Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
◼Ọ̀ bụ ihe kwesịrị ekwesị ka nwanyị onye Kraịst yiri ọla dị iche iche ma ọ bụ tee ihe otite ndị e ji achọ mma, tejie isi ya ma ọ bụ mee ihe ndị yiri nke ahụ?
N’oge ochie nakwa n’oge anyị a, ụfọdụ ndị na-ekwu na ha na-agbaso Bible ewulitewo echiche ndị siri ike ma dịrịtakwa iche nke ukwuu n’ihe banyere ịchọ mma.a
Ndị inyom nọ n’ụfọdụ chọọchị na-ajụ iji ihe ịchọ mma ma ọ bụ ọla ọ bụla eme ihe kpam kpam. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ ahụ bụ The Amish People kọrọ na ha “na-amachibido ọdịdị anụ ahụ ha n’ihi na ha chere na onye òtù ha ọ bụla nke nwere ezi mmasị n’ọdịdị elu ahụ nke ụwa nọ n’ihe ize ndụ, ebe ọ bụ na e kwesịrị itinye mmasị [ahụ] n’ihe ime mmụọ kama ịbụ n’ihe anụ ahụ. Ụfọdụ ndị . . . ga-ehota okwu Akwụkwọ nsọ.”
Akụkụ akwụkwọ nsọ a na-ehota okwu na ya mgbe ahụ bụ 1 Samuel 16:7, nke na-asị: “Jehova sịrị Samuel, Elegidela ihu ya anya, elegidekwala ogologo nke ịdị elu ya; . . . mmadụ na-ele ihe anya n’ahụ, ma Jehova na-ele obi.” Otú ọ dị, akụkụ ihe odide ahụ na-ezo aka n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke nwanne Devid bụ Elaịab. O doro anya site n’amaokwu ndị dị ya gburugburu na ihe Chineke na-ekwu okwu banyere ya n’ebe a abụghị àgwà ịchọ mma, dị ka ile ma Devid ma ọ bụ ụmụnne ya hà doziri agịrị isi ha edozi ma ọ bụ ma hà ji ihe ịchọ mma dị iche iche tinye n’uwe ha.—Jenesis 38:18; 2 Samuel 14:25, 26; Luk 15:22.
Nke a mere ihe atụ nke eziokwu ahụ bụ na ụfọdụ ndị, bụ́ ndị na-ekwu na ndị Kraịst kwesịrị ịdị iche, n’ejighị ihe ịchọ mma ma ọ bụ ọla ọ bụla na-eme ihe, na-achọ nkwado site n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a kọwahiere akọwahie. N’eziokwu, Bible enyeghị nkọwa ọ bụla sara mbara banyere ịchọ mma; ọ dịghịkwa ụdị ịchọ mma ndị ọ kwadoro ma na-amachibido ndị ọzọ iwu. Ihe o nyere bụ nduzi ndị ezi uche dị na ha. Ka anyị tụlee ndị a ma hụ ụzọ a pụrụ isi tinye ha n’ọrụ taa.
Pọl onyeozi nyere nduzi sitere n’ike mmụọ nsọ, sị: “Ezubere m ka ndị inyom were ihe ịchọ mma kwesịrị ekwesị chọọ onwe ha mma, ya na nsọpụrụ na uche zuru okè; ọ bụghị isi a kpara akpa, na ọlaedo ma ọ bụ pearl ma ọ bụ uwe dị oké ọnụ ahịa.” (1 Timoti 2:9) Pita dekwara n’ụzọ yiri nke ahụ, sị: “[Ka ịchọ mma unu] ghara ịbụ ịchọ mma ahụ nke ahụ nke bụ ịkpa isi, na iyikwasị ihe ọlaedo, ma ọ bụ iyikwasị ọtụtụ uwe; kama ka ọ bụrụ mmadụ zoro ezo nke mkpụrụ obi, na uwe a na-apụghị imebi nke bụ mmụọ dị nwayọọ dịkwa udo, nke dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke.”—1 Pita 3:3, 4.
Okwu Grik ndị ahụ a sụgharịrị n’ebe ahụ ịbụ ‘chọọ mma,’ “kwesịrị ekwesị,” na “ịchọ mma” bụ ụdị dị iche iche nke koʹsmos, nke bụkwa mkpọrọgwụ okwu nke okwu Bekee bụ “cosmetic,” nke pụtara “ihe e ji achọ mma, karịsịa, nke ụcha akpụkpọ ahụ.” Ya mere, akụkụ ihe odide ndị ahụ na-enyere anyị aka ịza ajụjụ dị iche iche banyere iji ihe otite ma ọ bụ ihe ịchọ mma, ọla, na ihe ndị ọzọ ụmụ nwanyị na-eji achọ mma, na-eme ihe.
Ihe Pọl na Pita kwuru ọ̀ pụtara na ndị Kraịst aghaghị izere ịkpa isi ha, iyi ọla ma ọ bụ ihe ọlaedo, ma ọ bụ, ọ bụrụ na a gbasapụkwuo okwu ahụ, iji ihe otite eme ihe? Ee e. Ikwu na nke ahụ bụ isi ihe dị n’okwu ha ga-achọ n’aka ụmụnna nwanyị ndị Kraịst izerekwa ‘iyi uwe.’ Ma, Dọkas, bụ́ onye Pita kpọlitere n’ọnwụ, bụ onye a hụrụ n’anya n’ihi na o meere ụmụnna nwanyị ndị ọzọ “uwe” dị iche iche. (Ọrụ 9:39) Ya mere, 1 Timoti 2:9 na 1 Pita 3:3, 4 adịghị ekwu na ụmụnna nwanyị aghaghị izere ịkpa isi, iyi pearl, uwe na ihe ndị ọzọ. Kama nke ahụ, Pọl na-emesi ike mkpa ọ dị iji imeru ihe n’ókè na ezi uche na-eme ihe n’ịchọ mma ndị inyom. Pita gosiri na ndị inyom kwesịrị ilekwasịkarị anya ná mmụọ nke dị ha n’ime, ka ha wee rite ndị di ha, bụ́ ndị na-ekweghị ekwe, n’uru, ọ bụghị ịtụkwasị oké ịdị mkpa n’ihe banyere ọdịdị ahụ ma ọ bụ ịchọ mma.
N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, Bible akatọghị mgbalị nile a na-eme iji meziwanye ọdịdị mmadụ. Ụfọdụ n’ime ndị ohu Chineke, ma ndị ikom ma ndị inyom, jiri ọla mee ihe. (Jenesis 41:42; Ọpụpụ 32:2, 3; Daniel 5:29) Esta onye kwesịrị ntụkwasị obi kwere ka e nye ya oké nlekọta ịchọ mma, bụ́ nke e ji mmanụ ịchọ mma dị iche iche, ihe na-esi ísì ụtọ, na ịsa ahụ, wee mee. (Esta 2:7, 12, 15; tụlee Daniel 1:3-8.) Chineke kwuru na n’ụzọ ihe atụ, o yikwasịrị Israel ọla aka, ịyagba olu, ọla imi, na ọla ntị. Nke ahụ nyere aka ime ka ọ ghọọ ‘ihe magburu onwe ya ná mma.’—Ezikiel 16:11-13.
Ma, ihe ndekọ ahụ dị n’Ezikiel nwere ihe mmụta nke na-emegide anyị ilekwasị anya n’ọdịdị elu ahụ. Chineke kwuru, sị: “I wee tụkwasị mma gị obi, kwaa iko n’ihi aha gị, wụkwasị ịkwa iko gị nile n’ahụ onye ọ bụla na-agabiga.” (Ezikiel 16:15; Aịsaịa 3:16, 19) Otú a, Ezikiel 16:11-15 na-emesi ya ike, bụ́ amamihe dị na ndụmọdụ ahụ Pọl na Pita mesịrị nye banyere ịghara ilekwasịkarị anya n’ọdịdị elu ahụ. Ọ bụrụ na nwanyị ahọrọ iji ọla chọọ onwe ya mma, ọ̀tụ̀tụ̀ na ụzọ ọ ga-esi mee nke a kwesịrị ikwekọ n’imeru ihe n’ókè, wee ghara ịbụ nke gabigara ókè ma ọ bụ iji mee oké ngosi, nke na-adịghị mma n’anya.—Jemes 2:2.
Gịnị banyere nwanyị onye Kraịst iji ihe otite dị iche iche mee ihe, dị ka ihe a na-ete n’ọnụ, ihe a na-ete na ntì, ma ọ bụ ihe a na-ete n’ikù anya nakwa uri anya? Ndị ọkà mmụta ihe mgbe ochie e gwupụtara n’ala n’Israel nakwa n’ebe ndị dị ya nso achọtawo ihe dị iche iche e ji etinye ihe ịchọ mma, tinyekwara ihe e ji ete ha na enyo dị iche iche. Ee, ndị inyom bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ oge ochie jiri ihe ịchọ mma dị iche iche mee ihe, bụ́ ndị butere ọtụtụ ndị e nwere n’oge a ụzọ. Ọ pụrụ ịbụ na ihe aha nwa nwanyị Job bụ Keren-hapuk pụtara bụ “Mpì nke Ihe Otite (Anya) Ojii,” ma ọ bụ ihe e ji etinye ihe a na-ete n’anya.—Job 42:13-15.
E ji ihe otite ịchọ mma mee ihe n’Israel, ma ihe atụ dị iche iche dị na Bible gosiri ihe ize ndụ dị n’imebiga ya ókè. Ọtụtụ afọ mgbe ọ ghọsịrị eze nwanyị nke Israel, Jezebel ‘na-ede ihe ịchọ mma n’anya ya abụọ, na-emekwa ka isi ya dị mma.’ (2 Ndị Eze 9:30) Mgbe e mesịrị, mgbe ọ na-akọwa otú Israel si chọọ nleta rụrụ arụ nke mba ndị na-ekpere arụsị, Chineke kwuru na o ‘kere ihe ịchọ mma ọlaedo, jiri ihe ịchọ mma mee ka anya ya abụọ saa mbara, meekwa onwe ya ka ọ maa mma.’ (Jeremaịa 4:30; Ezikiel 23:40) Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime amaokwu ndị ahụ ma ọ bụ ndị ọ bụla ọzọ kwuru na ọ bụ ihe na-ezighị ezi iji ihe ndị mmadụ mere mee ka mmadụ makwuo mma. Ma, akụkọ Jezebel na-egosi na o tejiri anya ya nke ukwuu nke na a pụrụ ịnọ ebe dị anya hụta ya. Ọbụna na Jihu onye nọ n’èzí nke obieze ahụ hụtara ya. Gịnị bụ ihe mmụta dị na nke a? Ejila ihe ịchọ mma mebiga ihe ókè.b
N’eziokwu, o siri ike ịhụ nwanyị ọ bụla nke na-eji ọla ma ọ bụ ihe ịchọ mma na-eme ihe nke ga-ekwu na ụzọ ya na-esi eji ya eme ihe na ọ̀tụ̀tụ̀ ọ na-ejiru ya eme ihe ekwesịghị ekwesị. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, e nweghị ihe ịrụ ụka dị n’eziokwu ahụ nke bụ na n’ihi ịbụ onye ahụ na-eruchaghị ala ma ọ bụ ịbụ onye oké mkpọsa ngwa ahịa metụtara, nwanyị pụrụ iwulite àgwà nke iji ihe ịchọ mma na-emebiga ihe òkè. Otú ọ na-adị ma o techaa onwe ya pụrụ ịmara ya ahụ nke na ọ gaghị aghọtakwa na ọnọdụ ahụ ekwekọghị ná “nsọpụrụ na uche zuru okè” nke ihe ka ọtụtụ ná ndị inyom bụ ndị Kraịst.—Lee Jemes 1:23, 24.
Ọ bụ ezie na ihe na-amasị ndị mmadụ dị iche iche; ụfọdụ ndị inyom na-eji ihe ịchọ mma dị nta eme ihe ma ọ bụkwanụ ghara iji ya eji ma ọlị, ndị ọzọ na-eji karị. Ya mere, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịghara ịdị na-ekpe onye na-eji ihe ịchọ mma ma ọ bụ ọla na-eme ihe n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị iche ikpe. Ihe ọzọ a ga-echebara echiche bụ omenala dị n’ebe mmadụ bi. Eziokwu ahụ bụ na a na-anakwere ụdị ejiji ụfọdụ ná mba ọzọ (ma ọ bụkwanụ na ha bụ ndị a na-ejikarị eme ihe n’oge ochie) apụtaghị na ha kwesịrị ekwesị n’ebe anyị bi n’oge a.
Site n’oge ruo n’oge, nwanyị bụ onye Kraịst nke nwere amamihe ga na-atụlegharị ejiji ya, jiri obi eziokwu na-ajụ onwe ya, sị: ‘Àna m ejikarị ọla dị ukwuu karị (ma ọ bụ nke pụtara ìhè karị) ma ọ bụ ihe ịchọ mma na-eme ihe karịa ihe ka ọtụtụ ná ndị Kraịst bi n’ógbè ebe m bi? Àna m eme ka ịchọ mma m gbasoo ndị a ma ama dị mpako ma ọ bụ ndị na-eme ihe nkiri sinima, ka ihe na-eduzi m n’ụzọ bụ isi ọ̀ bụ ndụmọdụ ahụ dị na 1 Timoti 2:9 na 1 Pita 3:3, 4? Ee, ejiji m ọ̀ bụ nke e mere n’ụzọ imeru ihe n’ókè n’ezie, na-egosi ezi nsọpụrụ maka echiche na mmetụta nile nke ndị ọzọ?’—Ilu 31:30.
Ndị inyom, ndị nwere di bụ ndị Kraịst pụrụ ịjụta ha echiche ha, rịọkwa maka ndụmọdụ. Ọzọkwa, mgbe e ji obi eziokwu chọọ ya, a pụrụ inweta ndụmọdụ na-enye aka site n’aka ụmụnna nwanyị ndị ọzọ. Ma, kama ichigharịkwuru enyi nke otu ụdị ihe ahụ na-amasị, ọ pụrụ ịdị mma karị ijekwuru ụmụnna nwanyị ndị meworo okenye karị, ndị a na-asọpụrụ nguzozi na amamihe ha. (Tụlee 1 Ndị Eze 12:6-8.) Bible na-asị na ndị inyom meworo agadi, bụ́ ndị kwesịrị nsọpụrụ “[nwere ike ime] ka ndị bụ ụmụ agbọghọ nwee uche zuru okè . . . dị ọcha, . . . ka e wee ghara ikwulu okwu Chineke.” (Taịtọs 2:2-5) Ọ dịghị onye Kraịst ọ bụla tozuru okè nke ga-achọ ka otú ọ na-esi eji ọla ma ọ bụ ihe ịchọ mma na-eme ihe mee ka ‘e kwuluo’ Okwu Chineke ma ọ bụ ndị ya.
Ihe ndekọ Bible banyere Tema gosiri na ụdị ejiji nwanyị jiri pụrụ igosi ụdị onye ọ bụ, na-ezipụ ozi siri ike. (Jenesis 38:14, 15) Ozi dị aṅaa ka a na-ezipụ site n’otú nwanyị onye Kraịst si dozie isi ya ma ọ bụ ụdị ụcha e jiri tejie ya (ma ọ bụrụ na e tejiri ya eteji) ma ọ bụ ojiji ọ na-eji ọla na ihe otite eme ihe? Ọ̀ bụ: Nke a bụ ohu Chineke nke dị ọcha, onye na-emeru ihe n’ókè, guzoziekwa eguzozi?
Mmadụ kwesịrị inwe mmetụta dị mma mgbe ọ hụrụ ndị Kraịst nọ n’ozi ubi ma ọ bụ mgbe ọ bịara nzukọ anyị. Ndị na-ahụ ihe na-emenụ na-enwekarị mmetụta dị otú ahụ. Ihe ka ọtụtụ ná ndị inyom ndị Kraịst adịghị enye ndị nọ n’èzí ihe ọ bụla mere ha ga-eji kwubie na ha adịghị mma n’anya ma ọ bụkwanụ na ha chọbigara onwe ha mma ókè; kama nke ahụ, ha na-edozi onwe ha n’ụzọ “kwesịrị ndị inyom na-ekwupụta egwu Chineke.”—1 Timoti 2:10.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’ime narị afọ nke atọ O.A., Tertullian kwuru na ndị inyom “ndị na-ete ọgwụ dị iche iche n’ahụ ha, jiri ihe na-acha uhie uhie tee na ntì ha, jiri ọtanjele mee ka anya ha pụta ìhè, na-emehie megide Ya.” Ọ katọkwara ndị ahụ na-eteji agịrị isi ha. N’ịkọwahie okwu Jisọs dị na Matiu 5:36, Tertullian kwuru, sị: “Ha na-ekwugide Onyenwe anyị! Ha na-asị, ‘Lee! kama inwe agịrị isi dị ọcha ma ọ bụ oji, anyị na-eme ka [agịrị isi anyị] na-acha edo edo.’” O kwukwara, sị: “Ọbụna na ị pụrụ ịhụ ndị ihere na-eme na ha emewo agadi, ndị na-agbalịkwa ịgbanwe isi awọ ha ka ọ na-eji oji.” Nke ahụ bụ echiche onwe onye nke Tertullian nwere. Ma ọ na-agwagbu okwu, n’ihi na ịrụ ụka ya nile dabeere n’echiche ya nke bụ na ọ bụ ụmụ nwanyị kpatara ọnọdụ ọjọọ ihe a kpọrọ mmadụ nọ na ya, ya mere ha kwesịrị ‘ịgagharị dị ka Iv, na-eru újú, na-egosi nchegharị’ n’ihi ‘mweda n’ala nke mmehie mbụ ahụ.’ Bible ekwughị ihe ọ bụla dị otú ahụ; Chineke kwuru na ọ bụ Adam ka ụta dịịrị maka mmehie nke ihe a kpọrọ mmadụ.—Ndị Rom 5:12-14; 1 Timoti 2:13, 14.
b N’oge na-adịghị anya gara aga, ụlọ ọrụ mgbasa akụkọ ndị dị na United States kọsara akụkọ ọjọọ banyere otu onye okwuchukwu TV, a gbasakwara akụkọ fọrọ nke nta ka ọ hara otú ahụ banyere nwunye ya, bụ́ onye ya na ya na-apụtakọ. Dị ka akụkọ ndị ahụ si kwuo, mgbe ọ ka na-eto eto, nwanyị ahụ kwenyere na “ma ihe otite ma ihe nkiri sinima” bụ mmehie, mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ọ gbanwere echiche ya wee ghọọ onye a ma ama maka imebiga ihe ókè n’ite “ihe otite nke ukwuu nke na o yiri ihe a kpụrụ akpụ.”
[Foto ndị dị na peeji nke 31]
Ihe ochie ndị e gwutere n’ala site n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ: Igbe ihe otite e ji ọ́dụ́ mee, enyo, na ihe olu e ji ọlaedo na carnelian mee
[Ebe e si Nweta Foto]
Ha atọ: Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.