Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • dg akụkụ 3 p. 4-9
  • Otú Anyị Pụrụ Isi Mara na Chineke Dị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Anyị Pụrụ Isi Mara na Chineke Dị
  • Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Eluigwe na Ala Anyị nke Dị Ịtụnanya
  • A Haziri Ụwa n’Ụzọ Pụrụ Iche
  • Mkpụrụ Ndụ nke Dị Ịtụnanya
  • Ụbụrụ Anyị nke Dị Egwu
  • Usoro Pụrụ Iche nke Ọbara Ji Arụ Ọrụ
  • Ihe Ndị Ọzọ Dị Ịtụnanya
  • Onye Na-ewu Ihe nke Kasị Elu
  • Ònye Pụrụ Ịgwa Anyị?
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Ezi Uche Ọ̀ Dị n’Ikwere na Chineke?
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • ‘E Mere Anyị Ka Anyị Bụrụ Oké Ọrụ’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
dg akụkụ 3 p. 4-9

Akụkụ nke 3

Otú Anyị Pụrụ Isi Mara na Chineke Dị

1, 2. Olee ụkpụrụ na-enyere anyị aka ikpebi ma Chineke ọ̀ dị?

OTU ụzọ isi chọpụta ma Chineke ọ̀ dị bụ itinye ụkpụrụ nke a a maara nke ọma n’ọrụ: Ihe e mere eme aghaghị inwe onye mere ya. Ruo n’ókè ihe ahụ e mere dị mgbagwoju anya, ọ bụ ruo n’ókè ahụ ka onye mere ya na-aghaghị ịbụ onye nwere nkà.

2 Dị ka ihe atụ, legharịa anya n’ụlọ gị. Table, oche, desk, àkwà, ite, ọ̀kụ̀, efere na arịa ndị ọzọ e ji eri nri aghaghị inwe onye mere ha, dịkwa ka mgbidi, ala ụlọ, na ùkó ụlọ. Ma, ihe ndị ahụ dị mfe ime karị. Ebe ọ bụ na ihe ndị dị mfe aghaghị inwe onye mere ha, ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya na ihe ndị dị mgbagwoju anya aghaghị inwe onye mere ha, bụ́ onye nwere ọgụgụ isi ọbụna karị?

Eluigwe na Ala Anyị nke Dị Ịtụnanya

3, 4. Olee otú eluigwe na ala si enyere anyị aka ịmara na Chineke dị?

3 Elekere aghaghị inwe onye ne-eme elekere. Olee banyere ìgwè ụwa anyanwụ anyị nke dị mgbagwoju anya gabiga ókè, nke Anyanwụ na mbara ụwa ya dị iche iche ji usoro nke na-adịghị ehie ụzọ na-agba ya gburugburu site na narị afọ ruo na narị afọ? Olee banyere ụyọkọ kpakpando dị ịtụnanya anyị bi n’ime ya, nke a na-akpọ Milky Way, nke nwere ihe karịrị 100 ijeri kpakpando? Ọ̀ dịtụwo mgbe ị kwụsịrị n’abalị ile anya na Milky Way? Ọ̀ kpaliri mmasị gị? Mgbe ahụ chee banyere eluigwe na ala na-enweghị nsọtụ nke nwere ọtụtụ ijeri ụyọkọ kpakpando ndị dị ka Milky Way anyị! Ọzọ, a pụrụ ịdabere kpam kpam n’usoro ngagharị nke mbara ụwa ndị dị n’eluigwe site na narị afọ ruo na narị nke na e jiriwo ha tụnyere ihe ndị na-edebe oge n’ehieghị ụzọ.

4 Ọ bụrụ na elekere, bụ́ nke dị mfe karị, na-egosipụta ịdị adị nke onye na-eme elekere, ihe ịrụ ụka adịghị ya na eluigwe na ala nke dị mgbagwoju anya nke ukwuu karị ma dị ịtụnanya na-egosipụta ịdị adị nke onye nhazi na onye ome nkà. Ọ bụ nke ahụ mere Bible ji na-akpọ anyị òkù ka anyị ‘welie anya anyị elu ma hụ,’ mgbe ahụ ọ na-ajụkwa, sị: “Ọ̀ bụ ònye kere ihe ndị a?” Azịza ya: “Ọ bụ Onye ahụ [Chineke] nke na-eme ka usuu ha pụta n’ọnụ ọgụgụ: ha nile n’aha ha ka ọ na-akpọ; site n’ịba ụba nke ike ya, na n’ihi na o nwere ume n’ike, ọ dịghị ihe fọdụrụ nke a na-agụghị.” (Aịsaịa 40:26) Otú a, eluigwe na ala dị adị n’ihi otu ike nke a na-adịghị ahụ anya, nke na-eduzi ihe, nke nwere ọgụgụ isi​—⁠Chineke.

A Haziri Ụwa n’Ụzọ Pụrụ Iche

5-7. Eziokwu ndị dị aṅaa banyere ụwa na-egosi na o nwere Onye Haziri ya?

5 Ka ndị ọkà mmụta sayensị na-amụwanye ihe banyere ụwa, otú ahụ ka ha na-amatawanye na a haziri ya n’ụzọ pụrụ iche maka mmadụ ibi na ya. Ọ nọ nnọọ n’ebe kwesịrị ekwesị pụọ n’ebe anyanwụ nọ iji nweta ọ̀tụ̀tụ̀ nke ìhè na nke okpomọkụ kwesịrị ekwesị. Otu ugbo n’afọ, ọ na-agazu gburugburu anyanwụ, na-enwe ọnọdụ kwesịrị nnọọ ekwesị, na-eme ka o kwee omume inwe oge dịgasị iche iche n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa. Ụwa na-agbakwa gburugburu n’ahịrị nke ya n’ime 24 hour ọ bụla, na-eme ka e nwee oge ìhè na oge ọchịchịrị n’ụzọ na-adịgide adịgide. O nwere ihe mkpuchi ya nke nwere ngwakọrịta ikuku nke kwesịrị nnọọ ekwesị ka anyị wee nwee ike ikuru ume ma bụrụ ndị e chebere pụọ n’ụzarị na-emerụ ahụ nke si ná mbara igwe. O nwekwara mmiri na ájá dị mkpa iji zụlite nri.

6 E wezụga ihe ndị ahụ nile na ndị ọzọ ịrụkọ ọrụ ọnụ, ịdị adị nke ndụ ga-abụ ihe na-agaghị ekwe omume. Ihe ndị ahụ nile hà bụcha ihe ndabara? Magazin bụ́ Science News na-asị: “O yiri ka à ga-asị na ụdị ọnọdụ ndị ahụ kpọmkwem agaraghị enwe ike ibilite ná ndabara.” Ee e, ha apụghị. Ha nwere nhazi nke nzube dị na ya, nke sitere n’aka ezi Onye Na-eme Nhazi.

7 Ọ bụrụ na ị banye n’ime ụlọ mara mma ma chọpụta na a kwanyejuru nri n’ime ya, na o nwere usoro magburu onwe ya nke inye okpomọkụ na ịjụ oyi, na o nwekwara usoro nkesa mmiri, iji webata mmiri n’ime ya, gịnị ga-abụ nkwubi okwu gị? Na ihe nile pụtara n’onwe ya? Ee e, ị ghaghị ikwubi na otu onye nke nwere ọgụgụ isi haziri ya ma jiri ezi nlezi anya mee ya. E jikwa ezi nlezi anya mee nhazi nke ụwa ma mee ya ka o nwee ike inye ndị bi n’ime ya ihe dị ha mkpa, ọ dịkwa mgbagwoju anya ma nwezuo ihe nile nke ukwuu karịa ụlọ ọ bụla.

8. Olee ihe ọzọ banyere ụwa nke na-egosi na Chineke ji ịhụnaya na-eche banyere anyị?

8 Ọzọ, tụlee ọtụtụ ihe ndị na-emewanye ka ndụ dị ụtọ. Leenụ ọtụtụ ụdị dị iche iche nke okooko osisi ndị nwere àgwà ọma dị iche iche na ísì ụtọ ndị na-amasị mmadụ. E nwekwara ọtụtụ ụdị dị iche iche nke nri ndị na-atọ anyị ụtọ nke ukwuu. E nwere ọhịa dị iche iche, ugwu, ọdọ mmiri, na ihe ndị ọzọ e kere eke ndị mara mma ile anya. Ọzọ, olee banyere ịma mma nke ọdịda anyanwụ, bụ́ nke na-eme ka anyị nụwanye ụtọ nke ndụ? A bịakwa n’ógbè nke ụmụ anụmanụ, ọ̀ bụ na anyị adịghị enwe obi ụtọ n’egwuregwu na ụdịdị na-akpali ịhụnanya nke ụmụ nkịta, ụmụ nwamba, na ụmụ anụ ndị ọzọ? Ya mere ụwa na-enye ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị ịtụnanya, ndị na-adịchaghị mkpa iji nọgide na-adị ndụ. Ndị a na-egosi na e bu mmadụ n’uche wee jiri nchebara echiche ịhụnanya hazie ụwa, ka anyị wee ghara ịdị nanị ndụ, kama, nweta ọṅụ ná ndụ.

9. Ònye mere ụwa, n’ihi gịnịkwa ka o ji mee ya?

9 Ya mere, nkwubi okwu ezi uche dị na ya bụ ikweta na e nwere Onye Nyere ihe ndị a, dị ka onye ahụ so dee Bible mere, onye kwuru banyere Jehova Chineke, sị: “Gị onwe gị mere eluigwe na ụwa.” N’ihi nzube dị aṅaa? Ọ na-enye azịza ya site n’ịkọwa Chineke dị ka “Onye kpụworo ụwa, mee ya; ya onwe ya mere ka o guzosie ike, ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka o kere ya, ọ bụ ka e wee biri n’ime ya ka ọ kpụrụ ya.”​—⁠Aịsaịa 37:⁠16; 45:⁠18.

Mkpụrụ Ndụ nke Dị Ịtụnanya

10, 11. N’ihi gịnị ka mkpụrụ ndụ ji bụrụ ihe dị ịtụnanya?

10 Olee banyere ihe ndị dị ndụ? Ọ̀ bụ na ọ dịghị mkpa na ha ga-enwe onye mere ha? Dị ka ihe atụ, tụlee ole na ole n’akụkụ ndị dị ịtụnanya banyere mkpụrụ ndụ. N’akwụkwọ ya bụ Evolution: A Theory in Crisis, onye ọkà n’ihe ọmụmụ banyere ndụ nke ihe ndị dịkarịsị nta, bụ́ Michael Denton kwuru, sị: “Ọbụna nke kasị mfe n’usoro nile nke ihe ndị dị ndụ n’ụwa taa, bụ́ mkpụrụ ndụ nke nje bacteria, bụ ihe dị mgbagwoju anya gabiga ókè. Ọ bụ ezie na mkpụrụ ndụ kasị dị nta nke nje bacteria dị nnọọ nta nke ukwuu, . . . nke ọ bụla n’ime ha bụ, n’ezie, ụlọ ọrụ e ji ọ̀tụ̀tụ̀ dị nnọọ ukwuu mee ka ọ dị nta, nke nwere ọtụtụ puku akụkụ dị iche iche nke ígwè ọrụ kasị dị nta siri ike ịghọta, bụ́ nke a haziri n’ụzọ dị ebube . . . nke dị mgbagwoju anya nke ukwuu karịa ígwè ọrụ ọ bụla mmadụ mere ma bụrụkwa nke a na-enweghị ihe a ga-eji tụnyere ya n’ógbè nke ihe ndị na-adịghị ndụ.”

11 Banyere ụkpụrụ nketa ọmụmụ nke dị n’ime mkpụrụ ndụ ọ bụla, ọ sịrị: “Ikike mkpụrụ ndụ DNA nwere ichebe ihe ọmụma karịrị nnọọ nke e nwere n’usoro ọ bụla ọzọ ebe ọ dị ukwuu; ọ na-arụ ọrụ nke ọma nke ukwuu nke na ihe ọmụma nile dị mkpa iji gosipụta kpọmkwem ihe nile banyere ihe dị mgbagwoju anya dị ka mmadụ, nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị arọ dị ala karịa otu ụzọ n’ụzọ puku nde ole na ole nke otu gram. . . . E jiri ya tụnyere ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịdị nkà na ịdị mgbagwoju anya nke e gosipụtara n’ígwè ọrụ kasị nta nke ndụ, ọbụna nke kasị mma n’ihe ndị anyị [mepụtara] na-eyi ihe a na-arụzighị arụzi. Anyị na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị e wedara ala.”

12. Gịnị ka otu onye ọkà mmụta sayensị kwuru banyere mmalite nke mkpụrụ ndụ?

12 Denton kwukwara, sị: “Ịdị mgbagwoju anya nke ụdị kasị dị mfe a maara nke mkpụrụ ndụ dị ukwuu nke na ọ bụ ihe na-agaghị ekwe omume ikweta na ọ pụrụ ịbụworị na e jikọrọ ụdị ihe dị adị dị otú ahụ na mberede site n’ụdị ụfọdụ nke ihe omume na-enweghị ihe ndabere, nke na-eyighị ka ọ ga-eme eme n’ezie.” Ọ ghaghị inwe onye haziri ma mee ya.

Ụbụrụ Anyị nke Dị Egwu

13, 14. N’ihi gịnị ka ụbụrụ ji dị ịtụnanya ọbụna karịa mkpụrụ ndụ?

13 Mgbe ahụ onye ọkà mmụta sayensị nke a sịrị: “Banyere ịdị mgbagwoju anya, otu mkpụrụ ndụ abụghị ihe ọ bụla ma e jiri ya tụnyere usoro nke ụbụrụ nke ihe ndị dị ndụ ndị na-enye ụmụ ha ara. Ụbụrụ mmadụ nwere ihe dị ka iri puku nde nke mkpụrụ ndụ akwara. Mkpụrụ ndụ akwara nke ọ bụla na-achịpụta ihe dị ka malite na puku iri ruo otu narị puku irighiri akwara njikọ ndị o ji ejikọ onwe ya gaa ná mkpụrụ ndụ akwara ndị ọzọ dị n’ụbụrụ. Ná ngụkọta, ọnụ ọgụgụ nke njikọ ndị e nwere n’ụbụrụ mmadụ ruru . . . otu nde puku nde.”

14 Denton gara n’ihu, sị: “Ọbụna ọ bụrụ na ọ bụ nanị otu ụzọ n’ime otu narị ụzọ nke njikọ ndị dị n’ụbụrụ ka a haziri ahazi kpọmkwem, nke a ka ga-abụkwa usoro nke nwere kpọmkwem, ọnụ ọgụgụ njikọ dị iche iche karịa nke e nwere n’usoro nzirịta ozi nile dị n’Ụwa.” Mgbe ahụ ọ jụrụ, sị: “Ọ̀ dị ụdị usoro ọ bụla sitere kpam kpam n’ihe ndabara nke nwere ike ijikọtaworịị usoro ndị ahụ ọnụ?” O doro anya na azịza ya aghaghị ịbụ ee e. Ụbụrụ aghaghị inweworị Onye Nhazi na Onye Mere ya nke na-eche banyere anyị.

15. Okwu ndị dị aṅaa ka ndị ọzọ kwuru banyere ụbụrụ?

15 Ụbụrụ mmadụ na-eme ka ọbụna ígwè kọmputa kachasị mma yie ihe e mere mgbe ụwa ka nọ n’ìsì. Onye na-ede edemede banyere sayensị, bụ́ Morton Hunt sịrị: “Usoro ncheta ihe anyị nke na-arụsi ọrụ ike na-echekwa ihe ọmụma ji ọtụtụ ijeri ugboro karịa nnukwu kọmputa e ji eme nnyocha nke e nwere n’oge a.” Otú a, onye na-agwọ ọrịa ụbụrụ, bụ́ Dr. Robert J. White kwubiri, sị: “Enweghị m ihe ọzọ ime karịa ikwere n’ịdị adị nke Ọgụgụ Isi Ka Elu, nke ọ bụ ya haziri ma mepụta nrụrịta ọrụ dị ebube nke ụbụrụ na uche​—⁠bụ́ ihe karịrị nghọta mmadụ nke ukwuu. . . . Aghaghị m ikwere na ihe a nile nwere mmalite ya n’aka otu onye nke nwere ọgụgụ isi, na Otu Onye mere ka ọ malite ịdị adị. Ọ ghaghịkwa ịbụ Onye nke na-eche banyere anyị.

Usoro Pụrụ Iche nke Ọbara Ji Arụ Ọrụ

16-18. (a) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka usoro ọbara ji arụ ọrụ si bụrụ nke pụrụ iche? (b) Ná nkwubi okwu dị aṅaa ka e kwesịrị ịdọta anyị?

16 Tụleekwa usoro pụrụ iche nke ọbara ji arụ ọrụ bụ́ nke na-ebugharị nri na ikuku ndụ oxygen ma na-enye nchebe pụọ n’ibute ọrịa. Banyere mkpụrụ ndụ ọbara uhie, bụ́ akụkụ bụ isi nke mejupụtara usoro a, akwụkwọ bụ́ ABC’s of the Human Body na-asị: “Otu ntapụ nke ọbara nwere n’ime ya, ihe karịrị 250 nde mkpụrụ ndụ ọbara ndị dịgasị iche . . . Ma eleghị anya ahụ nwere 25 puku ijeri nke mkpụrụ ndụ ndị a, bụ́ nke zuru ezu, ma a gbasapụ ya, ikpuchite mbara ala anọ nke egwuregwu tennis. . . . A na-agbanwe ha n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nde 3 nke mkpụrụ ndụ ọhụrụ kwa sekọnd.”

17 Banyere mkpụrụ ndụ ọbara ọcha, nke bụ akụkụ ọzọ nke usoro pụrụ iche ọbara ji arụ ọrụ, otu akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na e nwere otu ụdị nke mkpụrụ ndụ ọbara uhie, mkpụrụ ndụ ọbara ọcha na-abịa n’ụdị dịgasị iche iche, ụdị nke ọ bụla na-enwe ike iburu ahụ agha n’ụzọ dị iche. Dị ka ihe atụ, otu ụdị na-ebibi mkpụrụ ndụ ndị nwụrụ anwụ. Ụdị ndị ọzọ na-emepụta ihe mgbochi megide nje virus dị iche iche wepụ nsí dị n’ihe ụfọdụ ndị na-abata n’ime ahụ, ma ọ bụ rie ma gbarie nje bacteria n’ụzọ nkịtị.”

18 Lee usoro dị ịtụnanya a haziri nnọọ nke ọma ọ bụ! N’ezie, ihe ọ bụla e jikọtara ọnụ nke ọma ma na-enye nchebe nke ọma aghaghị inwe onye nhazi nke nwere ọgụgụ isi ma na-eche banyere ya​—⁠bụ́ Chineke.

Ihe Ndị Ọzọ Dị Ịtụnanya

19. Olee otú anya dị ma e jiri ya tụnyere ígwè ọrụ ndị mmadụ mere?

19 E nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị ịtụnanya n’ahụ mmadụ. Otu bụ anya, bụ́ nke a haziri nke ọma nke na ọ dịghị kamera ọ bụla pụrụ ịrụ ọrụ ka ya. Onye na-enyocha mbara igwe, bụ́ Robert Jastrow sịrị: “Anya yiri ihe a haziri ahazi; ọ dịghị onye ọ bụla na-ahazi ígwè ọrụ e ji ahụ ihe n’ebe dị anya nke pụrụ imeworị nke ka mma.” Akwụkwọ bụ Popular Photography na-akọkwa, sị: “Anya mmadụ na-ahụ ihe n’ozuzu ya nke ukwuu karịa otú akwụkwọ foto na-eme. Ha na-ahụzi ihe dị n’akụkụ atọ nke ọma n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nnọọ obosara, n’akwụsịghị akwụsị . . . Iji kamera tụnyere anya mmadụ bụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na-ezighị ezi. Anya mmadụ dị ka ọkpọka kọmputa kachasị mma nke nwere ọgụgụ isi a rụnyere n’ime ya, ikike ịkọwa ihe ọmụma, ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị ngwa, na ụdị dị iche iche o ji arụ ọrụ bụ́ ndị karịrị ígwè ọrụ ọ bụla mmadụ mere n’ebe ọ dị ukwuu, ma ọ̀ bụ kọmputa ma ọ bụ kamera.”

20. Olee akụkụ ndị ọzọ dị ịtụnanya nke ahụ mmadụ?

20 Cheekwa banyere otú akụkụ ahụ dị iche iche dị mgbagwoju anya si arụkọ ọrụ ọnụ n’abụghị ná mgbalị ọ bụla anyị ma ụma na-etinye. Dị ka ihe atụ, anyị na-etinye ụdị dị iche iche nke nri na ihe ọṅụṅụ n’ime afọ anyị, ma ahụ na-agbari ha ma na-emepụta ike. Nwalee itinye ọtụtụ ihe dị iche iche ndị ahụ n’ime ebe a na-agbanye mmanụ ụgbọ ala ma lee ihe ọ ga-emepụta! A ka nwekwara ọrụ ebube nke ịmụ nwa, ya bụ ịmụpụta nwa ọhụrụ mara mma​—⁠nke na-eyi ndị mụrụ ya​—⁠nanị n’ọnwa itoolu. Oleekwa banyere ikike nwata nke dị nanị afọ ole na ole nwere ịmụta otú e si ekwu okwu n’asụsụ nke siri ike mmụta?

21. N’ịtụle ihe ndi dị ịtụnanya dị n’ahụ, gịnị ka ndị nwere uche na-ekwu?

21 Ee, ọtụtụ ihe ndị e kere eke ndị dị ebube ma dị mgbagwoju anya n’ahụ mmadụ na-eme ka anyị jupụta n’egwu. Ọ dịghị onye injinia ọ bụla pụrụ ịrụgharị ihe ndị ahụ. Hà pụrụ ịbụ nanị ihe ndị sitere ná ndabara efu? Ọ dịghị ma ọlị. Kama nke ahụ, mgbe ha na-atụle akụkụ nile dị ịtụnanya nke ahụ mmadụ, ndị nwere uche na-ekwu dị ka onye ọbụ abụ ahụ, sị: “M ga-ekele gị [Chineke]; n’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ: oké ọrụ ka ọrụ gị nile dị.”​—⁠Abụ Ọma 139:14.

Onye Na-ewu Ihe nke Kasị Elu

22, 23. (a) N’ịhi gịnị ka anyị kwesịrị iji kwere n’ịdị adị nke Onye Okike? (b) Gịnị ka Bible na-ekwu n’ụzọ ziri ezi banyere Chineke?

22 Bible na-asị: “Ụlọ ọ bụla nwere onye wuru ya n’ezie, ma Chineke wuru ihe nile dị adị.” (Ndị Hibru 3:⁠4, The Jerusalem Bible) Ebe ụlọ ọ bụla, n’agbanyeghị otú o si dị mfe, na-aghaghị inwe onye wuru ya, mgbe ahụ eluigwe na ala nke dị mgbagwoju anya nke ukwuu karị, tinyere ọtụtụ ụdị dị iche iche nke ndụ ndị dị n’elu ala aghaghịkwa inweworị onye wuru ha. Ebe ọ bụkwa na anyị kwetara n’ịdị adị nke ụmụ mmadụ ndị mepụtara ígwè ọrụ ndị dị ka ụgbọ elu, telivishọn, na kọmputa, ọ̀ bụ na anyị agaghị ekwere n’ịdị adị nke Onye ahụ nyere ụmụ mmadụ ụbụrụ iji mee ihe ndị dị otú ahụ?

23 Bible na-eme otú ahụ, na-akpọ ya “[“Ezi,” NW] Chineke, bụ́ Jehova, . . . Onye keworo eluigwe, setịpụkwa ha; Onye meworo ụwa na ihe nile nke si n’ime ya apụta ka ọ saa mbara; Onye na-enye ndị bi n’elu ya ume ha na-eku.” (Aịsaịa 42:⁠5) Bible na-ekwupụta n’ụzọ ziri ezi, sị: “Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, i kwesịrị ịnara otuto nile na nsọpụrụ nile na ike nile: n’ihi na gị onwe gị kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ gị ka ha dịrị, ka e kekwara ha eke.”​—⁠Mkpughe 4:⁠11.

24. Olee otú anyị pụrụ isi mara na Chineke dị?

24 Ee, anyị pụrụ ịma na Chineke dị site n’ihe ndị o meworo. “N’ihi na àgwà [Chineke] anya na-adịghị ahụ ka a na-ahụ nke ọma site n’okike ụwa gaa n’ihu, n’ihi na a na-ahụ ha site n’ihe ndị [Chineke] mere.”​—⁠Ndị Rom 1:⁠20.

25, 26. N’ihi gịnị ka iji ihe mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na-ejighị bụrụ ihe mere a ga-eji sị na o nweghị onye mere ya?

25 Eziokwu ahụ nke bụ na e ji ihe e mere eme na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi apụtaghị na o nweghị onye mere ya. A pụrụ iji ụgbọ elu mee ihe maka udo, dị ka ụgbọ elu na-ebu ndị njem. Ma a pụkwara iji ya mee ihe maka mbibi, dị ka ụgbọ elu na-atụ bọmbụ. Ya ịbụ nke e ji mee ihe n’ụzọ na-eweta ọnwụ apụtaghị na ọ dịghị onye mere ya.

26 N’ụzọ yiri nke ahụ, eziokwu ahụ bụ na ụmụ mmadụ echigharịwo ime ihe ọjọọ mgbe mgbe karị apụtaghị na ha enweghị Onye Mere ha, na Chineke adịghị. N’ihi nke a Bible na-ekwu n’ụzọ ziri ezi, sị: “Lee, ka unu si ekpu ihe ihu nke ukwuu! Ọ̀ bụ n’ụrọ ka a ga-agụ ọkpụ ite? na ihe e mere eme ga-ekwu okwu banyere onye meworo ya, sị, O meghị m; ma ọ bụ na ihe a kpụrụ akpụ ga-ekwu okwu banyere onye kpụworo ya, sị, Ọ ghọtaghị.”​—⁠Aịsaịa 29:⁠16.

27. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji tụọ anya ka Chineke zaa ajụjụ anyị ndị metụtara ịta ahụhụ?

27 Onye Okike ahụ egosiwo amamihe ya site ná mgbagwoju anya dị ebube nke ihe o meworo. O gosiwo na ya na-eche banyere anyị site n’ime ụwa otú o kwesịrị kpọmkwem ka anyị biri n’elu ya, site n’ime ahụ na uche anyị n’ụzọ dị ịtụnanya otú a, nakwa site n’ime ọtụtụ ihe ndị dị mma ka anyị wee nweta ọṅụ na ha. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ ga-egosi ụdị amamihe na nchebara echiche yiri nke ahụ site n’ime ka a mara azịza nye ajụjụ ndị ahụ dị ka: N’ihi gịnị ka Chineke jiworo kwere ka ahụhụ dịrị? Gịnị ka ọ ga-eme banyere ya?

[Foto dị na peeji nke 5]

Ụwa, ya na ihe mkpuchi ya nke na-enye nchebe, bụ ebe obibi pụrụ iche e dokwara maka anyị site n’aka Chineke nke na-eche banyere anyị

[Foto dị na peeji nke 6]

E ji nchebara echiche ịhụnanya mee ụwa ka anyị wee nwee ike inweta ọṅụ zuru ezu ná ndụ

[Foto dị na peeji nke 7]

‘Otu ụbụrụ nwere ihe ọmụma karịa usoro nzirịta ozi nile dị n’Ụwa.’​—⁠Onye ọkà n’ihe ọmụmụ nke ndụ nke ihe ndị kasị nta

[Foto dị na peeji nke 8]

“Anya yiri ihe a haziri ahazi; ọ dịghị onye ọ bụla na-ahazi ígwè ọrụ e ji ahụ ihe n’ebe dị anya nke pụrụ imeworị nke ka mma.”​—⁠Onye na-enyocha mbara igwe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya