Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb19 Ọgọst p. 5
  • Ndị Na-eto Eto, ‘Na-anụnụ Ọkụ n’Obi Ịrụ Ezi Ọrụ’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Na-eto Eto, ‘Na-anụnụ Ọkụ n’Obi Ịrụ Ezi Ọrụ’
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ngọzi nke Ozi Ọsụ Ụzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Malite Ọrụ Ọsụ Ụzọ Oge Niile Iji Too Jehova
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
  • Mgbanwe n’Awa Ole A Chọrọ n’Aka Ndị Ọsụ Ụzọ
    Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Ngọzi nke Ozi Ọsụ Ụzọ
    Ozi Alaeze Anyi—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
mwb19 Ọgọst p. 5

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ndị Na-eto Eto, ‘Na-anụnụ Ọkụ n’Obi Ịrụ Ezi Ọrụ’

N’akwụkwọ ozi Pọl degaara Taịtọs, o kwuru na ndị na-eto eto, ma Taịtọs n’onwe ya, kwesịrị ịgbalị “bụrụ ihe nlereanya n’ezi ọrụ” n’ihe niile ha na-eme. (Taị. 2:​6, 7) O mechara kwuo na e mere ka ndị Jehova dị ọcha ka ha nwee ike “na-anụ ọkụ n’obi ịrụ ezi ọrụ.” (Taị. 2:14) Otu n’ime ezi ọrụ ndị ahụ bụ ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, ì nwere ike iji ike okorobịa gị ma ọ bụ ike agbọghọbịa gị rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ ọsụ ụzọ oge niile?​—Ilu 20:29.

Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịbụ onye ọsụ ụzọ, hazigharịa ihe ndị ị na-eme ka i nwee ike imeli ya. (Luk 14:​28-30) Dị ka ihe atụ, olee otú ị ga-esi na-akpa afọ gị ma i bido ozi oge niile? Olee otú ị ga-esi na-arụzu awa gị? Rịọ Jehova n’ekpere ka o nyere gị aka. (Ọma 37:5) Kọọrọ nne gị na nna gị ma ọ bụ ndị ọzọ na-eme nke ọma n’ọrụ ọsụ ụzọ banyere atụmatụ ị na-eme. Gbalịzie mee ihe ndị ga-enyere gị aka ịbụ ọsụ ụzọ. Jehova agaghị ahapụ ịgọzi mbọ niile ị na-agba n’ozi ya.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NDỊ NA-ETO ETO NA-ASỌPỤRỤ JEHOVA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee nsogbu ụmụnna ụfọdụ meriri iji nwee ike ịbụ ndị ọsụ ụzọ, oleekwa otú ha si mee ya?

  • Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi nyere ụmụ ha aka ịbụ ndị ọsụ ụzọ oge niile?

  • Gịnị mere mmadụ inwe oge ndị ọ haziri o ji aga ozi ọma ji dị mkpa?

  • Olee otú ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ga-esi na-agba ndị ọsụ ụzọ ume ma na-enyere ha aka?

  • Olee ngọzi ndị ọsụ ụzọ na-enweta?

Ebe otu nwanna nwaanyị na-agwa papa ya na ya chọrọ ịsụwa ụzọ; ebe otu nwanna nwoke bụ́ ọsụ ụzọ na-ede otú o si hazie isi na-arụzu awa ya; ebe otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ na nwanna nwaanyị ọzọ nọ n’ozi ọma; ebe otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ na-amụrụ mmadụ Baịbụl

Olee otú m ga-esi bụrụ onye ọsụ ụzọ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya