Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 8/15 p. 10-15
  • Nọgidenụ Na-ewuli Ibe Unu Elu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nọgidenụ Na-ewuli Ibe Unu Elu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Izere Okwu Rere Ure
  • Tinye Mgbalị n’Iwuli Ndị Ọzọ Elu
  • Na-ewuli Elu n’Ụzọ Chineke
  • Ndị Okenye Ndị Na-ewuli Elu
  • Ibi Ndụ Kwekọrọ n’Iwu Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Na-ekwu ‘Okwu Dị Mma Maka Iwuli Mmadụ Elu’
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Uwe na Ejiji Gị—Ọ̀ Gbasara Chineke?
    Teta!—1998
  • Ụdị Uwe Ị Na-eyi Ọ̀ Na-eme Ka E Too Chineke?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 8/15 p. 10-15

Nọgidenụ Na-ewuli Ibe Unu Elu

“Ka okwu ọ bụla nke na-ere ure ghara isi n’ọnụ unu pụta, kama ihe bụ ezi ihe, iwuli mmadụ elu.”—NDỊ EFESỌS 4:29.

1, 2. (a) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo n’ụzọ ziri ezi na ikwu okwu bụ ihe dị ịtụnanya? (b) Ịdị akọ dị aṅaa kwesịrị ekwesị n’ihe banyere ụzọ anyị si eji ire anyị eme ihe?

“OKWU bụ eriri majik na-ejikọta ndị enyi, ezinụlọ na ọha mmadụ dị iche iche . . . Site n’uche mmadụ na nhazi nke mmegharị usoro uru ahụ [nke ire], anyị na-eme mkpatụ ndị na-akpali ịhụnanya, ekworo, nkwanye ùgwù—n’ezie mmetụta uche ọ bụla nke mmadụ.”—Hearing, Taste and Smell.

2 Ire anyị abụghị akụkụ ahụ nanị maka iji loo ihe ma ọ bụ mara ụtọ ihe; ọ bụ akụkụ nke ikike anyị nwere ikerịta ihe anyị na-eche na ihe bụ mmetụta anyị. “Ire bụkwa ihe nta dị n’ahụ,” ka Jemes dere. “Nke a ka anyị ji na-agọzi Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], bụ́ Nna anyị; nke a ka anyị jikwa na-abụ mmadụ ọnụ, ndị e keworo dị ka oyiyi Chineke si dị.” (Jemes 3:5, 9) Ee, anyị pụrụ iji ire anyị mee ihe n’ụzọ ndị dị mma, dị ka n’inye Jehova otuto. Ma n’ịbụ ndị na-ezughị okè, ọ pụrụ ịdị mfe anyị iji ire anyị kwuo ihe ndị na-emerụ ahụ ma ọ bụ ihe ndị na-ezighị ezi. Jemes dere, sị: “Ụmụnna m, o kwesịghị ka ihe ndị a dị otú a.”—Jemes 3:10.

3. Anyị kwesịrị ileba anya n’akụkụ abụọ dị aṅaa nke okwu ọnụ anyị?

3 Ọ bụ ezie na ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ịchịkwa ire ya n’ụzọ zuru okè, n’ezie anyị kwesịrị ime mgbalị imeziwanye. Pọl onyeozi nyere anyị ndụmọdụ, sị: “Ka okwu ọ bụla nke na-ere ure ghara isi n’ọnụ unu pụta, kama ihe bụ ezi ihe, iwuli mmadụ elu dị ka ụlọ, dị ka mkpa si dị, ka o wee nye ndị na-anụ ya amara.” (Ndị Efesọs 4:29) Rịba ama na ndụmọdụ nke a nwere akụkụ abụọ: ihe anyị kwesịrị ime mgbalị izere na ihe anyị kwesịrị ịgbalị ime. Ka anyị tụlee akụkụ abụọ ahụ.

Izere Okwu Rere Ure

4, 5. (a) Ibu agha dị aṅaa ka ndị Kraịst nwere banyere okwu rụrụ arụ? (b) Onyinyo dị aṅaa pụrụ ikwekọ n’ahịrị okwu ahụ bụ “okwu ọ bụla nke na-ere ure”?

4 Ndị Efesọs 4:29 bu ụzọ gbaa anyị ume, sị: “Ka okwu ọ bụla nke na-ere ure ghara isi n’ọnụ unu pụta.” Nke ahụ pụrụ ịbụ ihe na-adịghị mfe. Otu ihe kpatara ya bụ na okwu rụrụ arụ jupụtara nke ukwuu n’ụwa anyị bi n’ime ya. Ọtụtụ ndị Kraịst na-eto eto na-anụ okwu rụrụ arụ kwa ụbọchị, n’ihi na ụmụ akwụkwọ ibe ha pụrụ iche na ọ na-emesi okwu ike ma ọ bụ na-eme ka ha yie ndị dị ike karị. Ọ pụrụ ịbụ na anyị agaghị enwe ike izere ịnụ okwu rere ure kpam kpam, ma anyị pụrụ, kwesịkwa iji nlezianya mee mgbalị ka anyị ghara ịmụta okwu ndị a. Ha enweghị ọnọdụ ọ bụla n’uche ma ọ bụ n’ọnụ anyị.

5 Ihe na-emesi ịdọ aka ná ntị Pọl ike bụ okwu Grik nke metụtara azụ mebiri emebi ma ọ bụ mkpụrụ osisi rere ure. Jiri anya nke uche gị hụ ihe a: Ị hụrụ otu nwoke na-achọghị inwe ndidi, mgbe ahụ ọ malitere iwe oké iwe. N’ikpeazụ o gosipụtara iwe ya, i wee hụ ka azụ rere ure si n’ọnụ ya dapụta. I wee hụkwa ka mkpụrụ osisi na-esi ajọ ísì, nke rere ure dapụtara, na-agbasa mmadụ nile nọ nso. Ònye ka ọ bụ? Lee ka ọ ga-esi jọgbuo onwe ya ma ọ bụrụ na ọ bụ onye ọ bụla n’ime anyị! Ma, onyinyo dị otú ahụ pụrụ ikwekọ ma ọ bụrụ na anyị ‘ekwere ka okwu rere ure na-esi anyị n’ọnụ apụta.’

6. Olee ụzọ Ndị Efesọs 4:29 si emetụta okwu nkatọ, nke na-ezighị ezi?

6 Ebe ọzọ a pụrụ iji Ndị Efesọs 4:29 mee ihe bụ ka anyị zere ịbụ ndị na-akatọ ihe mgbe nile. N’ikwu eziokwu, anyị nile nwere ihe bụ echiche na ọchịchọ anyị n’ihe ndị anyị na-enweghị mmasị na ha ma ọ bụ na-anabata, ma ị̀ nọtụwo n’akụkụ onye o yiri ka ọ̀ na-ekwu okwu na-ezighị ezi (ma ọ bụ ọtụtụ okwu) banyere onye, ebe, ma ọ bụ ihe ọ bụla e kwuru okwu ya? (Tụlee Ndị Rom 12:9; Ndị Hibru 1:9.) Okwu ọnụ ya na-egbu mmụọ, na-akpata ịda mbà, ma ọ bụ na-ebibi ebibi. (Abụ Ọma 10:7; 64:2-4; Ilu 16:27; Jemes 4:11, 12) Ọ pụrụ ịbụ na ọ mataghị ụzọ o si yie ndị nkatọ ahụ Malakaị kọwara. (Malakaị 3:13-15) Lee otú obi pụrụ isi mapụ ya ma ọ bụrụ na onye guzo n’akụkụ agwa ya na azụ rere ure ma ọ bụ mkpụrụ osisi retọrọ eretọ si n’ọnụ ya na-apụta!

7. Nnyocha onwe onye dị aṅaa ka onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ime?

7 Ebe ọ bụ na ọ na-adị mfe ịmata mgbe onye ọzọ na-ekwu okwu na-ezighị ezi ma ọ bụ okwu nkatọ mgbe nile, jụọ onwe gị, sị, ‘Àna m eme ihe yiri nke ahụ? N’ezie, àna m eme otú ahụ?’ Ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịtụgharị uche mgbe mgbe banyere mmụọ nke okwu anyị. Hà bụ n’ụzọ bụ isi okwu ndị na-ezighị ezi, okwu nkatọ? Ànyị na-ekwu okwu dị ka ndị nkasi obi ụgha atọ nke Job? (Job 2:11; 13:4, 5; 16:2; 19:2) Gịnị ma ị chọta akụkụ ziri ezi iji kwuo okwu? Ọ bụrụ na nkwurịta okwu bụ nke nkatọ n’ụzọ bụ isi, gịnị ma ị gbanwee ya ịghọ okwu na-ewuli elu?

8. Malakaị 3:16 na-enye ihe mmụta dị aṅaa banyere ikwu okwu, oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi gosi na anyị na-etinye ihe mmụta ahụ n’ọrụ?

8 Malakaị wepụtara ọdịiche nke a: “Ndị na-atụ egwu Jehova na-ekwurịta okwu, otu onye na ibe ya: Jehova wee ṅaa ntị, nụ, e wee deere ndị na-atụ egwu Jehova, ndị na-echekwa echiche aha ya, akwụkwọ ncheta n’ihu ya.” (Malakaị 3:16) Ị̀ rịbara ama ụzọ Jehova si meghachi omume n’okwu na-ewuli elu? Gịnị pụrụ ịbụ mmetụta nke nkwurịta okwu dị otú ahụ nwere n’ahụ ndị bụ enyi? Anyị onwe anyị pụrụ ịmụta ihe n’ihe banyere okwu anyị na-ekwu kwa ụbọchị. Lee ka ọ ga-esi dị mma karị nye anyị na ndị ọzọ ma ọ bụrụ na nkwurịta okwu ọ bụla anyị na-enwe na-egosipụta ‘àjà otuto anyị na-achụrụ Chineke.’—Ndị Hibru 13:15.

Tinye Mgbalị n’Iwuli Ndị Ọzọ Elu

9. N’ihi gịnị ka nzukọ nile nke ndị Kraịst ji bụrụ oge ndị dị mma maka iwuli ndị ọzọ elu?

9 Nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ bụ oge magburu onwe ya iji kwuo ‘ezi ihe maka iji wulie elu, dị ka mkpa si dị, ka e wee nye ndị na-anụ ya amara.’ (Ndị Efesọs 4:29) Anyị pụrụ ime nke ahụ mgbe anyị na-ekwu okwu n’ihe ọmụma Bible, na-ekere òkè n’ihe ngosi, ma ọ bụ na-aza ajụjụ n’oge ihe omume ntụle ajụjụ na azịza dị iche iche. Anyị si otú a na-egosipụta izi ezi nke Ilu 20:15: “Ihe dị oké ọnụ ahịa ka egbugbere ọnụ nke na-ekwu ihe ọmụma bụ.” Ònyekwa maara obi mmadụ ole anyị na-akpali ma ọ bụ na-ewuli?

10. Mgbe anyị tụgharịsịrị uche banyere ndị anyị sorowooro nwee nkwurịta okwu mgbe mgbe, mgbanwe dị aṅaa pụrụ ikwesị ekwesị? (2 Ndị Kọrint 6:12, 13)

10 Oge nzukọ na-amalitebeghị na mgbe ọ gasịrị bụ oge dị mma maka iwuli ndị ọzọ elu site ná nkwurịta okwu dị mma nye ndị na-anụ ya. Ọ ga-adị mfe isoro ndị ikwu na obere ọnụ ọgụgụ nke ndị enyi anyị, bụ́ ndị ahụ na-eru anyị ala n’ihu ha, nọrọ n’oge ndị a na-enwe nkwurịta okwu ndị dị mma. (Jọn 13:23; 19:26) Otú ọ dị, n’ikwekọ ná Ndị Efesọs 4:29, gịnị ma ị chọgharịa ndị ọzọ ị ga-eso kwurịta okwu? (Tụlee Luk 14:12-14.) Anyị pụrụ ibu ụzọ kpebie na anyị ga-ekwu ihe karịrị nanị ndewo nkịtị nye ndị ọhụrụ ụfọdụ, ndị meworo agadi, ma ọ bụ ndị na-eto eto, ọbụna na-anọdụ ala n’akụkụ ndị na-eto eto iji wee hara otú ha hà. Ezi mmasị anyị nwere na oge ikwu okwu ndị na-ewuli elu ga-eme ka ndị ọzọ ọbụna nwee ike ikwughachi mmetụta Devid nke dị n’Abụ Ọma 122:1.

11. (a) Àgwà dị aṅaa ka ọtụtụ zụliteworo banyere ịnọdụ n’oche? (b) N’ihi gịnị ka ụfọdụ ji akpacha anya agbanwe ebe ha na-anọ?

11 Ihe ọzọ na-enye aka inwe nkwurịta okwu na-ewuli elu bụ ịgbanwe ebe anyị na-anọ ná nzukọ dị iche iche. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka nne ku nwa n’aka nọdụ nso n’ebe a na-eje mposi, ma ọ bụ ọ pụrụ ịdị mkpa ka onye ọrịa nọdụ n’oche mpụta, ma gịnị banyere ndị ọzọ n’ime anyị? Àgwà anyị pụrụ ime ka anyị na-alaghachi n’otu oche ma ọ bụ n’otu ebe; ọbụna nnụnụ na-alaghachi n’akwụ ya ná mkpali ebumpụta ụwa. (Aịsaịa 1:3; Matiu 8:20) Otú ọ dị, n’ikwu eziokwu, ebe ọ bụ na anyị pụrụ ịnọdụ ala n’ebe ọ bụla, gịnị ma anyị na-agbanwe ebe anyị na-anọ—n’akụkụ aka nri, akụkụ aka ekpe, n’ebe dị nso n’ihu, na n’ebe ndị ọzọ—sikwa otú ahụ na-amata ndị dị iche iche nke ọma karị? Ọ bụ ezie na e nweghị ụkpụrụ nke na-asị ka anyị mee nke a, ndị okenye na ndị ọzọ tozuru etozu, bụ́ ndị na-agbanwe ebe ha na-anọ, ahụwo na ọ dị mfe karị ịkụnye ihe dị mma n’obi ọtụtụ ndị kama ịbụ nanị n’obi ndị ezigbo enyi ha ole na ole.

Na-ewuli Elu n’Ụzọ Chineke

12. Ọchịchọ dị aṅaa na-ekwesịghị ekwesị ka e gosipụtaworo n’akụkọ ihe mere eme nile?

12 Ọchịchọ nke onye Kraịst nwere iwuli ndị ọzọ elu kwesịrị ịkpali ya iṅomi Chineke n’akụkụ nke a kama ịgbaso omume mmadụ nke ime ọtụtụ ụkpụrụ.a Ụmụ mmadụ na-ezughị okè enwewo ọchịchọ nke ịchị ndị ha na ha nọ, ọbụnakwa na ụfọdụ n’ime ndị ohu Chineke adabawo n’ọchịchọ nke a. (Jenesis 3:16; Eklisiastis 8:9) N’oge Jisọs, ndị ndú nke ndị Juu ‘na-eke ibu arọ tụkwasị n’ubu ndị ọzọ ma ha achọghị ka otu mkpịsị aka ha metụ ya.’ (Matiu 23:4) Ha tụgharịrị ọdịnala ndị na-adịghị njọ ịghọ omenala ndị a ga-emerịrị. N’ihi nchegbu gabigara ókè ha nwere maka ụkpụrụ mmadụ, ha leghaara ihe ndị Chineke kọwara dị ka ihe dị mkpa karị anya. Ọ dịghị onye e wuliri elu site na ha ime ọtụtụ ụkpụrụ na-adabereghị n’Akwụkwọ nsọ; ụzọ ha abụghị ụzọ nke Chineke ma ọlị.—Matiu 23:23, 24; Mak 7:1-13.

13. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe na-ekwesịghị ekwesị ichepụta ọtụtụ ụkpụrụ maka ndị Kraịst ibe anyị?

13 Ndị Kraịst nwere ezi ọchịchọ nke ịrapara n’iwu nile nke Chineke. Otú ọ dị, ọbụna anyị onwe anyị pụrụ ịdaba n’omume nke ime ọtụtụ ụkpụrụ dị arọ. N’ihi gịnị? Na nke mbụ, ọchịchọ na mmasị mmadụ nile abụghị otu, ya mere ụfọdụ pụrụ ịnabata ihe na-amasịghị ndị ọzọ na ihe ha chere na e kwesịrị ịkachapụ. Ndị Kraịst na-enwekwa ọdịiche n’ọganihu ha iru ntozu ime mmụọ. Ma ime ọtụtụ ụkpụrụ ọ̀ bụ ụzọ Chineke isi nyere onye ọzọ aka inwe ọganihu iru ntozu okè? (Ndị Filipaị 3:15; 1 Timoti 1:19; Ndị Hibru 5:14) Ọbụna mgbe mmadụ na-achụso n’ezie ihe omume yiri ka ọ̀ gabigara ókè ma ọ bụ dị ize ndụ, iwu mmachibido ọ̀ bụ ihe ngwọta kasị mma? Ụzọ nke Chineke bụ ka ndị ruru eru gbalịa iweghachi onye na-ada ada site n’isoro onye ahụ tụgharịa uche n’ụzọ dị nwayọọ.—Ndị Galetia 6:1.

14. Nzube ndị dị aṅaa ka iwu ndị ahụ Chineke nyere Israel mezuru?

14 N’eziokwu, mgbe o ji Israel eme ihe dị ka ndị ya, Chineke setịpụrụ ọtụtụ narị iwu banyere ofufe ụlọ nsọ, ịchụ àjà, ọbụna ịdị ọcha. Nke a kwesịrị ekwesị nye mba pụrụ iche, ọtụtụ n’ime iwu ndị ahụ nwekwara ihe ha pụtara n’ụzọ amụma, nyekwa aka iduru ndị Juu bịakwute Mesaịa ahụ. Pọl dere, sị: “Iwu ahụ aghọwo onye ozizi anyị ikuru anyị bịakwute Kraịst, ka e wee site n’okwukwe gụọ anyị ná ndị ezi omume. Ma ebe okwukwe ahụ bịaworo, anyị anọghị ọzọ n’okpuru onye ozizi.” (Ndị Galetia 3:19, 23-25) Mgbe a kagbusịrị Iwu ahụ n’elu osisi ịta ahụhụ, Chineke enyeghị ndị Kraịst ndepụta nke ụkpụrụ buru ibu banyere ihe ka ọtụtụ n’akụkụ nke ndụ, dị ka à ga-asị na nke ahụ bụ ụzọ isi nọgide na-ewuli ha elu n’okwukwe.

15. Nduzi dị aṅaa ka Chineke nyeworo ndị Kraịst na-efe ofufe?

15 Otú ọ dị, anyị abụghị ndị na-enweghị iwu. Chineke nyere anyị iwu izere ikpere arụsị, ịkwa iko na ịkwa iko ndị lụrụ di na nwunye, na iji ọbara mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ọ machibidoro kpọmkwem igbu ọchụ, ikwu okwu ụgha, mgbaasị, na mmehie ndị ọzọ dị iche iche. (Ọrụ 15:28, 29; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Mkpughe 21:8) Ọ na-enyekwa ndụmọdụ doro anya n’ọtụtụ isiokwu n’ime Okwu ya. Ma, ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu karịa nke ndị Israel, anyị nwere ibu ọrụ nke ịmụta na itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Ndị okenye pụrụ iwuli ndị ọzọ elu site n’inyere ha aka ịchọta na ịtụle ụkpụrụ ndị a kama ịnọ nnọọ na-achọgharị ma ọ bụ na-eme ụkpụrụ.

Ndị Okenye Ndị Na-ewuli Elu

16, 17. Ndị ozi ahụ setịpụrụ ezi ihe nlereanya dị aṅaa n’ihe banyere imere ndị ofufe ibe ha ụkpụrụ?

16 Pọl dere, sị: “N’ihe ahụ anyị gbaruru, ka anyị na-agazi dị ka ihe ahụ si dị.” (Ndị Filipaị 3:16) N’ikwekọ n’echiche Chineke dị otú ahụ, onyeozi ahụ mesoro ndị ọzọ n’ụzọ wuliri ha elu. Dị ka ihe atụ, ajụjụ bilitere banyere ma à ga-eri anụ pụrụ isiteworị n’ụlọ arụsị. Onye okenye nke a, ma eleghị anya n’aha nke ime ihe kwekọrọ ekwekọ ma ọ bụ ịdị mfe, ò setịpụrụ ụkpụrụ ụfọdụ maka ndị nile nọ n’ọgbakọ oge gboo ahụ? Ee e. Ọ matara na ọdịiche e nwere n’ihe ọmụma na ọganihu iru ntozu okè pụrụ iduga ndị Kraịst ahụ n’ime nhọrọ dịgasị iche iche. Nye ya, o kpebiri isetịpụ ezi ihe nlereanya.—Ndị Rom 14:1-4; 1 Ndị Kọrint 8:4-13.

17 Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na-egosi na ndị ozi nyere ndụmọdụ na-enye aka n’ụfọdụ ihe onwe onye, dị ka banyere iyi uwe na iji ejiji, ọ dịghị mgbe ha wepụtara ụkpụrụ metụtara ihe nile. Taa nke a bụ ezi ihe nlereanya nye ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta, bụ́ ndị nwere mmasị n’iwuli ìgwè atụrụ ahụ elu. N’ezie ọ gabigakwara usoro ime ihe bụ isi nke Chineke gbasoro n’ọnọdụ nke Israel oge ochie.

18. Jehova nyere Israel ụkpụrụ ndị dị aṅaa banyere iyi uwe?

18 Chineke enyeghị ndị Israel iwu sara mbara banyere iyi uwe. O doro anya na ndị ikom na ndị inyom yiri otu ụdị uwe mwụda, ma ọ bụ uwe elu, ọ bụ ezie na nke ndị inyom pụrụ ịbụ nke a kpara akpa ma ọ bụ nke tụrụ àgwà karị. Ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwanyị yikwara sa·dhinʹ, ma ọ bụ uwe ime. (Ndị Ikpe 14:12; Ilu 31:24; Aịsaịa 3:23) Iwu dị aṅaa banyere iyi uwe ka Chineke nyere? Nwoke agaghị eyi uwe e ji amata nwanyị, nwanyị agaghị eyi uwe e ji amata nwoke, nke pụtara ìhè na ọ bụ n’ihi ọchịchọ idina ụdị onwe onye. (Deuterọnọmi 22:5) Iji gosi na ha dị iche pụọ ná mba ndị gbara ha gburugburu, ndị Israel ga-eme ka ọnụ ọnụ uwe ha nwee ajịrịja, nke nwere eriri na-acha anụnụ anụnụ n’elu ajịrịja ahụ, ma ọ bụ ma eleghị anya eriri a mara akpụ n’akụkụ nke uwe mwụda ahụ. (Ọnụ Ọgụgụ 15:38-41) N’ụzọ bụ isi, nke ahụ bụ ntụziaka nile nke Iwu ahụ nyere banyere ụdị uwe oyiyi.

19, 20. (a) Ntụziaka dị aṅaa ka Bible na-enye ndị Kraịst banyere iyi uwe na iji ejiji? (b) Echiche dị aṅaa ka ndị okenye kwesịrị inwe banyere ime ụkpụrụ ndị metụtara ọdịdị onwe onye?

19 Ọ bụ ezie na ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu ahụ, ànyị nwere ụkpụrụ ndị ọzọ zuru ezu banyere uwe ma ọ bụ ịchọ mma nke e setịpụụrụ anyị na Bible? N’ezie ọ dịghị. Chineke nyere ụkpụrụ ndị ziri ezi anyị pụrụ itinye n’ọrụ. Pọl dere, sị: “Ezubere m ka ndị inyom were ihe ịchọ mma kwesịrị ekwesị chọọ onwe ha mma, ya na nsọpụrụ na uche zuru okè; ọ bụghị isi a kpara akpa, na ọlaedo ma ọ bụ pearl ma ọ bụ uwe dị oké ọnụ ahịa.” (1 Timoti 2:9) Pita gbara ume na kama ịtụkwasị uche n’ịchọ mma elu ahụ, ndị Kraịst bụ́ ndị inyom kwesịrị ịtụkwasị uche na “mmadụ zoro ezo nke mkpụrụ obi, n’uwe a na-apụghị imebi emebi nke bụ mmụọ dị nwayọọ dịkwa udo.” (1 Pita 3:3, 4) Na e dekọrọ ndụmọdụ dị otú ahụ na-atụ aro na ọ pụrụ ịdịworị mkpa ka ụfọdụ ndị Kraịst narị afọ mbụ na-emeru ihe n’ókè karị ma beletakwuo aka n’ụzọ ha si eyi uwe ma na-eji ejiji. Ma, kama ịchọ n’aka ha—ma ọ bụ ịmachibido—ụfọdụ ejiji, ndị ozi ahụ nyere nanị ndụmọdụ na-ewuli elu.

20 Ndịàmà Jehova kwesịrị ịbụ, ha bụkwa, ndị a na-akwanyere ùgwù n’ozuzu ha maka imeru ihe n’ókè n’ọdịdị ha. Otú o sina dị, ejiji adighị abụ otu ihe site ná mba ruo ná mba, ọbụnakwa n’ime otu ógbè ma ọ bụ otu ọgbakọ. Otú ọ dị, onye okenye nwere echiche siri ike ma ọ bụ otú ọ chọrọ ka e si yie uwe ma ọ bụ jie ejiji pụrụ ikpebi ihe kwesịrị ekwesị maka onwe ya na ezinụlọ ya. Ma banyere ìgwè atụrụ ahụ, ọ dị mkpa ka o buru n’uche ihe Pọl na-ekwu: “Ọ bụghị na anyị bụ ndị nwe okwukwe unu, kama anyị bụ ndị soro unu na-arụta ọṅụ unu: n’ihi na unu ji okwukwe unu guzo.” (2 Ndị Kọrint 1:24) Ee, site n’iguzogide mkpali ọ bụla isetịpụrụ ọgbakọ ụkpụrụ, ndị okenye na-arụ ọrụ iwuli okwukwe ndị ọzọ elu.

21. Olee ụzọ ndị okenye pụrụ isi nye enyemaka na-ewuli elu ma ọ bụrụ na mmadụ eme ihe gabigara ókè n’uwe oyiyi?

21 Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, mgbe ụfọdụ, onye ọhụrụ ma ọ bụ onye na-adịghị ike n’ime mmụọ pụrụ ịgbaso ụzọ a na-enyo enyo ma ọ bụ nke amamihe na-adịghị na ya n’iyi uwe ma ọ bụ n’iji ihe ntecha ma ọ bụ ọla na-eme ihe. Mgbe ahụ gịnị ka a ga-eme? Ọzọ, Ndị Galetia 6:1 na-enye ndị Kraịst bụ́ ndị okenye nduzi bụ́ ndị ji ezi obi na-achọ inye aka. Tupu onye okenye ekpebie inye ndụmọdụ, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya ijekwuru onye okenye ibe ya, ọ ga-akasị mma ma ọ bụrụ na o jekwughị onye okenye ọ maara na o nwere ọchịchọ ma ọ bụ echiche ndị o nwere. Ọ bụrụ na omume ụwa nke iyi uwe ma ọ bụ iji ejiji yiri ka ọ̀ na-emetụta ọtụtụ ndị n’ọgbakọ, òtù ndị okenye pụrụ ịtụle ụzọ kasị mma isi nye enyemaka, dị ka site n’ime ihe omume obi ọma, nke na-ewuli elu ná nzukọ ma ọ bụ site n’inye enyemaka onwe onye. (Ilu 24:6; 27:17) Ihe mgbaru ọsọ ha ga-abụ ịgba ume ka e nwee echiche ahụ e gosipụtara ná 2 Ndị Kọrint 6:3: “Anyị adịghị eme ihe ịsụ ngọngọ ọ bụla n’ihe ọ bụla, ka a ghara ịta ije ozi anyị ụta.”

22. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-ekwesịghị iji bụrụ ihe na-akpata nsogbu ma ọ bụrụ na e nwee ntakịrị ọdịiche n’ụzọ e si ele ihe? (b) Ezi ihe nlereanya dị aṅaa ka Pọl setịpụrụ?

22 Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye ‘na-azụ ìgwè atụrụ Chineke dị n’etiti ha’ ga-achọ ime dị ka Pita si depụta, ya bụ, ọ bụghị ‘ime dị ka ọ̀ bụ ha nwe ndị bụ ihe nketa Chineke.’ (1 Pita 5:2, 3) Mgbe ha na-arụ ọrụ ịhụnanya ha, ajụjụ pụrụ ibilite n’ihe ndị a pụrụ inwe mmasị dị iche iche na ha. Ma eleghị anya ọ pụrụ ịbụ omume ọgbakọ unu iguzo ọtọ gụpụta paragraf n’oge Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Ndokwa ìgwè maka ije ozi ubi na ọtụtụ ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ banyere ije ozi n’onwe ya pụrụ ịbụ ndị a na-eme dị ka omenala ógbè ahụ si dị. Ma, ọ̀ ga-abụ ọdachi ma ọ bụrụ na onye ọzọ enwee ụzọ dịtụ iche? Ndị nlekọta na-ahụ n’anya na-achọ “ka e mee ihe nile n’ụzọ dị mma n’anya, na n’usoro,” bụ́ okwu Pọl ji mee ihe banyere onyinye ọrụ ebube dị iche iche. Ma ihe a na-atụle na-egosi na ihe bụ mmasị Pọl n’ụzọ bụ isi bụ “ka e wee wulie nzukọ Kraịst elu.” (1 Ndị Kọrint 14:12, 40) O gosipụtaghị ọchịchọ ọ bụla ime ọtụtụ ụkpụrụ na-adịghị agwụ agwụ, dị ka à ga-asị na nkwekọ zuru ezu ma ọ bụ ịdị irè zuru ezu bụ nzube bụ isi o nwere. O dere, sị: “Onyenwe anyị nyere [anyị ikike] iwuli unu elu dị ka ụlọ, ọ bụghịkwa iweda unu.”—2 Ndị Kọrint 10:8.

23. Olee ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Pọl nke iwuli ndị ọzọ elu?

23 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Pọl rụrụ ọrụ iji wulie ndị ọzọ elu site n’okwu ndị ziri ezi na ndị na-agba ume. Kama inwe mkpakọrịta n’etiti nanị ndị enyi ole na ole, o tinyekwuru mgbalị ileta ọtụtụ ụmụnna nwoke na nwanyị, ma ndị dị ike n’ime mmụọ na ndị nọ ná mkpa karịsịa ịbụ ndị e wuliri elu. O mesiri inwe ịhụnanya ike—kama ọtụtụ ụkpụrụ—n’ihi na “ịhụnanya na-ewuli elu.”—1 Ndị Kọrint 8:1.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’ime ezinụlọ ọ pụrụ ịdị mkpa inwe ụkpụrụ dị iche iche, na-adabere n’ọnọdụ ndị e nwere. Bible nyere ndị mụrụ ụmụ ikike ikpebi okwu ndị metụtara ụmụ ka nọ n’okpuru ha.—Ọpụpụ 20:12; Ilu 6:20; Ndị Efesọs 6:1-3.

Isi Ihe Ndị A Ga-atụleghachi

◻ N’ihi gịnị ka ime mgbanwe ji kwesị ekwesị ma ọ bụrụ na anyị nwere ọchịchọ ikwu okwu na-ezighị ezi ma ọ bụ okwu nkatọ?

◻ Gịnị ka anyị pụrụ ime iji bụrụ ndị na-ewuli elu karị n’ọgbakọ?

◻ Gịnị bụ ihe nlereanya Chineke banyere imere ndị ọzọ ọtụtụ ụkpụrụ?

◻ Gịnị ga-enyere ndị okenye aka izere imere ìgwè atụrụ ahụ ụkpụrụ mmadụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya