Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 11/15 p. 29-31
  • Ọnisifọrọs Onye Nkasi Obi Nwere Obi Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọnisifọrọs Onye Nkasi Obi Nwere Obi Ike
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịtụ Pọl Mkpọrọ nke Ugbo Abụọ
  • Ileta Pọl Onye Mkpọrọ
  • Gịnị Mere Ọnisifọrọs?
  • Ka Anyị Bụrụ Ndị Nkasi Obi Na-eguzosi Ike n’Ihe
  • Gee Ntị Ka Ị Nụ Mgbe A Ga-aza Ajụjụ Ndị A
    2024-2025 Usoro Ihe Omume Mgbakọ Sekit nke Onye Na-anọchite Anya Alaka Ụlọ Ọrụ
  • Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Mee Ka Ị Kwụsị Ife Jehova
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ndị Ha na Pọl Rụkọrọ Ọrụ—Hà Bụ Ole Ndị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • ‘Ịgba Àmà nke Ọma’
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 11/15 p. 29-31

Ọnisifọrọs Onye Nkasi Obi Nwere Obi Ike

“NA-ECHETANỤ ndị nọ n’agbụ, dị ka ndị e kekọworo unu na ha n’agbụ; na-echetanụ ndị a na-emejọ.” (Ndị Hibru 13:3) Mgbe Pọl onyeozi dere okwu ndị a n’ihe dị ka 61 O.A., ya onwe ya anọwo na mkpọrọ ihe karịrị otu mgbe, ọ na-agakwa ime otú ahụ ọzọ tupu ọnwụ ya dị ka onye e gburu n’ihi okwukwe ya. (Ọrụ 16:23, 24; 22:24; 23:35; 24:27; 2 Ndị Kọrint 6:5; 2 Timoti 2:9; Faịlimọn 1) E nwere oké mkpa n’oge ahụ, dị ka e nwere ugbu a, maka ọgbakọ ilekọta ndị kwere ekwe ibe ha ndị nọ n’ọnwụnwa n’ihi okwukwe ha.

Otu onye na-eso ụzọ nke narị afọ mbụ nke lebakarịịrị mkpa ahụ anya bụ Ọnisifọrọs. O letara Pọl mgbe ọ nọ na mkpọrọ nke ugbo abụọ ya na Rom. Banyere ya, onyeozi ahụ dere, sị: “Ka onyenwe anyị meere ezinụlọ Ọnisifọrọs ebere: n’ihi na o mere ka m nwee ume ndụ ọtụtụ mgbe, ihere mkpọrọ m emeghịkwa ya; kama, mgbe ọ bịaruru Rom, o weere ịnụ ọkụ n’obi chọwa m, wee chọta m.” (2 Timoti 1:16, 17) Ọ̀ dịwo mgbe i wepụtara oge iji tụgharịa uche n’ihe okwu ole na ole ndị ahụ pụtara n’ezie? Ime otú ahụ yiri ka ọ ga-amụba nghọta gị maka Ọnisifọrọs. Ị ga-ahụ na ọ bụ onye nkasi obi nwere obi ike.

Ịtụ Pọl Mkpọrọ nke Ugbo Abụọ

Mgbe a tọhapụsịrị ya site na mkpọrọ nke mbụ ya, Pọl gaghachiri ọzọ n’ụlọ nga Rom kama n’okpuru ọnọdụ ndị dị iche. Ndị enyi na-enwebu ike na mbụ ịbịakwute ya n’ụlọ nke aka ya a gbazitere agbazite, o yikwara ka o nwere obi ike na ntọpụ dị nso. Ugbu a n’ịbụ onye ihe ka ọtụtụ gbahapụrụ, ogbugbu na eru ka mmiri.—Ọrụ 28:30; 2 Timoti 4:6-8, 16; Faịlimọn 22.

Pọl nọ na mkpọrọ n’oge a n’ihe dị ka 65 O.A. Ihe dị ka otu afọ tupu mgbe ahụ—na July 64 O.A.—ọkụ gbara Rom, na-akpata mbibi dị ukwuu na 10 n’ime ógbè 14 nke obodo ukwu ahụ. Dị ka onye Rom na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Tacitus si kwuo, Eze Ukwu Nero enweghị ike “iwepụ ajọ nkwenkwe ahụ bụ na ọkụ ọgbụgba ahụ bụ ihe sitere n’otu iwu o nyere pụta. N’ihi ya, iji wepụ akụkọ a, Nero sịrị na ọ bụ òtù ndị a kpọrọ asị n’ihi arụ ha na-eme, ndị ndị obodo ahụ na-akpọ ndị Kraịst kpatara ya ma nye ha ntaramahụhụ kasị sie ike. . . . A tụkwasịrị ụdị ịkwa emo ọ bụla n’ọnwụ ha. N’ịbụ ndị e ji akpụkpọ anụ kpuchie, ha bụ ndị nkịta dọkasịrị wee laa n’iyi, ma ọ bụ ndị a kpọgidere n’elu obe, ma ọ bụ bụrụ ndị e ji ọkụ regbuo, ịbụ ihe na-enye ìhè n’abalị, mgbe chi jiworo.”

Ọ bụ n’ọnọdụ yiri nke a na n’atụmanya ndị yiri ndị a ka Pọl hụrụ onwe ya n’ụlọ mkpọrọ ọzọ. Ka a sịkwa ihe mere o ji nwee nnọọ obi ekele maka nleta nke enyi ya bụ́ Ọnisifọrọs! Ma ka anyị lee otu ọnọdụ ahụ anya site n’akụkụ nke Ọnisifọrọs.

Ileta Pọl Onye Mkpọrọ

N’ụzọ doro anya, ezinụlọ Ọnisifọrọs biri n’Efesọs. (2 Timoti 1:18; 4:19) E kwughị ma Ọnisifọrọs ọ bịara n’isi obodo alaeze ukwu ahụ maka achụmnta ego nke aka ya ma ọ bụ kpọmkwem ileta Pọl. Otú o sina dị, onyeozi ahụ kwuru, sị: ‘Mgbe Ọnisifọrọs bịaruru Rom, o mere ka m nwee ume ọhụrụ ọtụtụ mgbe.’ (2 Timoti 1:16, 17) Ụdị ume ọhụrụ dị aṅaa? Ọ bụ ezie na enyemaka Ọnisifọrọs pụrụ ịgụnyeworị enyemaka ihe onwunwe, ọnụnọ ya wusiri Pọl ike, gbaakwa ya ume. N’ezie, ụfọdụ nsụgharị na-agụ: “O wuliwo mmụọ m ọtụtụ mgbe,” ma ọ bụ “ọ kasiwo m obi ọtụtụ mgbe.”

Imezu ọchịchọ ileta onye mkpọrọ bụ́ onye Kraịst na Rom n’oge ahụ na-enye ihe ịma aka dị iche iche. N’adịghị ka ụbọchị ndị ahụ nke Pọl nọ na mkpọrọ nke mbụ ya, n’ụzọ doro anya, ndị Kraịst bụ́ ndị Rom amaghị ebe ọ nọ. N’obodo ukwu dị ka Rom, ọ bụghị ọrụ dị mfe ịchọ otu onye mkpọrọ a na-amaghị ebe ọ nọ n’etiti ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị nọ n’agbụ maka ịda iwu dị iche iche. Ya mere, iji ịdị uchu chọọ ya dị mkpa. Ọkà mmụta Giovanni Rostagno na-akọwa okwu otú a: “Ihe isi ike ahụ pụrụ ịdịworịị n’ụdị dị iche iche. Karịsịa, mkpachara anya pụrụ iche dị mkpa n’ịchọ ihe ahụ. Inweta ihe ọmụma site n’ebe dị iche iche na iyi onye ọ dị ọkụ n’obi ịchọpụta ụlọ nga ji otu onye mkpọrọ mere agadi nke na-anụbiga ọkụ n’obi ókè onye a sị na aka ya dị n’ọtụtụ mpụ pụrụ ịkpaliteworị inyo onye ahụ enyo n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị.”

Onye na-ede ihe bụ́ P. N. Harrison na-enye ihe atụ pụtara ìhè nke otu ọnọdụ a, na-asị: “O yiri ka anyị na-ahụpere otu ihu nwere nzube n’ime ìgwè mmadụ na-enufenụ, werekwa oké mmasị soro onye a a na-amabughị si n’ụsọ oké osimiri dị anya nke Aegean, ka ọ na-aga n’okporo ámá ndị ọ na-amaghị, na-akụ aka n’ọtụtụ ọnụ ụzọ, na-agbaso ntụziaka ọ bụla, bụrụ onye a dọrọ aka ná ntị banyere ihe ize ndụ ọ na-etinye onwe ya na ya ma bụrụ onye a na-apụghị ime ka ọ hapụ ihe ọ na-achọ; ruo mgbe otu olu ọ ma ama kelere ya n’otu ụlọ mkpọrọ a na-amachaghị ama, o wee chọta Pọl ebe e ji ịgà kegide ya n’ahụ onye agha Rom.” Ọ bụrụ na ebe ahụ dị ka ụlọ nga ndị Rom ndị ọzọ, ọ pụrụ ịbụ ma eleghị anya ebe jụrụ oyi, gbaa ọchịchịrị, ruokwa unyi, ebe agbụ na ihe otiti ndị ọzọ jupụtara.

Ịbụ onye a matara dị ka enyi onye mkpọrọ dị ka Pọl bụ ihe dị ize ndụ. Ọ dị ize ndụ ọbụna karịa ịnọgide na-eleta ya. Ịkọwa onwe onye n’ụzọ pụtara ìhè dị ka onye Kraịst bụ itinye onwe onye n’ihe ize ndụ nke njide na ọnwụ site n’ịta ahụhụ. Ma o jughị Ọnisifọrọs afọ ime nleta nanị otu ugbo ma ọ bụ abụọ. Ihere emeghị ya, egwu atụghịkwa ya ime otú ahụ “ọtụtụ mgbe.” N’ezie, Ọnisifọrọs biri ndụ kwekọrọ n’ihe aha ya pụtara, “Onye Na-ebu Uru,” na-enye enyemaka obi ike na ịhụnanya n’agbanyeghị ihe ize ndụ ndị dị na ya.

Gịnị mere Ọnisifọrọs ji mee ihe a nile? Brian Rapske kwuru, sị: “Ụlọ mkpọrọ abụghị nanị ebe ịta ahụhụ anụ ahụ, kamakwa ebe nchegbu dị ukwuu maka nchekasị ọ na-ewetara onye mkpọrọ ahụ. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọnụnọ anụ ahụ na agbamume okwu ọnụ nke ndị enyemaka pụrụ ịbụ ihe ịgba ume dị ukwuu n’ụzọ mmetụta uche nye onye mkpọrọ ahụ.” Dị ka ihe àmà na-egosi, Ọnisifọrọs ghọtara nke ahụ ma were obi ike rapagide enyi ya n’ahụ. Lee otú Pọl na-aghaghị isiworị nwee obi ekele maka enyemaka dị otú ahụ!

Gịnị Mere Ọnisifọrọs?

N’ime akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara Timoti, Pọl zigaara ezinụlọ Ọnisifọrọs ozi ekele ma kwuo banyere ya, sị: “Ka Onyenwe anyị nye ya ka ọ chọta ebere n’aka Onyenwe anyị n’ụbọchị ahụ.” (2 Timoti 1:18; 4:19) Ọtụtụ na-eche na okwu ndị ahụ bụ́ “n’ụbọchị ahụ” na-atụ aka n’ụbọchị ikpe Chineke wee si otú a kwubie na Ọnisifọrọs anwụọla. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, ikekwe ‘Ọnisifọrọs abawo n’ebe a dị ize ndụ nke ikpeazụ ya, ma were ndụ ya kwụọ ụgwọ ya,’ ka P. N. Harrison na-atụ n’aro. Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ nanị na Ọnisifọrọs anọghị n’ụlọ, ma ọ bụkwanụ na Pọl tinyere ya n’ozi ekele o zigaara ezinụlọ ya nile.

Ụfọdụ kweere na e nwere ihe pụrụ iche dị n’okwu ahụ bụ́: “Ka Onyenwe anyị nye ya ka ọ chọta ebere n’aka Onyenwe anyị n’ụbọchị ahụ.” Ha na-eche na okwu ndị a na-akwado ikpechitere mkpụrụ obi ndị pụrụ apụ dị ndụ na ma eleghị anya na-ata ahụhụ n’ógbè ndị bụ mmụọ ekpere. Otú ọ dị, echiche dị otú ahụ na-emegide nkụzi Akwụkwọ Nsọ ahụ bụ́ na ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla. (Eklisiastis 9:5, 10) Ọ bụrụgodị na Ọnisifọrọs anwụọla, nanị ihe Pọl mere bụ ikwupụta ọchịchọ ya ka enyi ya chọta ebere site n’aka Chineke. “Anyị kwesịrị ikwupụta ọchịchọ ahụ maka mmadụ nile,” ka R. H. Horton na-ekwu. “Ma ikpere ndị nwụrụ anwụ ekpere, na idoro ha Mas bụ echiche na-abatatụghị [onyeozi] ahụ n’uche.”

Ka Anyị Bụrụ Ndị Nkasi Obi Na-eguzosi Ike n’Ihe

Ma Ọnisifọrọs ọ̀ tụfuru ndụ ya n’ezie mgbe ọ na-enyere Pọl aka ma ọ bụ na ọ bụghị, n’ezie o tinyere ya n’ihe ize ndụ iji chọta onyeozi ahụ ma leta ya n’ụlọ mkpọrọ. A pụghịkwa inwe obi abụọ ọ bụla na Pọl nwere ekele maka nkwado na agbamume ahụ dị mkpa o nwetara n’aka Ọnisifọrọs.

Mgbe ndị Kraịst ibe anyị na-agabiga ọnwụnwa, mkpagbu, ma ọ bụ ịtụ mkpọrọ, anyị pụrụ ịnọ n’ọnọdụ ịkasi ha obi na ịgba ha ume. Ya mere, ka anyị na-ekpe ekpere maka ha, werekwa ịhụnanya mee ihe nile anyị nwere ike ime iji nyere ha aka. (Jọn 13:35; Ndị Tesalọnaịka 5:25) Dị ka Ọnisifọrọs, ka anyị bụrụ ndị nkasi obi nwere obi ike.

[Foto dị na peeji nke 31]

Ọnisifọrọs ji obi ike kasie Pọl onyeozi a tụrụ mkpọrọ obi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya