Iji Mmụọ Ịchụ Onwe Onye N’àjà Na-ejere Jehova Ozi
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya, ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, nọgidekwa na-eso m.”—MATIU 16:24, NW.
1. Olee otú Jisọs si gwa ndị na-eso ụzọ ya banyere ọnwụ ya na-eru nso?
NA NSO Ugwu Heamọn nke snow na-ada n’elu ya, Jisọs Kraịst ruru otu ọnọdụ dị ịrịba ama ná ndụ ya. O nwere ihe na-erughị otu afọ ịdị ndụ. Ọ maara ya; ndị na-eso ụzọ ya amaghị. Oge eruwo ugbu a ka ha mara. N’eziokwu, Jisọs ezowo aka n’ọnwụ ya na-eru nso n’oge mbụ, ma nke a bụ mbụ ọ na-ekwu okwu ya hoo haa. (Matiu 9:15; 12:40) Ihe ndekọ Matiu na-agụ, sị: “Site na mgbe ahụ Jisọs Kraịst malitere igosi ndị na-eso ụzọ ya, na ọ ghaghị ije Jerusalem, na ịhụ ọtụtụ ahụhụ n’aka ndị okenye na ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ, na a ghaghị igbu ya, meekwa ka o si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị nke atọ.”—Matiu 16:21; Mak 8:31, 32.
2. Gịnị bụ mmeghachi omume Pita nye okwu ndị Jisọs kwuru banyere ahụhụ Ọ ga-ata n’ọdịnihu, oleekwa otú Jisọs si zaghachi?
2 A gụwo ụbọchị Jisọs ọnụ. Ma, iwe were Pita n’ihi ihe nke a yiri iche echiche ọnwụ dị otú a. Ọ pụghị ikweta na a ga-egbu Mesaịa ahụ n’ezie. Ya mere, Pita nwara ịbara Onyenwe ya mba. N’ihi nkwali nke ezi ebumnobi, n’echeghị echiche ọ gbara ume, sị: “Chineke meere gị ebere, Onyenwe anyị: ihe a agaghị adịrị gị ma ọlị.” Ma Jisọs jụrụ obi ọma na-ezighị ezi nke Pita ozugbo, n’ụzọ kwesịrị ekwesị dị ka mmadụ ga-azọpịa isi nke agwọ bu nsí. “Gaa n’azụ m, Setan: ị bụ ihe na-eme ka m maa n’ọnyà: n’ihi na ị dịghị atụkwasị uche gị n’ihe Chineke, kama ọ bụ n’ihe mmadụ.”—Matiu 16:22, 23.
3. (a) Olee otú Pita si mee onwe ya onye ọrụ Setan n’amaghị ama? (b) Olee otú Pita si bụrụ ihe ịma n’ọnyà nye ụzọ nke ịchụ onwe onye n’àjà?
3 N’amaghị ama Pita emewo onwe ya onye ọrụ Setan. Nzaghachi Jisọs dị ike dị ka mgbe ọ zara Setan okwu n’ọzara. N’ebe ahụ Ekwensu nwara iji ndụ dị mfe, ọbụbụeze n’ataghị ahụhụ, nwaa Jisọs ọnwụnwa. (Matiu 4:1-10) Ugbu a Pita na-agba ya ume imere onwe ya ebere. Jisọs matara na nke a abụghị uche Nna ya. Ndụ ya aghaghị ịbụ nke iji onwe onye achụ àjà, ọ bụghị nke ime onwe onye ihe ụtọ. (Matiu 20:28) Pita ghọrọ ihe ịma n’ọnyà n’ụzọ ndụ dị otú ahụ; ọmịiko ya e bu ezi ihe n’uche gosipụta ghọrọ ọnyà.a Ma, Jisọs hụrụ nke ọma na ọ bụrụ na ya enwee echiche ọ bụla nke ndụ achụghị àjà, na ya ga-adapụ n’ihu ọma Chineke site n’ịbụ onye e jidere n’aka ọnwụ nke ọnyà Setan.
4. N’ihi gịnị ka ndụ nke ịchọ ntụsara ahụ onwe onye nanị na-ejighị bụrụ maka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya?
4 Ya mere, ọ dị mkpa ịgbazi echiche Pita. Okwu ndị ọ gwara Jisọs gosipụtara echiche mmadụ, ọ bụghị nke Chineke. Ndụ nke ịchọ ntụsara ahụ onwe onye, ụzọ dị mfe isi pụọ n’ahụhụ, abụghị maka Jisọs; ndụ dị otú ahụ agaghịkwa adịrị ndị na-eso ụzọ ya, n’ihi na Jisọs gwazịrị Pita na ndị ọzọ na-eso ụzọ, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya, ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, nọgidekwa na-eso m.”—Matiu 16:24, NW.
5. (a) Gịnị bụ ihe ịma aka nke ibi ndụ ndị Kraịst? (b) Ihe atọ dị aṅaa bụ́ ndị dị mkpa ka onye Kraịst na-aghaghị ịdị njikere maka ha?
5 Ugboro ugboro, Jisọs na-alaghachi n’isiokwu a bụ isi: ihe ịma aka nke ibi ndụ ndị Kraịst. Iji bụrụ ndị na-eso ụzọ Jisọs, ndị Kraịst, dị ka Onyendú ha, aghaghị iji mmụọ iji onwe onye achụ àjà jeere Jehova ozi. (Matiu 10:37-39) Otú a, o depụtara ihe atọ dị mkpa onye Kraịst na-aghaghị ịdị njikere ime: (1) jụ onwe onye, (2) bulie osisi ịta ahụhụ ya, na (3) nọgide na-eso Ya.
“Ọ Bụrụ na Onye Ọ Bụla Chọrọ Iso M n’Azụ”
6. (a) Olee otú mmadụ si ajụ onwe ya? (b) Ònye ka anyị na-aghaghị ime ihe na-atọ ya ụtọ karịa onwe anyị?
6 Gịnị ka ịjụ onwe onye pụtara? Ọ pụtara na mmadụ aghaghị ịnapụ onwe ya ihe nile, otu ụdị ọnwụ n’ebe onwe onye nọ. Ihe Grik a sụgharịrị ịbụ “jụ” pụtara n’ụzọ bụ isi bụ “isi ee e”; ọ pụtara “ịnapụ kpam kpam.” Ya mere, ọ bụrụ na ị nakwere ihe ịma aka nke ndụ ndị Kraịst, i ji obi gị na-ahapụ oké ọchịchọ gị nile, ntụsara ahụ gị, ọchịchọ gị, obi ụtọ gị, ihe ụtọ gị. Ya bụ na ị na-enyefe Jehova Chineke ndụ gị dum na ihe nile ọ gụnyere ruo oge nile. Ịjụ onwe onye pụtara ihe karịrị ịnapụ onwe onye ihe ụtọ ụfọdụ site n’oge ruo n’oge. Kama nke ahụ, ọ pụtara na mmadụ aghaghị ịgbahapụ inwe onwe ya nye Jehova. (1 Ndị Kọrint 6:19, 20) Onye jụworo onwe ya na-adị ndụ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, ọ bụghị onwe ya. (Ndị Rom 14:8; 15:3) Ọ pụtara na n’oge ọ bụla ná ndụ ya, ọ na-asị ee e nye ọchịchọ nile nke ọdịmma onwe ya nanị na ee nye Jehova.
7. Gịnị bụ osisi ịta ahụhụ nke onye Kraịst, oleekwa otú o si eburu ya?
7 Ya mere, ibuli osisi ịta ahụhụ gị nwere ihe ndị siri ike o metụtara. Iburu osisi ịta ahụhụ bụ ibu arọ na ihe atụ nke ọnwụ. Onye Kraịst ahụ dị njikere ịta ahụhụ ma ọ dị mkpa, ma ọ bụ ka e mee ya ihe ihere ma ọ bụ mekpọọ ya ọnụ ma ọ bụ ọbụna mee ka ọ nwụọ n’ihi ịbụ onye na-eso ụzọ Jisọs Kraịst. Jisọs sịrị: “Onye na-anaraghịkwa [osisi ịta ahụhụ ya, NW] sookwa m n’azụ, adịghị ekwesị m.” (Matiu 10:38) Ọ bụghị mmadụ nile na-ata ahụhụ na-eburu osisi ịta ahụhụ ahụ. Ndị ọjọọ na-enwe ọtụtụ “ihe mgbu” ma ọ bụghị osisi ịta ahụhụ. (Abụ Ọma 32:10) Otú ọ dị, ndụ onye Kraịst bụ ndụ nke iburu osisi ịta ahụhụ nke ijere Jehova ozi ịchụ àjà.
8. Ihe ilereanya nke ndụ dị aṅaa ka Jisọs setịpụụrụ ndị na-eso ụzọ ya?
8 Ihe ikpeazụ a chọrọ nke Jisọs hotara bụ ka anyị nọgide na-eso ya. Jisọs chọrọ, ọ bụghị nanị ka anyị nakwere ma kwenye n’ihe ọ kụziri, kamakwa, ná ndụ anyị nile, ka anyị nọgide na-agbaso ihe ilereanya o setịpụrụ. Gịnịkwa bụ ụfọdụ akụkụ ndị bụ isi a hụrụ n’ihe ilereanya nke ndụ ya? Mgbe o nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ikpeazụ ha, ọ sịrị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke m nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Jisọs kwusara ma kụzie ozi ọma Alaeze ahụ. Otú ahụ ka ndị mbụ na-eso ụzọ ya na, n’ezie, ọgbakọ dum nke ndị Kraịst oge mbụ, mere. Ọrụ ịnụ ọkụ n’obi nke a, tinyere ha ịghara ịbụ akụkụ nke ụwa, wetaara ha ịkpọasị na mmegide nke ụwa, na-akpata osisi ịta ahụhụ ha ịbụ nke dị arọ ibu ọbụna karị.—Jọn 15:19, 20; Ọrụ 8:4.
9. Olee otú Jisọs si mesoo ndị ọzọ?
9 Ihe ilereanya ọzọ pụtara ìhè a na-ahụ ná ndụ Jisọs bụ ụzọ o si mesoo ndị ọzọ. Ọ dị obi ọma bụrụkwa “onye nwayọọ na onye wedatara onwe ya ala n’obi.” N’ihi ya, a na-eme ka ndị na-ege ya ntị dị ọhụrụ na mmụọ, bụrụkwa ndị ọnụnọ ya gbara ume. (Matiu 11:29) O jighị anya ike mee ka ha na-eso ya ma ọ bụ na-enyegbu ha n’iwu banyere otú ha ga-esi mee otú ahụ; o meghịkwa ka ha nwee mmetụta nke obi ọmụma ikpe iji manye ha ịbụ ndị na-eso ụzọ ya. N’agbanyeghị ndụ ha nke ịchụ onwe onye n’àjà, ha gosipụtara ezi ọṅụ. Lee ka ha si dị iche site na ndị nwere mmụọ nke ụwa nke ịchọ imeju ọchịchọ nile nke onwe ha bụ́ nke na-aka “mgbe ikpeazụ” akara!—2 Timoti 3:1-4.
Zụlite ma Jigide Mmụọ Ịchụ Onwe Onye n’Àjà nke Jisọs
10. (a) Dị ka Ndị Filipaị 2:5-8 na-ekwu, olee otú Kraịst si jụ onwe ya? (b) Ọ bụrụ na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, uche dị aṅaa ka anyị na-aghaghị igosipụta?
10 Jisọs n’onwe ya setịpụrụ ihe nlereanya n’ịjụ onwe onye. O buuru osisi ịta ahụhụ ya ma nọgide na-ebu ya site n’ime uche Nna ya. Pọl degaara ndị Kraịst nọ na Filipaị, sị: “Nweenụ uche a n’ime onwe unu, nke dịkwa n’ime Kraịst Jisọs: onye, ọ bụ ezie na ọ dịrịị n’ụdị nke Chineke na mbụ, ma ọ gụghị ya n’ihe ọ ga-ejidesi ike, bụ́ ịha ka Chineke, kama o mere onwe ya ihe efu, n’ịnara ụdị nke ohu, e wee mee ya n’oyiyi nke mmadụ; ebe a hụrụ ka ọ dị ka mmadụ n’oyiyi ya, o wedakwara onwe ya, wee bụrụ onye na-aṅa ntị ruo ọnwụ, bụ́ ọnwụ nke [osisi ịta ahụhụ, NW].” (Ndị Filipaị 2:5-8) Ònye pụrụ ịjụ onwe ya kpam kpam karịa nke ahụ? Ọ bụrụ na ị dịịrị Kraịst Jisọs na ị dịkwa njikere ịbụ otu n’ime ndị na-eso ya n’azụ, ị ghaghị inwe otu uche a.
11. Ibi ndụ ịchụ onwe onye n’àjà pụtara ibi ndụ maka uche onye?
11 Onyeozi ọzọ, bụ́ Pita na-agwa anyị na ebe Jisọs hụrụ ahụhụ ma nwụọ n’ihi anyị, ndị Kraịst gaje iji otu mmụọ ahụ Kraịst nwere kee onwe ha ekike agha, dị ka ndị soja kere ekike nke ọma. O na-ede, sị: “Ya mere, ebe Kraịst hụrụ ahụhụ n’anụ ahụ, unu onwe unu werekwa otu izu ahụ kee dị ka ekike agha; n’ihi na onye hụworo ahụhụ n’anụ ahụ agharawo mmehie; ka unu wee ghara ibi ọzọ n’oge fọdụụrụ unu n’anụ ahụ unu ime ihe ọjọọ dị iche iche na-agụ mmadụ, kama ime ihe Chineke na-achọ.” (1 Pita 3:18; 4:1, 2) Ụzọ ịchụ onwe onye n’àjà nke Jisọs gosipụtara nke ọma otú o si dị ya. Uche ya kwụ otu ebe ná ntinye o tinyere onwe ya n’ọrụ, mgbe nile na-ebute uche Nna ya ụzọ tupu nke onwe ya, ọbụna ruo n’ókè nke ọnwụ ihere.—Matiu 6:10; Luk 22:42.
12. Ndụ ịchụ onwe onye n’àjà ọ̀ bụụrụ Jisọs ihe ilu? Kọwaa.
12 Ọ bụ ezie na ndụ Jisọs nke ịchụ onwe onye n’àjà bụ ụzọ tara akpụ na nke ịma aka ọ ga-agbaso, ọ bụghịrị ya ihe ilu. Kama nke ahụ, Jisọs nwetara ọṅụ n’ido onwe ya n’okpuru uche Chineke. Nye ya, ịrụ ọrụ Nna ya dị ka nri. Ọ na-enweta ezi afọ ojuju site na ya, dị ka mmadụ ga-enweta ná nrị dị mma. (Matiu 4:4; Jọn 4:34) Otú a, ọ bụrụ na ị chọrọ inwe afọ ojuju n’ezie ná ndụ gị, ọ dịghị ihe dị mma ị ga-eme karịa ịgbaso ihe nlereanya Jisọs site n’ịzụlite ọnọdụ uche ya.
13. Olee otú ịhụnanya si bụrụ ikike nkwali nke mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà?
13 N’ezie, gịnị bụ ike nkwali nke mmụọ iji onwe onye achụ àjà? N’otu okwu, ịhụnanya. Jisọs sịrị: “Ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya. Nke a bụ ihe ukwu na ihe mbụ e nyere n’iwu. Ihe nke abụọ nke yiri ya bụ nke a, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:37-39) Onye Kraịst apụghị ịdị na-achọ ọdịmma onwe ya nanị ma, n’otu oge ahụ, rube isi n’okwu ndị ahụ. Obi ụtọ na mmasị nke onwe ya aghaghị ịbụ ndị e bu nnọọ ụzọ jiri ịhụnanya ya maka Jehova na e mesịakwa ịhụnanya ya maka onye agbata obi, chịkwaa. Ọ bụ otú ahụ ka Jisọs si bie ndụ ya, ọ bụkwa ihe ọ tụrụ anya ya n’aka ndị na-eso ụzọ ya.
14. (a) Ibu ọrụ ndị dị aṅaa ka a kọwara ná Ndị Hibru 13:15, 16? (b) Gịnị na-agba anyị ume iji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma?
14 Pọl onyeozi ghọtara iwu nke a nke ịhụnanya. O dere, sị: “Ka anyị site n’aka ya na-achụ àjà, bụ́ otuto, nye Chineke mgbe nile, nke ahụ bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta nye aha ya. Ma unu echezọla ime ihe dị mma na ime ka unu na ndị ọzọ nwekọọ ihe unu: n’ihi na àjà dị otú a na-atọ Chineke ezi ụtọ.” (Ndị Hibru 13:15, 16) Ndị Kraịst adịghị achụrụ Jehova anụmanụ ma ọ bụ ihe ndị yiri ya n’àjà; n’ihi ya, ndị nchụàjà bụ mmadụ adịghị ha mkpa n’ụlọ nsọ a na-ahụ anya ka ha lekọta ofufe ha. Ọ bụ site na Kraịst Jisọs ka a na-achụ àjà otuto anyị. N’ụzọ bụ isi ọ bụkwa site n’àjà otuto ahụ, nkwupụta ihu ọha nye aha ya, ka anyị na-egosi ịhụnanya anyị maka Chineke. Karịsịa mmụọ anyị nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị nke gbara mkpọrọgwụ n’ịhụnanya na-agba anyị ume iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, na-agbalịsi ike ịdị njikere mgbe nile ịchụrụ Chineke mkpụrụ egbugbere ọnụ anyị n’àjà. N’ụzọ dị otú a anyị na-egosipụtakwa ịhụnanya maka ndị agbata obi.
Ịchụ Onwe Onye n’Àjà Na-eweta Ngọzi n’Ụba
15. Ajụjụ nnyocha ndị dị aṅaa banyere ịchụ onwe onye n’àjà ka anyị pụrụ ịjụ onwe anyị?
15 Kwụsịtụ nke nta ma chee echiche n’ajụjụ ndị na-esonụ: Ụzọ ndụ m na-ebi ugbu a ọ na-egosipụta ụzọ nke ịchụ onwe onye n’àjà? Ihe mgbaru ọsọ m hà na-atụ aka n’ụdị ndụ ahụ? Ndị òtù ezinụlọ m hà na-erite uru ime mmụọ site n’ihe nlereanya m? (Tụlee 1 Timoti 5:8.) Gịnị banyere ụmụ mgbei na ndị di ha nwụrụ? Ha onwe ha kwa hà na-erite uru site ná mmụọ m nke ịchụ onwe onye n’àjà? (Jemes 1:27) M̀ pụrụ ịgbasapụkwu oge m na-etinye n’àjà otuto m nke ihu ọha? M̀ nwere ike iru eru maka ozi ọsụ ụzọ, Betel, ma ọ bụ ozi ala ọzọ, ma ọ bụ m̀ pụrụ ịkwagharị ịga jee ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze?
16. Olee otú akọ pụrụ isi nyere anyị aka ibi ndụ ịchụ onwe onye n’àjà?
16 Mgbe ụfọdụ ọ na-ewe nanị ntakịrị akọ iji ruo uju nke ikike anyị n’ozi Jehova site ná mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà. Dị ka ihe atụ, Janet, bụ́ onye ọsụ ụzọ oge nile n’Ecuador, na-arụ ọrụ ego oge nile. Mgbe ogologo oge na-agabigabeghị, usoro ihe omume ya mere ka o sie ike iji mmụọ nke obi na-atọ ụtọ ruo hour ole a chọrọ n’aka onye ọsụ ụzọ oge nile. O kpebiri ịkọwara onye were ya n’ọrụ nsogbu ahụ ma rịọ ka e bilata hour ole ọ na-arụ ọrụ. Ebe onye were ya n’ọrụ na-adịghị njikere ibilata oge ọrụ ya, Janet kpọọrọ Maria, onye na-achọ ọrụ nwa oge ka o wee nwee ike ịsụ ụzọ. Nke ọ bụla n’ime ha kwere ịrụ ọrụ ọkara ụbọchị, na-eke ọrụ otu ụbọchị zuru ezu. Onye were ya n’ọrụ kwenyere nke a. Ugbu a ụmụnna nwanyị abụọ ahụ bụ ndị ọsụ ụzọ oge nile. Mgbe ọ hụrụ oké ihe nke a a rụpụtara, Kaffa, onye ike gwụwokwara site n’ịrụrụ otu ụlọ ọrụ ahụ ọrụ oge nile ma na-agbalị inwetazu oge ọrụ ọsụ ụzọ ya, kpọọrọ Magali wee kwuokwa na ya chọrọ ime otu ihe ahụ. A nabatakwara ya. Otú a, ụmụnna nwanyị anọ nwere ike ịsụ ụzọ, kama abụọ nọ n’ọnọdụ ịhapụ ije ozi oge nile. Akọ na ibu ụzọ mee ihe mịpụtara mkpụrụ.
17-21. Olee otú otu di na nwunye si hazigharịa nzube ha ná ndụ, gịnịkwa ka ọ rụpụtara?
17 Ọzọ, tụlee ụzọ nke ịchụ onwe onye n’àjà nke Evonne gbasoro n’afọ iri gara aga. O degaara Watch Tower Society ihe na-esonụ na May 1991:
18 “N’October 1982, mụ na ezinụlọ m letara Betel nke Brooklyn. Ịhụ ya mere ka m chọọ inyefe onwe m ịrụ ọrụ ebe ahụ. M gụrụ akwụkwọ a na-edejupụta, e nwekwara otu ajụjụ dị ịrịba ama, ‘Gịnị bụ nkezi hour gị n’ozi ubi n’ime ọnwa isii gara aga? Ọ bụrụ na nkezi hour erughị iri, kọwaa ihe kpatara ya.’ M pụghị icheta ezi ihe ọ bụla kpatara ya, ya mere m setịpụrụ ihe mgbaru ọsọ ma ruo ya n’ọnwa ise.
19 “Ọ bụ ezie na m pụrụ icheta ihe ngọpụ ole na ole mere na m gaghị asụ ụzọ, mgbe m gụrụ 1983 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, e mesiri m obi ike na ndị ọzọ emeriwo ihe mgbochi ndị buru ibu karịa nke m iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ. Ya mere, n’April 1, 1983, m hapụrụ ọrụ oge nile m na-arụ bụ́ nke na-enye ego wee ghọọ onye ọsụ ụzọ inyeaka, m sonyekwara n’ọkwá ndị ọsụ ụzọ oge nile na September 1, 1983.
20 “E mesịa, ọ bụụrụ m ihe ọṅụ ịlụ otu ezi ohu na-eje ozi n’April 1985. Mgbe afọ atọ gasịrị, otu okwu mgbakọ distrikti banyere ịsụ ụzọ kwaliri di m ihulata isi jụọ m, ‘Ọ̀ dị ihe ị hụrụ mere na m kwesịghị ịmalite ọrụ ịsụ ụzọ na September 1?’ O sonyeere m n’ọrụ a n’afọ abụọ sonụ.
21 “Di m nyefekwara onwe ya ịrụ ọrụ owuwu ihe na Betel dị na Brooklyn ruo izu abụọ ma tinye akwụkwọ maka Usoro Iwu Ihe Owuwu ná Mba Nile. Ya mere na May 1989, anyị gara Nigeria maka otu ọnwa iji nye aka n’iwu alaka ụlọ ọrụ. Echi, anyị ga-eje Germany, ebe a ga-emere anyị ndokwa maka akwụkwọ ikike iji banye Poland. Obi dị anyị ụtọ nke ukwuu ikere òkè n’ọrụ owuwu ihe dị otú a na-eme ihe akụkọ na ịbụ akụkụ nke ụdị ọhụrụ nke a nke ozi oge nile.”
22. (a) Olee otú anyị, dị ka Pita, pụrụ isi n’amaghị ama ghọọ ihe ịma n’ọnyà? (b) Ijere Jehova ozi ná mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà adabereghị na gịnị?
22 Ọ bụrụ na i nweghị ike ịsụ ụzọ n’onwe gị, ị̀ pụrụ ịgba ndị nọ n’ozi oge nile ume ịnọgide n’ihe ùgwù ha na ma eleghị anya ọbụna inyere ha aka ime otú ahụ? Ka ị̀ ga-adị ka ụfọdụ ndị òtù ezinụlọ na ndị enyi bu ezi ihe n’uche, bụ́ ndị, dị ka Pita, pụrụ ịgwa onye ozi oge nile ka o jiritụ nwayọọ, meere onwe ya ebere, n’aghọtaghị otú nke ahụ pụrụ isi bụrụ ihe ịma n’ọnyà? N’eziokwu, ọ bụrụ na ahụ ike onye ọsụ ụzọ dị n’ọnọdụ dị ize ndụ ma ọ bụ na ọ na-eleghara ibu ọrụ dị iche iche nke ndị Kraịst anya, ọ pụrụ ịhapụ ozi oge nile ruo nwa oge. Ijere Jehova ozi ná mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà adabereghị n’utu aha, dị ka onye ọsụ ụzọ, onye Betel, ma ọ bụ aha ndị ọzọ. Kama nke ahụ, ọ dabeere n’ihe anyị bụ dị ka ndị mmadụ—otú anyị si eche echiche, ihe anyị na-eme, otú anyị si emeso ndị ọzọ, otú anyị si adị ndụ anyị.
23. (a) Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe ọṅụ nke ịbụ onye ya na Chineke na-arụkọ ọrụ? (b) Mmesi obi ike dị aṅaa ka anyị na-achọta ná Ndị Hibru 6:10-12?
23 Ọ bụrụ n’ezie na anyị nwere mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà, anyị ga-enwe ọṅụ nke ịbụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ. (1 Ndị Kọrint 3:9) Anyị ga-enwe afọ ojuju nke ịmara na anyị na-eme ka obi Jehova ṅụrịa. (Ilu 27:11) Anyị nwekwara obi ike na Jehova agaghị echezọ anyị mgbe ọ bụla ma ọ bụ gbahapụ anyị ma ọ bụrụhaala na anyị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya.—Ndị Hibru 6:10-12.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Na Grik, ‘ihe ịma n’ọnyà’ (σκάνδαλον, skanʹda·lon) bụ na mbụ “aha nke akụkụ otu ọnyà bụ́ ebe a na-ekegide ihe e ji arata anụ, si otú a bụrụ ọnyà ahụ n’onwe ya.”—Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words.
Gịnị Bụ Echiche Gị?
◻ Olee otú Pita si ghọọ ihe ịma n’ọnyạ n’amaghị ama nye ụzọ ịchụ onwe onye n’àjà?
◻ Gịnị ka ịjụ onwe onye pụtara?
◻ Olee otú onye Kraịst si ebu osisi ịta ahụhụ ya?
◻ Olee otú anyị si azụlite ma na-ejigide mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà
◻ Gịnị bụ ikike nkwali nke mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà?
[Foto dị na peeji nke 10]
Ị̀ dị njikere ịjụ onwe gị, bulie osisi ịta ahụhụ gị, ma nọgide na-eso Jisọs n’azụ?