Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 5/15 p. 21-23
  • Iji Nkà Ime Ka Mmadụ Kwenye Na-eru n’Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iji Nkà Ime Ka Mmadụ Kwenye Na-eru n’Obi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iji Ime Ka Mmadụ Kwenye Eme Ihe n’Ozi
  • Ime Ihe Banyere Mmetụta Uche
  • Ụzọ Isi Mee Ka Ndị Ọzọ Kwenye
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Na-elezi “Nkà Izi Ihe” Gị Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Nyere Onye Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka Ka O Mee Baptizim
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Otú E Si Eduziri Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl Ga-eme Ka O Ruo Eru Ime Baptizim—Agba nke Abụọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 5/15 p. 21-23

Iji Nkà Ime Ka Mmadụ Kwenye Na-eru n’Obi

ỌTỤTỤ ndị mmadụ na-enyo okwu ahụ bụ́ ‘ime ka mmadụ kwenye’ enyo. Ọ pụrụ iweta n’uche mmadụ onye na-ere ahịa nke na-enunye mmadụ ime ihe ma ọ bụ mkpọsa e zubere iji ghọgbuo ma ọ bụ megharịa onye na-azụ ihe anya. Ọbụna na Bible, mgbe ụfọdụ echiche nke ime ka mmadụ kwenye na-enye nghọta na-adịghị mma, na-egosi mmerụ ma ọ bụ ndufu. Dị ka ihe atụ, onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi degaara ndị Galetia, sị: “Unu na-agbarịị ọsọ nke ọma; ònye gbochiri unu, ka unu ghara ikwenyere eziokwu ahụ? Nkwenye ahụ e mere ka unu kwenye esiteghị n’Onye ahụ Nke na-akpọ unu.” (Ndị Galetia 5:7, 8) Pọl dọkwara ndị Kọlọsi aka ná ntị megide ikwe ka onye ọ bụla ‘were ire ụtọ rafuo ha.’ (Ndị Kọlọsi 2:4) Ime ka mmadụ kwenye dị otú ahụ na-adabere n’arụmụka dị nkọ nke e wukwasịrị na ntọala ụgha.

Otú ọ dị, n’akwụkwọ ozi nke abụọ ya nye Timoti, Pọl onyeozi jiri echiche nke ime ka mmadụ kwenye mee ihe n’ụzọ dị iche. O dere, sị: “Nọgide n’ime ihe nile ị mụtara, nke e mekwara ka i kwere ha, ebe ị matara mmadụ ndị ị mụtara ha n’ọnụ ha.” (2 Timoti 3:14) N’ịbụ onye ‘e mere ka o kwere,’ Timoti abụghị onye nne na nne nne ya, bụ́ ndị o sitere n’aka ha mụta eziokwu Akwụkwọ Nsọ, na-emegharị anya.—2 Timoti 1:5.a

Mgbe e ji ya eji n’ụlọ ya na Rom, Pọl gbaara ọtụtụ àmà n’ụzọ siri ike, “na-emekwa ka ha kwenye n’ihe banyere Jisọs, site n’iwu Mosis, sitekwa ná ndị amụma, si n’ụtụtụ ruo anyasị.” (Ọrụ 28:23) Pọl ọ̀ nọ na-eduhie ndị na-ege ya ntị? Ọ dịghị ma ọlị! Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, ime ka mmadụ kwenye anaghị adị njọ mgbe nile.

E jiri ya mee ihe n’ụzọ ziri ezi, okwu Grik bụ́ isi a sụgharịrị ịbụ “mee ka e kwenye” pụtara ime ka e kweta, ịkpata mgbanwe obi site ná ntụgharị uche dị mma, nke ezi izu dị na ya. Onye nkụzi pụrụ isi otú a dabere n’ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ e nwere zie ihe, na-eji ime ka mmadụ kwenye ihe na-akụnye n’ime ndị ọzọ nkweta nke eziokwu Bible. (2 Timoti 2:15) N’ezie, nke a bụ ihe e ji mara ozi Pọl. Ọbụna Dimitriọs bụ́ ọkpụ ụzụ, onye weere ozizi ndị Kraịst dị ka ụgha, kwuru, sị: “Ọ bụghị nanị n’Efesọs, kama ọ fọdụrụ ihe nta ka ọ bụrụ n’Esia nile, ka Pọl nke a [mere ka oké ìgwè mmadụ kwenye ma mee ka ha nwee echiche ọzọ, NW] ebe ọ na-asị na ihe e ji aka mee abụghị chi.”—Ọrụ 19:26.

Iji Ime Ka Mmadụ Kwenye Eme Ihe n’Ozi

Jisọs Kraịst tụziiri ụmụazụ ya, sị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu: ma lee, Mụ onwe m nọnyeere unu ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.” (Matiu 28:19, 20) N’ihe karịrị ala 230, Ndịàmà Jehova na-erube isi n’iwu a. Kwa ọnwa n’oge afọ ije ozi 1997 ha, ha duziri nkezi nke ọmụmụ Bible ebe obibi 4,552,589 n’ụwa nile.

Ọ bụrụ na i nwere ihe ùgwù nke iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi, i nwere ike ịtụ anya ihe ịma aka ndị ga-achọ gị iji nkà ime ka mmadụ kwenye mee ihe. Dị ka ihe atụ, weredị ya na ná nnọkọ ọmụmụ ihe unu ọzọ, ajụjụ ga-ebilite banyere Atọ n’Ime Otu. Gịnị ma ọ bụrụ na ị maara na onye ị na-amụrụ ihe kwere n’ozizi a? Ị pụrụ inye ya mbipụta tụlere isiokwu ahụ. Mgbe ọ gụsịrị ya, ị pụrụ ịhụta na e mewo ka o kwenye na Chineke na Jisọs abụghị otu onye. Ma ọ bụrụ na ajụjụ ndị ọzọ afọdụ, olee otú ị pụrụ isi gaa n’ihu?

Gee ntị nke ọma. Nke a ga-enyere gị aka ikpebi ihe onye ị na-amụrụ ihe kwerewororị banyere otu isiokwu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ ihe asị, “Ekwere m n’Atọ n’Ime Otu,” ị pụrụ ịbanye ná nkwurịta okwu dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ngwa ngwa iji kagbuo ozizi a. Ma e nwere nkwenkwe dị iche iche banyere Atọ n’Ime Otu. Onye ị na-amụrụ ihe pụrụ ikwere ihe dị nnọọ iche n’ihe ị ga-akọwa dị ka ozizi Atọ n’Ime Otu. Nke a pụrụ ịbụ eziokwu banyere nkwenkwe ndị ọzọ, dị ka ịlọ ụwa, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, na nzọpụta. N’ihi ya gee ntị nke ọma tupu i kwuo okwu. Ewerela ya na ị maara ihe onye a na-amụrụ ihe kweere.—Ilu 18:13.

Jụọ ajụjụ. Ndị a pụrụ ịgụnye: ‘Ị̀ nọworị na-ekwere Atọ n’Ime Otu mgbe nile? Ọ̀ dịwo mgbe ị mụrụ ihe Bible na-ekwu n’isiokwu a nke ọma? Ọ bụrụ na Chineke bụ akụkụ nke atọ n’ime otu, ọ̀ bụ na Okwu ya, bụ́ Bible, agaghị agwa anyị otú ahụ n’ụzọ doro anya, n’ụzọ a kapịkwara ọnụ?’ N’ịkụziri onye ahụ a na-amụrụ ihe ihe, kwụsị site n’oge ruo n’oge iji jụọ ajụjụ ndị dị ka ndị a: ‘Ihe ndị anyị tụleworo ka ọ dị ugbu a hà dị gị ka ihe ezi uche dị na ha?’ ‘Ì kweere ná nkọwa a?’ Site na gị iji ajụjụ mee ihe n’ụzọ nkà, ị na-eme ka onye ahụ a na-amụrụ ihe na-ekere òkè. Nanị ihe ọ ga na-eme abụghị ige gị ntị ka ị na-akọwa otu isiokwu.

Jiri ezi ntụgharị uche mee ihe. Dị ka ihe atụ, n’ịtụle ozizi Atọ n’Ime Otu, ị pụrụ ịgwa onye ị na-amụrụ ihe, sị: ‘Mgbe e mere Jisọs baptism, otu olu si n’eluigwe daa, na-asị: “Gị onwe gị bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya.” Ọ bụrụ na Chineke nọ n’ụwa n’ezie bụrụ onye a na-eme baptism, ọ̀ ga-eweli olu ya gaa n’eluigwe ma wedata ya ka e wee nwee ike ịnụ okwu ndị ahụ n’ụwa? Nke ahụ ọ̀ gaghị abụ ihe na-eduhie eduhie? Chineke, “Onye na-apụghị ikwu okwu ụgha,” ọ̀ ga-eme ihe aghụghọ dị otú ahụ?’—Luk 3:21, 22; Taịtọs 1:1, 2.

Ezi ntụgharị uche e mere n’ụzọ akọ na-adịkarị nnọọ irè. Tụlee ihe atụ nke otu nwanyị anyị ga-akpọ Barbara. Ná ndụ ya nile, o kwenyewo na Jisọs bụ Chineke, bụrụkwa otu akụkụ nke Atọ n’Ime Otu nke gụnyere mmụọ nsọ. Ma mgbe ahụ otu n’ime Ndịàmà Jehova gwara ya na Chineke na Jisọs bụ ndị dịgasị iche, o gosikwara ya akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche iji kwadoo ihe o kwuru.b Barbara apụghị ịgbagha Bible. N’otu oge ahụ, o nwere nkụda mmụọ. E kwuwerị, o ji ozizi Atọ n’Ime Otu kpọrọ ihe nke ukwuu.

Onyeàmà ahụ ji ndidi soro Barbara tụgharịa uche. “Ọ bụrụ na ị na-achọ ịkụziri m na mmadụ abụọ hà nhata,” ka Onyeàmà ahụ jụrụ, “olee njikọ ezinụlọ ị ga-eji eme ihe atụ ya?” O chere echiche nwa oge wee zaghachizie, sị: “M pụrụ iji ụmụnne abụọ.” “Ị zatara ya,” ka Onyeàmà ahụ zaghachiri. “Ikekwe ọbụna ejima yiri nnọọ onwe ha. Ma n’ịkụziri anyị iwere Chineke dị ka Nna ahụ na ya onwe ya dị ka Ọkpara ahụ, echiche dị aṅaa ka Jisọs na-enye?” “O dowo m anya,” ka Barbara zaghachiri, ka anya ya na-emeghekwu. “Ọ na-akọwa otu dị ka onye tọrọ nke ọzọ ma na-enwe ikike ka ukwuu.”

“Ee,” ka Onyeàmà ahụ zara, “ndị Juu na-egekwa Jisọs ntị, bụ́ ndị bi n’etiti ọha mmadụ nke na-asọpụrụ ndị nna ochie, gaara eru ná nkwubi okwu ahụ karịsịa.” N’imesi ihe ọ na-ekwu ike, Onyeàmà ahụ kwubiri, sị: “Ọ bụrụ na anyị chepụtara ihe atụ ahụ dabara nnọọ adaba iji kụzie ịha nhata—ya bụ nke ụmụnne ma ọ bụ ejima yiri nnọọ onwe ha—n’ezie Jisọs, Onye Ozizi Ukwu ahụ, pụrụ imewokwa otú ahụ. Kama nke ahụ, o jiri okwu bụ́ ‘nna’ na ‘ọkpara’ mee ihe iji kọwaa mmekọrịta dị n’etiti ya na Chineke.”

Barbara mesịrị ghọta isi ihe ahụ, ọ nabatakwara ya. E jiwo nkà ime ka mmadụ kwenye ruo n’obi ya.

Ime Ihe Banyere Mmetụta Uche

Nkwenkwe okpukpe ndị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike na-agụnyekarị mmetụta uche. Tụlee ọnọdụ Edna, bụ́ onye Katọlik ji okpukpe kpọrọ ihe. Ụmụ ụmụ ya ndị nọ n’afọ iri na ụma nyere ya ihe àmà doro anya sitere n’Akwụkwọ Nsọ na Chineke na Jisọs abụghị otu onye ahụ. Edna ghọtara ihe ọ nụrụ. Ka o sina dị, o kwuru n’ụzọ obiọma ma n’ụzọ nkwenyesi ike, sị: “M kweere n’Atọ n’Ime Otu dị nsọ.”

Ikekwe i nwewo ahụmahụ yiri nke ahụ. Ọtụtụ na-ewere ozizi okpukpe ha dị ka a ga-asị na ndị a bụ akụkụ nke ihe e ji amata ha. Iji mee ka ndị dị otú ahụ a na-amụrụ Bible kwenye, a chọrọ ihe karịrị ezi izu na-enweghị mmetụta ma ọ bụ ọbụna ọtụtụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-anwapụta echiche onye ahụ ịbụ ihe hiere ụzọ. A pụrụ ime ihe banyere ọnọdụ ndị dị otú ahụ site n’ime ka nkà ime ka mmadụ kwenye na ọmịiko gakọọ. (Tụlee Ndị Rom 12:15; Ndị Kọlọsi 3:12.) N’eziokwu, onye nkụzi dị irè kwesịrị ikwenyesi ike n’ihe. Dị ka ihe atụ, Pọl jiri nkebi okwu ndị dị ka “e mewo ka m kwenye” na “amatara m, e mekwara ka m kwenye n’ime Onyenwe anyị Jisọs” mee ihe. (Ndị Rom 8:38; 14:14) Otú ọ dị, n’ikwupụta ihe ndị anyị kwenyesiri ike na ha, anyị agaghị na-ekwu ha n’ụzọ ikwesi olu ike, n’ụzọ ịbụ onye ezi omume n’anya anyị, anyị ekwesịghị ikwu eziokwu Bible n’ụzọ ime akaje ma ọ bụ nlelị. N’ezie anyị achọghị imejọ ma ọ bụ ọbụna ịkparị onye ahụ a na-amụrụ ihe.—Ilu 12:18.

Ọ na-adị nnọọ irè karị ịkwanyere nkwenkwe onye a na-amụrụ ihe ùgwù ma ghọta ikike o nwere ikwenye ha. Ịdị umeala n’obi bụ isi ihe dị na ya. Onye nkụzi dị obi umeala adịghị eche na e kere ya ịdị elu karịa onye ọ na-amụrụ ihe. (Luk 18:9-14; Ndị Filipaị 2:3, 4) Iji ụzọ Chineke mee ka mmadụ kwenye na-agụnye ịdị umeala n’obi nke, n’ụzọ ọzọ, na-asị: ‘Jehova ejiriwo obi ebere mee ka m hụ nke a. Ka m soro gị kerịta ya.’

Nye ndị Kraịst ibe ya na Kọrint, Pọl dere, sị: “(Ihe agha nke ibu agha anyị abụghị nke anụ ahụ, kama ha sitere na Chineke bụ ihe pụrụ ịkwada ebe e wusiri ike); ebe anyị na-eweda ihe a na-atụle n’obi, na ihe nile ọ bụla dị elu nke e weliri elu imegide ọmụma Chineke, anyị na-adọtakwa ihe nile ọ bụla a na-echepụta n’agha ịṅa ntị Kraịst.” (2 Ndị Kọrint 10:4, 5) Taa, Ndịàmà Jehova na-eji Okwu Chineke akwada ozizi ụgha ndị e wusiri ike nakwa omume na àgwà ndị gbamiworo mkpọrọgwụ bụ́ ndị na-adịghị ya mma. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) N’ime nke a, Ndịàmà na-echeta na Jehova enweworo ha ndidi n’ịhụnanya. Lee ka obi si dị ha ụtọ na ha nwere Okwu ya, bụ́ Bible, nakwa iji ngwá ọrụ a siri ike na-eme ihe iji fopụ ozizi ụgha ma jiri nkà ime ka mmadụ kwenye na-eru n’obi!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee isiokwu bụ́ “Yunaịsị na Lọịs—Ndị Nkụzi Bụ́ Ezi Ihe Nlereanya,” na peji nke 7-9 nke mbipụta Ụlọ Nche a.

b Lee Jọn 14:28; Ndị Filipaị 2:5, 6; Ndị Kọlọsi 1:13-15. Maka inwetakwu ihe ọmụma, lee broshuọ bụ́ Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Igbe dị na peeji nke 23]

Iru n’Obi Onye Ị Na-amụrụ Ihe

◻ Kpee ekpere maka nduzi Jehova iji ruo n’obi onye ị na-amụrụ Bible.—Nehemaịa 2:4, 5; Aịsaịa 50:4.

◻ Ghọta ihe onye ị na-amụrụ ihe kwere na ihe mere ọ ga-eji ahụta nkwenkwe ụgha dị ka ihe na-adọrọ mmasị.—Ọrụ 17:22, 23.

◻ N’ụzọ obiọma na ndidi, wepụta arụmụka dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, nke nwere ezi izu ka ị na-anọgide n’ihe gị na ya kwekọrịtara na ya.—Ọrụ 17:24-34.

◻ O kwe mee, jiri ihe atụ dị irè mesikwuo eziokwu Bible ike.—Mak 4:33, 34.

◻ Gosi onye ị na-amụrụ ihe uru ndị dị n’ịnakwere ezi ihe ọmụma sitere na Bible.—1 Timoti 2:3, 4; 2 Timoti 3:14, 15.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya