Echiche Nke Bible
Uwe na Ejiji Gị—Ọ̀ Gbasara Chineke?
“Dị ka ndepụta ntụaka na-egosi ihe ndị dị n’ime akwụkwọ, . . . ọbụna otú a ka ọdịdị na uwe, nke nwoke ma ọ bụ nwanyị, na-egositụ anyị otú o si eche echiche.”—Onye England na-ede egwuregwu bụ́ Philip Massinger.
NA NARỊ afọ nke atọ O.A., onye na-edere chọọchị ihe bụ́ Titus Clemens depụtara ogologo ụkpụrụ nduzi ndị na-achịkwa uwe na ejiji. A machibidoro ihe ịchọ mma na uwe okomoko ma ọ bụ ndị mara mma iwu. Ụmụ nwanyị agaghị eteji ntutu ha ma ọ bụ “tee ihe ndị na-ara ụrà nke ịghọ aghụghọ n’ihu ha,” ya bụ, “ite ihe n’ihu.” E nyere ụmụ nwoke ntụziaka ịkpụchasị isi ha n’ihi na “ntutu a kpụtulatara akpụtulata . . . na-egosi na nwoke na-eji ihe akpọrọ ihe,” ma ha agaghị akpa afụ ọnụ ha aka, n’ihi na “ọ na-enye ihu ùgwù na ụjọ kwesịrị nna.”a
Ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, onye ndú Protestant bụ́ John Calvin tiri iwu ndị kwuru kpọmkwem ụcha na ụdị uwe ndị na-eso ụzọ ya pụrụ iyi. A kagburu ọla na uwe lace, a pụkwara ịtụ nwanyị nga maka idozi isi ya ruo “n’ịdị elu na-adịghị mma.”
Ụdị echiche ndị ahụ gabigara ókè, nke ndị ndú okpukpe kwalitere n’ime ọtụtụ afọ gara aga, emewo ka ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu na-eche, sị, Ihe m na-eyi ọ̀ gbasara Chineke n’ezie? Ọ̀ kagburu ụdị uwe ụfọdụ ma ọ bụ ite ihe otite? Gịnị ka Bible na-akụzi?
Okwu Aka Mmadụ
Ọ dị mma ịmara na dị ka e dekọrọ na Jọn 8:31, 32, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na unu onwe unu anọgide n’okwu m, . . . unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.” Ee, eziokwu ndị Jisọs kụziri bụ ndị e zubere iji tọpụ ndị mmadụ pụọ n’ibu arọ na-egbu mgbu nke ọdịnala na ozizi ụgha kpatara. E mere ha iji mee ka ndị ‘na-adọgbu onwe ha n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ’ nwee ume ọhụrụ. (Matiu 11:28) Ma Jisọs ma Nna ya, bụ́ Jehova Chineke, adịghị nke nwere ọchịchọ ọ bụla ịchịkwa ndụ ndị mmadụ ruo n’ókè nke na ndị mmadụ apụkwaghị ime ihe n’onwe ha ma jiri echiche ha mee ihe n’okwu ndị dịịrị ha. Jehova chọrọ ka ha ghọọ ndị tozuru okè, ndị “a nwaworo nghọta ha n’ihi omume ha na-eme mgbe dum ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ.”—Ndị Hibru 5:14.
N’ihi ya, Bible enyeghị iwu sara mbara nke na-achịkwa uwe na ejiji ma ọ bụ ite ihe ntecha, e wezụga iwu ụfọdụ kpọmkwem banyere uwe bụ́ ndị Iwu Mosis tụkwasịrị ndị Juu, bụ́ ndị e zubere iji nyere ha aka ịdị iche ná mba ndị gbara ha gburugburu na mmetụta omume rụrụ arụ ha. (Ọnụ Ọgụgụ 15:38-41; Deuterọnọmi 22:5) N’ime ndokwa ndị Kraịst, uwe na ejiji bụ n’ụzọ bụ́ isi okwu ihe masịrị mmadụ.
Otú ọ dị, nke ahụ abụghị ikwu na ihe anyị na-eyi agbasaghị Chineke ma ọ bụ na ‘a pụrụ iyi ihe ọ bụla.’ Kama nke ahụ, Bible nwere ụkpụrụ nduzi ndị ezi uche dị na ha ndị na-egosipụta echiche Chineke banyere uwe na ejiji.
‘Nke Kwesịrị Ekwesị na nke Uche Zuru Okè’
Pọl onyeozi dere na ụmụ nwanyị bụ́ ndị Kraịst kwesịrị iji “ihe ịchọ mma kwesịrị ekwesị chọọ onwe ha mma, ya na nsọpụrụ na uche zuru okè; ọ bụghị isi a kpara akpa, na ọlaedo ma ọ bụ pearl ma ọ bụ uwe dị oké ọnụ ahịa.” N’otu aka ahụ, Pita na-adụ ọdụ megide “ịchọ mma ahụ nke ahụ nke bụ́ ịkpa isi, na iyikwasị ihe ọlaedo.”—1 Timoti 2:9; 1 Pita 3:3.
Pita na Pọl hà na-egosi na ụmụ nwanyị na ụmụ nwoke bụ́ ndị Kraịst kwesịrị izere imeziwanye ọdịdị ha? Ọ dịghị ma ọlị! N’ezie, Bible hotara ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị jiri ọla ma ọ bụ mmanụ otite na ihe na-esi ísì ụtọ mee ihe. Tupu a kpọpụta ya n’ihu Eze Ahasuerọs, Esta gbasoro usoro ịchọ mma siri ike nke gụnyere mmanụ na-esi ísì ụtọ na ịhịa aka. E yikwasịkwara Josef ezi ákwà ọcha na ihe olu ọlaedo.—Jenesis 41:42; Ọpụpụ 32:2, 3; Esta 2:7, 12, 15.
Nkebi okwu ahụ bụ́ “uche zuru okè,” dị ka Pọl si jiri ya mee ihe, na-enyere anyị aka ịghọta ndụmọdụ ahụ. Okwu Grik mbụ e ji mee ihe na-egosi imeru ihe n’ókè na inwe njide onwe onye. Ọ na-enye nghọta nke inwe echiche kwesịrị ekwesị banyere onwe onye, ọ bụghị ịdọta mmasị na-ekwesịghị ekwesị. Nsụgharị Bible ndị ọzọ sụgharịrị okwu a ịbụ “n’ezi uche,” “n’ụzọ amamihe,” “nke dị mma,” ma ọ bụ “ná njide onwe onye.” Àgwà a bụ ihe dị mkpa a chọrọ n’aka ndị Kraịst bụ́ ndị okenye.—1 Timoti 3:2.
Ya mere, n’ịgwa anyị na uwe na ejiji anyị kwesịrị ịbụ nke kwesịrị ekwesị na nke dị mma, Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume izere ụdị ọ bụla gabigara ókè nke ga-akpasu ndị ọzọ iwe ma wetara aha ọma anyị na nke ọgbakọ ndị Kraịst nkọcha. Kama ịdọta uche n’ebe ọdịdị ha dị site n’ịchọ mma elu ahụ, ndị na-ekwu na ha na-atụ egwu Chineke kwesịrị igosi uche zuru okè ma lekwasị anya na “mmadụ zoro ezo nke mkpụrụ obi, n’uwe a na-apụghị imebi nke bụ́ mmụọ dị nwayọọ dịkwa udo.” Nke a, ka Pita na-ekwubi, “dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—1 Pita 3:4.
Ndị Kraịst bụ “ihe nkiri nye ụwa.” Ọ dị ha mkpa ịmata echiche ha na-enye ndị ọzọ, karịsịa n’ihi iwu e nyere ha ikwusa ozi ọma ahụ. (1 Ndị Kọrint 4:9; Matiu 24:14) Ya mere ha agaghị achọ ikwe ka ihe ọ bụla, gụnyere ọdịdị ha, dọpụ uche ndị ọzọ n’ige ntị n’ozi ahụ dị mkpa.—2 Ndị Kọrint 4:2.
Ọ bụ ezie na ọdịdị uwe na-adị nnọọ iche site n’otu ebe gaa n’ọzọ, Bible na-enye ndị mmadụ n’otu n’otu ụkpụrụ nduzi ndị doro anya, ndị ezi uche dị na ha, ndị na-eme ka ha nwee ike iji amamihe mee nhọrọ. Ọ bụrụhaala na ndị mmadụ agbasosie ụkpụrụ ndị a ike, Chineke na-eji ọchịchọ obi na ịhụnanya ekwere ka mmadụ nile gosipụta ụdị uwe na ejiji na-amasị ha.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E mere mgbalị imesi mmachibido iwu ndị a ike site n’ịhịgharị Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụ ezie na Bible ekwughị ihe dị otú ahụ, ọkà mmụta okpukpe ahụ a ma ama bụ́ Tertullian kụziri na ebe ọ bụ nwanyị kpatara “mmehie mbụ, na aha ọjọọ . . . amamikpe nke ụmụ mmadụ,” ụmụ nwanyị kwesịrị ịdị na-ejegharị “dị ka Iv na-eru újú ma na-egosi nchegharị.” N’ezie, o kwusiri ike na nwanyị mara mma site n’okike kwesịrị ọbụna iru n’ókè nke izochi ịma mma ya.—Tụlee Ndị Rom 5:12-14; 1 Timoti 2:13, 14.