-
Kpachara Anya Banyere Enweghị OkwukweỤlọ Nche—1998 | Julaị 15
-
-
“Unu Emela Ka Obi Unu Sie Ike”
13. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Pọl nyere, oleekwa otú o si jiri Abụ Ọma nke 95 mee ihe?
13 Mgbe ọ tụlesịrị ọnọdụ ihu ọma nke ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru, Pọl nyere ịdọ aka ná ntị a: “Dị ka Mmụọ Nsọ na-asị, Taa, ọ bụrụ na unu ga-anụ olu Ya, unu emela ka obi unu sie ike, dị ka n’ịkpasu obi ilu ahụ, dị ka e mere n’ụbọchị ọnwụnwa ahụ n’ọhịa.” (Ndị Hibru 3:7, 8) Pọl na-ehota ihe dị n’Abụ Ọma nke 95, n’ihi ya kwa ọ pụrụ ikwu na “Mmụọ Nsọ na-asị.”b (Abụ Ọma 95:7, 8; Ọpụpụ 17:1-7) Akwụkwọ Nsọ bụ ihe e ji ike mmụọ nsọ Chineke dee.—2 Timoti 3:16.
14. Olee otú ndị Israel si meghachi omume nye ihe Jehova mewooro ha, n’ihi gịnịkwa?
14 Mgbe a tọhapụsịrị ha n’ịbụ ohu n’Ijipt, e nyere ndị Israel ihe ùgwù dị ukwuu nke isoro Jehova banye ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ. (Ọpụpụ 19:4, 5; 24:7, 8) Otú ọ dị, kama igosipụta ekele maka ihe Chineke mewooro ha, n’oge na-adịghị anya ha nupụrụ isi. (Ọnụ Ọgụgụ 13:25–14:10) Olee otú nke ahụ pụrụ isiworị mee? Pọl zoro aka n’ihe kpatara ya: ime ka obi ha sie ike. Ma olee otú obi ndị ihe na-emetụta, ndị na-anabatakwa Okwu Chineke ga-esi sie ike? Gịnịkwa ka anyị na-aghaghị ime iji gbochie nke a?
15. (a) Olee otú e siworo nụ ‘olu Chineke,’ n’oge ochie na n’oge a? (b) Olee ajụjụ ndị dị mkpa ka anyị jụọ onwe anyị banyere ‘olu Chineke’?
15 Pọl ji nkebi ahịrịokwu dabeere n’ọnọdụ bụ́ “ọ bụrụ na unu ga-anụ olu Ya” malite ịdọ aka ná ntị ya. Chineke gwara ndị ya okwu site n’ọnụ Mosis na ndị amụma ọzọ. E mesịa, Jehova gwara ha okwu site n’ọnụ Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst. (Ndị Hibru 1:1, 2) Taa, anyị nwere Okwu Chineke zuru ezu e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible Nsọ. Anyị nwekwara “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” onye Jisọs họpụtara inye nri ime mmụọ “n’oge ya.” (Matiu 24:45-47) N’ihi ya, Chineke ka na-ekwu okwu. Ma ànyị na-aṅa ntị? Dị ka ihe atụ, olee otú anyị si emeghachi omume nye ndụmọdụ banyere uwe na ejiji ma ọ bụ ntụrụndụ na egwú ndị anyị na-ahọrọ? Ànyị ‘na-anụ olu Ya,’ ya bụ, ṅaa ntị ma rube isi n’ihe anyị na-anụ? Ọ bụrụ na anyị nwere àgwà nke ime ngọpụ ma ọ bụ ịjụ ịnara ndụmọdụ ahụ, anyị na-ekpughepụ onwe anyị nye ihe ize ndụ zoro ezo nke ime ka obi anyị sie ike.
16. Olee otu ụzọ nke obi anyị pụrụ isi sie ike?
16 Obi anyị pụkwara isi ike ma ọ bụrụ na anyị agbahapụ ihe anyị pụrụ ime na ihe anyị kwesịrị ime. (Jemes 4:17) N’agbanyeghị ihe nile Jehova meere ndị Israel, ha egosipụtaghị okwukwe, nupụụrụ Mosis isi, họrọ ikwere akụkọ ọjọọ banyere Kenean, ma jụ ịbanye n’Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụgụ 14:1-4) N’ihi ya Jehova nyere iwu na ha ga-anọ n’ọzara afọ 40—oge zuru ezu ka ndị so ná ndị na-enweghị okwukwe nke ọgbọ ahụ nwụsịa. N’iwesa ha iwe, Chineke kwuru, sị: “Ha na-ejehie mgbe nile n’obi ha: ma ndị ahụ amaghị ụzọ m nile; dị ka M ṅụrụ iyi n’iwe m, ha agaghị aba n’izu ike m ma ọlị.” (Ndị Hibru 3:9-11) Ànyị na-ahụ ihe mmụta dị na nke a nye anyị?
-
-
Kpachara Anya Banyere Enweghị OkwukweỤlọ Nche—1998 | Julaị 15
-
-
19. Olee otú aṅaghị ntị na ndụmọdụ pụrụ isi duje n’ihe dị oké njọ? Nye ihe atụ.
19 Ya mere, ihe mmụta dị na ya bụ na ọ bụrụ na anyị adaba n’àgwà nke ‘anụghị olu Ya,’ na-eleghara ndụmọdụ Jehova nyere site n’Okwu ya na òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, ọ gaghị adị anya tupu obi anyị akpọọ nkụ, sie ike. Dị ka ihe atụ, mmadụ abụọ na-alụbeghị dị na nwunye pụrụ ịkpatụ onwe ha nso gabiga ókè. Gịnị ma ha leghara okwu ahụ anya? Nke ahụ ọ̀ ga-egbochi ha imeghachi ihe ha mere, ka nke ahụ ọ̀ ga-eme ka ọ dịrị ha nnọọ mfe ime ya ọzọ? N’otu aka ahụ, mgbe òtù ohu ahụ nyere ndụmọdụ banyere mkpa ọ dị ime nhọrọ n’egwú na ntụrụndụ anyị, na ihe ndị ọzọ, ànyị na-eji ekele anara ya ma mee mgbanwe n’ebe ọ dị mkpa? Pọl gbara anyị ume ‘ka anyị ghara ịhapụ nzukọ nke onwe anyị.’ (Ndị Hibru 10:24, 25) N’agbanyeghị ndụmọdụ a, ụfọdụ na-ele nzukọ ndị Kraịst anya dị ka ihe na-adịghị oké mkpa. Ha pụrụ iche na ịhapụ ụfọdụ n’ime ha ma ọ bụ ọbụna ileghara nzukọ ụfọdụ anya kpam kpam enweghị ihe ọ ga-arụpụta.
-
-
Kpachara Anya Banyere Enweghị OkwukweỤlọ Nche—1998 | Julaị 15
-
-
b Ihe àmà na-egosi na Pọl hotara ihe sitere na Septuagint nke Grik, nke na-asụgharị okwu Hibru maka “Meriba” dị ka “iseokwu” na “Masa” dị ka “ọnwụnwa.” Lee peji nke 350 na 379 n’ime mpịakọta nke 2 nke Insight on the Scriptures, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
-