-
Ka Anyị Ghara Iwezụga Onwe Anyị Mgbe Ọ Bụla Ịla n’Iyi!Ụlọ Nche—1999 | Disemba 15
-
-
Ka Anyị Ghara Iwezụga Onwe Anyị Mgbe Ọ Bụla Ịla n’Iyi!
“Anyị adịghị n’etiti ndị wezụgara onwe ha ịla n’iyi.”—NDỊ HIBRU 10:39.
1. Ọnọdụ ndị dị aṅaa mere ka egwu merie Pita onyeozi?
IBOBO aghaghị ịnwụwo ndị ozi ahụ n’ahụ mgbe Onyenwe ha ha hụrụ n’anya, bụ́ Jisọs, gwara ha na ha nile ga-agbasasị ma gbahapụ ya. Olee otú ihe dị otú ahụ pụrụ isi mee—n’awa a ọ kasị nọrọ ná mkpa? Pita siri ọnwụ, sị: “Ọ bụrụ na a ga-eme ọbụna mmadụ nile ka ha ma n’ọnyà, ma a gaghị eme mụ onwe m.” N’eziokwu, Pita bụ nwoke obi ike, nke nwere nkwuwa okwu. Ma mgbe a raara Jisọs nye ma jide ya, ndị ozi ahụ—gụnyere Pita—gbasasịrị. E mesịa, mgbe a na-agba Jisọs ajụjụ n’ebe obibi Onyeisi Nchụàjà bụ́ Kaịafas, Pita kwụgharịrị n’ahụ erughị ala n’ogige ahụ. Ka chi na-ejimi n’abalị ahụ oyi na-atụ, ma eleghị anya Pita bịara tụwa egwu na a pụrụ igbu Jisọs na onye ọ bụla nke ya na ya na-akpakọrịta. Mgbe ụfọdụ ndị guzo n’akụkụ matara Pita dị ka otu n’ime ezi ndị enyi Jisọs, ụjọ jidere ya. Ọ gọnahụrụ inwe ihe jikọrọ ya na Jisọs ugboro atọ. Pita gọpụrụ ọbụna ịma onye ọ bụ!—Mak 14:27-31, 66-72.
2. (a) N’ihi gịnị ka egwu Pita tụrụ n’abalị ahụ e jidere Jisọs na-ejighị mee ka ọ dị “n’etiti ndị wezụgara onwe ha”? (b) Gịnị kwesịrị ịbụ mkpebi anyị?
2 Nke ahụ bụ oge dị njọ ná ndụ Pita, oge nke obi abụọ na-adịghị ya na ọ kwara ụta banyere ya ná ndụ ya fọdụrụnụ. Ma omume Pita n’abalị ahụ ò mere ka ọ bụrụ onye ụjọ? O mere ka ọ bụrụ otu n’ime “ndị” Pọl onyeozi mesịrị kọwaa mgbe o dere, sị: “Ma anyị onwe anyị adịghị n’etiti ndị wezụgara onwe ha ịla n’iyi”? (Ndị Hibru 10:39) O yikarịrị ka ihe ka ọtụtụ n’ime anyị hà ga-ekweta na okwu Pọl emetụtaghị Pita. N’ihi gịnị? N’ihi na egwu Pita adịteghị anya, ọ bụ ndaghachi azụ dị mkpirikpi bụ́ nke obi ike na okwukwe pụtara ìhè kara akara. N’otu aka ahụ, ọtụtụ n’ime anyị nwere oge ndị anyị na-ejitụ ihere echeta ná ndụ anyị, bụ́ oge ndị egwu jidere anyị na mberede ma mee ka anyị ghara iji obi ike kwụrụ maka eziokwu dị ka anyị gaara achọ ime. (Tụlee Ndị Rom 7:21-23.) Anyị pụrụ ijide n’aka na ndaghachi azụ dị otú ahụ bụ́ ndị na-adịteghị anya adịghị eme ka anyị dịrị n’etiti ndị wezụgara onwe ha ịla n’iyi. Ma, ọ dị anyị mkpa ikpebisi ike ịghara ịdị n’etiti ndị ahụ. N’ihi gịnị? Oleekwa otú anyị pụrụ isi zere ịghọ mmadụ dị otú ahụ?
Ihe Iwezụga Onwe Onye Ịla n’Iyi Pụtara
3. Olee otú ndị amụma bụ́ Elaịja na Jona si kwe ka egwu merie ha?
3 Mgbe Pọl dere banyere “ndị wezụgara onwe ha,” o bughị ndị pụrụ inwe ndaghachi azụ n’inwe obi ike ruo nwa oge, n’uche. N’ezie Pọl maara banyere ahụmahụ Pita nakwa ọnọdụ ọzọ ndị yiri nke ahụ. Otu mgbe, Elaịja, bụ́ onye amụma nwere obi ike ma nwee nkwuwa okwu, tụrụ egwu ma rie mbọ mbọ iji zọrọ isi ya n’ihi egwu ọnwụ nke ajọ Eze Nwanyị Jezebel yiri ya. (1 Ndị Eze 19:1-4) Egwu nyụrụ onye amụma bụ́ Jona ịkpakwụ n’ụzọ ka sie ike. Jehova nyere ya ọrụ ime njem gaa Nineve, bụ́ obodo e ji ime ihe ike na ajọ omume mara. Ozugbo, Jona banyere ụgbọ mmiri na-aga Tashish—kilomita 3,500 n’ụzọ dị iche n’ebe a gwara ya! (Jona 1:1-3) Ma, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị amụma a kwesịrị ntụkwasị obi ma ọ bụ Pita onyeozi a pụrụ ịkọwa n’ụzọ ziri ezi dị ka ndị wezụgara onwe ha ịla n’iyi. N’ihi gịnị?
4, 5. (a) Olee otú ihe a na-ekwu banyere ya si enyere anyị aka ịmata ihe Pọl bu n’uche mgbe o kwuru banyere “mbibi” ná Ndị Hibru 10:39? (b) Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe ọ sịrị: “Anyị adịghị n’etiti ndị wezụgara onwe ha ịla n’iyi”?
4 Rịba nkebi ahịrịokwu Pọl ji mee ihe ama: “Ma anyị onwe anyị adịghị n’etiti ndị wezụgara onwe ha ịla n’iyi.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Gịnị ka o bu n’uche kwuo banyere “ịla n’iyi”? Okwu Grik o ji mee ihe na-ezo aka mgbe ụfọdụ ná mbibi ebighị ebi. Nkọwa a kwekọrọ n’ihe a na-ekwu banyere ya. Pọl ka dọsịrị aka ná ntị, sị: “A sị na anyị weere ọchịchọ obi na-anọ ná mmehie mgbe anyị nataworo mmazu nke eziokwu, àjà a ga-achụ banyere mmehie dị iche iche afọdụghị ọzọ, kama nke fọdụrụ bụ oké olileanya dị egwu nke ikpe, ya na [ekworo na-ere ka ọkụ, NW] nke gaje iripịa ndị na-eguzogide Chineke.”—Ndị Hibru 10:26, 27.
5 Ya mere mgbe Pọl gwara ndị kwere ekwe ibe ya, sị, “Anyị adịghị n’etiti ndị wezụgara onwe ha ịla n’iyi,” o bu n’uche na ya na ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi na-agụ akwụkwọ ya kpebisiri ike ịghara ma ọlị iwezụga onwe ha n’ebe Jehova nọ ma kwụsị ijere ya ozi. Ime otú ahụ pụrụ nanị iduga ná mbibi ebighị ebi. Judas Iskariọt bụ otu onye wezụgara onwe ya gaa n’ịla n’iyi dị otú ahụ, dịkwa ka ndị iro ndị ọzọ nke eziokwu ahụ mere bụ́ ndị ma ụma rụọ ọrụ megide mmụọ Jehova. (Jọn 17:12; 2 Ndị Tesalọnaịka 2:3) Mmadụ ndị dị otú ahụ so n’etiti “ndị na-atụ ụjọ” bụ́ ndị ga-enweta mbibi ebighị ebi n’ime ọdọ ọkụ ihe atụ ahụ. (Mkpughe 21:8) Ee e, anyị achọghị ịdị n’etiti ndị ahụ ma ọlị!
6. Olee ụzọ Setan bụ́ Ekwensu na-achọ ka anyị gbasoo?
6 Setan bụ́ Ekwensu chọrọ ka anyị wezụga onwe anyị ịla n’iyi. N’ịbụ ọkà nke “nzupụta aghụghọ,” ọ maara na omume mbibi dị otú ahụ na-amalitekarị n’ụzọ ndị dị ntakịrị. (Ndị Efesọs 6:1, nkọwa ala ala peji nke NW) Ọ bụrụ na mkpagbu ihu na ihu arụzughị ihe ọ chọrọ, ọ na-anwa imebi okwukwe nke ezi ndị Kraịst site n’ụzọ ndị dị aghụghọ karị. Ọ chọrọ ịhụ ka e mechiri ọnụ Ndịàmà Jehova nwere obi ike, ma na-anụ ọkụ n’obi. Ka anyị lee ụzọ aghụghọ ndị o ji mee ihe megide ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst bụ́ ndị Pọl degaara akwụkwọ.
Otú E Si Rụgide Ndị Kraịst Iwezụga Onwe Ha
7. (a) Gịnị bụ akụkọ ihe mere eme nke ọgbakọ ahụ dị na Jerusalem? (b) Ọnọdụ ime mmụọ ndị dị aṅaa ka ụfọdụ ndị na-agụ akwụkwọ Pọl nwere?
7 Ihe àmà na-egosi na Pọl dere akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru n’ihe dị ka 61 O.A. Akụkọ ihe mere eme nke ọgbakọ ahụ dị na Jerusalem jupụtara n’ọgba aghara. Mgbe ọnwụ Jisọs gasịrị, ọtụtụ mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ tiwapụrụ, na-amanye ọtụtụ ndị Kraịst nọ n’obodo ahụ ịgbasasị. Otú ọ dị, a bịara nwee oge udo, na-ekwe ka ọnụ ọgụgụ ndị Kraịst mụbaa. (Ọrụ 8:4; 9:31) Ka afọ na-agafe, mkpagbu na ihe isi ike ndị ọzọ bịara ma laa. O yiri ka n’oge Pọl degaara ndị Hibru akwụkwọ ozi ahụ, ọgbakọ ahụ nọ ọzọ na-anụ ụtọ oge udo hitụrụ nne. Ma, e nwere nrụgide. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri afọ atọ agafewo kemgbe Jisọs buru amụma banyere mbibi Jerusalem. O yiri ka e nwere ụfọdụ ndị chere na ọgwụgwụ ahụ anọọla ọdụ n’ụzọ ezi uche na-adịghị na ya, nakwa na e nwere ike ọ gaghị abịa n’oge ndụ ha. Mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ elebeghị ndị ọzọ ule, karịsịa ndị ka chegharịrị ọhụrụ, ha makwaara ihe dị nta banyere mkpa ọ dị ịtachi obi n’ule. (Ndị Hibru 12:4) N’ezie Setan nwara iji ọnọdụ ndị dị otú ahụ mee ihe. Olee “nzupụta aghụghọ” ndị o ji mee ihe?
8. Àgwà dị aṅaa ka ọtụtụ ndị Juu nwere n’ebe ọgbakọ ndị Kraịst ka dị ọhụrụ bụ́ nke na-enwechaghị ahụmahụ dị?
8 Ndị Juu nọ na Jerusalem na Judia lelịrị ọgbakọ ndị Kraịst ka dị ọhụrụ bụ́ nke na-enwechaghị ahụmahụ anya. N’ịdabere n’ihe dị n’akwụkwọ ozi Pọl, anyị na-enweta nkọwa ụfọdụ banyere emo ndị ndú okpukpe ndị Juu ahụ dị mpako na ụmụazụ ha kwara ndị Kraịst. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ha pụrụ ịsịwo: ‘Anyị nwere ụlọ nsọ ukwu dị na Jerusalem, nke dịworo ọtụtụ narị afọ! Anyị nwere onyeisi nchụàjà a ma ama nke na-eje ozi n’ebe ahụ, tinyere ndị nchụàjà nọ n’okpuru ya. A na-achụ àjà kwa ụbọchị. Anyị nwere Iwu ahụ, bụ́ nke ndị mmụọ ozi nyere Mosis, nke e jikwa oké ihe ịrịba ama guzobe n’Ugwu Saịnaị. Ịrọ òtù a malitere ọhụrụ, ndị Kraịst a, bụ́ ndị dapụrụ site n’okpukpe ndị Juu, enweghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a!’ Ịkwa emo dị otú ahụ ọ̀ rụzuru nzube e ji kwaa ya? Ihe àmà na-egosi na mwakpo ndị ahụ nyere ụfọdụ ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst nsogbu n’obi. Akwụkwọ ozi Pọl nyeere ha nnọọ aka mgbe ọ dị ha mkpa.
Ihe Mere Ha Na-agaghị Eji Wezụga Onwe Ha Ma Ọlị Ịla n’Iyi
9. (a) Olee isiokwu jupụtara n’akwụkwọ ozi ahụ e degaara ndị Hibru? (b) N’echiche dị aṅaa ka ndị Kraịst jere ozi n’ụlọ nsọ dị mma karịa nke ahụ dị na Jerusalem?
9 Ka anyị nyochaa ihe abụọ Pọl gwara ụmụnna ya ndị nwoke na ndị nwanyị nọ na Judia mere ha na-agaghị eji wezụga onwe ha ma ọlị ịla n’iyi. Nke mbụ—ọkịka nke usoro ofufe ndị Kraịst ka ndị ọzọ—jupụtara n’akwụkwọ ozi ahụ o degaara ndị Hibru. Site ná mmalite ruo ná ngwụsị nke akwụkwọ ozi ya, Pọl wulitere isiokwu a. Ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem bụ onyinyo nkịtị nke ihe ka ukwuu gaje ịdị adị, ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova, bụ́ ihe owuwu “[na-abụghị] nke e ji aka mee.” (Ndị Hibru 9:11) Ndị Kraịst ahụ nwere ihe ùgwù nke ije ozi ná ndokwa ime mmụọ ahụ e mere maka ofufe dị ọcha. Ha na-eje ozi n’okpuru ọgbụgba ndụ ka mma, ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa eri oge, bụ́ nke nwere Onye Ogbugbo ka Mosis ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst.—Jeremaịa 31:31-34.
10, 11. (a) N’ihi gịnị ka usoro ọmụmụ Jisọs na-ejighị mee ka ọ ghara iru eru ije ozi dị ka Onyeisi Nchụàjà n’ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ? (b) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jisọs si bụrụ Onyeisi Nchụàjà nke ka nke ahụ na-eje ozi n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem elu?
10 Ndị Kraịst ahụ nwekwara Onyeisi Nchụàjà ka nnọọ mma, bụ́ Jisọs Kraịst. Ee e, o siteghị n’usoro ọmụmụ Erọn. Kama nke ahụ, ọ bụ Onyeisi Nchụàjà “dị ka usoro Melkizedek si dị.” (Abụ Ọma 110:4) Melkizedek bụ́ onye a na-edekọghị usoro ọmụmụ ya edekọ, bụ eze Selem oge ochie nakwa onyeisi nchụàjà ya. O si otú a see onyinyo kwekọrọ ekwekọ e buru n’amụma banyere Jisọs, onye ịbụ onye nchụàjà ya na-adabereghị n’usoro ọmụmụ ọ bụla nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè, kama n’ihe ka nnọọ ukwuu—ịṅụ iyi nke Jehova Chineke n’onwe ya. Dị ka Melkizedek, Jisọs na-eje ozi ọ bụghị nanị dị ka Onyeisi Nchụàjà kamakwa dị ka Eze, nke na-agaghị anwụ anwụ ma ọlị.—Ndị Hibru 7:11-21.
11 Ọzọkwa, n’adịghị ka onyeisi nchụàjà nọ n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem, ọ dịghị Jisọs mkpa ịchụ àjà kwa afọ. Àjà ya bụ ndụ ya zuru okè, nke ọ chụrụ n’àjà otu ugbo. (Ndị Hibru 7:27) Àjà nile ahụ a chụrụ n’ụlọ nsọ bụ nanị onyinyo, ihe ndị na-egosi ihe Jisọs chụrụ n’àjà. Àjà ya zuru okè mere ka e nwee ezi mgbaghara mmehie maka ndị nile gosipụtara okwukwe. Ihe na-enyekwa obi ụtọ bụ okwu Pọl nke na-egosi na Onyeisi Nchụàjà a bụ otu Jisọs ahụ na-adịghị agbanwe agbanwe bụ́ onye ndị Kraịst nọ na Jerusalem mawooro. Ọ dị obi umeala, obiọma, bụrụkwa onye pụrụ “iji obi so anyị hụkọọ ahụhụ n’adịghị ike anyị.” (Ndị Hibru 4:15; 13:8) Ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ nwere atụmanya nke ije ozi dị ka ndị nchụàjà nọ n’okpuru Kraịst! Olee otú ha pụrụ isi chetụdị n’echiche iwezụga onwe ha gaa ‘n’ihe na-adịghị ike na-enweghịkwa ihe ọ bụla’ nke okpukpe ndị Juu rụrụ arụ?—Ndị Galetia 4:9.
12, 13. (a) Olee ihe nke abụọ Pọl sịrị mere anyị na-agaghị eji wezụga onwe anyị ma ọlị? (b) N’ihi gịnị ka ntachi obi ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst tachirila ga-eji gbaa ha ume ịghara iwezụga onwe ha ịla iyi?
12 Dị ka a ga-asị na nke ahụ ezughị, Pọl gwara ndị Hibru ihe nke abụọ mere ha na-agaghị eji wezụga onwe ha ịla n’iyi—ntachi obi ndị ha tachirila. O dere, sị: “Na-echetanụ ụbọchị mbụ ahụ, nke ọ bụ n’ime ha, mgbe e nyesịrị unu ìhè, ka unu tachiri obi n’oké ịgba mgba nke ahụhụ dị iche iche.” Pọl chetaara ha na ‘e mewo ka ha bụrụ ihe nkiri’ nye nkọcha na mkpagbu. A tụwo ụfọdụ mkpọrọ; ndị ọzọ enwewo ọmịiko n’ebe ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ nọ ma kwadoo ha. Ee, ha egosiwo okwukwe na nnọgidesi ike kwesịrị nṅomi. (Ndị Hibru 10:32-34) Ma, n’ihi gịnị ka Pọl ji gwa ha ka ha ‘na-echeta’ ahụmahụ ndị dị otú ahụ dị ilu? Nke ahụ ọ́ gaghị abụ ihe nkụda mmụọ?
13 N’ụzọ megidere nke ahụ, ‘icheta ụbọchị mbụ ahụ’ ga-echetara ndị Hibru ahụ otú Jehova siworo kwagide ha n’oge ule. Site n’enyemaka ya, ha eguzogideworị ọtụtụ n’ime mwakpo Setan. Pọl dere, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha Ya dị.” (Ndị Hibru 6:10) Ee, Jehova chetara ọrụ nile ha rụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi, na-edebe ha n’ikike ncheta ya na-enweghị nsọtụ. A na-echetara anyị agbamume Jisọs ịkpado akụ̀ n’eluigwe. Ọ dịghị onye ohi ga-ezu akụ̀ ndị a; ọ dịghị nla ma ọ bụ nchara pụrụ irichapụ ha. (Matiu 6:19-21) N’ezie, a pụrụ imebi akụ̀ ndị a nanị ma ọ bụrụ na onye Kraịst ewezụga onwe ya ịla n’iyi. Nke ahụ ga-etisasị akụ̀ ọ bụla ọ kpadoworo n’eluigwe. Lee ihe dị ike Pọl gwara ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst mere ha na-agaghị eji gbasoo ụzọ dị otú ahụ ma ọlị! N’ihi gịnị ka ha ga-eji mee ka afọ nile ha jeworo ozi dị nsọ laa n’iyi? Ọ ga-abụ ihe ziri ezi na ihe ka nnọọ mma ịnọgide na-atachi obi.
Ihe Mere Anyị Na-ekwesịghị Iji Wezụga Onwe Anyị Ịla n’Iyi
14. Olee ihe ịma aka ndị anyị na-eche ihu bụ́ ndị yiri ndị ahụ ndị Kraịst narị afọ mbụ chere ihu?
14 Ezi ndị Kraịst taa nwekwara ihe ndị siri ike mere ha na-agaghị eji wezụga onwe ha. Nke mbụ, ka anyị cheta ụdị ngọzi anyị nwere n’ụdị ofufe dị ọcha nke Jehova nyeworo anyị. Dị ka ndị Kraịst narị afọ mbụ, anyị na-ebi n’oge ndị na-ekpe okpukpe ndị a ka mara amara na-ama anyị njakịrị, na-emekwa anyị akaje, na-eji nganga na-ezo aka ná nnukwu ụlọ okpukpe ha dị iche iche na ịdị ochie nke ọdịnala ha. Otú ọ dị, Jehova na-emesi anyị obi ike na ọ na-anabata ụdị ofufe anyị. N’ezie, taa anyị na-enweta ngọzi nke ndị Kraịst oge mbụ na-enwetaghị. Ị pụrụ ịjụ sị, ‘Olee otú nke ahụ pụrụ isi mee?’ E kwuwerị, ha dịrị ndụ mgbe ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ malitere ọrụ. Kraịst ghọrọ Onyeisi Nchụàjà ya mgbe e mesịrị ya baptism na 29 O.A. Ụfọdụ n’ime ha hụrụ Ọkpara Chineke ahụ na-arụ ọrụ ebube. Ọbụna mgbe ọnwụ ya gasịrị, e nwekwuru ọrụ ebube. Otú ọ dị, dị ka e buru n’amụma, onyinye ndị dị otú ahụ mesịrị kwụsị.—1 Ndị Kọrint 13:8.
15. Ezi ndị Kraịst taa na-ebi n’oge mmezu nke amụma dị aṅaa, gịnịkwa ka nke ahụ pụtara nye anyị?
15 Otú ọ dị, anyị na-ebi n’oge mmezu dị ịrịba ama nke amụma ahụ sara mbara banyere ụlọ nsọ nke dị n’Ezikiel isi nke 40-48.a N’ihi ya, anyị ahụwo mweghachi nke ndokwa Chineke maka ofufe dị ọcha. E kpochapụwo ụdị nile nke mmetọ na ikpere arụsị okpukpe n’ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ. (Ezikiel 43:9; Malakaị 3:1-5) Chee banyere abamuru mkpocha a wetawooro anyị.
16. Ihe omume dị aṅaa na-akụda mmụọ ka ndị Kraịst narị afọ mbụ chere ihu?
16 Na narị afọ mbụ, ọdịnihu yiri ihe olileanya na-adịghị na ya nye ọgbakọ ndị Kraịst ahụ a haziri ahazi. Jisọs ebuwo n’amụma na ọ ga-adị ka a ga-asị na a kụnyekọtara ata n’ubi ọka a kụrụ ọhụrụ, na-eme ka ọ fọdụ nke nta ka a ghara ịmata ọdịiche dị n’etiti ọka na ata. (Matiu 13:24-30) Otú ahụ kwa ka ọ dịrịị. Ka ọ na-erule ná ngwụsị nke narị afọ mbụ, mgbe Jọn onyeozi meworo agadi na-arụ ọrụ dị ka onye ikpeazụ na-egbochi ịkpa àgwà na-ezighị ezi, ndapụ n’ezi ofufe ejupụtaworị ebe nile. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:6; 1 Jọn 2:18) N’oge na-adịghị anya ndị ozi nwụsịrị, òtù ndị ụkọchukwu dị iche bilitere, na-emegbu ìgwè atụrụ ahụ ma na-eyi uwe ndị pụrụ iche. Ndapụ n’ezi ofufe gbasara ebe nile dị ka gangrene. Lee ihe na-akụda mmụọ ọ bụ nye ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi! Ha hụrụ ka ụdị ofufe rụrụ arụ rikpuru ndokwa ahụ e guzobere ọhụrụ maka ofufe dị ọcha. Nke a mere mgbe ọ na-erubeghị otu narị afọ Kraịst guzobesịrị ọgbakọ ahụ.
17. N’echiche dị aṅaa ka ọgbakọ ndị Kraịst nke oge a dịteworo aka karịa ogbo ya nke narị afọ mbụ?
17 Ugbu a, tụlee ihe dị iche. Taa, ofufe dị ọcha adịteela aka karịa ka ọ dị n’oge ahụ tupu ndị ozi anwụsịa. Site n’oge e wepụtara mbipụta nke mbụ nke magazin a laa azụ na 1879, Jehova ejiwo ofufe a na-emewanye ka ọ dị ọcha gọzie anyị. Jehova na Kraịst Jisọs banyere n’ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ na 1918 ná nzube nke ikpocha ya. (Malakaị 3:1-5) Kemgbe 1919, a nụchawo n’ụzọ na-agawanye n’ihu ndokwa ndị e mere maka ife Jehova Chineke ofufe. Nghọta anyị nke amụma na ụkpụrụ Bible edowo anya karị. (Ilu 4:18) Ònye ka otuto na-agara? Ọ naghị agara ụmụ mmadụ nkịtị na-ezughị okè. Ọ bụ nanị Jehova, tinyere Ọkpara ya dị ka Isi nke ọgbakọ, pụrụ ichebe ndị Ya pụọ n’ịkpa àgwà na-ezighị ezi n’oge a rụrụ arụ. Mgbe ahụ, ka anyị ghara ịhapụ ma ọlị ikele Jehova maka ikwe ka anyị na-ekere òkè n’ofufe dị ọcha taa. Ka anyị kpebisiekwa ike ịghara iwezụga onwe anyị ịla n’iyi ma ọlị!
18. Olee ihe mere anyị na-agaghị eji wezụga onwe anyị ịla n’iyi?
18 Dị ka ndị Hibru ahụ bụ́ ndị Kraịst, anyị nwere ihe nke abụọ mere anyị ga-eji ajụ omume ịtụ ụjọ na nke iwezụga onwe onye—ntachi obi anyị tachirila. Ma ànyị malitere ijere Jehova ozi n’afọ ndị na-adịbeghị anya ma ọ bụ na anyị anọwo na-eme otú ahụ ruo ọtụtụ iri afọ, anyị ekerewo òkè n’ọrụ ndị Kraist. A kpagbuwo ọtụtụ n’ime anyị, ma ọ̀ bụ site n’ịtụ mkpọrọ, mmachibido iwu, mmeso obi ọjọọ, ma ọ bụ site ná mfu nke ihe onwunwe. Ihe ka ọtụtụ echewo mmegide ezinụlọ, nlelị, ịkwa emo, na enweghị mmasị, ihu. Anyị nile atachiwo obi, nọgide na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị ihe ịma aka na ule dị iche iche nke ndụ. Site n’ime otú ahụ, anyị amụbawo ịnọgidesi ike anyị bụ́ ihe Jehova na-agaghị echefu echefu, nke bụ́ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa n’eluigwe. N’ezie, nke a abụghị oge iwezụga onwe anyị gaa n’usoro ihe ochie rụrụ arụ nke anyị hapụworo! N’ihi gịnị ka anyị ga-eji mee ka nrụsi ọrụ ike anyị nile bụrụ ihe na-abaghị n’ihe? Nke a dị otú a taa karịsịa, bụ́ mgbe ọ fọdụrụ nanị “nwa oge nta” tupu ọgwụgwụ eruo.—Ndị Hibru 10:37.
19. Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu anyị na-esonụ?
19 Ee, ka anyị kpebisie ike na “anyị adịghị n’etiti ndị wezụgara onwe ha ịla n’iyi”! Kama nke ahụ, ka anyị dị “n’etiti ndị kwere ekwe.” (Ndị Hibru 10:39) Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na anyị na-ekwekọ ná nkọwa ahụ, oleekwa otú anyị pụrụ isi nyere ndị Kraịst ibe anyị aka ime otu ihe ahụ? Isiokwu anyị na-esonụ ga-atụle nke a.
-
-
Ka Anyị Dị n’Etiti Ndị Kwere EkweỤlọ Nche—1999 | Disemba 15
-
-
Ka Anyị Dị n’Etiti Ndị Kwere Ekwe
“Anyị dị n’etiti ndị kwere ekwe inweta mkpụrụ obi ha.”—NDỊ HIBRU 10:39.
1. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na okwukwe nke ohu Jehova ọ bụla na-eguzosi ike n’ihe dị oké ọnụ ahịa?
MGBE ọzọ ị nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke jupụtara ná ndị na-efe Jehova, letụ ndị nọ gị gburugburu anya. Chee banyere ọtụtụ ụzọ ndị ha si egosipụta okwukwe. Ị pụrụ ịhụ ndị agadi jewooro Chineke ozi ruo ọtụtụ iri afọ, ndị ntorobịa bụ́ ndị na-eguzogide nrụgide ndị ọgbọ kwa ụbọchị, na ndị mụrụ ụmụ bụ́ ndị na-arụsi ọrụ ike ịzụlite ụmụaka na-atụ egwu Chineke. E nwere ndị okenye ọgbakọ na ndị ohu na-eje ozi, bụ́ ndị bu ọtụtụ ibu ọrụ. Ee, ị pụrụ ịhụ ụmụnna ime mmụọ ndị nwoke na ndị nwanyị nọ n’afọ ndụ nile bụ́ ndị na-emeri ụdị ihe mgbochi nile iji na-ejere Jehova ozi. Lee ka okwukwe onye nke ọ bụla n’ime ha si dị oké ọnụ ahịa!—1 Pita 1:7.
2. N’ihi gịnị ka ndụmọdụ Pọl dị ná Ndị Hibru isi nke 10 na 11 ji baara anyị uru taa?
2 Ọ bụ mmadụ ole na ole na-ezughị okè, ma ọ bụrụ na e nwere, ghọtaworo ịdị mkpa nke okwukwe karịa Pọl onyeozi . N’ezie, o kwuru na ezi okwukwe na-eduga ‘n’inweta mkpụrụ obi.’ (Ndị Hibru 10:39) Otú ọ dị, Pọl maara na a pụrụ ịwakpo okwukwe, na a pụkwara imebi ya n’ụwa a na-enweghị okwukwe. O nwere nchegbu miri emi banyere ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst nọ na Jerusalem na Judia, bụ́ ndị nọ na-adọga iji chebe okwukwe ha. Ka anyị na-eleba anya n’akụkụ ụfọdụ nke Ndị Hibru isi nke 10 na 11, ka anyị rịba ama usoro Pọl ji mee ihe n’iwulite okwukwe ha. Ka anyị na-eme nke ahụ, anyị ga-ahụ otú anyị pụrụ isi wulite okwukwe ka sie ike n’ime onwe anyị nakwa n’ime ndị nọ anyị gburugburu.
Gosipụtanụ Obi Ike n’Ebe Ibe Unu Nọ
3. Olee otú okwu Pọl ndị dị ná Ndị Hibru 10:39 si egosi na o nwere obi ike n’ebe ụmụnna ya ndị nwoke na ndị nwanyị kwere ekwe nọ?
3 Ihe mbụ anyị nwere ike ịrịba ama bụ omume ziri ezi Pọl nwere n’ebe ndị na-agụ akwụkwọ ya nọ. O dere, sị: “Ma anyị onwe anyị adịghị n’etiti ndị wezụgara onwe ha ịla n’iyi; kama anyị dị n’etiti ndị kwere ekwe inweta mkpụrụ obi ha.” (Ndị Hibru 10:39) Pọl chere ihe kasị mma, ọ bụghị ihe kasị njọ, banyere ndị Kraịst ibe ya kwesịrị ntụkwasị obi. Rịbakwa ama na o ji okwu bụ́ “anyị” mee ihe. Pọl bụ onye ezi omume. Ma, ọ gwaghị ndị na-agụ akwụkwọ ya okwu mweda n’ala, dị ka a ga-asị na ezi omume ya karịrị nnọọ nke ha. (Tụlee Eklisiastis 7:16.) Kama nke ahụ, ọ gụnyekọrọ onwe ya n’etiti ha. O gosipụtara obi ike miri emi na ya na ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi na-agụ akwụkwọ ya ga-ezutecha ihe mgbochi ndị na-akụda mmụọ bụ́ ndị dị n’ihu ha, na ha ga-eji obi ike jụ iwezụga onwe ha ịla n’iyi, nakwa na ha ga-egosipụta onwe ha ịdị n’etiti ndị kwere ekwe.
4. Gịnị mere Pọl ji nwee obi ike n’ebe ndị kwere ekwe ibe ya nọ?
4 Olee otú Pọl pụrụ isi nwee obi ike dị otú ahụ? Ọ̀ bụ na ọ hụghị mmejọ nke ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst? N’ụzọ dị iche, o nyere ha ndụmọdụ a kapịrị ọnụ iji nyere ha aka imeri adịghị ike ime mmụọ ha. (Ndị Hibru 3:12; 5:12-14; 6:4-6; 10:26, 27; 12:5) Ma, Pọl nwere ma ọ dịkarịa ala ihe abụọ mere o ji nwee obi ike n’ebe ụmụnna ya nọ. (1) Dị ka onye na-eṅomi Jehova, Pọl gbalịrị ịhụ ndị Chineke dị ka Jehova si ahụ ha. Nke ahụ abụghị nnọọ n’ihe banyere emezighị emezi ha kama n’ihe banyere àgwà ọma ha na ha ịbụ ndị nwere ike ịhọrọ ime ezi ihe n’ọdịnihu. (Abụ Ọma 130:3; Ndị Efesọs 5:1) (2) Pọl nwere okwukwe pụtara ìhè n’ike nke mmụọ nsọ. Ọ maara na ọ dịghị ihe mgbochi ọ bụla, adịghị ike mmadụ ọ bụla, nke pụrụ igbochi Jehova inye onye Kraịst ọ bụla na-agbalị ijere Ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi “ọkịka nke ike.” (2 Ndị Kọrint 4:7; Ndị Filipaị 4:13) Ya mere obi ike Pọl nwere n’ebe ụmụnna ya ndị nwoke na ndị nwanyị nọ abụghị nke hiere ụzọ, nke ezi uche na-adịghị na ya, ma ọ bụ inwe nchekwube n’ụzọ na-enweghị isi. Ọ kwụụrụ chịm ma bụrụ nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ.
5. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie obi ike Pọl, gịnịkwa ka o yikarịrị ka ọ ga-arụpụta?
5 N’ezie, obi ike ahụ Pọl gosipụtara mesịrị bụrụ nke na-esi n’otu onye fere ibe ya. Pọl ịgwa ọgbakọ ndị ahụ dị na Jerusalem na Judia okwu n’ụzọ na-agba ume otú ahụ aghaghị ịbụwo ihe dị oké ọnụ ahịa nye ha. Ka ha nọ na-enweta ajọ nlelị na enweghị mmasị nke ndị Juu na-emegide ha ji mpako na-egosipụta, e ji okwu ndị dị otú ahụ nyere ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst aka ikpebisi ike n’obi ha ịdị n’etiti ndị kwere ekwe. Ànyị pụrụ ime otu ihe ahụ n’ebe ibe anyị nọ taa? Ọ dị nnọọ mfe ịhụta nanị ọtụtụ emezighị emezi na àgwà ndị na-adịghị anyị mma n’ebe ndị ozọ nọ. (Matiu 7:1-5) Ma, anyị pụrụ inyere nnọọ ibe anyị aka karị ma ọ bụrụ na anyị arịba okwukwe pụrụ iche nke onye nke ọ bụla nwere ama ma jiri ya kpọrọ ihe. Site n’agbamume dị otú ahụ, o yikarịrị ka okwukwe ọ̀ ga-amụba amụba.—Ndị Rom 1:11, 12.
Iji Okwu Chineke Eme Ihe n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị
6. Olee ebe Pọl nọ na-ehota mgbe o dere okwu ndị ahụ e dekọrọ ná Ndị Hibru 10:38?
6 Pọl wulitekwara okwukwe n’ime ndị kwere ekwe ibe ya site n’ụzọ nkà o si jiri Akwụkwọ Nsọ mee ihe. Dị ka ihe atụ, o dere, sị: “Ma onye ezi omume nke m ga-esite n’okwukwe dị ndụ: ọ bụrụkwa na ọ ga-ewezụga onwe ya, ihe ya adịghị mkpụrụ obi m ezi mma.” (Ndị Hibru 10:38) N’ebe a Pọl na-ehota okwu Habakuk onye amụma.a O yikarịrị ka ndị na-agụ akwụkwọ Pọl, bụ́ ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst bụ́ ndị maara akwụkwọ amụma ndị ahụ nke ọma, hà maara okwu ndị a nke ọma. N’ịtụle ihe mgbaru ọsọ ya—iwusikwu okwukwe ndị Kraịst nọ n’ime nakwa na nso Jerusalem n’ihe dị ka afọ 61 O.A., ike—nhọrọ ọ họọrọ ihe atụ Habakuk bụ nke dabara adaba. N’ihi gịnị?
7. Olee mgbe Habakuk dekọrọ amụma ya, oleekwa ọnọdụ ndị dị na Juda n’oge ahụ?
7 Ihe àmà na-egosi na Habakuk dere akwụkwọ ya n’ihe ji ntakịrị gafetụ iri afọ abụọ tupu mbibi Jerusalem na 607 T.O.A. N’ọhụụ, onye amụma ahụ hụrụ ndị Kaldea (ma ọ bụ, ndị Babilọn), bụ́ “mba ahụ dị ilu nke na-emekwa ngwa ngwa,” ka ha na-awakpo Juda, na-ebibikwa Jerusalem, na-elomi ndị mmadụ na mba dị iche iche ka nke ahụ na-eme. (Habakuk 1:5-11) Ma e buwo amụma ọdachi dị otú ahụ kemgbe ụbọchị Aịsaịa, ihe karịrị otu narị afọ tupu mgbe ahụ. N’oge Habakuk, Jehoiakim nọchiri ezigbo Eze Josaịa, ajọ omume jupụtakwara ọzọ na Juda. Jehoiakim kpagburu, ọbụna gbuokwa ndị na-ekwu okwu n’aha Jehova. (2 Ihe E Mere 36:5; Jeremaịa 22:17; 26:20-24) Ọ bụghị ihe ijuanya na onye amụma bụ́ Habakuk bụ́ onye ihe a na-egbu mgbu n’obi tiri mkpu, sị: “Jehova, ruo ole mgbe?”—Habakuk 1:2.
8. N’ihi gịnị ka ihe nlereanya Habakuk ji bụrụ nke bara uru nye ndị Kraịst na narị afọ mbụ nakwa taa?
8 Habakuk amaghị ókè mbibi Jerusalem dịruru nso. N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị Kraịst oge mbụ amaghị mgbe usoro ihe nke ndị Juu ga-agwụ. Anyị onwe anyị kwa taa amaghị “ụbọchị na oge awa” ahụ mgbe ikpe Jehova ga-abịakwasị ajọ usoro ihe a. (Matiu 24:36) Mgbe ahụ, ka anyị rịba azịza gbara mkpị nke Jehova nyere Habakuk ama. Nke mbụ, o mesiri onye amụma ahụ obi ike na ọgwụgwụ ga-abịa nnọọ n’oge. “Ọ gaghị anọ ọdụ,” ka Chineke kwuru, ọ bụ ezie na site n’ụzọ mmadụ si ele ihe anya, ọ pụrụ iyi ka ọ na-egbu oge. (Habakuk 2:3) Nke abụọ, Jehova chetaara Habakuk, sị: “Onye ezi omume ga-eji okwukwe ya dị ndụ.” (Habakuk 2:4) Lee eziokwu mara mma ma dị mfe nghọta okwu ndị a bụ! Ihe kasị mkpa abụghị mgbe ọgwụgwụ ga-abịa, kama ọ bụ ma ànyị ga-anọgide na-ebi ndụ nke okwukwe.
9. Olee otú ndị ohu Jehova na-erube isi si nọgide na-adị ndụ site n’ikwesị ntụkwasị obi ha (a) na 607 T.O.A.? (b) na 66 O.A.? (ch) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị mee ka okwukwe anyị sikwuo ike?
9 Mgbe e bibiri Jerusalem na 607 T.O.A., Jeremaịa, odeakwụkwọ ya bụ́ Beruk, Ebed-melek, na ndị Rikab na-eguzosi ike n’ihe hụrụ eziokwu nke nkwa Jehova kwere Habakuk. Ha ‘dịrị ndụ’ site n’ịlanarị mbibi ahụ dị egwu nke Jerusalem. N’ihi gịnị? Jehova nyere ha ụgwọ ọrụ maka ikwesị ntụkwasị obi ha. (Jeremaịa 35:1-19; 39:15-18; 43:4-7; 45:1-5) N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ aghaghị imeghachiwo omume n’ụzọ dị mma nye ndụmọdụ Pọl, n’ihi na mgbe usuu ndị agha Rom wakporo Jerusalem na 66 O.A. ma mesịa laa n’ụzọ a na-apụghị ịkọwa ihe kpatara ya, ndị Kraịst ahụ ji ikwesị ntụkwasị obi ṅaa ntị na ndụmọdụ Jisọs bụ́ ịgbapụ. (Luk 21:20, 21) Ha nọgidere na-adị ndụ n’ihi ikwesị ntụkwasị obi ha. N’otu aka ahụ kwa, anyị ga-anọgide na-adị ndụ ma ọ bụrụ na a hụta anyị dị ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi mgbe ọgwụgwụ ruru. Lee ihe dị mkpa ọ bụ mere anyị ga-eji mee ka okwukwe anyị sikwuo ike ugbu a!
Ichetaghachi Ihe Nlereanya nke Okwukwe
10. Olee otú Pọl si kọwaa okwukwe Mosis, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie Mosis n’akụkụ a?
10 Pọl wulitekwara okwukwe site n’iji ihe nlereanya eme ihe n’ụzọ dị irè. Ka ị na-agụ Ndị Hibru isi nke 11, rịba ama otú o si chetaghachi ihe nlereanya nke ndị a kpọrọ aha ha na Bible. Dị ka ihe atụ, o kwuru na Mosis “nọgidesiri ike, dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ Ya anya.” (Ndị Hibru 11:27, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Jehova dị nnọọ adị n’ezie nye Mosis nke na ọ dị ka a ga-asị na ọ pụrụ ịhụ Chineke nke a na-adịghị ahụ anya. À pụrụ ikwu otu ihe ahụ banyere anyị? Ọ dị mfe ikwu banyere iso Jehova nwee mmekọrịta, ma iwulite na ime ka mmekọrịta ahụ sie ike chọrọ ọrụ. Nke ahụ bụ ọrụ ọ dị anyị mkpa ịrụ! Jehova ọ̀ dị nnọọ adị n’ezie nye anyị nke na anyị na-echebara ya echiche mgbe anyị na-eme mkpebi, gụnyere ndị yiri ka ha dị obere? Okwukwe dị otú ahụ ga-enyere anyị aka ịtachiri ọbụna mmegide kasị njọ obi.
11, 12. (a) N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka a pụrụ ilewo okwukwe Inọk ule? (b) Ụgwọ ọrụ dị aṅaa na-enye agbamume ka Inọk nwetara?
11 Tụleekwa okwukwe Inọk. Mmegide o nwetara na-esiri anyị ike iche n’echiche. Inọk aghaghị izi ozi ikpe ọmụma na-agbakasị ahụ megide ndị ajọ omume dị ndụ mgbe ahụ. (Jud 14, 15) Ihe àmà na-egosi na mkpagbu nke yiri nwoke a kwesịrị ntụkwasị obi egwu dị nnọọ oké njọ, bụrụ nnọọ nke ime ihe ike, nke na Jehova “bubigara ya,” na-ewepụ ya site n’ọnọdụ nke ịdị ndụ gaa n’ọnọdụ nke ịrahụ ụra ọnwụ tupu aka ndị iro ya akpara ya. N’ihi ya Inọk ahụghị mmezu nke amụma ahụ o buru. Otú ọ dị, o nwetara onyinye nke kadị mma n’ụzọ ụfọdụ.—Ndị Hibru 11:5; Jenesis 5:22-24.
12 Pọl na-akọwa, sị: “Mgbe a ka-ebubigaghị [Inọk] a gbaworo ya àmà na ihe ọ na-emerị na-atọ Chineke ezi ụtọ.” (Ndị Hibru 11:5) Gịnị ka nke a pụtara? Tupu ọ rahụ ụra ọnwụ, Inọk pụrụ ịhụworị ọhụụ dị n’ụdị ụfọdụ, ikekwe banyere elu ala Paradaịs bụ́ ebe ọ ga-eteta na ya otu ụbọchị n’oge na-adịghị anya. Otú o sina dị, Jehova mere ka Inọk mara na ụzọ ndụ nke ikwesị ntụkwasị obi ya tọrọ Ya ezi ụtọ. Inọk emewo ka obi Jehova ṅụrịa. (Tụlee Ilu 27:11.) Iche banyere ndụ Inọk na-emetụ n’ahụ, ọ́ bụghị ya? Ị̀ ga-achọ ịdị ndụ nke okwukwe dị otú ahụ? Mgbe ahụ, chebara ihe nlereanya ndị dị otú ahụ echiche nke ọma; lee ha anya dị ka mmadụ ndị dị adị n’ezie. Kpebisie ike ịdị ndụ n’okwukwe, kwa ụbọchị. Chetakwa na ndị nwere okwukwe adịghị ejere Jehova ozi ná ndabere nke ụbọchị ma ọ bụ oge a kara aka mgbe Chineke ga-emezu nkwa ya nile. Kama nke ahụ, anyị kpebisiri ike ijere Jehova ozi ruo mgbe ebighị ebi! Ime otú ahụ bụ ịgbaso ụzọ ndụ kasị nnọọ mma n’usoro ihe a nakwa na nke na-abịanụ.
Ụzọ Isi Sikwuo Ike n’Okwukwe
13, 14. (a) Olee otú okwu Pọl ndị e dekọrọ ná Ndị Hibru 10:24, 25 pụrụ isi nyere anyị aka ime ka nzukọ anyị bụrụ nke na-enye ọṅụ? (b) Gịnị bụ nzube bụ́ isi nke nzukọ ndị Kraịst?
13 Pọl gosiri ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst ọtụtụ ụzọ ndị dị irè ha pụrụ isi mee ka okwukwe ha sikwuo ike. Ka anyị tụlee nanị abụọ. Ma eleghị anya anyị maara ndụmọdụ ya dị ná Ndị Hibru 10:24, 25 nke ọma, nke na-agba anyị ume izukọchi anya ná nzukọ ndị Kraịst anyị. Otú ọ dị, cheta na okwu Pọl ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ apụtaghị na anyị ga-abụ nanị ndị nkiri ná nzukọ ndị dị otú ahụ. Kama nke ahụ, Pọl na-akọwa nzukọ dị ka ohere iji matakwuo ibe anyị, ịkwali ibe anyị ijere Chineke ozi n’ụzọ zuru ezu karị, na ịgba ibe anyị ume. Anyị nọ n’ebe ahụ inye enye, ọ bụghị nanị ịnara anara. Nke ahụ na-enye aka ime ka nzukọ anyị bụrụ nke na-enye ọṅụ.—Ọrụ 20:35.
14 Otú ọ dị, n’ụzọ bụ́ isi, anyị na-aga nzukọ ndị Kraịst iji fee Jehova Chineke. Anyị na-eme otú ahụ site n’isonye n’ekpere nakwa n’abụ, site n’ige ntị nke ọma, nakwa site n’inye “mkpụrụ egbugbere ọnụ”—okwu otuto nye Jehova n’azịza anyi nakwa n’ihe omume ndị anyị nwere ná nzukọ. (Ndị Hibru 13:15) Ọ bụrụ na anyị eburu ihe mgbaru ọsọ ndị ahụ n’uche ma rụọ ọrụ na ha ná nzukọ ọ bụla, a ga-ewuliterịrị okwukwe anyị n’oge nke ọ bụla.
15. N’ihi gịnị ka Pọl ji gbaa ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst ume ijidesi ozi ha ike, n’ihi gịnịkwa ka otu ndụmọdụ ahụ ji daba adaba taa?
15 Ụzọ ọzọ isi wulite okwukwe bụ ịrụ ọrụ nkwusa. Pọl dere, sị: “Ka anyị jidesie nkwupụta nke olileanya anyị ike ka ọ ghara iruda n’ala; n’ihi na Onye ahụ Nke kwere nkwa kwesịrị ntụkwasị obi.” (Ndị Hibru 10:23) Ị pụrụ ịgba ndị ọzọ ume ka ha jidesie ihe ike mgbe o yiri ka ha nọ n’ihe ize ndụ nke ịhapụ ihe ahụ. N’ezie Setan nọ na-arụgide ndị Hibru ahụ bụ́ ndị Kraịst ka ha hapụ ozi ha, ọ na-arụgidekwa ndị Chineke taa. Mgbe anyị na-enwe nrụgide dị otú ahụ, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Tụlee ihe Pọl mere.
16, 17. (a) Olee otú Pọl si nweta ike nkwuwa okwu maka ozi ahụ? (b) Olee ihe ndị anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị ahụ na akụkụ ụfọdụ nke ozi ndị Kraịst anyị na-emenye anyị ụjọ?
16 Pọl degaara ndị Kraịst nọ na Tesalọnaịka akwụkwọ, sị: “Ọ bụ ezie na anyị hụrụrịị ahụhụ na mbụ, e meekwa anyị ihe ihere, dị ka unu matara, na Filipaị, ma anyị kwuwara okwu n’ime Chineke anyị ịgwa unu ozi ọma Chineke n’oké mgba.” (1 Ndị Tesalọnaịka 2:2) Olee otú e siworo ‘mee Pọl na ndị ha na ya so ihe ihere’ na Filipaị? Dị ka ndị ọkà mmụta ụfọdụ si kwuo, okwu Grik Pọl ji mee ihe na-egosi mmeso mkparị, nke na-emenye ihere, ma ọ bụ nke jọgburu onwe ya. Ndị ọchịchị Filipaị pịara ha ụtarị, tụba ha n’ụlọ mkpọrọ, tinyekwa ha n’ọtọsị. (Ọrụ 16:16-24) Olee otú ahụmahụ ahụ na-egbu mgbu si metụta Pọl? Ndị obodo ọzọ Pọl letara na njem ozi ala ọzọ ya, bụ́ ndị Tesalọnaịka, hà hụrụ ya ka ọ na-ewezụga onwe ya n’ihi egwu ? Ee e, o “kwuwara okwu.” O meriri egwu ma nọgide na-eji nkwuwa okwu na-eme nkwusa.
17 Olee ebe Pọl si nweta ike nkwuwa okwu ya? Ọ̀ bụ site n’onwe ya? Ee e, ọ sịrị na ya kwuwara okwu “n’ime Chineke anyị.” Otu akwụkwọ ndị nsụgharị Bible na-eme nnyocha na ya na-ekwu na a pụrụ ịsụgharị okwu a ịbụ “Chineke wepụrụ egwu n’obi anyị.” Ya mere ọ bụrụ na ị dịghị enwecha nkwuwa okwu n’ozi gị, ma ọ bụ ọ bụrụ na akụkụ ya ụfọdụ kpọmkwem na-eyi gị ka ọ na-emenye ụjọ, gịnị ma ị rịọ Jehova ka o meere gị otu ihe ahụ? Rịọ ya ka o wepụ egwu ahụ n’obi gị. Rịọ ya ka o nyere gị aka inwe nkwuwa okwu maka ọrụ ahụ. Ọzọkwa, were nzọụkwụ ndị ọzọ dị irè. Dị ka ihe atụ, mee ndokwa isoro onye nwere nkà n’ụdị ịgba àmà ahụ ị na-enwe nchegbu banyere ya rụọ. Ọ pụrụ ịgụnye ógbè azụmahịa, ịgba àmà okporo ámá, ime nkwusa mberede, ma ọ bụ iji telifon agba àmà. Ikekwe onye gị na ya na-arụkọ ga-enwe ọchịchọ ibute ụzọ na mbụ. Ọ bụrụ otú ahụ, kirie otú o si eme ya ma mụta ya. Ma mgbe e mesịrị, nwee nkwuwa okwu iji nwalee ya.
18. Olee ngọzi ndị anyị pụrụ inweta ma ọ bụrụ na anyị enwee nkwuwa okwu n’ozi anyị?
18 Ọ bụrụ na i nwee nkwuwa okwu, chee banyere ihe ọ pụrụ ịrụpụta. Mgbe ị nọgidesiri ike, n’ekweghịkwa ka i nwee nkụda mmụọ, o yikarịrị ka ị ga-enwe ahụmahụ ndị dị mma n’ikesa eziokwu ahụ, ahụmahụ ndị ị na-agaraghị enwe ma a sị na i meghị otú ahụ. (Lee peji nke 25.) Ị ga-enwe afọ ojuju nke ịmara na i mewo ihe na-atọ Jehova ụtọ site n’ime ihe na-esiri gị ike. Ị ga-enweta ngọzi na enyemaka ya n’imeri egwu gị. Okwukwe gị ga-esikwu ike. N’ezie, ị gaghị arụ ọrụ n’iwulite okwukwe ndị ọzọ n’ewuliteghị okwukwe nke gị n’otu oge ahụ.—Jud 20, 21.
19. Ụgwọ ọrụ dị aṅaa dị oké ọnụ ahịa na-echere “ndị kwere ekwe”?
19 Nọgide na-ewusi okwukwe gị na okwukwe ndị nọ gị gburugburu ike. Ị pụrụ ime otú ahụ site n’iwulite onwe gị na ndị ọzọ site n’iji nkà na-eji Okwu Chineke eme ihe, site n’ịmụ ihe nlereanya ndị dị na Bible banyere okwukwe na ichetaghachi ha, site n’ịkwadebe maka na ikere òkè ná nzukọ ndị Kraịst, na site n’ijigidesi ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa nke ozi ihu ọha ahụ ike. Ka ị na-eme ihe ndị a, jide n’aka na ị bụ, n’ezie, otu n’ime “ndị kwere ekwe.” Chetakwa na ndị dị otú a nwere ụgwọ ọrụ dị oké ọnụ ahịa. Ha “dị n’etiti ndị kwere ekwe inweta mkpụrụ obi ha.”b Ka okwukwe gị nọgide na-eto eto, ka Jehova Chineke chebekwa gị ndụ ruo mgbe ebighị ebi!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Pọl hotara nsụgharị Septuagint nke Habakuk 2:4, bụ́ nke gụnyere nkebi ahịrịokwu bụ́ “ọ bụrụkwa na ọ ga-ewezụga onwe ya, ihe ya adịghị mkpụrụ obi m ezi mma.” Okwu a apụtaghị n’ihe odide Hibru ọ bụla dị adị. Ụfọdụ enyewo echiche na Septuagint ahụ dabeere n’ihe odide Hibru ndị bu ụzọ bụ́ ndị na-adịghịzi adị. Otú o sina dị, Pọl tinyere ya n’ebe a ná mkpali nke mmụọ nsọ Chineke. Ya mere o nwere nkwado Chineke.
b Isiokwu dịịrị afọ nke Ndịàmà Jehova maka afọ 2000 ga-abụ: “Anyị adịghị n’etiti ndị wezụgara onwe ha . . . kama anyị dị n’etiti ndị kwere ekwe.”—Ndị Hibru 10:39.
-