IHE ỌMỤMỤ NKE 27
Ikwu Okwu n’Agụghị Ya Agụ
Ọ PỤRỤ ịbụ na i tinyewo mgbalị dị ukwuu n’ịkwadebe okwu gị. Ị pụrụ inwe ihe ọmụma bara uru. Isi ihe ndị dị na ya pụrụ ịbụ ịgba. Ọ pụrụ ịbụ na ị ga-enwe ike ikwu ya n’ụzọ na-aga were were. Ma ọ bụrụ na uche ndị na-ege gị ntị adịghị na ya—ha na-ege ntị nanị n’ụfọdụ n’ime ihe ị na-ekwu n’ihi na uche ha na-agakarị n’ihe ndị ọzọ—ruo ókè ha aṅaa ka okwu gị dị irè? Ọ bụrụ na ọ na-esiri ha ike ime ka uche ha dịgide n’okwu ahụ, ò yiri ka ị ga-eru n’obi ha?
Olee ihe pụrụ ịdị na-akpata ụdị nsogbu ahụ? Ọtụtụ ihe pụrụ iso kpata ya. Ọtụtụ mgbe, ọ bụ ịgụ okwu ahụ agụ. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọkà okwu ahụ na-elekarị anya n’ihe ndị o deturu, ma ọ bụ, ụzọ o si ekwu okwu na-agbasobiga otu ụkpụrụ ókè. Otú ọ dị, nsogbu ndị a bụ kpọmkwem n’ihi otú e si kwadebe okwu ahụ.
Ọ bụrụ na i buru ụzọ depụta okwu gị ma chọzie ime ka ọ ghọọ ihe ndepụta, ma eleghị anya ị ga-achọpụta na ọ na-esi ike ikwu ya n’agụghị ya agụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ị họrọwo kpọmkwem okwu ndị ị na-eme atụmatụ iji mee ihe. Ọ bụrụgodị na i jiri ihe ndepụta na-ekwu ya, ị ga na-agbalị icheta okwu ndị i ji mee ihe na nke mbụ ahụ. Mgbe e deturu ihe edetu, mkpụrụ okwu ndị na-adị na ya na-adịkarị iche, ọdịdị ahịrịokwu ya na-agụnye ọtụtụ ihe karịa mkparịta ụka nkịtị. Ọ ga-apụtakwa ìhè n’otú i si ekwu ya.
Kama idepụta okwu ahụ dum edepụta, nwalee ihe ndị na-esonụ: (1) Họrọ otu isiokwu na akụkụ ndị bụ́ isi n’isiokwu ahụ bụ́ ndị ị gaje iji kọwapụta isiokwu ahụ. Maka okwu dị mkpirikpi, isi ihe abụọ ezuola. Okwu dị ogologo karị pụrụ inwe anọ ma ọ bụ ise. (2) N’okpuru isi ihe nke ọ bụla, detuo akụkụ Akwụkwọ Nsọ bụ́ isi ndị ị na-eme atụmatụ iji kọwapụta ya; detuokwa ihe atụ na isi ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị n’okwu gị. (3) Chee echiche otú ị ga-esi malite okwu ahụ. Ị pụrụ ọbụna idetu otu ahịrịokwu ma ọ bụ abụọ. Meekwa ndokwa maka okwu mmechi gị.
Ime nkwadebe maka ikwu okwu dị oké mkpa. Ma amụgharịla mkpụrụ okwu nile dị n’okwu ahụ ná nzube nke iburu ha n’isi. N’okwu a na-agaghị agụ agụ, mgbe a na-akwadebe otú a ga-esi kwuo ya, e kwesịrị ilekwasị anya n’echiche ndị a ga-ewepụta, ọ bụghị ná mkpụrụ okwu dị iche iche. E kwesịrị ịnọgide na-elerughachi anya n’echiche ndị ahụ ruo mgbe nke ọ bụla na-esote ibe ya n’ụzọ dị mfe n’uche gị. Ọ bụrụ na ị kwadebere echiche ndị dị n’okwu gị n’ụzọ ezi uche dị na ya, haziekwa ha nke ọma, nke a ekwesịghị isiri gị ike, mgbe ị na-ekwukwa okwu gị, echiche ndị ahụ kwesịrị ịdị na-abịara onwe ha n’ụzọ dị mfe.
Tụlee Uru Ndị Dị na Ya. Otu uru dị mkpa nke dị n’ikwu okwu n’agụghị ya agụ bụ na ị ga-ekwu okwu n’ụzọ ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ ga-aghọta. Okwu gị ga-ekpo ọkụ karị sikwa otú a na-atọ ndị na-ege gị ntị ụtọ karị.
Isi otú a kwuo okwu na-eme ka ị na-ele ndị na-ege gị ntị anya n’anya ruo n’ókè kasị ukwuu bụ́ nke na-eme ka nzirịta ozi gị na ha kakwuo mma. Ebe ọ bụ na ị dịghị adabere n’ihe ndị i deturu maka iji kwuo ahịrịokwu nke ọ bụla, ndị na-ege gị ntị ga-aka chee na ị maara isiokwu gị nke ọma nakwa na i kwenyere n’ezie n’ihe ị na-ekwu. Ya mere, ikwu okwu n’ụzọ dị otú a na-eme ka e kwuo okwu n’ụzọ na-ekpo ọkụ, n’ụzọ mkparịta ụka, nke na-eru n’obi n’ezie.
Ikwu okwu n’agụghị ya agụ na-emekwa ka e nwee ike ime mgbanwe. A hazighị okwu ahụ n’ụzọ nke na ị pụghị ịgbanwetụ ihe na ya. Ka e were ya na n’isi ụtụtụ nke ụbọchị ị gaje ikwu okwu gị, ị nụrụ otu akụkọ dị ịrịba ama nke metụtara isiokwu gị kpọmkwem. Ọ̀ bụ na ọ gaghị ekwesị ekwesị izo aka na ya? Ma ọ bụ, ikekwe mgbe ị nọ na-ekwu okwu, ị chọpụta na e nwere ọtụtụ ụmụaka ka na-aga akwụkwọ nọ na-ege ntị. Lee ka ọ ga-esi dị mma ịgbanwetụ ihe atụ gị na nkọwa ya n’ebumnobi nke inyere ha aka ịghọta otú ihe ọmụma ahụ si emetụta ndụ ha!
Uru ọzọ dị n’ikwu okwu n’agụghị ya agụ bụ mkpali ọ na-akpali uche nke gị. Mgbe i nwere ndị na-ege ntị nwere mmasị ma na-egosi na ha na-anụ ihe ị na-ekwu, ọ na-eme ka gị onwe gị nwekwuo ịnụ ọkụ n’obi, mgbe ahụ ị na-akọwakwu echiche dị iche iche ma ọ bụ nwee ahụ́ iru ala ikwughachi isi ihe ụfọdụ iji mesie ha ike. Ọ bụrụ na ị chọpụta na mmasị nke ndị na-ege gị ntị na-ebelata, ị pụrụ ime ihe iji merie nsogbu ahụ kama ịnọ na-agwa ndị uche ha dị ebe ọzọ okwu.
Zere Nsogbu Ndị Dị na Ya. I kwesịrị ịma na e nwekwara ihe ndị pụrụ ịbụ nsogbu n’ikwu okwu n’agụghị ya agụ. Otu bụ na i nwere ike iri oge. Ọ bụrụ na i webata echiche ntụkwasị buru ibu gabiga ókè mgbe ị nọ na-ekwu okwu, ọ pụrụ isiri gị ike idebe oge. Ị pụrụ imeri nke a ma ọ bụrụ na i detuo oge e kenyere maka nkebi nke ọ bụla nke okwu ahụ n’ihe ndepụta gị. Mgbe ahụ gbasosie usoro a ike.
Nsogbu ọzọ, karịsịa nye ndị ọkà okwu nwere ahụmahụ, bụ inwe obi ike gabiga ókè. Ebe ikwu okwu n’ihu ọha marawooro ha ahụ́, ụfọdụ pụrụ ịchọpụta na ịchịkọta echiche dị iche iche iji mezuo oge e kenyere esighị ike. Ma ịdị umeala n’obi na ịghọta eziokwu ahụ bụ́ na anyị na-ekere òkè n’usoro izi ihe nke Jehova n’onwe ya bụ Onye Nkụzi Ukwu na ya kwesịrị ịkpali anyị iji ekpere chebara ihe omume nke ọ bụla echiche ma kwadebe ya nke ọma.—Aịsa. 30:20; Rom 12:6-8.
Ikekwe ihe na-aka echegbu ọtụtụ ndị ọkà okwu na-enweghị ahụmahụ n’ikwu okwu n’agụghị ya agụ bụ na ha pụrụ ichefu ihe ha chọrọ ikwu. Ekwela ka echiche a gbochie gị inwe ọganihu a n’ikwu okwu n’ụzọ dị irè. Kwadebe nke ọma ma dabere n’ebe Jehova nọ maka enyemaka nke mmụọ nsọ ya.—Jọn 14:26.
Ndị ọkà okwu ndị ọzọ na-ekwe ka nchegbu gabigara ókè banyere otú ha ga-esi hazie mkpụrụ okwu ha dọghachi ha azụ. N’eziokwu, ikwu okwu n’agụghị ya agụ nwere ike ọ gaghị abụ nke a haziri mkpụrụ okwu ya n’ụzọ kasị mma nakwa nke ụtọ asụsụ ya ziri ezi dị ka n’okwu a na-agụpụta agụpụta, ma ikwu ya n’ụdị mkparịta ụka n’ụzọ dị mma na-eme ka ọ ghara ịdị njọ. Ndị mmadụ na-emeghachikarịsị omume ngwa ngwa n’echiche ndị e ji okwu ha na-aghọta ngwa ngwa nakwa ahịrịokwu ndị na-adịghị mgbagwoju anya wepụta. Ọ bụrụ na i mee ezi nkwadebe, ịhazi ahịrịokwu n’ụzọ kwesịrị ekwesị ga-abịa n’onwe ya, ọ bụghị n’ihi na i buruwo ya n’isi, kama n’ihi na ị tụleghachiwo echiche ndị dị n’okwu gị otú zuru ezu. Ọ bụrụkwa na ị na-ekwu okwu n’ụzọ dị mma ná mkparịta ụka gị kwa ụbọchị, ọ ga-abịara onwe ya mgbe ị nọ n’elu ikpo okwu.
Ụdị Ihe Odide A Ga-eji Mee Ihe. Ka oge na-aga, sitekwa n’ịmụgharị ihe, ị pụrụ inwe ike igbubilata ihe ndepụta gị inwe nanị okwu ole na ole maka isi ihe nke ọ bụla dị n’okwu gị. A pụrụ idepụta isi ihe ndị a na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ị na-eme atụmatụ iji mee ihe n’otu kaadị ma ọ bụ ná mpempe akwụkwọ maka ile ha anya ngwa ngwa. Maka ozi ubi, n’ọnọdụ ka ukwuu, ị ga-eburu usoro dị mfe ị ga-eji wepụta isi ihe ndị ị chọrọ ikwu okwu na ha n’isi. Ọ bụrụ na i mewo nchọpụta n’otu isiokwu maka iji gaa nletaghachi, ị pụrụ idetu ihe ole na ole ná mpempe akwụkwọ i tinyere n’ime Bible gị. Ma ọ bụkwanụ, ị pụrụ nanị iji ihe ndepụta sitere ‘n’Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu’ ma ọ bụ ihe ọmụma ndị dị na Reasoning From the Scriptures mere ebe nkwurịta okwu unu ga-agbakwasị ụkwụ.
Otú ọ dị, ọ bụrụ na e kenyere gị ọtụtụ ihe omume ị ga-eme n’ime izu ole na ole, ikekwe gụnyere ikwu ihe karịrị otu okwu ihu ọha, ị pụrụ ịhụ na ọ dị gị mkpa inwe ihe ndepụta buru ibu karị. N’ihi gịnị? Iji chetaghachi ihe ọmụma ahụ tupu ị na-eme nke ọ bụla n’ime ihe omume ndị ahụ. Ọbụna otú ahụ, ọ bụrụ na ị dabere n’ihe ndị i deturu gabiga ókè maka mkpụrụ okwu ị ga-eji mee ihe mgbe ị na-ekwu okwu—na-ele ha anya n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ahịrịokwu ọ bụla—ị gaghị enweta uru ndị dị n’ikwu okwu n’agụghị ya agụ. Ọ bụrụ na i detuo ihe buru ibu, kanye akara na ha ka i wee nwee ike ile anya n’ụzọ ga-adịrị gị mfe nanị n’okwu ole na ole a kanyere akara na ha na n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị mejupụtara ihe ndepụta gị.
Ọ bụ ezie na ọkà okwu nwere ahụmahụ kwesịrị ikwu okwu ya n’ụzọ ka ukwuu n’agụghị ya agụ, a pụrụ inwe uru dị n’ijikọta ụzọ ndị ọzọ nke ikwu okwu mee ihe. N’okwu mmeghe na nke mmechi, bụ́ ebe ọ dị mkpa ka e jikọta ile nnọọ ndị na-ege ntị anya na okwu ndị dị ike, ndị e ji nlezianya hazie, ahịrịokwu ole na ole e bu n’isi pụrụ ịdị irè. Mgbe e ji ihe ndị mere eme, ọnụ ọgụgụ, nhota okwu, ma ọ bụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche na-eme ihe, ịgụ ha agụ kwesịrị ekwesị, a pụkwara iji ya mee ihe n’ụzọ ga-enwe mmetụta dị ike.
Mgbe Ndị Ọzọ Chọrọ Ka A Kọwaara Ha Ihe. Mgbe ụfọdụ a na-achọ ka anyị kọwaa ihe ndị anyị kwere n’enyeghị anyị ohere ibu ụzọ mee nkwadebe. Nke a pụrụ ime mgbe onye anyị zutere n’ozi ubi welitere ajụjụ. Ọnọdụ ndị yiri ya pụrụ ibilite mgbe anyị na ndị ikwu anyị nọ, n’ụlọ ọrụ, ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ. Ndị ọrụ gọọmenti pụkwara ịchọ ka a kọwaara ha ihe ndị anyị kwere na ụzọ ndụ anyị. Akwụkwọ Nsọ na-agba ume, sị: “Na-adịnụ njikere mgbe nile ime ngọpụ n’ihu onye ọ bụla nke na-ajụ unu ihe mere unu ji nwee olileanya ahụ dị n’ime unu, ma jirinụ obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù miri emi na-eme nke ahụ.”—1 Pita 3:15.
Rịba ama otú Pita na Jọn si zaghachi Sanhedrin nke ndị Juu, dị ka e dekọrọ ya n’Ọrụ 4:19, 20. N’ahịrịokwu abụọ nanị, ha kwuru n’ụzọ doro anya ebe ha guzo. Ha kwuru ya n’ụzọ kwekọrọ n’ụdị ndị na-ege ha ntị—na-akọwapụta na nsogbu na-eche ndịozi ahụ ihu na-echekwa ụlọikpe ahụ ihu. Ka oge na-aga, e boro Stivin ebubo ụgha, a kpụgakwara ya n’otu ụlọikpe ahụ. Gụọ nzaghachi dị ike o nyere n’ebughị ụzọ mee nkwadebe n’Ọrụ 7:2-53. Olee otú o si hazie ihe ọmụma ya? O kwupụtara ihe ndị merenụ n’usoro ha ji mee. N’ebe kwesịrị ekwesị, ọ malitere imesi mmụọ nnupụisi mba Izrel gosipụtara ike. Ná mmechi, o gosiri na Sanhedrin ahụ gosipụtakwara otu ụdị mmụọ ahụ site n’ime ka e gbuo Ọkpara Chineke.
Mgbe a chọrọ ka i nye nkọwa maka ihe ndị i kwenyere n’ebughị ụzọ mee nkwadebe, gịnị pụrụ inyere gị aka ime ka okwu gị dị irè? Ṅomie Nehemaịa, bụ́ onye kpere ekpere n’ime obi ya tupu ọ zaa ajụjụ Eze Ataksakses jụrụ ya. (Neh. 2:4) Chepụtazie n’egbughị oge, otú ị ga-esi hazie okwu gị. A pụrụ idepụta nzọụkwụ ndị bụ́ isi n’usoro a: (1) Họrọ otu isi ihe ma ọ bụ abụọ i kwesịrị ịgụnye ná nkọwa gị (ị pụrụ ikpebi iji ihe ndị dị ‘n’Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu’ mee ihe). (2) Kpebie akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ị ga-eji kwadoo isi ihe ndị ahụ. (3) Mee atụmatụ otú ị ga-esi jiri akọ malite nkọwa gị ka onye ahụ jụrụ ajụjụ wee dị njikere ịṅa ntị. Malitezie ikwu okwu.
Mgbe ị nọ ná nrụgide, ị̀ ga-echeta ihe ị ga-eme? Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu echegbula onwe unu banyere otú unu ga-esi ekwu okwu ma ọ bụ ihe unu ga-ekwu; n’ihi na a ga-enye unu ihe unu gaje ikwu n’oge awa ahụ; n’ihi na ọ bụghị unu onwe unu na-ekwu okwu, kama ọ bụ mmụọ nke Nna unu si n’ọnụ unu na-ekwu okwu.” (Mat. 10:19, 20) Nke a apụtaghị na ị ga-enweta “okwu amamihe” n’ụzọ ọrụ ebube bụ́ nke e nyere Ndị Kraịst narị afọ mbụ. (1 Kọr. 12:8) Ma ọ bụrụ na i ji ihe Jehova na-ezi ndị ohu ya n’ọgbakọ Ndị Kraịst na-eme ihe mgbe nile, mmụọ nsọ ga-eme ka i cheta ihe ọmụma dị mkpa mgbe a chọrọ ya.—Aịsa. 50:4.
N’enweghị obi abụọ ọ bụla, ikwu okwu n’agụghị ya agụ pụrụ ịdị nnọọ irè. Ọ bụrụ na ị na-eme ya mgbe ọ bụla ị na-eme ihe omume n’ọgbakọ, mgbe ahụ inye azịza, mgbe ọ dị mkpa, n’ebughị ụzọ mee nkwadebe agaghị esi ike, ebe ọ bụ otu usoro ahụ nke ime ihe ndepụta ka a ga-agbaso. Alala azụ. Ịmụta ikwu okwu n’agụghị ya agụ ga-enyere gị aka ime ka ozi ubi gị dịkwuo irè. Ọ bụrụkwa na i nwere ihe ùgwù nke ikwu okwu n’ọgbakọ, o yikarịrị ka ị ga-eme ka ndị na-ege gị ntị nọgide na-ege ntị ma ruokwa n’obi ha.