Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ebe ọ bụ na onye nchụàjà oge ochie aha ya bụ Melkizedek bụ mmadụ n’ezie, n’ihi gịnị ka Bible ji sị na o “nweghị akụkọ usoro ọmụmụ”?
E kwuru nke a ná Ndị Hibru 7:3. Rịba amaokwu a ama n’etiti ihe a na-akọ:
“N’ihi na Melkizedek nke a, eze Selem, onye nchụàjà nke Chineke Onye kachasị ihe nile elu, onye zutere Abraham mgbe o si n’ogbugbu ndị eze ahụ laghachi, wee gọzie ya, onye Abraham kekwara otu ụzọ n’ụzọ iri n’ihe nile nye, (ebe ọ bụ mbụ, ma a sụgharịa aha ya, Eze nke ezi omume, bụrụkwa ma e mesịa Eze nke Selem, nke bụ, Eze nke udo; enweghị nna, enweghị nne, enweghị akụkọ osuso ọmụmụ, enweghị mmalite ụbọchị ma ọ bụ ọgwụgwụ ndụ, ma e mewo ya ka o yie Ọkpara Chineke), ọ na-anọgide onye nchụàjà mgbe nile.”—Ndị Hibru 7:1-3.
Dị ka e kwuru, Melkizedek bụ mmadụ dị adị n’ezie, ọ dịrị adị n’ezie dị ka Abraham dịrị, onye ya na ya mekọrịtara ihe kpọmkwem. (Jenesis 14:17-20; Ndị Hibru 7:4-10) Ebe ọ dị otú ahụ, Melkizedek aghaghị inwe ndị mụrụ ya, nne na nna, ọ pụkwara ịbụ na o nwere ụmụ. N’ihi ya, dị ka mmadụ, o nwere osuso ọmụmụ, ma ọ bụ ndepụta ezinụlọ. O nwekwara ọgwụgwụ nke ndụ nkịtị ya. N’otu oge Melkizedek nwụrụ, n’ikwekọ n’okwu Pọl onyeozi ná Ndị Rom 5:12, 14. Ma ebe anyị na-amaghị mgbe Melkizedek nwụrụ wee kwụsị ije ozi dị ka onye nchụàjà, n’ụzọ dị otú ahụ o jere ozi n’enweghị ọgwụgwụ ọ bụla a matara.
Ná Ndị Hibru, Pọl kwuru okwu banyere Melkizedek mgbe ọ na-atụle òkè Jisọs Kraịst na-ekere dị ka Onye Isi Nchụàjà ka elu. N’izo aka na Melkizedek dị ka ụdị, ma ọ bụ onyinyo, nke Jisọs n’ọrụ ịchụàjà, Pọl sịrị: “Jisọs . . . bụrụ onye isi nchụàjà ruo mgbe ebighị ebi dị ka usoro Melkizedek si dị.” (Ndị Hibru 6:20) N’echiche dị aṅaa?
Pọl aghaghị ịghọtawo na ihe ndekọ Bible enyeghị nkọwa miri emi banyere usoro ezinụlọ Melkizedek—ndị nna nna ya ha ma ọ bụ ụmụ ọ bụla ọ pụrụ inwewo. Ihe ọmụma ahụ abụghị nnọọ ihe gbasara ndekọ Bible. Ya mere, site n’ihe Pọl maara ma ọ bụ nke anyị maara, a pụrụ ikwu n’izi ezi na Melkizedek ‘enweghị osuso ọmụmụ’ (New World Translation of the Holy Scriptures; American Standard Version), “enweghị ndepụta usoro ọmụmụ” (W. J. Conybeare), ma ọ bụ “enweghị ndepụta ezinụlọ.”—J. B. Phillips.
N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs dị otú ahụ? Ọ bụ ezie na anyị maara na Nna Jisọs bụ Jehova Chineke nakwa na nne ya bụ́ mmadụ bụ Meri nke si n’agbụrụ Juda. Ma, e nwere ihe myirita ndị dị n’etiti Melkizedek na Jisọs. N’ụzọ dị aṅaa? A mụghị Jisọs n’agbụrụ Livaị, agbụrụ maka ndị nchụàjà ná mba Israel. Ee e, Jisọs abụghị onye nchụàjà site n’usoro ọmụmụ ụmụ mmadụ. Melkizedek abụghịkwa, bụ́ onye na-aghọghị onye nchụàjà “dị ka iwu nke ihe e nyere n’iwu nye anụ ahụ si dị,” ya bụ, site n’ịmụnye ya n’agbụrụ na ezinụlọ ndị nchụàjà. (Ndị Hibru 7:15, 16) Kama ịbụ onye nchụàjà site ná nna bụ́ mmadụ onye bụworo n’onwe ya onye nchụàjà, Jisọs bụ “onye Chineke turu aha onye isi nchụàjà dị ka usoro Melkizedek si dị.”—Ndị Hibru 5:10.
Ọzọkwa, Jisọs enweghị ụmụ ma ọ bụ ndị nnọchị n’ịbụ onye nchụàjà ya. N’echiche nke a kwa, o nweghị osuso ọmụmụ. Ọ ga-eje ozi onye nchụàjà ya ruo ebighị ebi dị ka onye ozizi nke na-enye aka. Pọl kwuru banyere ije ozi a na-adịgide adịgide, na-asị:
“N’ihi na [Jisọs] na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi, o nwere ọnọdụ onye nchụàjà Ya na-adịghị agabiga onye ọzọ. O sitekwara na nke a pụ ịzọpụtachasị ndị na-esite n’aka Ya abịakwute Chineke, ebe Ọ na-adị ndụ mgbe nile ịrịọ arịrịọ n’ihi ha.”—Ndị Hibru 7:24, 25.
Ya mere ntụle anyị tụleworo okwu Pọl ná Ndị Hibru 7:3 kwesịrị ịbụ ihe karịrị nanị ihe ọmụma e chekwara n’isi anyị. O kwesịrị ime ka obi ekele anyị maka ndokwa ịhụnanya Jehova Chineke meworo maka anyị ịnata mgbaghara nke mmehie ruo mgbe ebighị ebi na maka ụzọ o si hazie ihe ka anyị wee nata enyemaka na nduzi ruo ebighị ebi siwanye ike.