Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ‘Na-etinye Uche N’ihe Karịa Otú Ị Na-adị Etinye’
    Ụlọ Nche—2002 | Septemba 15
    • ‘Na-etinye Uche N’ihe Karịa Otú Ị Na-adị Etinye’

      ‘Ọ dị mkpa ka anyị na-etinye uche n’ihe ndị anyị na-anụ karịa otú anyị na-adị etinye, ka anyị wee ghara ịkpafu mgbe ọ bụla.’—NDỊ HIBRU 2:1.

      1. Nye ihe atụ otú ndọpụ uche pụrụ isi kpata ọdachi.

      IHE ọghọm ụgbọala na-ata isi ihe dị ka mmadụ 37,000 kwa afọ na United States nanị. Ndị ọkachamara na-ekwu na a pụrụ izetewo ọtụtụ n’ime ọnwụ ndị a ma ọ bụrụ na ndị ọkwọ ụgbọala kpachapụkwuru anya n’okporo ụzọ. Saịn bọdụ, bọọdụ mkpọsa, ma ọ bụ iji fon ha na-enweghị eriri eme ihe na-adọpụ uche ụfọdụ ndị ọkwọ ụgbọala. E nwekwara ndị na-erikarị ihe ka ha na-akwọ ụgbọala. N’ọnọdụ a nile, ndọpụ uche pụrụ ịkpata ọdachi.

      2, 3. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl nyere ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ndụmọdụ ya ji kwesị ekwesị?

      2 Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 tupu e chepụta ụgbọala, Pọl onyeozi kwuru ụdị ihe ndọpụ uche nke nọworo na-akpatara ụfọdụ ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst ọdachi. Pọl mesiri ya ike na e nyere Jizọs Kraịst ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie ọnọdụ karịrị nke ndị mmụọ ozi nile elu, n’ihi na e mere ka ọ nọdụ n’aka nri Chineke. Onyeozi ahụ kwuziri, sị: “Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka anyị na-etinye uche n’ihe ndị anyị na-anụ karịa otú anyị na-adị etinye, ka anyị wee ghara ịkpafu mgbe ọ bụla.”—Ndị Hibru 2:1.

      3 N’ihi gịnị ka o ji dị ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst mkpa ‘itinye uche n’ihe ndị ha nụrụ banyere Jizọs karịa otú ha na-adị etinye’? Ọ bụ n’ihi na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 30 agafewo kemgbe Jizọs hapụsịrị ụwa. Ebe Nna ha ukwu na-anọghị ya, ụfọdụ ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst amalitewo ịkpafu site n’ezi okwukwe ahụ. Okpukpe ndị Juu, bụ́ ụzọ mbụ ha si efe ofufe, nọ na-adọpụ uche ha.

      Ọ Dị Ha Mkpa Itinyekwu Uche n’Ihe

      4. N’ihi gịnị ka a pụrụ ijiwo nwaa ụfọdụ ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst ịlaghachi n’okpukpe ndị Juu?

      4 N’ihi gịnị ka a pụrụ ijiwo nwaa Onye Kraịst ọnwụnwa ịlaghachi n’okpukpe ndị Juu? Usoro ife ofufe n’okpuru Iwu ahụ gụnyere ihe ndị a na-ahụ anya. Ndị mmadụ pụrụ ịhụ ndị nchụàjà ma nụ ísì nke àjà a na-esure n’ọkụ. Otú ọ dị, n’akụkụ ụfọdụ, Iso Ụzọ Kraịst dị nnọọ iche. Ndị Kraịst nwere Nnukwu Onye Nchụàjà, bụ́ Jizọs Kraịst, ma a hụbeghị ya n’ụwa ruo afọ iri atọ. (Ndị Hibru 4:14) Ha nwere ụlọ nsọ, ma ebe dị nsọ ọ dị bụ n’eluigwe n’onwe ya. (Ndị Hibru 9:24) N’adịghị ka ibi úgwù anụ ahụ́ n’okpuru Iwu ahụ, ibi úgwù nke Ndị Kraịst bụ “nke obi site ná mmụọ.” (Ndị Rom 2:29) N’ihi ya, nye ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst, Iso Ụzọ Kraịst pụrụ ịmalitewo iyi ihe na-adịghị adị.

      5. Olee otú Pọl si gosi na usoro ife ofufe nke Jizọs guzobere dị elu karịa nke ahụ e guzobere n’okpuru Iwu ahụ?

      5 Ọ dị ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst mkpa ịghọta ihe dị nnọọ ịrịba ama banyere usoro ife ofufe nke Kraịst guzobere. Ọ dabeere n’ụzọ dị ukwuu n’okwukwe karịa n’ihe a na-ahụ anya, n’agbanyeghị nke ahụ, ọ dị elu karịa Iwu ahụ e nyere site n’aka Mozis onye amụma. “Ọ bụrụ na ọbara ewu na nke oké ehi na ntụ nke nwa ehi e fesara n’ahụ́ ndị e merụworo emerụ na-edo nsọ ruo n’ókè nke ime ka anụ ahụ́ dị ọcha,” ka Pọl dere, “ruo ókè ka ukwuu há aṅaa ka ọbara nke Kraịst ahụ, bụ́ onye sitere na mmụọ ebighị ebi chụọ onwe ya n’àjà nye Chineke n’enweghị mmerụ, ga-eme ka akọ na uche anyị dị ọcha pụọ n’ọrụ nwụrụ anwụ ka anyị wee na-ejere Chineke ahụ dị ndụ ozi dị nsọ?” (Ndị Hibru 9:13, 14) Ee, mgbaghara mmehie nke a na-enweta site n’okwukwe e nwere n’àjà mgbapụta Jizọs Kraịst dị nnọọ ukwuu n’ọtụtụ ụzọ karịa nke a na-enweta site n’àjà ndị a chụrụ n’okpuru Iwu ahụ.—Ndị Hibru 7:26-28.

      6, 7. (a) Ọnọdụ dị aṅaa mere ka ọ dị ngwa ka ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst ‘tinye uche n’ihe ndị ha nụrụ karịa otú ha na-adị etinye’? (b) Mgbe Pọl degaara ndị Hibru akwụkwọ ozi ya, ogologo oge ha aṅaa fọdụụrụ Jeruselem? (Lee ihe odide ala ala peeji.)

      6 E nwere ihe ọzọ mere o ji dị ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst mkpa itinyesi uche ike n’ihe ha nụrụ banyere Jizọs. O buwo amụma na a ga-ebibi Jeruselem. Jizọs kwuru, sị: “Ụbọchị ga-abịakwasị gị mgbe ndị iro gị ga-eji osisi a pịrị ọnụ wuo ihe e wusiri ike gburugburu gị, ha ga-agbakwa gị gburugburu ma site n’akụkụ ọ bụla kpagbuo gị, ha ga-akụtu gị na ụmụ gị bụ́ ndị nọ n’ime gị n’ala, ha agaghịkwa ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya n’ime gị, n’ihi na ị ghọtaghị oge e ji eleta gị.”—Luk 19:43, 44.

      7 Olee mgbe nke a ga-eme? Jizọs ekpugheghị ụbọchị na awa ọ ga-abụ. Kama nke ahụ, o nyere ntụziaka a: “Mgbe unu hụrụ Jeruselem ka usuu ndị agha mara ụlọikwuu gbara ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ime ka ọ tọgbọrọ n’efu adịwo nso. Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu, ka ndị nọkwa n’ime ya wezụga onwe ha, ka ndị nọkwa n’obodo nta dị iche iche ghara ịbanye n’ime ya.” (Luk 21:20, 21) N’ime afọ 30 sochirinụ ka Jizọs kwusịrị okwu ndị ahụ, ụfọdụ Ndị Kraịst nọ na Jeruselem kwụsịrị inwe echiche nke ịdị ngwa ma bụrụ ndị a dọpụrụ uche ha. Ha wepụrụ anya ha n’okporo ụzọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ọ bụrụ na ha agbanweghị ụzọ ha si eche echiche, ọdachi aghaghị ịdakwasị ha. Ma hà chere otú ahụ ma ọ bụ na ha echeghị, mbibi Jeruselem dị ezi nso!a E nwere olileanya na ndụmọdụ Pọl kpọtere Ndị Kraịst nọ na Jeruselem bụ́ ndị nọ na-ehi ụra n’ụzọ ime mmụọ.

      ‘Itinye Uche n’Ihe Taa Karịa Otú A Na-adị Etinye’

      8. N’ihi gịnị ka o ji dị anyị mkpa ‘itinye uche n’eziokwu nke Okwu Chineke karịa otú anyị na-adị etinye’?

      8 Dị ka Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ, ọ dị anyị mkpa ‘itinye uche n’eziokwu nke Okwu Chineke karịa otú anyị na-adị etinye.’ N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị onwe anyị na-eche mbibi dị ezi nso ihu, ọ bụghị nke nanị otu mba, kama nke otu usoro ihe dum. (Mkpughe 11:18; 16:14, 16) N’ezie, anyị amaghị kpọmkwem ụbọchị na awa Jehova ga-eweta ya. (Matiu 24:36) Otú o sina dị, anyị ji anya anyị na-ahụ mmezu nke amụma dị iche iche nke Bible bụ́ ndị na-egosi n’ụzọ doro anya na anyị na-ebi “n’ụbọchị ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịnọ na nche megide ihe ọ bụla nke pụrụ ịdọpụ uche anyị. Ọ dị anyị mkpa itinye uche n’Okwu Chineke ma nọgide na-enwe nnọọ echiche nke ịdị ngwa. Ọ bụ nanị site n’ime otú ahụ ka anyị ‘ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ịgbanahụ ihe ndị a nile a kara aka na ha ga-ewere ọnọdụ.’—Luk 21:36.

  • ‘Na-etinye Uche N’ihe Karịa Otú Ị Na-adị Etinye’
    Ụlọ Nche—2002 | Septemba 15
    • a Eleghị anya e degaara ndị Hibru akwụkwọ ozi ahụ na 61 O.A. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụ mgbe nanị ihe dị ka afọ ise gasịrị ka usuu ndị agha Cestius Gallus gbara Jeruselem gburugburu. N’oge na-adịghị anya, usuu ndị agha ahụ pụrụ, na-enye Ndị Kraịst mụ anya ohere ịgbalaga. Afọ anọ ka e mesịrị, usuu ndị agha Rom nọ n’okpuru Ọchịagha Titus bibiri obodo ahụ.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya