Nụrụ Ụtọ “Ndụ Ahụ nke Bụ́ Ndụ n’Ezie”
JEHOVA CHINEKE enyewo mmadụ echiche nke mgbe ebighị ebi. (Eklisiastis 3:11) Nke a na-eme ka ụmụ mmadụ na-enwe mmetụta nke enweghị ihe ha ga-eme ma ọnwụ bịa ma, n’otu mgbe ahụ, na-akpali n’ime ha ọchịchọ siri ike nke ịdị ndụ.
Bible Nsọ, bụ́ Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ, na-enye anyị nnukwu olileanya. (2 Timoti 3:16) Jehova, onye bụ́ ịhụnanya n’onwe ya, apụghị imewo mmadụ inwe ikike inwe echiche nke mgbe ebighị ebi ma mazie ya ikpe ịdị ndụ ruo nanị afọ ole na ole. Chineke ike anyị ịhụsi anya n’ihi ihe dabaara anyị bụ nnọọ ihe megidere àgwà ya. E keghị anyị dị ka “anụ na-enweghị uche, ndị bụ́ anụ efu site n’ọmụmụ ha ịnwụde na imebi.”—2 Pita 2:12.
N’ikenye Adam na Iv echiche mgbe ebighị ebi n’ime, Jehova Chineke mere ihe “dị mma nke ukwuu”; o mere ha inwe ikike nke ịdị ndụ ebighị ebi. (Jenesis 1:31) Ma n’ụzọ dị mwute, di na nwunye mbụ ahụ ji nnwere onwe ime nhọrọ ha mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, na-enupụ isi ná mmachibido iwu doro anya nke sitere n’aka Onye Okike ma na-atụfu izu okè mbụ ha. N’ihi ya, ha nwụrụ, ka ha bufesịịrị ụmụ ha ezughị okè na ọnwụ.—Jenesis 2:17; 3:1-24; Ndị Rom 5:12.
Bible na-ewepụ ihe mgbagwoju anya nile banyere nzube nke ndụ na ihe ọnwụ pụtara. Ọ na-ekwu na “ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe” adịghị n’ọnwụ nakwa na ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5, 10) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ndị nwụrụ anwụ anwụọla. Ozizi mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ esiteghị na Bible, ya mere ọ dịghị oké ihe omimi dịnụ a ga-ekpughe banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ.—Jenesis 3:19; Abụ Ọma 146:4; Eklisiastis 3:19, 20; Ezikiel 18:4.a
Chineke nwere nzube; o keghị ụwa ịbụ “ihe tọgbọrọ n’efu.” Ọ kpụrụ ya ‘ka ụmụ mmadụ zuru okè wee biri n’ime ya’ n’ọnọdụ bụ́ nke paradaịs, Chineke agbanwebeghịkwa nzube ya. (Aịsaịa 45:18; Malakaị 3:6) Iji mezuo ya, o zitere Ọkpara ya n’ụwa. Site n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, Jisọs Kraịst nyere ihe a ga-eji gbapụta ihe a kpọrọ mmadụ pụọ ná mmehie na ọnwụ. N’ezie, Jisọs kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.
Ogologo oge gara aga, Chineke kwere nkwa na ya ga-eke “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” (Aịsaịa 65:17; 2 Pita 3:13) Nke ahụ ga-agụnye ya ịhọrọ ìgwè nta nke ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi maka ịdị ndụ n’eluigwe. Ha na Jisọs Kraịst mejupụtara isi ọchịchị. Bible na-ezo aka n’ebe nke a dị dị ka “alaeze eluigwe,” ma ọ bụ “alaeze Chineke,” bụ́ nke ga-elekọta “ihe nile dị n’elu ụwa.” (Matiu 4:17; 12:28; Ndị Efesọs 1:10; Mkpughe 5:9, 10; 14:1, 3) Mgbe Chineke bibisịrị ndị nile na-adịghị erubere iwu ya isi n’ụwa anyị ma mee ka ọ dị ọcha, ọ ga-ewebata ọha mmadụ ọhụrụ bụ́ ndị ezi omume, ma ọ bụ “ụwa ọhụrụ.” Nke a ga-agụnye ndị Chineke ga-echebe gabiga mbibi dị nso nke ajọ usoro ihe a. (Matiu 24:3, 7-14, 21; Mkpughe 7:9, 13, 14) Ndị e weghachitere ná ndụ site ná mbilite n’ọnwụ ahụ e kwere ná nkwa, ga-esonyere ha.—Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15.
“Ndụ ahụ nke Bụ́ Ndụ n’Ezie” n’Oge Ahụ
N’imesi nkọwa na-akpali akpali nke ndụ n’ụwa Paradaịs na-abịanụ ike, Chineke na-ekwu, sị: “Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ.” (Mkpughe 21:5) Ọ gaghị ekwe uche mmadụ omume ịghọtazu ọrụ ndị dị ebube nke Chineke ga-arụrụ ihe a kpọrọ mmadụ. Chineke ga-eke paradaịs zuru ụwa ọnụ, nke e mere ka o yie Iden. (Luk 23:43) Dị ka ọ dị n’Iden, ịma mma na ịdị mma nke àgwà, ụda, na nke ụtọ ga-aba ụba. Ịda ogbenye na ụnwụ nri agaghị adịkwa ọzọ, n’ihi na Bible na-ekwu banyere oge ahụ, sị: “Ihe mbụ nile agabigawo.” (Mkpughe 21:4; Abụ Ọma 72:16) Ọ dịghị onye ọ bụla ga-asị ọzọ, “Ana m arịa ọrịa,” n’ihi na a ga-ewepụ nrịanrịa ruo mgbe ebighị ebi. (Aịsaịa 33:24) Ee, ihe nile na-akpata ihe mgbu ga-apụ n’anya, gụnyere onye iro nọworo ogologo oge nke ihe a kpọrọ mmadụ, bụ́ ọnwụ. (1 Ndị Kọrint 15:26) N’ọhụụ dị ịtụnanya nke “ụwa ọhụrụ,” bụ́ ọha mmadụ ọhụrụ n’okpuru ịchịisi Kraịst, Jọn onyeozi nụrụ olu na-asị: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.” Olee ihe pụrụ iweta nkasi obi na ọṅụ dị ukwuu karịa mmezu nke nkwa a nke Chineke?
N’ịkọwa ndụ nke dị n’ihu, Bible na-ekwusi okwu ike karịsịa banyere ọnọdụ ndị ga-emeju ọchịchọ mmadụ n’ụzọ omume na n’ụzọ ime mmụọ. A ga-eru n’ụzọ zuru ezu ezi ihe mgbaru ọsọ nile nke ihe a kpọrọ mmadụ nọworo na-adọga iru n’enweghị ihe ịga nke ọma ruo ugbu a. (Matiu 6:10) Otu n’ime ha bụ ọchịchọ maka ikpe ziri ezi, bụ́ nke a na-erubeghị n’ihi na mmadụ abụrụwo onye ndị mmegbu obi tara mmiri bụ́ ndị nọworo na-achị ndị na-adịghị ike, mekpọworo ọnụ mgbe mgbe. (Eklisiastis 8:9) Ọbụ abụ ahụ dere n’ụzọ amụma banyere ọnọdụ ndị ga-adị n’okpuru ịchịisi Kraịst, sị: “N’oge ya izi ezi ga-ejupụta ebe nile, udo ga-abakwa ụba.”—Abụ Ọma 72:7, The New Jerusalem Bible.
Ịha nhata bụ ọchịchọ ọzọ nke ọtụtụ ndị chụworo àjà dị iche iche maka ya. Ná “nkegharị” ahụ, Chineke ga-ekpochapụ ịkpa ókè. (Matiu 19:28, NW) Mmadụ nile ga-enwe ùgwù hà nhata. Nke a agaghị abụ ịha nhata nke ọchịchị aka ike ga-amanye ndị mmadụ inwe. N’ụzọ dị iche, a ga-ewepụ ihe ndị na-akpata ịkpa ókè, gụnyere anyaukwu na nganga nke na-eduga ndị mmadụ ịchọ ịchịkwa ndị ọzọ ma ọ bụ ịkwakọba ngwongwo hiri nne. Aịsaịa buru amụma, sị: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vine, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie.”—Aịsaịa 65:21, 22.
Lee ka mmadụ siworo hụsie anya n’ihi mwụfu ọbara ma n’ọgụ otu onye na ibe ya ma na nke a gbakọtara aka lụọ! Nke a adịgidewo site n’ogbugbu Ebel ruo n’agha nke oge a. Lee ogologo oge ụmụ mmadụ nọworo na-enwe olileanya ma na-echere, n’ụzọ yiri ka o nweghị isi, ka e guzobe udo! Na Paradaịs ahụ e weghachiri, mmadụ nile ga-abụ ndị na-eme udo na ndị dị nwayọọ; “ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Abụ Ọma 37:11.
Aịsaịa 11:9 na-asị: “Ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” N’ihi ezughị okè e ketara eketa, tinyere ihe ndị ọzọ, o kweghị anyị omume ịghọtacha ihe okwu ndị ahụ pụtara. Otú ihe ọmụma zuru okè nke Chineke ga-esi mee ka anyị na ya dị n’otu na otú nke ahụ ga-esi weta ọṅụ zuru ezu bụ ihe anyị ka ga-amata. Ma ebe Akwụkwọ Nsọ na-eme ka anyị mara na Jehova bụ Chineke dị ebube n’ike, amamihe, ikpe ziri ezi, na n’ịhụnanya, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-anụ ekpere nile nke ndị ga-ebi n’ime “ụwa ọhụrụ” ahụ ga-ekpe.
“Ndụ ahụ nke Bụ́ Ndụ n’Ezie” Bụ Ihe E Ji n’Aka—Jigide Ya!
Nye ọtụtụ ndị, ndụ ebighị ebi n’ụwa ka mma bụ nanị nrọ ma ọ bụ echiche ụgha. Otú ọ dị, nye ndị nwere okwukwe n’ezie ná nkwa Bible, olileanya a bụ ihe e ji n’aka. Ọ dị ka arịlịka nye ndụ ha. (Ndị Hibru 6:19) Dị nnọọ ka arịlịka na-ejigide ụgbọ mmiri n’otu ebe ma na-egbochi ya ịṅagharị aṅagharị, olileanya nke ndụ ebighị ebi na-eme ka ndị mmadụ kwụrụ chịm ma nwee obi ike, na-emekwa ka ha nwee ike iche nsogbu ndị tara akpụ ná ndụ ihu, ọbụnakwa merie ha.
Anyị pụrụ ijide n’aka na Chineke ga-emezu nkwa ya nile. O nyela ọbụna ihe mmesi obi ike site n’ịṅụ iyi, bụ́ nkwa a na-apụghị ịkagbu akagbu. Pọl onyeozi dere, sị: “Chineke, ebe Ọ na-ezube igosibiga ndị nketa nke nkwa Ya ókè karị na ìzù Ya bụ ihe na-adịghị agha agha, O weere ịṅụ iyi gboo okwu: ka anyị wee were ihe abụọ na-adịghị agha agha, nke Chineke na-apụghị ikwu okwu ụgha n’ime ha, nwee nkasi obi siri ike . . . ijidesi olileanya ahụ ike, bụ́ nke e debere n’ihu anyị.” (Ndị Hibru 6:17, 18) “Ihe abụọ na-adịghị agha agha” nke Chineke na-apụghị ịkagbu ma ọlị bụ nkwa ya na iyi ọ ṅụrụ, bụ́ ndị atụmanya anyị dabeere na ha.
Okwukwe ná nkwa Chineke na-enye nkasi obi na ume ime mmụọ dị ukwuu. Joshua, bụ́ onye ndú ndị Israel, nwere okwukwe dị otú ahụ. Mgbe Joshua gwara ụmụ Israel okwu nọrọ nke ọma ya, o meela agadi, ọ makwaara na ya agawala ịnwụ. Ma, o gosipụtara ume na iguzosi ike n’ihe a na-apụghị imebi emebi, bụ́ nke sitere n’inwe ntụkwasị obi zuru ezu ná nkwa Chineke. Mgbe o kwusịrị na ya na-eje “n’ụzọ ụwa nile,” bụ́ ụzọ nke na-eduga ihe nile a kpọrọ mmadụ n’ọnwụ, Joshua kwuru, sị: “Unu amawo n’obi unu nile na n’ime mkpụrụ obi unu nile, na ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu; ha nile emeworo unu, ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ime ya.” Ee, Joshua kwughachiri ugboro atọ na Chineke na-emezu nkwa ya nile mgbe dum.—Joshua 23:14.
Gị onwe gị kwa pụrụ inwe okwukwe dị otú ahụ ná nkwa Chineke banyere ụwa ọhụrụ nke a ga-eguzobe n’oge na-adịghị anya. Site n’ịmụsi Bible ike, ị ga-aghọta onye Jehova bụ na ihe mere o ji kwesị ka ị tụkwasị ya obi n’ụzọ zuru ezu. (Mkpughe 4:11) Abraham, Sera, Aịsak, Jekọb, na ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie nwere okwukwe a na-apụghị imebi emebi, nke dabeere n’ezi ihe ọmụma ha nwere banyere ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova. Ha nọgidere na-adị ike n’olileanya, n’agbanyeghị eziokwu ahụ bụ́ na ha “anataghị nkwa ahụ” mgbe ha nọ ndụ. Ma, “ha hụrụ ha rịị, sikwa n’ebe dị anya kelee ha.”—Ndị Hibru 11:13.
N’ịghọta amụma Bible, anyị na-ahụzi ọbịbịa nke “oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile,” bụ́ nke a ga-anọ na ya kpochapụ ihe ọjọọ nile n’ụwa. (Mkpughe 16:14, 16) Dị ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie, anyị aghaghị iji obi ike nọgide na-atụ anya ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu, n’ịbụ ndị okwukwe na ịhụnanya n’ebe Chineke nọ nakwa mmasị ná “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie” na-akwali. Ịdị nso nke ụwa ọhụrụ ahụ na-enye ndị nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ na ndị hụrụ ya n’anya ihe nkwali siri ike. Ọ dị mkpa ịzụlite okwukwe na ịhụnanya dị otú ahụ iji nweta ihu ọma na nchebe Chineke n’oké ụbọchị ya, nke dị nso.—Zefanaịa 2:3; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:3; Ndị Hibru 10:37-39.
Ya mere, ndụ ọ̀ dị gị ụtọ? Ì nwekwara ọchịchọ ọbụna karị maka “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie”—ndụ dị ka ohu Chineke a nwapụtara, na-enwe atụmanya maka ọdịnihu obi ụtọ, ee, na-eburu ndụ ebighị ebi n’uche? Ọ bụrụ na nke ahụ bụ ihe ị na-achọ, ṅaa ntị n’agbamume Pọl onyeozi, bụ́ onye dere na anyị ekwesịghị ‘ịtụkwasị obi n’ihe ahụ a na-ejighị aka, bụ́ akụ̀, kama ka anyị tụkwasị obi na Chineke.’ Pọl gara n’ihu, sị: “Bụrụ ọgaranya n’ọrụ ọma nile,” bụ́ nke na-asọpụrụ Chineke, iji “jide ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.”—1 Timoti 6:17-19.
Site n’ịnakwere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, ị pụrụ inweta ihe ọmụma nke “bụ ndụ ebighị ebi.” (Jọn 17:3) N’ụzọ ịhụnanya, Bible nwere ihe ndekọ nke òkù a dị ka nke nna bụ́ nke a kpọrọ mmadụ nile, sị: “Nwa m, echezọla iwu m; ma ka obi gị chebe ihe nile m nyere n’iwu: n’ihi na ụbọchị ndụ nke dị ogologo, na ọtụtụ afọ nke ndụ, na udo, ka ha ga-atụkwasịrị gị.”—Ilu 3:1, 2.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Iji tụlekwuo isiokwu ahụ n’ụzọ zuru ezu, lee broshuọ bụ́ Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, bipụtara.