Onye Ọ Bụla Ga-enwere Onwe Ya
“Ana m agụ na ahụhụ nile nke oge dị ugbu a ekwesịghị ka e kwute ha ma e lee ebube ahụ anya, bụ́ nke a gaje ikpughe n’ebe anyị nọ. N’ihi na olileanya siri ike nke ihe nile e kere eke na-echesi mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke ike. N’ihi na e doro ihe ahụ e kere eke n’okpuru ihe efu, ọ bụghị na ọ chọrọ ya, kama n’ihi Onye ahụ Nke doro ya n’okpuru ya n’olileanya; n’ihi na a ga-eme ka ihe e kere eke onwe ya pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke. N’ihi na anyị matara na ihe e kere eke nile na-asụkọ udè, ime na-emekọkwa ha, ruo ugbu a.”—NDỊ ROM 8:18-22.
N’AKỤKỤ a nke akwụkwọ ozi o degaara ndị Kraịst nọ na Rom, Pọl onyeozi na-achịkọta n’ụzọ dị ịrịba ama ihe mere ndụ ji bụrụ nke ezi nnwere onwe na-adịghị na ya, bụrụkwa nke ịtọgbọrọ chakoo na ihe mgbu na-aka akara mgbe mgbe. Ọ kọwakwara otú anyị pụrụ isi nweta ezi nnwere onwe.
“Ahụhụ Nile nke Oge Dị Ugbu A”
Pọl adịghị elelị “ahụhụ nile nke oge dị ugbu a” mgbe ọ na-asị na ha “ekwesịghị ka e kwute ha ma e lee ebube ahụ anya, bụ́ nke a gaje ikpughe n’ebe anyị nọ.” N’oge Pọl nakwa mgbe oge ahụ gasịrị, ndị Kraịst tara ahụhụ n’ụzọ dị ukwuu n’okpuru ọchịchị aka ike nke ndị na-achị Rom, bụ́ ndị na-elebachaghị anya n’ihe ndị ruuru mmadụ. Ozugbo Rom kweere na ndị Kraịst bụ ndị iro nke Ọchịchị, o megburu ha n’ụzọ obi ọjọọ. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ J. M. Roberts na-ekwu, sị: “Ọtụtụ ndị Kraịst nọ n’isi obodo ahụ [Rom] nwụrụ n’ezie n’ụzọ dị egwu n’ọgbọ egwuregwu ma ọ bụ bụrụ ndị a gbara ọkụ ná ndụ.” (Shorter History of the World) Akụkọ ọzọ kwuru banyere ndị a Nero na-akpagbu, sị: “A kpọgburu ụfọdụ, a dụchiri ụfọdụ n’ime akpụkpọ anụ, nkịta wee na-achụgharị ha, e tere ụfọdụ mmanụ korota ma mụnye ha ọkụ ka ha bụrụ ọwa ndị dị ndụ mgbe ọchịchịrị gbara.”—New Testament History, nke F. F. Bruce dere.
O doro anya na ndị Kraịst oge mbụ ahụ ga-enweworị mmasị inwere onwe ha pụọ ná mmegbu dị otú ahụ, ma ha adịghị njikere imebi ozizi Jisọs Kraịst iji nweta ya. Dị ka ihe atụ, ha nọpụrụ iche kpam kpam n’ọgụ ahụ dị n’etiti ndị na-achị Rom na ndị Juu na-alụ ọgụ maka nnwere onwe dị ka ndị Zealot. (Jọn 17:16; 18:36) Nye ndị Zealot, “okwu banyere ichere oge Chineke abụghị ihe nsogbu dị mgbe ahụ chọrọ.” Ha sịrị na ihe dị mkpa bụ “ime ihe ike megide onye iro ahụ,” bụ́ Rom. (New Testament History) Ndị Kraịst oge mbụ nwere echiche dị iche. Nye ha, “ichere oge Chineke” bụ nanị ihe ezi uche dị na ya ha pụrụ ime. Ha kwenyesiri ike na ọ dịghị ihe ọzọ ga-akwụsị “ahụhụ nile nke oge dị ugbu a” ma weta ezi nnwere onwe nke na-adịgide adịgide ma e wezụga ntinye aka Chineke. (Maịka 7:7; Habakuk 2:3) Otú ọ dị, tupu anyị atụlee otú nke ahụ ga-esi mee, ka anyị nyochaa ihe medịrị e ji ‘doo ihe ahụ e kere eke n’okpuru ihe efu.’
‘E Doro Ya n’Okpuru Ihe Efu’
N’ebe a, okwu bụ́ ‘ihe e kere eke,’ ka Benjamin Wilson na-ekwu na The Emphatic Diaglott, apụtaghị “anụ ọhịa na ihe e kere eke na-adịghị ndụ” dị ka ụfọdụ na-enye echiche ya, kama, “ihe nile a kpọrọ mmadụ.” (Tụlee Ndị Kọlọsi 1:23.) Ọ na-ezo aka n’ezinụlọ mmadụ n’ozuzu ya—anyị nile bụ́ ndị nnwere onwe na-agụsi agụụ ike. ‘E doro anyị n’okpuru ihe efu’ n’ihi omume nne na nna anyị mbụ. “Ọ bụghị na [anyị] chọrọ ya” ma ọ bụ n’ihi nhọrọ mmadụ meere onwe ya ka nke a ji mee. Anyị ketara ọnọdụ anyị eketa. N’echiche Akwụkwọ Nsọ, Rousseau dara ya mgbe ọ sịrị na “mmadụ nweere onwe ya site n’ọmụmụ.” A mụrụ onye ọ bụla n’ime anyị n’agbụ nke mmehie na ezughị okè, bụrụ ndị nọ n’ohu, dị ka a pụrụ ikwu ya, nye usoro ihe nke nkụda mmụọ na ihe efu jupụtara na ya.—Ndị Rom 2:23.
N’ihi gịnị ka nke ahụ ji dị otú a? N’ihi na nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, chọrọ ịdị “ka Chineke,” ime mkpebi onwe onye zuru ezu, na-ekpebiri onwe ha ihe ọma na ihe ọjọọ. (Jenesis 3:5) Ha leghaara otu ihe dị mkpa banyere nnwere onwe anya. Nanị Onye Okike ahụ pụrụ inwere onwe ya n’ụzọ zuru ezu. Ọ bụ Eze Eluigwe na Ala. (Aịsaịa 33:22; Mkpughe 4:11) Nnwere onwe ụmụ mmadụ aghaghị ịbụ nnwere onwe a kpaara ókè. Ọ bụ ya mere onye na-eso ụzọ bụ́ Jemes ji gbaa ndị Kraịst ume n’oge ya ịbụ ndị “iwu zuru okè, bụ́ iwu nke inwe onwe” na-achịkwa.—Jemes 1:25.
N’ụzọ ziri ezi Jehova chụpụrụ Adam na Iv site n’ezinụlọ eluigwe na ala ya, n’ihi ya ha nwụrụ. (Jenesis 3:19) Ma gịnị banyere ụmụ ha? N’ụzọ obi ebere, Jehova ka kwere ka ha mụọ ụmụ, ọ bụ ezie na ha pụrụ nanị ibufere ha ezughị okè, mmehie, na ọnwụ. Ya mere “ọnwụ [gabigara] ruo mmadụ nile.” (Ndị Rom 5:12) N’echiche ahụ, Chineke “doro ihe ahụ e kere eke n’okpuru ihe efu.”
“Mkpughe nke Ụmụ Ndị Ikom Chineke”
Jehova doro ihe ahụ e kere eke n’okpuru ihe efu “n’olileanya” nke na otu ụbọchị a ga-eweghachiri ezinụlọ mmadụ nnwere onwe site n’ihe omume nke “ụmụ ndị ikom Chineke.” Ole ndị bụ “ụmụ ndị ikom Chineke” a? Ha bụ ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst bụ́ ndị a mụrụ n’ohu nke mmehie na ezughị okè, dị ka “[mmadụ ndị ọzọ] e kere eke.” Site n’ọmụmụ ha enweghị ezi ọnọdụ n’ezinụlọ eluigwe na ala nke Chineke bụ́ nke dị ọcha, zuo okè. Ma Jehova meere ha ihe dị ịrịba ama. Site n’àjà mgbapụta Jisọs Kraịst, Ọ na-atọhapụ ha pụọ n’agbụ nke mmehie e ketara eketa ma na-agụ ha ná “ndị ezi omume,” ma ọ bụ ndị dị ọcha n’ụzọ ime mmụọ. (1 Ndị Kọrint 6:11) Mgbe ahụ, ọ na-edo ha dị ka “ụmụ ndị ikom Chineke,” na-eweghachi ha n’ezinụlọ eluigwe na ala ya.—Ndị Rom 8:14-17.
Dị ka ndị Jehova doro dị ka ụmụ ya ndị ikom, ha ga-enwe ihe ùgwù dị ebube. Ha ga-abụ “ndị nchụàjà nye Chineke anyị; ha [ga-abụkwa] eze n’elu ụwa” ha na Jisọs Kraịst dị ka akụkụ nke Alaeze, ma ọ bụ ọchịchị eluigwe nke Chineke. (Mkpughe 5:9, 10; 14:1-4) Nke a bụ ọchịchị e guzobesiri ike n’ụkpụrụ nke nnwere onwe na ikpe ziri ezi—ọ bụghị ná mmegbu ma ọ bụ n’ọchịchị aka ike. (Aịsaịa 9:6, 7; 61:1-4) Pọl onyeozi na-ekwu na ụmụ ndị ikom Chineke a bụ ndị enyi Jisọs, bụ́ “mkpụrụ Abraham” ahụ e kwere ná nkwa eri oge. (Ndị Galetia 3:16, 26, 29) N’ihi ya, ha na-ekere òkè dị mkpa n’imezu otu nkwa Chineke kwere enyi ya bụ́ Abraham. Otu akụkụ nke nkwa ahụ bụ na site ná mkpụrụ (ma ọ bụ, nwa) Abraham “mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha.”—Jenesis 22:18.
Ngọzi dị aṅaa ka ha na-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ? Ụmụ ndị ikom Chineke na-ekere òkè n’ịtọhapụ ezinụlọ nile nke mmadụ pụọ n’ihe ndị dị egwu mmehie Adam na-akpata nakwa n’iweghachi ihe a kpọrọ mmadụ gaa n’izu okè. Ndị mmadụ “si na mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile” pụrụ ịgọzi onwe ha site n’igosi okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs Kraịst nakwa site n’ido onwe ha n’okpuru ịchịisi Alaeze ya ga-eweta ihe ọma. (Mkpughe 7:9, 14-17; 21:1-4; 22:1, 2; Matiu 20:28; Jọn 3:16) N’ụzọ a, “ihe e kere eke nile” ga-anụkwa ụtọ “inwe onwe . . . nke ebube nke ụmụ Chineke.” Nke a agaghị abụ ụdị ụfọdụ nke nnwere onwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị a kpaara ókè, nke na-adịru nwa oge, kama ọ ga-abụ nnwere onwe pụọ n’ihe ọ bụla nke kpatawooro ezinụlọ nke mmadụ ihe mgbu na ahụhụ kemgbe Adam na Iv jụrụ ọbụbụeze Chineke. Ka a sịkwa ihe mere Pọl onyeozi pụrụ iji kwuo na “ahụhụ nile nke oge dị ugbu a ekwesịghị ka e kwute ha” ma e were ha tụnyere ozi dị ebube nke ndị kwesịrị ntụkwasị obi ga-eje!
Olee mgbe “mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke” ga-amalite? N’oge na-adịghị anya site n’ugbu a, mgbe Jehova ga-eme ka o doo mmadụ nile anya ndị ụmụ ndị ikom Chineke ahụ bụ. Nke a ga-abụ mgbe “ụmụ ndị ikom” a, bụ́ ndị e mere ka ha si n’ọnwụ bilie gaa n’ógbè ndị bụ́ mmụọ, ga-eso Jisọs Kraịst kere òkè n’ime ka ụwa a dị ọcha pụọ n’ajọ ihe na mmegbu n’agha Chineke bụ́ Ha-Magedọn. (Daniel 2:44; 7:13, 14, 27; Mkpughe 2:26, 27; 16:16; 17:14; 19:11-21) Anyị na-ahụ gburugburu anyị ihe àmà dị ukwuu na anyị abamiela n’ime “mgbe ikpeazụ,” mgbe nkwere dịruru ogologo oge nke Chineke kwere ka nnupụisi dịrị na ajọ omume ndị na-esi na ya apụta, ga-ejedebe.—2 Timoti 3:1-5; Matiu 24:3-31.
Ee, ọ bụ eziokwu, dị ka Pọl onyeozi na-ekwu, na “ihe e kere eke nile na-asụkọ udè, ime na-emekọkwa ha, ruo ugbu a”—ma ọ gaghị adịtekwa anya. Ọtụtụ nde ndị dị ndụ ugbu a ga-ahụ “oge a ga-eme ka ihe nile dị ka ha dị na mbụ, bụ́ oge nke Chineke kwuru okwu banyere ha site n’ọnụ ndị amụma Ya dị nsọ ndị sitere ná mmalite oge a,” gụnyere iweghachiri ezinụlọ mmadụ dum udo, nnwere onwe, na ikpe ziri ezi.—Ọrụ 3:21.
Ezi Nnwere Onwe n’Ikpeazụ
Gịnị ka ị na-aghaghị ime iji nụ ụtọ “inwe onwe . . . nke ebube nke ụmụ Chineke” a? Jisọs Kraịst sịrị: “Ọ bụrụ na unu onwe unu anọgide n’okwu m, unu bụ ndị na-eso ụzọ m n’ezie; unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.” (Jọn 8:31, 32) Nke ahụ bụ isi ihe na-eduga ná nnwere onwe—ịmụta na irubezi isi n’iwu na n’ozizi Kraịst. Nke a na-eweta nnwere onwe ruo n’ókè ụfọdụ ọbụna ugbu a. N’ọdịnihu dị nso, ọ ga-eweta nnwere onwe zuru ezu n’okpuru ịchịisi Kraịst Jisọs. Ụzọ amamihe dị na ya bụ ịmata ‘okwu’ Jisọs site n’ọmụmụ Bible. (Jọn 17:3) Dị ka ndị Kraịst oge mbụ, soro ọgbakọ nke ezi ndị na-eso ụzọ Kraịst na-akpachi anya. Site n’ime otú ahụ, ị pụrụ irite uru site n’eziokwu na-atọhapụ atọhapụ ndị Jehova na-enye site ná nzukọ ya taa.—Ndị Hibru 10:24, 25.
Ka ị “na-echesi mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke ike,” ị pụrụ ịzụlite obi ike ahụ Pọl onyeozi nwere ná nlekọta na nkwado na-echebe echebe nke Kraịst, ọbụna mgbe nhụjuanya na ikpe na-ezighị ezi fọrọ nke nta ka o yie ihe a na-agaghị anagideli. Mgbe ọ tụlesịrị mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke, Pọl jụrụ, sị: “Ònye ga-ekewapụ anyị n’ịhụnanya nke Kraịst? Ọ̀ bụ mkpagbu, ma ọ bụ oké mkpa, ma ọ bụ nsogbu, ma ọ bụ oké ụnwụ, ma ọ bụ ịgba ọtọ, ma ọ bụ ize ndụ, ma ọ bụ mma agha?” (Ndị Rom 8:35) N’ezie, n’ikwu ya n’okwu Rousseau, ndị Kraịst n’oge Pọl ka nọ “n’agbụ” nye otu ụdị ọchịchị aka ike ma ọ bụ ọzọ. “A na-eme ka [ha] nwụọ ogologo ụbọchị dum” dị ka “atụrụ ogbugbu.” (Ndị Rom 8:36) Hà kwere ka nke ahụ karịa ha ike?
“Ee e,” ka Pọl na-ede, “kama n’ihe ndị a nile anyị na-emeribiga ókè site n’aka Onye ahụ Nke hụrụ anyị n’anya.” (Ndị Rom 8:37) Ndị Kraịst oge mbụ hà meriri n’agbanyeghị ihe nile ha na-aghaghị ịtachiri obi? N’ụzọ dị aṅaa? “E mewo ka m kwenye,” ka ọ na-aza, “na ọnwụ, ma ọ bụ ndụ, ma ọ bụ ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ ịbụisi dị iche iche, ma ọ bụ ihe dị ugbu a, ma ọ bụ ihe gaje ịdị, ma ọ bụ ike dị iche iche, ma ọ bụ ihe dị elu, ma ọ bụ ihe dị omimi, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke, agaghị apụ ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke, nke dị n’ime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 8:38, 39) Gị onwe gị kwa pụrụ ‘imeri’ “mkpagbu, ma ọ bụ oké mkpa, ma ọ bụ nsogbu” ọ bụla ị na-aghaghị ịtachiri obi ka ọ dị ugbu a. Ịhụnanya Chineke na-emesi anyị obi ike na n’oge na-adịghị anya—n’oge na-adịghị nnọọ anya site n’ugbu a—“a ga-eme ka [anyị] pụọkwa n’ịbụ ohu [nile] baa n’ọnọdụ inwe onwe . . . nke ebube nke ụmụ Chineke.”
[Foto ndị dị na peeji nke 6]
“Ihe e kere eke nile na-asụkọ udè, ime na-emekọkwa ha, ruo ugbu a”
[Foto dị na peeji nke 7]
‘A ga-eme ka ihe e kere eke nile nwere onwe ha pụọ n’ịbụ ohu nile baa n’ọnọdụ inwe onwe nke ebube nke ụmụ Chineke’