Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 4/15 p. 28-31
  • Ị̀ Na-erizi Ihe n’Ụzọ Ime Mmụọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-erizi Ihe n’Ụzọ Ime Mmụọ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nri Maka Uto Ime Mmụọ
  • Nri Maka Ike Ime Mmụọ
  • Nri Maka Ahụ Ike Ime Mmụọ
  • Mmetọ Ime Mmụọ
  • Ụba nke Nri Ime Mmụọ
  • Ezi Àgwà Iri Ihe
  • Olee Otú Ị Na-eriru Nri Ime Mmụọ nke Ọma?
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Ihe Oriri Na-adịghị Ize Ndụ Maka Mmadụ Nile
    Teta!—2002
  • “Na-ekwuzi Okwu nke Eziokwu Ahụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • O nweghị Onye Ga-erite Ọrịa Ná Nri n’Oge Na-adịghị Anya
    Teta!—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 4/15 p. 28-31

Ị̀ Na-erizi Ihe n’Ụzọ Ime Mmụọ?

“Nri Dị Mma Bụ Mkpa Bụ Isi Karịsịa Mmadụ Nwere. . . . Ma E Nweghị Nri Zuru Ezu, Anyị Ga-anwụ.” —Food And Nutrition.

A NA-EGOSIPỤTA eziokwu ahụ gbara ọkpụrụkpụ n’ahụ tasịrị atasị nke ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka agụụ na-agụ bụ́ ndị a na-enyeghị ‘mkpa a bụ isi mmadụ nwere.’ Ndị ọzọ nwere ike igbo mkpa a ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ kama ha ka bụ ndị na-adịtụghị eri ihe na-edozi ahụ. Ma, ọtụtụ ndị pụrụ irizi ihe na-enwekarị afọ ojuju ná nri ratụ ratụ nke na-enye ihe dị nta na-emezi ahụ n’ezie. “Nri,” ka akwụkwọ bụ́ Healthy Eating na-ekwu, “yiri ka ọ bụ otu n’ime ihe onwunwe anyị a kasị eji eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.”

Ọ dịghị iche ná nri ime mmụọ—eziokwu a na-ahụ n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Ụfọdụ ndị enweghị ọbụna nri ime mmụọ bụ isi karịsịa; ha nọ n’agụụ n’ụzọ ime mmụọ. Ihe ndị ọzọ na-eme bụ nanị ịghara iji nri ime mmụọ nke dị adị eme ihe bara uru. Gịnị banyere gị? Ị̀ na-erizi ihe n’ụzọ ime mmụọ n’onwe gị? Ka ọ̀ pụrụ ịbụ na ị na-anapụ onwe gị ihe ime mmụọ na-edozi ahụ? Ọ dị mkpa ịgwa onwe anyị eziokwu n’okwu a n’ihi na anyị chọrọ nri ime mmụọ karịa ka anyị chọrọ nri anụ ahụ.—Matiu 4:4.

Nri Maka Uto Ime Mmụọ

Food and Nutrition, akwụkwọ ọgụgụ nke na-atụle ịdị mkpa nke inwe nri kwesịrị ekwesị, na-enye anyị ihe atọ dị mma mere a ga-eji rizie nri. Otu bụ na nri dị anyị mkpa “iji kwalite uto na iji dochie mbibi na-aga n’ihu nke mkpụrụ ndụ ahụ.” Ị̀ maara na kwa ụbọchị ị na-adị ndụ, otu puku ijeri nke mkpụrụ ndụ ahụ gị na-akwụsị ịrụ ọrụ, ọ dịkwa mkpa idochi ha? Uto kwesịrị ekwesị na nlekọta ahụ chọrọ nri dị mma.

Nke ahụ bụkwa eziokwu n’ụzọ ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, mgbe Pọl onyeozi degaara ọgbakọ nọ n’Efesọs akwụkwọ ozi, o mesiri ike otú nri ime mmụọ si dị onye Kraịst ọ bụla mkpa iji ghọọ “nwoke tozuru okè.” (Ndị Efesọs 4:11-13) Mgbe anyị ji nri ime mmụọ na-edozi ahụ na-azụ onwe anyị n’ụzọ kwesịrị ekwesị, anyị adịkwaghị ka ụmụ ọhụrụ na-esighị ike, na-enweghị ike ilekọta onwe anyị, na-adaba n’ụdị ihe ize ndụ dị iche iche. (Ndị Efesọs 4:14) Kama nke ahụ, anyị na-eto ghọọ ndị okenye siri ike, na-enwe ike ịlụsi ọgụ ike maka okwukwe n’ihi na ‘a na-azụpụta anyị n’okwu nile nke okwukwe anyị.’—1 Timoti 4:6.

Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu n’ebe ị nọ? Ì towo n’ụzọ ime mmụọ? Ka ị̀ ka dị ka nwa ọhụrụ ime mmụọ—onye e kpughere nye ihe ize ndụ, na-adabere kpam kpam n’ebe ndị ọzọ nọ, na-enweghịkwa ike iburu ibu ndị Kraịst n’ụzọ zuru ezu? N’ụzọ a pụrụ ịghọta, ole na ole n’ime anyị ga-ekwu ngwa ngwa na anyị dị ka ụmụ ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ, kama iji eziokwu nyochaa onwe onye kwesịrị ekwesị. Ụfọdụ ndị Kraịst e tere mmanụ dị otú ahụ na narị afọ mbụ. Ọ bụ ezie na ha kwesịrị ịbụ “ndị ozizi” n’onwe ha, na-enwe ike ma dị njikere ịkụziri ndị ọzọ ihe Okwu Chineke na-ekwu, Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ dị unu mkpa ọzọ ka mmadụ zie unu ihe bụ ihe ozizi mbụ nke mmalite okwu si n’ọnụ Chineke pụta; unu aghọwokwa ndị mmiri ara dị mkpa, ọ bụghị nri siri ike.” Ọ bụrụ na ị chọrọ itolite n’ụzọ ime mmụọ, zụlite agụụ maka nri ime mmụọ siri ike, nke dị mma. Afọ ejula gị ná nri ime mmụọ nke ụmụ ọhụrụ!—Ndị Hibru 5:12.

Nri ime mmụọ a siri ike dịkwa anyị mkpa iji mezie mbibi ọ bụla nke ule ndị anyị na-eche ihu kwa ụbọchị n’ụwa na-ebu iro. Ndị a pụrụ ịmịkọrọ ume ime mmụọ anyị. Ma Chineke pụrụ ime ka ume ahụ dịghachi ọhụrụ. Pọl kwuru, sị: “Ike agwụghị anyị n’obi; kama a sị na ọ bụ ezie na mmadụ elu ahụ anyị na-ere ure, ma a na-eme ka mmadụ ime anyị bụrụ ihe ọhụrụ kwa ụbọchị.” (2 Ndị Kọrint 4:16) Olee otú a na-esi eme ka anyị “bụrụ ihe ọhụrụ kwa ụbọchị”? N’otu akụkụ, site n’iri Okwu Chineke mgbe nile site n’ịmụ Akwụkwọ Nsọ na mbipụta ndị dabeere na Bible n’onwe onye na n’ìgwè.

Nri Maka Ike Ime Mmụọ

Nri dịkwa mkpa “iji mepụta okpomọkụ na ike.” Nri na-akwado ahụ anyị ịrụ ọrụ nke ọma. Ọ bụrụ na anyị erizighị nri, anyị ga-enwe ntakịrị ike. Ụkọ iron ná nri anyị pụrụ ime ka anyị bụrụ ndị ike gwụrụ ma na-eme umengwụ umengwụ. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ na-adị gị ma a bịa n’ihe omume ime mmụọ? Ọ̀ na-esiri gị ike ịrụ ọrụ ndị na-eso ịbụ onye Kraịst abịa? Ụfọdụ ndị na-ekwu na ha bụ ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst na-aghọ ndị ike gwụrụ n’ime ihe ọma, ha adịghịkwa enwe ike maka ọrụ ndị Kraịst. (Jemes 2:17, 26) Ọ bụrụ ị hụta na nke a dị otú ahụ n’ọnọdụ gị, ọgwụ ya pụrụ ịdabere n’ókè dị ukwuu n’imeziwanye nri ime mmụọ gị ma ọ bụ ịmụba nri ime mmụọ ị na-eri.—Aịsaịa 40:29-31; Ndị Galetia 6:9.

Ekwela ka a ghọgbuo gị n’ịzụlite àgwà iri nri ime mmụọ na-adịghị mma. Otu n’ime aghụghọ kasị ukwuu nke Setan jiworo mee ihe kemgbe ọtụtụ narị afọ abụrụwo nke ime ka ndị mmadụ kweta na ọ dịghị ha mkpa ịgụ Bible ma nweta ezi ihe ọmụma site na ya. Ọ na-eji atụmatụ nọteworo anya nke ndị agha na-eme mwakpo ji eme ihe ịwakwasị obodo ndị iro—gbochie ha inweta nri ma kwụgide ha agụụ ruo mgbe ha chịliri aka elu. Ma o werewo atụmatụ a gakwuo n’ihu. Ọ na-aghọgbu ndị ọ “na-awakpo” ka ha kwụọ onwe ha agụụ ọ bụ ezie na ụba nke nri ime mmụọ dị mma gbara ha gburugburu. Ka a sịkwa ihe mere na ọtụtụ ndị na-adaba ná mwakpo a!—Ndị Efesọs 6:10-18.

Nri Maka Ahụ Ike Ime Mmụọ

Ihe nke atọ mere nri ji dị anyị mkpa, ka Food and Nutrition na-ekwu, bụ “iji chịkwa ahụ ike nke ahụ . . . ma gbochie ọrịa.” Abamuru ahụ ike nke nri dị mma adịghị apụta ìhè ozugbo. Mgbe anyị risịrị nri dị mma, anyị adịghị echekarị, sị, ‘Nke ahụ emeworo obi m (ma ọ bụ akụrụ m ma ọ bụ uru ahụ m, na ihe ndị ọzọ) ihe ọma dị ukwuu.’ Ma, gbalịa ghara iri nri ruo ogologo oge, ihe ndị ọ ga-apụtara ahụ ike gị ga-apụta ìhè. Olee ihe ndị ọ na-arụpụta? “Otu mmetụta a na-ahụkarị,” ka otu akwụkwọ ntụaka nkà ọgwụ na-ekwu, “bụ nke na-adịghị mma: ịghara ito eto, ịghara iguzogide ọrịa dị nta, enweghị ume ma ọ bụ ike ichepụta ihe.” Ọrịa ime mmụọ a pụrụ iji tụnyere nke ahụ rịara Israel oge ochie ruo oge ụfọdụ. Aịsaịa onye amụma kwuru banyere ha, sị: “Isi nile ọ bụla na-arịa ọrịa, ahụ adịghịkwa obi nile ọ bụla ike. Site n’ọbụ ụkwụ wee ruo isi ọ dịghị izu okè dị n’ime ya.”—Aịsaịa 1:5, 6.

Nri ime mmụọ dị mma na-enye anyị ike iguzogide ụdị adịghị ike ime mmụọ dị otú ahụ na ihe ga-esi n’ọrịa ime mmụọ pụta. Ihe ọmụma sitere n’aka Chineke na-enye aka idebe anyị n’ezi ọnọdụ ime mmụọ—ma ọ bụrụ na anyị erie ya! Jisọs Kraịst kwuru otú ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị mmadụ n’oge ya si ghara ịmụta ihe site ná nleghara anya nke ndị nna nna ha n’ihe banyere iri nri ime mmụọ kwesịrị ekwesị. Ha onwe ha kwa jụrụ iri eziokwu ahụ nke ọ na-akụzi. Gịnị si na ya pụta? Jịsọs sịrị: “Obi ndị nke a mara abụba, ntị ha kpọchikwara, ha kpuchikwara anya ha; ka ha ghara iwere anya ha hụ ụzọ ma eleghị anya, gharakwa iwere ntị ha nụ ihe, gharakwa iwere obi ha ghọta, gharakwa ichigharị, ka M gharakwa ime ka ahụ dị ha ike.” (Matiu 13:15) Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ eriteghị uru site n’ike ọgwụgwọ nke Okwu Chineke ma ọlị. Ha nọgidere na-arịa ọrịa n’ụzọ ime mmụọ. Ọbụna ụfọdụ ndị Kraịst e tere mmanụ “adịghị ike na-arịakwa nrịanrịa.” (1 Ndị Kọrint 11:30) Ka anyị ghara mgbe ọ bụla igosi nlelị maka nri ime mmụọ Chineke na-enye.—Abụ Ọma 107:20.

Mmetọ Ime Mmụọ

E wezụga iyi egwu nke ịnọ n’agụụ ime mmụọ, ọ dị ihe ize ndụ ọzọ ọ dị anyị mkpa ịmara—ụdị nri nke anyị na-eri pụrụ ịbụ n’onwe ya nke e metọrọ. Ịnara ozizi ndị echiche ndị mmụọ ọjọọ dị ize ndụ merụrụ pụrụ ime anyị nsí n’ụzọ dị mfe dị ka iri nri nkịtị nke nje ma ọ bụ ihe na-egbu egbu merụrụ pụrụ ime. (Ndị Kọlọsi 2:8) Ọ naghị adị mfe mgbe nile ịchọpụta nri nwere nsí. “Nri,” ka otu akwụkwọ na-ekwu, “pụrụ mgbe ụfọdụ iyi ihe dị nnọọ mma ma nwee nje bacteria na-akpata ọrịa.” Ya mere anyị ga-eme nke ọma inyocha ebe nri ihe atụ anyị si abịa, na-eburu n’uche na akwụkwọ ụfọdụ, dị ka ihe odide ndị si n’ezi ofufe dapụ, pụrụ ịbụ ndị mwebata nke ozizi na nkà ihe ọmụma na-adịghị n’Akwụkwọ Nsọ merụrụ. Ụfọdụ ndị na-emepụta nri na-eji ọbụna aha nduhie eme ihe iji duhie ndị ahịa ha n’ihe banyere ihe dị n’ime ihe ha mepụtara. N’ezie anyị pụrụ ịtụ anya na Setan, onye nduhie ukwu ahụ, ga-eme otu ihe ahụ. Ya mere, jide n’aka na i nwetara nri ihe atụ dị otú ahụ n’ebe a pụrụ ịdabere na ya, ka i wee nwee ike ịnọgide na-enwe “ezi ndụ n’ime okwukwe anyị.”—Taịtọs 1:9, 13.

Thomas Adams, onye okwuchukwu nke narị afọ nke 17, kwuru banyere ndị nọ n’oge ya, sị: “Ha ejiriwo ezé ha gwuo ili ha.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ihe ha riri gburu ha. Jide n’aka na ihe ị na-eri n’ụzọ ime mmụọ egbughị gị. Chọpụta ebe e si enweta ezi nri ime mmụọ. “N’ihi gịnị ka unu na-atụ ego inye n’ọnọdụ ihe na-abụghị nri?” ka Jehova Chineke jụrụ mgbe ndị zọọrọ na ha bụ ndị ya chigharịkwuuru ndị ozizi na ndị amụma ụgha. “Geenụ m ntị nke ọma, rie ezi ihe, ka ihe nke mara abụba tọọkwa mkpụrụ obi unu ụtọ. Tọọnụ ntị unu n’ala, bịakwute m; nụrụnụ, mkpụrụ obi unu ewee dị ndụ.”—Aịsaịa 55:2, 3; tụlee Jeremaịa 2:8, 13.

Ụba nke Nri Ime Mmụọ

N’ezie e nweghị ụkọ nke nri ime mmụọ dị mma. Dị ka Jisọs Kraịst buru n’amụma, o nwere ugbu a òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi nke nwekwara uche nke ji ọrụ n’aka na-enye “[nri] n’oge ya” maka onye ọ bụla chọrọ ya. (Matiu 24:45) Site n’ọnụ Aịsaịa onye amụma, Jehova kwere nkwa, sị: “Lee, ndị ohu m ga-eri ihe, ma agụụ ga-agụ unu onwe unu. . . . Ndị ohu m ga-eti mkpu ọṅụ site n’obi dị mma.” N’ezie, ọ na-ekwe nkwa oké ihe oriri maka ndị chọrọ iri ya. “Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-emere ndị nile dị iche iche oké oriri nke ihe mara abụba, bụ́ oké oriri nke ezi mmanya vine doro edo, nke ihe mara abụba jupụtara n’ụmị.”—Aịsaịa 25:6; 65:13, 14.

Otú ọ dị, chee echiche banyere nke a: Anyị pụrụ ịkwụgbu onwe anyị n’agụụ n’ebe e nwere oké oriri! N’ịbụ ndị nri gbara gburugburu, anyị ka pụrụ imesịa bụrụ ndị na-enwetụghị ihe na-emezi anyị ahụ ma ọ bụrụ na anyị akpalighị onwe anyị n’ezie iri ụfọdụ n’ime ya. Ilu 26:15 na-enye nkọwa nkịtị a: “Onye umengwụ esumiwo aka ya n’ọkwa; ọ na-agwụ ya ike iweghachi ya n’ọnụ ya.” Lee ọnọdụ ọjọọ nke a bụ! Anyị pụkwara ịdị umengwụ nke ukwuu nke na anyị agaghị etinyesi onwe anyị ike n’ọmụmụ ihe onwe onye nke Okwu Chineke na mbipụta ndị dabeere na Bible e mere iji nyere anyị aka iri nri ime mmụọ. Ma ọ bụ oké ike pụrụ ịgwụ anyị ịkwadebe maka ma ọ bụ ikere òkè ná nzukọ nile nke ọgbakọ ndị Kraịst.

Ezi Àgwà Iri Ihe

Mgbe ahụ, anyị nwere ihe nile mere anyị ga-eji azụlite ezi àgwà iri ihe ime mmụọ. Otú ọ dị, ihe bụ ezie bụ na ụfọdụ na-atụchara nri ime mmụọ ha atụchara, ụfọdụ ọbụna na-akwụ onwe ha agụụ kpam kpam. Ha pụrụ iyi ndị na-adịghị ahụ ịdị mkpa nke nri kwesịrị ekwesị ruo mgbe ha nwetara ihe ndị si na ya apụta ka oge na-aga ná ndụ. Akwụkwọ bụ́ Healthy Eating na-enye ihe a mere anyị pụrụ iji leghara ụzọ iri ihe anyị anya, ọ bụ ezie na anyị maara na iri ihe nke ọma dị oké mkpa maka ndụ: “Nsogbu ya bụ na [dị ka ihe si n’ụzọ iri ihe nke na-adịghị mma pụta] a dịghị enwe ndakpọ ahụ ike ngwa ngwa, ọ dịghị ihe na-esi na ya apụta ozugbo dị ka nke ịgafe n’okporo ụzọ n’elezighị anya na-akpata. Kama nke ahụ, a pụrụ inwe ndakpọ nke ahụ ike mmadụ, n’ụzọ na-aga ntakịrị ntakịrị, dịkwa aghụghọ, a pụrụ ibute ọrịa n’ụzọ dị mfe karị, ọkpụkpụ pụrụ ịdị nro karị, ịgwọ ọnyá na mgbake site n’ọrịa pụrụ ịga ntakịrị ntakịrị karị.”

N’ọnọdụ ndị gabigara ókè mmadụ pụrụ ịdị ka otu nwanyị na-akatabeghị ahụ bụ́ onye nwere nsogbu achọghị iri ihe. Ọ na-agwa onwe ya na ya chọrọ ntakịrị nri, na ahụ dị ya nnọọ mma, n’agbanyeghị eziokwu bụ na ọ na-atakpọ n’elu ahụ. N’ikpeazụ ọ dịghị enwe ọchịchọ ọ bụla iri ihe. “Ọ bụ ọnọdụ dị ize ndụ,” ka otu akwụkwọ ntụaka nkà ọgwụ na-ekwu. N’ihi gịnị? “Ọ bụ ezie na ọ na-esi ike onye ọrịa ahụ ịnwụ n’ihi ịkwụ agụụ ọ na-aghọ onye na-enweghị ihe na-edozi ahụ ma ọlị, ọ pụkwara ịdaba n’ihe kwesịrị ịbụ ọrịa ntakịrị.”

Otu nwanyị bụ́ onye Kraịst kwetara, sị: “Ruo ọtụtụ afọ agbasoro m ịmara mkpa maka ịkwadochi nzukọ anya na ọmụmụ ihe onwe onye mgba ma ọ dịghị mgbe m nwere ike ime ya.” O mesịrị mee mgbanwe nke mere ka ọ ghọọ ezi onye mmụta nke Okwu Chineke, ma ọ bụ nanị mgbe ọ ghọtazuru ịdị ngwa nke ọnọdụ ya.

Mgbe ahụ, buru n’obi okwu ndụmọdụ nke Pita onyeozi nyere. Bụrụnụ ndị dị ka “ụmụ a mụrụ ọhụrụ,” ma “ka agụụ mmiri ara nke okwu Chineke, nke aghụghọ na-adịghị ya, na-agụsi unu ike, ka unu wee were ya na-eto eto ruo nzọpụta.” (1 Pita 2:2) Ee, ‘ka agụụ na-agụ gị’—na-azụlite ọchịchọ siri ike—iji were ihe ọmụma Chineke mejupụta uche na obi gị. Ọ dịkwa ndị toworo ogo mmadụ n’ụzọ ime mmụọ mkpa ịnọgide na-azụlite agụụ ahụ. Ekwela ka nri ime mmụọ ghọọ ‘otu n’ime ihe onwunwe gị a kasị jiri mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.’ Rizie nri n’ụzọ ime mmụọ, ritekwa uru n’ụzọ zuru ezu site ‘n’okwu nile nke na-enye ezi ndụ’ a na-ahụ n’Okwu Chineke, bụ́ Bible.—2 Timoti 1:13, 14.

[Foto dị na peeji nke 28]

Ọ̀ dị gị mkpa imeziwanye nri gị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya