Ha Mere Uche Jehova
E Nyere Okwukwe Nke Ndị Nne Na Nna Ụgwọ Ọrụ
NYE ndị Israel, ọmụmụ nke nwa nwoke bụ ihe na-akpata ịṅụrị ọṅụ dị ukwuu. Ọ pụtara na usoro ọmụmụ ga-anọgide nakwa na ihe nketa nke ala ga-adịgide n’ezinụlọ. Ma n’ihe dị ka afọ 1593 T.O.A., ịmụ nwa nwoke pụrụ iyiworị nkọcha karịa ngọzi nye ndị Hibru. N’ihi gịnị? N’ihi na Fero Ijipt, n’ịtụ ụjọ banyere mmụba ike ike nke ọnụ ọgụgụ ndị Juu n’ókèala nọ n’okpuru ọchịchị ya, enyewo iwu na a ga-egbu ụmụ ọhụrụ nile ha ndị nwoke.—Ọpụpụ 1:12, 15-22.
Ọ bụ n’oge a na-anwa ime mgbukpọ nke a na-awụ akpata oyi n’ahụ ka Amram and Jokebed, otu di na nwunye ndị Hibru, mụrụ otu nwa nwoke mara mma. Ọ dị mfe iche n’echiche otú ụjọ pụrụ isiworị kpuchie ọṅụ ha mgbe ha chetara iwu Fero tiri. Ma, ka Amram na Jokebed lere nwa nwoke ha anya, ha kpebisiri ike ịghara ịhapụ ya, n’agbanyeghị ihe ndị ga-esi na ya pụta.—Ọpụpụ 2:1, 2; 6:20.
Ime Ihe n’Okwukwe
Ruo ọnwa atọ, Amram na Jokebed zobere nwa ọhụrụ ha. (Ọpụpụ 2:2) Otú ọ dị, nke a dị ize ndụ, ebe ndị Hibru na ndị Ijipt bi onwe ha nso. Onye ọ bụla a hụtara na-anwa imebi iwu Fero yiri ka a ga-eji ọnwụ nye ya ahụhụ—nwa ọhụrụ ahụ ga-anwụkwa. Mgbe ahụ, gịnị ka nne na nna ndị a ji ihe akpọrọ ihe ga-eme iji debe nwa ha na ha onwe ha ndụ?
Jokebed chịkọtara alaka osisi papyrus ụfọdụ. Papyrus bụ osisi rush siri ike, yiri ọtọsị, nweekwa ókpòrò dị akụkụ atọ fọrọ nke nta ka ọ hà ibu ka mkpịsị aka. Ọ pụrụ iru mita isii n’ịdị elu. Ndị Ijipt jiri osisi a mee akwụkwọ, ute, ákwà ụgbọ, sandal, na ụgbọ epeepe ndị na-adịghị arọ.
Jokebed jiri ókpòrò ahụ rụpụta igbe ga-abali nwa ọhụrụ ya. O werezie bitumen na pitch tee ya iji jikọta igbe ahụ ọnụ na ka mmiri ghara ịba ya. Mgbe ahụ Jokebed kubara nwa ya n’ime ụgbọ ahụ ma dokwasị ya n’etiti amị n’akụkụ ụsọ Osimiri Naịl.—Ọpụpụ 2:3.
A Hụrụ Nwa Ọhụrụ Ahụ
Nwa nwanyị Jokebed, bụ́ Miriam, guzobere onwe ya n’ebe dị nso ịhụ ihe ọzọ gaje ime. E mesịa nwa nwanyị Fero bịara na Naịl ịsa ahụ.a Ikekwe Jokebed maara na adaeze na-abịakarị n’akụkụ a nke Naịl wee mara ụma hapụ igbe ahụ ebe ọ pụrụ ịdị mfe ịhụ ya. Otú ọ bụla o si dị, nwa nwanyị Fero n’oge na-adịghị anya ji anya gwuru igbe ahụ dọkwasịrị n’etiti amị, ya wee kpọọ otu n’ime ndị na-ejere ya ozi ibute ya. Mgbe ọ hụrụ nwata na-ebe ákwá n’ime ya, a kpaliri ọmịiko ya. Ọ ghọtara na ihe a bụ nwa ọhụrụ onye Hibru. Ma, olee otú ọ pụrụ isi mee ka e gbuo nwata mara mma otú a? E wezụga obiọma mmadụ, ọ pụrụ ịbụ na nkwenkwe ndị Ijipt na-ewu ewu bụ na nnabata gaa n’eluigwe dabeere n’ihe ndekọ nke omume obiọma n’oge ndụ mmadụ kpaliri nwa nwanyị Fero.b—Ọpụpụ 2:5, 6.
Miriam, onye na-ele anya site n’ebe dị anya, bịakwutere nwa nwanyị Fero. “M̀ ga-eje kpọọrọ gị nwanyị na-enye nwa ara site ná ndị inyom Hibru, ka o wee nyere gị nwa nke a ara?” ka ọ jụrụ. Adaeze zaghachiri, sị: “Jee.” Miriam gbakwuuru nne ya. N’oge na-adịghị anya, Jokebed na-eguzo n’ihu nwa nwanyị Fero. “Kuru nwa nke a laa, nyere m ya ara,” ka adaeze gwara ya, “mụ onwe m ga-enyekwa gị ụgwọ ọrụ gị.” Ọ pụrụ ịbụ n’ezie na n’oge a nwa nwanyị Fero ghọtara na Jokebed bụ nne nwa ọhụrụ ahụ.—Ọpụpụ 2:7-9.
Jokebed lekọtara nwa ya ruo mgbe a napụrụ ya ara.c Nke a nyere ya ohere ndị dị oké ọnụ ahịa ịkụziri ya banyere ezi Chineke, bụ́ Jehova. E mesịa Jokebed kpọghachiiri nwa nwanyị Fero nwata ahụ, onye gụrụ nwata nwoke ahụ Mosis, nke na-apụta “onye a zọpụtara site na mmiri.”—Ọpụpụ 2:10.
Ihe Mmụta Nye Anyị
Amram na Jokebed weere obere ohere ha nwere mee ihe n’ụzọ zuru ezu ịkụziri nwa ha nwoke ụkpụrụ nke ofufe dị ọcha. Ndị nne na nna taa kwesịrị ime otu ihe ahụ. N’ezie, ọ dị mkpa na ha mere otú ahụ. Setan bụ Ekwensu “dị ka ọdụm na-agbọ ụja, na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi.” (1 Pita 5:8) Ọ ga-achọ inweta ndị ntorobịa dị oké ọnụ ahịa—ụmụaka ndị nwoke na ndị nwanyị—ndị nwere ọdịnihu ịghọ ezi ndị ohu Jehova. Obere afọ ndụ ha adịghị adọta ọmịiko ọ bụla site n’aka ya! N’ihi nke a, ndị nne na nna nwere amamihe na-azụ ụmụ ọhụrụ ha ịtụ egwu ezi Chineke, bụ́ Jehova.—Ilu 22:6; 2 Timoti 3:14, 15.
Ná Ndị Hibru 11:23, e dekọrọ mgbalị Amram na Jokebed mere izobe nwa ọhụrụ ha n’ọnwa atọ mbụ nke ndụ ya dị ka ọrụ okwukwe. Ma nne ma nna a na-atụ egwu Chineke gosiri ntụkwasị obi n’ikike nzọpụta Jehova site n’ịjụ ịhapụ nwa ha, n’ihi nke a kwa a gọziri ha. Anyị onwe anyị kwesịrị igosi nraparasi ike n’iwu na ụkpụrụ Jehova, na-enwe obi ike na ihe ọ bụla Jehova kwere ka ọ bịakwasị anyị ga-arụpụta ọdịmma na obi ụtọ ebighị ebi anyị n’ikpeazụ.—Ndị Rom 8:28.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ndị Ijipt fere Naịl ofufe dị ka chi nke ọmụmụ. Ha kweere na mmiri ya nwere ikike inyefe ịmụ ọmụmụ na ọbụna ime ka ndụ dị ogologo.
b Ndị Ijipt kweere na n’ọnwụ mmụọ mmadụ ga-ekwughachi n’ihu Osiris ụdị nkwupụta ndị dị ka “Akpagbughị m mmadụ ọ bụla,” “Anapụghị m ụmụ na-aṅụ ara mmiri ara,” na “Enyewo m onye nọ n’agụụ achịcha na mmiri nye onye akpịrị na-akpọ nkụ.”
c N’oge ochie, e nyere ọtụtụ ụmụaka ara ogologo oge dị nnọọ ukwuu karịa ka a na-eme taa. O yiri ka Samuel ọ dị ma ọ dịkarịa ala afọ atọ mgbe a napụrụ ya ara, Aịsak dịkwa ihe dị ka afọ ise.