Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 4/15 p. 26-29
  • Ikpebisi Ike Ijere Jehova Ozi!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikpebisi Ike Ijere Jehova Ozi!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Imeri Owu Ọmụma
  • Ịnọgidesi Ike n’Agbanyeghị Mmegide
  • Ido Onwe n’Okpuru n’Emebighị Okwukwe
  • “Rite Ha n’Uru n’Ebe A Na-ekwughị Okwu”
  • ‘Na-agha n’Anya Mmiri; Na-ewe Ihe Ubi n’Ọṅụ’
  • ‘Nwoke Bụ Isi nke Nwaanyị’
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Gịnị Ka Ido Onwe Onye n’Okpuru n’Alụmdi na Nwunye Pụtara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Nduzi Amamihe Dị Na Ya Maka Ndị Di Na Nwunye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ndị Bụ́ Di Meenụ Ka Obi Na-eru Nwunye Unu Ala
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 4/15 p. 26-29

Ikpebisi Ike Ijere Jehova Ozi!

“ỊGAGHỊ aga ime nkwusa!” “Ndị chọọchị unu abịakwala ebe a!” Ọtụtụ ndị Kraịst bụ́ ndị inyom na-anụ okwu ndị a na ndị yiri ha site n’ọnụ di ha bụ́ ndị na-emegide ha. Ma mgbe ndị ikom ndị a bụ ndị soja, ndị nwunye ha na-eche ihe ịma aka pụrụ iche nke okwukwe ha ihu. (Aịsaịa 2:4; Jọn 17:16) Mgbe ahụ, olee otú ndị nwunye dị otú ahụ bụ́ ndị Kraịst si agbalị ịnọgide na-adị ike n’ime mmụọ ma na-arụsi ọrụ ike n’ije ozi Alaeze?

Ịnọgidesi ike n’ihe nye Jehova Chineke tinyere mkpebi nke ha siri ike na-enyere ha aka ịnọgide. “Echere m na ọ bụ nnọọ mkpebi m siri ike,” ka Yvonne na-akọwa, bụ́ nwunye onye soja. “Amaara m na a ghaghị inwe ụzọ dị iche iche isi zere mmegide nke di m.” N’ezie, e nwere.

Nwanyị ọzọ bụ́ onye Kraịst, nke otu onye isi ndị agha na-alụ, kọrọ otú nguzo ya nke mkpebi siri ike si ọbụna na-eme ka ndụ kara di ya mfe. “Ọ maara usoro ihe omume m nakwa nke ya, ndị soja na-enwekwa mmasị na nke ahụ,” ka ọ na-akọwa. Ka o sina dị, ozi ọ nọgidere na-ejere Jehova abụghị ihe omume dị mfe.

Imeri Owu Ọmụma

Nwunye ndị agha na-echekarị ihu ihe ịma aka nke ibili njem e mere ka ha mara banyere ya nanị ụbọchị ole na ole tupu ya ma ọ bụrụ na ha ga-eso di ha gaa n’ebe dị anya site n’ụlọ ha bụ́ ebe e kenyere di ha ọrụ. Mgbe ahụ, n’ịbụ onye nọ n’ógbè na-eweghị ya ahụ, ọ dị mfe inwe mmetụta nke ịnọpụ iche. Ma ọ bụghị iwu na ihe ga-adị otú a. Ndị na-ejere Jehova ozi nwere ọnọdụ ọma. Gịnị bụ nke ahụ? Dị ka onye ozi ndị Kraịst bụ́ Pita kwuru, ọ bụ “òtù ndị bụ ụmụnna.” N’ịbụ nke ọnụ ọgụgụ ya na-eru ọtụtụ nde ugbu a, Ndịàmà Jehova n’ime 231 mba na-eme ka otu nnukwute ezinụlọ ndị Kraịst, “òtù ndị bụ ụmụnna.” Ị ga-ahụ ha nnọọ n’ebe nile.​—⁠1 Pita 2:17.

Susan, onye a kpọpụrụ n’ike n’ógbè ebe o bi, bịarutere ibi n’ogige ndị agha ụgbọ elu ebe e kenyere di ya ọrụ. Ebe ọ bụ onye ọhụrụ n’okwukwe ahụ ma nọrọ n’okpuru nrụgide sitere n’aka di ya na-ekweghị ekwe ịkwụsị ikere òkè n’ozi ndị Kraịst, ọ na-akọ sị: “Agara m ozugbo ná nzukọ a na-enwe n’ebe ahụ, n’ebe ahụ kwa enwere m ike ịnọdụ ala ma kwunyere ụmụnna nwanyị ndị ọzọ okwu. Apụrụ m ikwu n’eziokwu na ọ bụ mkpakọrịta nke a nyere m ume ịnọ na-aga n’ihu.”

Mgbe ụfọdụ owu ọmụma na-akpata ịda mbà n’obi. Ọbụna mgbe ahụ, ozi ọma na-enye ọnọdụ uche dị mma. Glenys, nwanna nwanyị bụ onye England nke sonyeere di ya mgbe e zigara ya ọrụ n’ofesị, na-akọ, sị: “Mgbe obi dara m nnọọ mbà, n’atụghị anya ya, otu onye m maara ọtụtụ afọ gara aga mgbe m nọ n’ìgwè ndị agha n’onwe m detaara m akwụkwọ ma kwuo na e mere ya baptism ọhụrụ dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Nke ahụ nyere m agbamume kpọmkwem n’oge ọ dị mkpa.”

Jane, onye soro di ya gaa Kenya, chọpụtara na nzukọ ndị Kraịst ghọrọ ihe na-enye ndụ, ọ bụ ezie na e duziri ha n’asụsụ ndị ọ na-adịghị aghọta. “Amaara m na nke a bụ ebe Jehova chọrọ ka m nọrọ,” ka ọ na-akọwa. “Mụ na ụmụnna m nọ, ha dịkwa ka ọgwụ na-enye ume. Ha nabatara m, ọ dịkwa m ka anyị bụ otu ezinụlọ.”

Jane bụ nanị otu n’ime ọtụtụ ndị nọ n’ọnọdụ ndị a bụ́ onye chọtara ndị ikwu ime mmụọ bụ́ ndị ọ na-amaghịdị na ya nwere!​—⁠Mak 10:​29, 30.

Ịnọgidesi Ike n’Agbanyeghị Mmegide

“Unu echela na abịara m ịtụba udo n’elu ụwa,” ka Jisọs dọrọ aka ná ntị ya. “Abịaghị m ịtụba udo, kama ọ bụ mmà agha.” (Matiu 10:34) Gịnị ka o bu n’uche? Ọbụna n’ime ezinụlọ, ebe a ga-atụ anya inwe udo, a pụrụ inwe “ọtụtụ mberede nke mmà agha,” ka A. T. Robertson kwuru n’akwụkwọ Word Pictures in the New Testament. “N’ezie,” ka Jisọs rịbara ama, “ọ bụkwa ndị ezinụlọ mmadụ ga-abụ ndị iro ya.” (Matiu 10:36) Lee ka okwu ndị a si bụrụ eziokwu mgbe di ma ọ bụ nwunye mmadụ na-ebuso eziokwu ahụ iro!

Mgbe Diane malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, di ya, bụ́ ọchịagha ndị agha elu, were iwe nke ukwuu. Mmetụta dị aṅaa ka nke a nwere n’alụmdi na nwunye ha? “Ọ bụ dị ka ọkpụrụkpụ ice dị n’etiti anyị,” ka Diane na-akọwa. “Anyị na-enwebu obi ụtọ n’alụmdi na nwunye anyị. Na mberede ọ bụ nanị na anyị bi n’otu ụlọ.” Mgbe ahụ, olee otú o si nagide ọnọdụ ahụ? “Nkwenye onwe onye na mkpebi siri ike bụ ihe ndị bụ isi, tinyere enyemaka sitere n’aka Jehova na mmụọ ya.” Diane buuru n’obi ihe nlereanya Bible nke onye amụma bụ́ Daniel.

Mgbe a kpụụrụ ya laa Babilọn ma nye ya nri onye na-ejere Chineke ozi na-agaghị anakwere, Daniel ‘tinyere nkà n’obi ya na ọ gaghị ewere ihe oriri ọma eze mee onwe ya ka ọ ghara ịdị nsọ.’ Ee, Daniel ji uche ya mee mkpebi. O kpebiri n’obi ya na ọ dịghị mgbe ya ga-eme onwe ya ka ọ ghara ịdị nsọ site n’iri nri ahụ. Lee aha obi ike o gosipụtara ka ‘ọ na-achọ n’aka onye isi ndị onozi ka ọ ghara ime onwe ya onye na-adịghị nsọ’! Gịnị si n’ime ya pụta? Jehova gọziri nguzo ya siri ike.​—⁠Daniel 1:​8, 9, 17.

N’otu aka ahụ taa, di na-emegide emegide pụrụ ịchọ ka nwunye ya kwụsị ịga nzukọ nke ọgbakọ. Olee otú o kwesịrị isi meghachi omume? Jane chọtara onwe ya n’ọnọdụ nke a. Ọ na-akọwa: “Ọ dịghị mgbe m ga-ala azụ n’ihi nrụgide. Amaara m na a pụghị inwe nhọrọ ọzọ. Aghaghị m igosipụta otú m si jiri nzukọ ndị ahụ kpọrọ ihe.” Jehova gọziri mkpebi ya siri ike ka ọ nọgidere na-aga nzukọ.

“Di m gbalịrị ime ka m ghara ịdị na-aga nzukọ, ma nke ahụ adịteghị anya,” ka Glenys na-akọ. “M nọgidere na-aga. Mgbe m lọtara, mgbe ụfọdụ ọ na-eti m ihe, n’oge ndị ọzọ ọ naghị ekwunyere m okwu.” Ma, ọ nagidere ọnọdụ ahụ, na-ekpe ekpere ọtụtụ mgbe. Ọzọ, abụọ n’ime ndị okenye ọgbakọ na-eso ya ekpe ekpere mgbe nile, bụ́ nke gbara ya ume nke ukwuu ịnọgide na-aga.​—⁠Jemes 5:13-⁠15; 1 Pita 2:23.

Mgbe ụfọdụ ndị ka onye bụ di n’ọkwá pụrụ ịrụgide ya ka ọ kwụsị nwunye ya ịdị na-aga na-ekwusa ozi ọma. Diane chọpụtara na ya aghaghị ime ka ihe ndị ka ya mkpa doo di ya anya nke ọma. “Adi m njikere,” ka ọ sịrị, “ịnakwere ihe ọ bụla sitere na mụ ịnọgide na-eme nkwusa pụta.” Lee ka nguzo nke a si yie nke ndị ozi ahụ! (Ọrụ 4:​29, 31) Ka o sina dị, ọ na-eji akọ eme ihe ná nkwusa ya. Ọ na-akọ, sị: “M na-enwe nnọkọ ịṅụ kọfị ma nye onye ọ bụla bịaranụ otu akwụkwọ Ezi-Okwu.”​—⁠Matiu 10:16; 24:14.

Ido Onwe n’Okpuru n’Emebighị Okwukwe

Ọ bụ ezie na ọnọdụ siri ike n’alụmdi na nwunye na-enye ha nsogbu, ndị nwunye bụ́ ndị Kraịst na-elega anya n’ọdịnihu ma na-adabere na Jehova. Nke a na-enyere ha aka ịnọgide na-enwe echiche ziri ezi. Ha na-enye ndị di ha nkwado ọ bụla ha nwere ike n’emebighị okwukwe ha. N’ime nke ahụ, ha na-agbaso okwu ndụmọdụ Pita dere n’ike mmụọ nsọ: “Ndị bụ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu.” (1 Pita 3:1) Na The Amplified New Testament, ntụziaka nke a nke onye ozi na-agụ, sị: “Doonụ onwe unu n’okpuru dị ka ndị ka ala ma na-adaberenụ n’ebe ha nọ, meekwanụ onwe unu ka unu kwekọọ n’ọnọdụ ha.” Rịba ama ụzọ Jane si gbasoo okwu ndụmọdụ nke a. “Di m gwara m na ihe m chọrọ ime agaghị anwa anwa metụta ọrụ ya,” ka ọ na-akọwa. “Ya mere agbalịri m ịchọ ụzọ dị iche iche m pụrụ isi nyere ya aka.”

Ụfọdụ nwunye bụ́ ndị Kraịst ejiwo n’ihi nke a kwere ịga nnọkọ ọha na eze nke a kpọrọ di ha òkù ịbịa. Ma ha ka na-ekpebikwa ịhapụ imebi okwukwe ha. Jane wepụtara oge iso di ya kwurịta banyere nke a. O ji obi ọma kọwaa na ya dị njikere ịga ma na ya achọghị ka ọnụnọ ya menye di ya ihere. “Amaara na site n’oge ruo n’oge a ga-achọ ka ndị nile bịaranụ guzo ọtọ ma kụkọrịta iko. Amụtawo m na nraranye dịịrị nanị Jehova, ịkụkọrịta iko karịkwara nnọọ nanị igosi nkwanye ùgwù. Di m hụrụ otú ọnọdụ ahụ si bụrụ nke na-adịghị mma, ya mere nanị ihe o kwuru bụ: ‘Abịala!’ M rubere isi.”

Glenys, n’aka nke ọzọ, sooro di ya gaa nnọkọ ndị dị otú ahụ, ma ọ na-elegide ndị isi nọgasị n’isi oche anya. Mgbe ọ hụrụ ka ha na-akwadebe ịkụkọrịta iko, ọ na-eji akọ pụọ ịga n’ụlọ mposi! Ee, ndị inyom ndị a mere ka ha kwekọọ n’ọnọdụ dịnụ ma ghara imebi okwukwe ha mgbe ọ bụla.

“Rite Ha n’Uru n’Ebe A Na-ekwughị Okwu”

“Ọ bụrụ na mụ akawanye mma dị ka nwunye, di m ga-ahụ na eziokwu ahụ na-agbanwe m,” ka Yvonne chere. Ya mere ọ gụrụ ma gụghachi isiakwụkwọ ahụ dị n’akwụkwọ Ndu Ezi-na-ulo nke a kpọrọ “Nwunye nke A Hụrụ n’Anya nke Ukwuu.”a “E lekwasịrị m anya karịsịa n’ihe e kwuru n’okpuru isiokwu nta bụ́ ‘Ndị Obe Ákwá, Ndị Ekwurekwu’! Ma achọpụtara m na ka m na-achọkwu ịgwa di m okwu, otú ahụ ka ọnọdụ na-akawanye njọ.” Ma, n’ikpeazụ, o nwere ihe ịga nke ọma n’inyere di ya aka ijere Jehova ozi. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’itinye ụkpụrụ e depụtara na 1 Pita 3:1 n’ọrụ, na ‘a pụrụ irite ndị bụ di n’uru n’ekwughị okwu.’

Ụzọ ụmụ nwanyị ndị Kraịst si elekọta ezinụlọ ha na-eme ihe dị ukwuu n’ime ka ndị ọzọ nakwere Iso Ụzọ Kraịst. “M na-eme ka eziokwu ahụ na-adọrọ adọrọ dị ka m nwere ike,” ka Diane na-akọ. “Mgbe m gara nzukọ, ọ na-adị di m nke ukwuu ka nanị ya anọ, ya mere m kpọrọ ya ọrụ ịkụziri ụmụ m ka ha na-akpa àgwà ọma nke ukwuu mgbe anyị laruru ụlọ. M gbalịkwara ilebakwuru ya anya mgbe anyị lọtara.” Nwayọọ nwayọọ àgwà di ya gbanwere ka ọ na-anabata nlebara anya obi ọma nke ezinụlọ ya.

Ndị ọzọ so na-ejere Jehova ozi pụkwara inye aka. Jane na-akọ na di ya na-enwe mmasị ná mkparịta ndị ozi ala ọzọ nke Ndịàmà o zutere na Kenya. “Ha mere ya enyi ma kparịta maka bọl ọgbụgba, ha na-elekwa ọbịa nke ọma. N’oge ụfọdụ, a kpọrọ anyị òkù n’ụlọ dị iche iche nke ndị ozi ala ọzọ maka nri.” Di ya mesịrị kọwaa, sị: “M malitere ịhụ okpukpe Jane site n’ụzọ ile ihe anya dịwagara iche. Ndị enyi ya bụ ndị nwere nnọọ ọgụgụ isi dị elu, nwee ike ikwurịta okwu n’ụdị isiokwu dị iche iche.” N’otu aka ahụ, di Diane gbanwere echiche ya banyere eziokwu ahụ. Mgbe ụgbọ ala ọ na-anya mebiri, otu Onyeàmà na-eto eto bịara nyere ya aka. “Nke ahụ metụrụ m nnọọ,” ka ọ sịrị.

Otú ọ dị, ọ bụghị di ma ọ bụ nwunye nile ka a na-erite n’uru gaa n’eziokwu ahụ. Mgbe ahụ gịnị ka a ga-eme? Jehova na-enye aka iji mee ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi nwee ike ịtachi obi. (2 Ndị Kọrint 10:13) Tụlee agbamume Glenys maka ndị nọ n’ọnọdụ yiri nke ya: “Arụla ụka mgbe ọ bụla ma ọlị na Jehova ọ bụ Onye malitere alụmdi na nwunye nakwa na ọ chọrọ ka ndị bụ di na nwunye nọgide na-abụ otu. Ya mere n’agbanyeghị ihe di pụrụ ime ma ọ bụ mmegide ị pụrụ inweta site n’aka ndị nọ gị gburugburu, ọ dịghị mgbe Jehova ga-ahapụ gị ka ị daa mbà.” Ọ bụ ezie na di ya efewebeghị Jehova, àgwà ya n’ebe ọ nọ na n’ebe eziokwu ahụ dị adịwo nro karị.

‘Na-agha n’Anya Mmiri; Na-ewe Ihe Ubi n’Ọṅụ’

N’eziokwu, ụmụ nwanyị ndị Kraịst ndị a kpebisiri ike ijere Jehova ozi. Ọ bụrụ na ị nọ n’ọnọdụ dị otú ahụ, meekwa nke a mkpebi gị siri ike. Cheta agbamume ahụ bụ́: “Jehova, bụ́ Chineke gị, ka ị ga-atụ egwu; Ya ka ị ga-efe, Ya ka ị ga-arapara n’ahụ.”​—⁠Deuterọnọmi 10:20.

“Onye na-ebu nju aka mkpụrụ ọghịgha, ọ bụ ezie na ọ na-eje ije na-akwa ákwá; ma ọ ghaghị iwere iti mkpu ọṅụ bịaghachi, na-ebu ùkwù ọka ya nile,” ka ọbụ abụ ahụ kwupụtara. (Abụ Ọma 126:6) “Ị na-akwa ọtụtụ ákwá ka ị na-anwa igosi onye ị lụrụ eziokwu ahụ, ma ọ bụ n’ekwughị okwu ma ọ bụ site n’ikwu okwu,” ka otu Onyeàmà kwetara. “Ma n’ikpeazụ ị ga-eti mkpu n’ọṅụ n’ihi na ọbụna ma ọ bụrụ na ọ nabataghị eziokwu ahụ, Jehova na-agọzi gị n’ihi mgbalị ị na-eme.”

Mmadụ nile ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị mmegide n’ebe obibi kwesịrị ezi ịja mma. Ha kwesịrị inweta nkwado na ịhụnanya. Ka ha jigide nguzo ha nke emebighị okwukwe, kpebisie ike ijere Jehova ozi!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., na-ebipụta (1981).

[Foto dị na peeji nke 28]

Iji ekpere na-amụ ihe na-ewusi mkpebi siri ike nke onye Kraịst ike

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya