sị: “O lekọtara m ruo 20 afọ. Ugbu a achọrọ m imere ya otu ihe ahụ.” Eze Solomọn maara ihe dụrụ ọdụ, sị: “Gee nna gị, bụ́ onye mụrụ gị, ntị, eledakwala nne gị anya mgbe o mere agadi.”—Ilu 23:22.
Ma ịkpọasị okpukpe ma ibu iro n’akụkụ nke ndị nne na nna na-ekweghị ekwe adịghị nke mebiri ntụziaka Akwụkwọ Nsọ ahụ. E ji ike mmụọ nsọ mee ka onye Kraịst ahụ bụ́ Pọl onyeozi dee, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ebughị ụzọ cheere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha, ma nke kachasị ndị ezinụlọ nke aka ya, ọ gọnarịwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” (1 Timoti 5:8) Jisọs setịpụụrụ anyị ihe nlereanya mgbe, dị ka otu n’ime ihe ndị o mere tupu ọ nwụọ, o mere ndokwa ka e lekọta nne ya.—Jọn 19:26, 27.
Ileba Anya n’Ihe Isi Ike Ndị A Na-ezute
Ọ dị mkpa mmadụ nile ime mgbanwe mgbe ezinụlọ bikọtara ọnụ ọzọ mgbe ha bisasịrị ebisasị ruo ọtụtụ afọ. Mgbanwe ndị a chọrọ oké ịhụnanya, ndidi, na inwerịta nghọta. Ọ bụrụ na diọkpara, ma ọ bụ nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwanyị ọzọ, akpọrọ ezinụlọ ya gaa n’ụlọ nne na nna ya, a na-enwe ọnọdụ ọhụrụ kpam kpam. A pụrụ inwe ọrụ ọhụrụ, ụlọ akwụkwọ ọhụrụ maka ụmụaka, na agbata obi ọhụrụ nke ga-amara mmadụ ahụ. Ọtụtụ mgbe ọ ga-apụta ibu ọrụ mụbara amụba nye onye bụ nwunye.
Ọ ga-esikwara ndị nne na nna ahụ ike ime mgbanwe. Ọ pụrụ ịbụ na ọ marawo ha ahụ inwe ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ihe dịịrị onwe onye, ịdị jụụ, na nnwere onwe; ugbu a ha ga na-anụ mkpọtụ nke ụmụ ụmụ na-eme aghara na ndị enyi ha. Ọ marawo ha ahụ imere onwe ha mkpebi nke aka ha, mgbalị ọ bụla e mere inye ha ntụziaka pụrụ iwute ha. Ọtụtụ ndị nne na nna, n’ibu ụzọ hụ ụbọchị ezinụlọ nke ụmụ ha ga-abịa ibinyere ha, arụwo ụlọ ndị dịpụrụ adịpụ n’ebe dị nso ma ọ bụ gbakwụnye ọnụ ụlọ ndị ọzọ n’ebe obibi nke ha, na-arụnye paseji ndị jikọtara ha, nke mere ka e nwee ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nnwere onwe maka mmadụ nile.
N’ebe e nwere ntakịrị ebe obibi, ọ pụrụ ịdị mkpa ime mgbanwe dị ukwuu karị iji nwee ohere maka ndị ọhụrụ ahụ na-abatanụ. Otu onye bụ nne chịrị ọchị mgbe o chetara otú o si wute ụmụ ya nwanyị anọ mgbe ngwá ụlọ na ihe ndị ọzọ nọgidere na-abata n’ime ụlọ ihi ụra ha iji nwee ohere maka nne ha ochie dị 80 afọ. Ma, ihe ka ọtụtụ ná nsogbu ahụ na-abụkarị ndị e doziri ka mmadụ nile ghọtara mkpa ọ dị ime mgbanwe ma cheta ndụmọdụ Bible nke bụ na ịhụnanya ‘adịghị achọ ihe nke aka ya.’—1 Ndị Kọrint 13:5.
Ntụfu nke Nnwere Onwe
Oké nsogbu pụrụ ibilitere onye Kraịst bụ nwanyị ma ọ bụrụ na di ya anọghị n’okpukpe ya ma kpebie ịkpọrọ ezinụlọ ahụ jee binyere ndị mụrụ ya. Ọrụ ndị dị n’ilekọta ezinụlọ pụrụ iyi ka ọ na-eme ka ọ ghara ikwe ya omume ịhazi ibu ọrụ ndị Kraịst ya na ibu ọrụ ya ndị ọzọ. Setsuko sịrị: “Di m chere na ọ dị ize ndụ ịhapụ nanị nne ya na-arịa ọrịa nká n’ụlọ, ọ chọkwara ka m na-anọ n’ụlọ mgbe nile. Ọ bụrụ na m anwaa ije nzukọ, ọ ga-ewe iwe ma mee mkpesa. Na mbụ, n’ihi ọzụzụ e nyere m dị ka onye Japan, mụ onwe m chekwara na ọ dị njọ ịhapụ nanị ya. Ma mgbe ahụ, ka oge na-aga, achọpụtara m na a pụrụ idozi nsogbu ahụ.”
Hisako nwere nsogbu yiri nke ahụ. “Mgbe anyị malitere ibinyere ezinụlọ nke di m,” ka ọ kọrọ, “n’ihi ụjọ nke ihe ndị ikwu ya ga-eche, ọ chọrọ ka m gbanwee okpukpe m ma kwụsị ihe omume m nile nke okpukpe. Iji mee ka ihe ka njọ, n’ụbọchị Sunday ndị ikwu ya bi nso na-abịa eleta anyị, na-eme ka o siere m ike ije nzukọ. Ọzọkwa, ụmụ anyị na-achọ isoro ụmụ nke ụmụnne nna ha gwurie egwu kama ije nzukọ. Apụrụ m ịhụ na ọ na-emetụta ọnọdụ ime mmụọ anyị. Eguzosiri m ike ma kọwaara di m na okpukpe m abụghị ihe a ga-agbanwe dị ka a na-agbanwe uwe kama ọ bụ ihe dị mkpa nye m. Ka oge na-aga, ezinụlọ anyị mere mgbanwe.”
Ụfọdụ edoziwo nsogbu nke inwekwu ohere site n’ịkpọ onye ndozi ụlọ na-arụ ọrụ nwa oge ka ọ bịa nye aka otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ n’izu. Ndị ọzọ enwewo ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ohere maka ozi onwe onye na ihe omume ndị Kraịst site n’ịchọ enyemaka nke ụmụ ha, ndị ikwu bi nso, ọbụna ndị enyi n’ime ọgbakọ. Ndị di enwewokwa ike inye aka n’abalị nakwa ná ngwụsị izu mgbe ha nọ n’ụlọ.—Eklisiastis 4:9.
Ime Ka Ha Na-ekere Òkè
Ime ka ndị agadi na-ekere òkè bụ ihe ịma aka ọzọ a ga-eche ihu. Ụfọdụ ndị agadi na-enwe obi ụtọ ikere òkè n’isi nri na ozi ndị ọzọ a na-eje n’ebe obibi. Ha na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị dị mkpa ma ọ bụrụ na a gwa ha lekọta ụmụ, ha na-enwetakwa afọ ojuju n’ilekọta obere ugbo akwụkwọ nri, idozi okooko osisi, ma ọ bụ ikere òkè n’ọrụ ụfọdụ e ji ezu ike.
Otú ọ dị, ndị ọzọ na-achọ ịdị na-ehi ụra n’akụkụ ka ukwuu n’ime ụbọchị, na-atụkwa anya ka a na-emere ha ihe ha chọrọ. Ma ime ka ha na-ekere òkè ruo ókè o kwere omume yiri ka ọ dị mkpa n’ọdịmma ha, ogologo ndụ ha, na ịdị nkọ nke uche ha. Hideko chọpụtara na ọ bụ ezie na a na-akwagharị nne ya n’oche, ịkpọrọ ya gaa nzukọ bụ nnọọ mkpali nke dị nne ya mkpa. Mmadụ nile nabatara ya n’ụzọ na-ekpo ọkụ, e mekwara ka o tinye ọnụ ná nkwurịta okwu. Mmasị ahụ e gosiri ya mesịrị duga na ya ikwere ka ya na otu nwanyị meworo agadi mụọ Bible. Otu di na nwunye, ndị na-elekọta nne ha nke na-arịa ọrịa na-amị akwara, na-akpọ ya eje nzukọ ndị Kraịst ha. “Ọ dịghị achọ ime ihe ọ bụla ma ọlị,” ka ha kwuru, “ma ọ na-enwe obi ụtọ ná nzukọ dị iche iche. A na-anabata ya n’ụzọ na-ekpo ọkụ, ya mere ọ na-eji ọchịchọ obi ya abịa. Anyị na-eche na ọ bara nnọọ uru nye ya.”
Shinetsu, onye e hotara ná mmalite nke isiokwu a, gwọtara nsogbu ya site n’inwetara nne nwunye ya otu ụlọ dị n’ebe etiti nke ógbè ahụ ebe o jere ozi dị ka onye ozi na-ejegharị ejegharị. Ya na nwunye ya ga-esi otú a na-anọnyere ya n’agbata oge ndị ọ na-eleta ọgbakọ dị iche iche kwa izu. Nwunye ya, bụ́ Kyoko, sịrị: “Nne m na-enwe mmetụta nke ịbụ akụkụ dị mkpa n’ọrụ anyị, na-enwekwa mmetụta nke ịbụ onye dị mkpa. Ọ na-enwe obi ụtọ mgbe di m gwara ya ka o sie nri pụrụ iche.”
Ime Ihe Banyere Ọrịa Nká
Ka ndị nne na nna na-eme agadi, ọ̀tụ̀tụ̀ dị iche iche nke ọrịa nká pụrụ ibilite, ya mere ha chọrọ ka a na-enwekwu mmasị n’ebe ha nọ. Ha na-echezọ ụbọchị, oge, na nkwa ndị ha kwere. Ha pụrụ ichezọ ịkpụ isi ha na ịsa uwe ha. Ha pụrụ ọbụna ichezọ ụzọ e si eyi uwe ma na-asa ahụ. Ọtụtụ aghọwo ndị uche ha gbasasịrị, ebe ndị ọzọ na-enwe ihe isi ike ihi ụra n’oge abalị. Ha na-ekwughachikarị ihe ha kwuburu ma na-ewe iwe ma ọ bụrụ na e mee ka ha mara banyere ya. Uche ha na-aghọgbu ha. Ha pụrụ ịnọ na-ekwusi ike na e zuwo ha ohi ma ọ bụ na ndị abalị dị egwu na-agbalị ịwakpo ụlọ ha. Otu ezinụlọ nke mụrụ ụmụ nwanyị anọ nagidere ọtụtụ ebubo na-emeghị eme nke inwe mmekọahụ na-ezighị ezi. “Ọ na-agbakasị ahụ,” ka ha kwuru, “ma anyị mụtara nnọọ ịnagide ebubo ndị ahụ ma gbalịa ịgbanwe isiokwu ahụ. Ịrụ Mama Nnukwu ụka bụ igbu oge.”—Ilu 17:27.
Mkpa Mmetụta Uche Ndị A Ga-emeju
Ime agadi na-ewetara ndị agadi ọtụtụ ọnwụnwa. E nwere ọrịa ndị dị oké njọ, enweghị ike ịga ije, na ihe mgbu nke uche ndị a ga-anagide. Ọtụtụ na-eche na ndụ ha enweghị nduzi ma ọ bụ nzube. Ha pụrụ iche na ha bụ ibu ọrụ ma kwupụta ọchịchọ nke ịnwụ. Ọ dị ha mkpa ka ha nwee mmetụta nke ịbụ ndị a hụrụ n’anya, ndị a na-akwanyere ùgwù, na ndị a na-agụnye n’ihe a na-eme. (Levitikọs 19:32) Hisako sịrị: “Anyị na-agbalịkarị ime ka Nne di m na-ekere òkè ná nkwurịta okwu anyị mgbe ọ nọ ya, na-eme ka ọ bụrụ isiokwu nkwurịta okwu anyị n’ebe o kwere omume.” Ezinụlọ ọzọ gbara mbọ ibuli ùgwù onwe onye nke nna ha ochie site n’ịgwa ya ka o duzie ntụle kwa ụbọchị nke ihe mmụta Bible.
Mmadụ aghaghị ịgbalị mgbe mgbe inwe echiche ziri ezi banyere ndị agadi. Ndị ọrịa na-adịghị enwe ike ibili n’elu àkwà na-ewe iwe mgbe ha chere na a na-agwa ha okwu mweda n’ala ma ọ bụ na-emeso ha omume n’enweghị nkwanye ùgwù. “Mama dị nkọ,” ka Kimiko kọwara, bụ́ onye ya na nne di ya nwere ọrụsị biri, “ọ makwaara mgbe obi m na-adịghị n’ilekọta ya ma ọ bụ mgbe m na-ewetu ya ala.” Hideko mekwara mgbanwe n’àgwà ya. “Na mbụ, enwere m nkụda mmụọ mgbe m malitere ilekọta nne di m. Abụbu m onye ọsụ ụzọ [onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova], ịhapụkwa ozi ahụ wutere m. Mgbe ahụ ahụrụ m na ọ dị m mkpa ime mgbanwe n’echiche m. Ọ bụ ezie na ije ozi ụlọ n’ụlọ dị mkpa, nke a bụkwa akụkụ dị mkpa nke ịṅa ntị n’iwu Chineke. (1 Timoti 5:8) Achọpụtara m na ọ dị m mkpa ịzụlitekwu ịhụnanya na ọmịiko ma ọ bụrụ na m gaje inwe ọṅụ. Akọ na uche m ga-enye m nsogbu mgbe m mere ihe iji mezuo iwu n’ihi echiche nke inwe ibu ọrụ. Mgbe m nwere ihe ọghọm ma nọrọ n’ihe mgbu, echere m echiche banyere nne di m nakwa ihe mgbu o nwere. Mgbe nke ahụ gasịrị ọ dịịrị m mfe igosipụta ikpo ọkụ na ọmịiko karị.”
Ndị Nlekọta Chọkwara Nlekọta
Ihe a na-agaghị elefuru anya bụ mkpa ọ dị ikwupụta obi ekele nye onye ibu ọrụ nke ilekọta ndị agadi dakwasịrị n’isi ya karịsịa. (Tụlee Ilu 31:28.) Ihe ka ọtụtụ ná ndị inyom nọgidere na-ebu ibu ọrụ ha ma hà nụrụ okwu ekele ma ọ bụ na hà anụghị. Otú ọ dị, mgbe anyị tụlere ihe ọrụ ha gụnyere, nkwupụta dị otú ahụ kwesịrị ekwesị n’ezie. O doro anya na ha ga-enwekwu ihe ndị ha ga-ehicha, sachaa, ma sie. Tụleekwa ịga n’ụlọ ọgwụ ma ọ bụ na nke dọkịta, tinyekwara inye onye ọrịa meworo agadi nri ma ọ bụ ịsa ya ahụ. Otu nwanyị, bụ́ onye lekọtara nne di ya ruo ogologo oge, sịrị: “Amaara m na o siiri di m ike iji ọnụ ya kelee m, ma ọ na-egosipụta n’ụzọ ndị ọzọ na o nwere ekele n’ihe ndị m na-eme.” Okwu ekele nkịtị pụrụ ime ka o yie ihe kwesịrị mgbalị a na-eme.—Ilu 25:11.
E Nwekwara Nkwụghachi Ụgwọ
Ọtụtụ ezinụlọ ndị lekọtaworo ndị nne na nna meworo agadi ruo ọtụtụ afọ na-ekwu na nke a enyeworo ha aka ịzụlite àgwà ndị Kraịst dị mkpa: ntachi obi, iji onwe onye achụ àjà, ịhụnanya na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya, ịdị uchu, ịdị umeala, na ịdị nro. Ọtụtụ ezinụlọ adịwo n’otu karị n’ụzọ mmetụta uche. Uru ọzọ nke ahụ bara bụ ohere nke isoro ndị nne na nna na-ekwurịta okwu ma mara ha nke ọma. Hisako kwuru banyere nne di ya, sị: “O biri ndụ na-akpali mmasị. O nwere ahụmahụ nke ọtụtụ ihe isi ike. Amatawo m ya nke ọma karị, amụtawokwa m ịghọta àgwà ndị o nwere bụ́ ndị m na-achọpụtaghị na mbụ.”
“E nwere oge tupu m mụọ Bible mgbe m chọrọ ịgba alụkwaghịm ma gbahapụ ọnọdụ ahụ,” ka Kimiko kọwara, bụ́ onye lekọtara nne na nna di ya nakwa nne ochie di ya nke na-adịghị enwe ike ibili n’àkwà. “Mgbe ahụ agụrụ m na anyị kwesịrị ‘ileta . . . ndị inyom di ha nwụrụ n’ime mkpagbu ha.’ (Jemes 1:27) Obi dị m ụtọ na m mere ike m nile, ebe ọ na-adịghị onye ọ bụla n’ime ezinụlọ ahụ nke pụrụ ime mkpesa ziri ezi banyere nkwenkwe m. Akọ na uche m dị ọcha.” Onye ọzọ sịrị: “Ejiwo m anya m abụọ hụ ajọ mmetụta nke mmehie Adam, ugbu a ana m aghọtakwa ọbụna karị mkpa nke àjà mgbapụta ahụ dị.”
N’oge na-adịghị anya, ị̀ gaje ịkpọbata onye ọzọ so n’ezinụlọ gị n’ime ezinụlọ nke gị? Ma ọ bụ ma eleghị ị̀ gaje ije binyere nne na nna gị meworo agadi? Ọ̀ na-enye gị nsogbu n’obi? Nke ahụ kwere nghọta. A ga-enwe mgbanwe ndị a ga-eme. Ma ị ga-ahụ na ị ga-enweta nkwụghachi ụgwọ bara ụba maka inwe ihe ịga nke ọma n’imeri ihe ịma aka ahụ.
[Foto dị na peeji nke 24]
Ndị agadi chọrọ ịbụ ndị a hụrụ n’anya na ndị a na-akwanyere ùgwù