Olee Ụzọ Anyị Pụrụ Isi Nyezuo Ịdị Mma N’okwukwe Anyị?
“N’akụkụ unu tụkwasịnụ ịnụ ọkụ n’obi nile, nyezukwaanụ ịdị mma n’okwukwe unu.”—2 PITA 1:5.
1, 2. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụọ anya ka ndị Jehova mee ihe dị mma?
JEHOVA na-eme omume mgbe nile n’ụzọ dị mma. Ọ na-eme ihe ziri ezi na ihe ọma. Ya mere, Pita onyeozi pụrụ ikwu okwu banyere Chineke dị ka onye nke kpọrọ ndị Kraịst e tere mmanụ ‘site n’ebube na ịdị mma Ya.’ Ezi ihe ọmụma banyere Nna eluigwe ha nke dị mma egosiwo ha ihe dị mkpa iji gbasoo ndụ nke ezi nsọpụrụ Chineke.—2 Pita 1:2, 3.
2 Pọl onyeozi na-agba ndị Kraịst ume ka ha ‘bụrụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.’ (Ndị Efesọs 5:1) Dị ka Nna ha nke eluigwe, ndị na-efe Jehova kwesịrị ime ihe dị mma n’ọnọdụ ọ bụla. Ma gịnị bụ ịdị mma?
Ihe Ịdị Mma Bụ
3. Olee ụzọ e siworo kọwaa “ịdị mma”?
3 Akwụkwọ ọkọwa okwu ọgbara ọhụrụ na-akọwa “ịdị mma” dị ka “omume ọma; ịma mma.” Ọ bụ “omume na echiche ziri ezi; ịma mma nke àgwà.” Onye dị mma na-eme ezi omume. A kọwawokwa ịdị mma dị ka “ikwekọ n’ụkpụrụ nke ezi ihe.” Otú ọ dị, nye ndị Kraịst, Chineke na-ekpebi “ụkpụrụ nke ezi ihe,” a na-emekwa ka o doo anya Okwu ya dị Nsọ, bụ́ Bible.
4. Àgwà ndị dị aṅaa e hotara na 2 Pita 1:5-7 ka ndị Kraịst na-aghaghị ịrụsi ọrụ ike ịzụlite?
4 Ezi ndị Kraịst na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume nke Jehova Chineke, ha na-anarakwa nkwa ya nile dị oké ọnụ ahịa site n’igosipụta okwukwe. Ha na-aṅakwa ntị na ndụmọdụ Pita: “N’akụkụ unu tụkwasịnụ ịnụ ọkụ n’obi nile, nyezukwaanụ ịdị mma n’okwukwe unu; nyezukwa ihe ọmụma n’ịdị mma unu; nyezukwa ijisi onwe unu ike n’ihe ọmụma unu; nyezukwa ntachi obi n’ijisi onwe unu ike; nyezukwa nsọpụrụ Chineke n’ime ntachi obi unu; nyezukwa ịhụnanya ụmụnna unu n’ime nsọpụrụ Chineke unu; nyezukwa ịhụnanya n’ime ịhụnanya ụmụnna unu.” (2 Pita 1:5-7) Onye Kraịst aghaghị ịrụsi ọrụ ike iji zụlite àgwà ndị a. A dịghị eme nke a n’ime ụbọchị ma ọ bụ afọ ole na ole kama ọ chọrọ mgbalị a nọgidere na-eme n’oge nile a dị ndụ. Lee, inyezu ịdị mma n’okwukwe anyị bụ ihe ịma aka n’onwe ya!
5. Gịnị bụ ịdị mma site n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ si ele ihe anya?
5 Onye na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu bụ M. R. Vincent sịrị na echiche mbụ kasị mkpa nke okwu Grik ahụ a sụgharịrị “ịdị mma” pụtara “ụdị ịma mma ọ bụla.” Pita ji ụdị ya nke ụbara mee ihe mgbe ọ sịrị na ndị Kraịst gaje ikwusa “ịdị mma nile,” ma ọ bụ ịma mma, nke Chineke. (1 Pita 2:9) Site n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ si ele ihe anya, a na-akọwa ịdị mma ọ bụghị dị ka okwu na-adịghị ike kama dị ka “ịdị ike nke omume ọma, ike nke omume, inwe ume nke mkpụrụ obi.” N’ihota ịdị mma, Pita bu n’uche omume ọma obi ike nke a tụrụ anya ka ndị ohu Chineke gosipụta ma jigide. Otú ọ dị, ebe anyị na-ezughị okè, ànyị pụrụ n’ezie ime ihe dị mma n’anya Chineke?
Ndị Na-ezughị Okè ma Dịrị Mma
6. Ọ bụ ezie na anyị ezughị okè, n’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na anyị pụrụ ime ihe dị mma n’anya Chineke?
6 Anyị eketawo ezughị okè na mmehie site n’ọmụmụ, ya mere ọ pụrụ iju anyị anya ụzọ anyị pụrụ n’ezie isi mee ihe dị mma n’anya Chineke. (Ndị Rom 5:12) N’ezie enyemaka Jehova dị anyị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-enwe obi dị ọcha, bụ́ ebe echiche, okwu ọnụ, na omume dị mma pụrụ isi pụta. (Tụlee Luk 6:45.) Mgbe o mesịrị mmehie n’ihe banyere ya na Bat-sheba, onye ọbụ abụ ahụ nwere nchegharị bụ́ Devid rịọrọ, sị: “Keere m obi dị ọcha, Chineke; meekwa ka mmụọ nke na-eguzosi ike dị ọhụrụ n’ime m.” (Abụ Ọma 51:10) Devid natara mgbaghara Chineke na enyemaka nke dị mkpa iji gbasoo omume ọma. Ya mere, ọ bụrụ na anyị emewo mmehie dị oké njọ ma jiri nchegharị nakwere enyemaka nke Chineke na nke ndị okenye ọgbakọ, anyị pụrụ ịlaghachi n’ụzọ dị mma ma nọgide na ya.—Abụ Ọma 103:1-3, 10-14; Jemes 5:13-15.
7, 8. (a) Ọ bụrụ na anyị ga-anọgide na-eme ihe dị mma, gịnị dị mkpa? (b) Enyemaka dị aṅaa ka ndị Kraịst nwere iji bụrụ ndị dị mma?
7 N’ihi omume mmehie e bu pụta ụwa, anyị aghaghị ịnọgide na-alụ agha sitere n’ime nke ihe omume ọma chọrọ anyị n’aka. Ọ bụrụ na anyị ga-anọgide na-eme ihe dị mma, ọ dịghị mgbe anyị ga-ekwe ka anyị ghọọ ndị ohu nke mmehie. Kama nke ahụ, anyị aghaghị ịbụ “ndị ohu nke ezi omume,” nọgide na-eche echiche, na-ekwu okwu, ma na-eme omume n’ụzọ dị mma. (Ndị Rom 6:16-23) Otú ọ dị, ọchịchọ anụ ahụ na mkpali mmehie anyị dị ike, anyị na-echekwa ihu mburịta agha dị n’etiti ihe ndị a na ihe ndị dị mma nke Chineke chọrọ anyị n’aka. Ya mere, gịnị ka a ga-eme?
8 Nke mbụ, ọ dị mkpa anyị ịgbaso nduzi nke mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ Jehova. Ya mere anyị kwesịrị ịṅa ntị na ndụmọdụ Pọl: “Na-ejegharịnụ site na mmụọ nsọ, unu agaghị emezukwa agụụ nke anụ ahụ ma ọlị. N’ihi na agụụ na-agụ mmụọ nsọ megide anụ ahụ; n’ihi na ndị a na-emegide onwe ha; ka unu wee ghara ime ihe ndị a ọ bụla unu na-achọ ime.” (Ndị Galetia 5:16, 17) Ee, dị ka ihe na-enye ike ime ezi omume, anyị nwere mmụọ Chineke, dịkwa ka ihe nduzi ime ezi omume, anyị nwere Okwu ya. Anyị nwekwara enyemaka ịhụnanya nke nzukọ Jehova na ndụmọdụ nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Otú a, anyị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịlụ ọgụ megide mkpali mmehie nile. (Ndị Rom 7:15-25) Otú ọ dị, ọ bụrụ na echiche na-adịghị ọcha abata n’uche anyị, anyị aghaghị iwezụga ya ozugbo ma kpee ekpere maka enyemaka Chineke iji guzogide ọnwụnwa ọ bụla nke ime omume n’ụzọ ọ bụla na-adịghị mma.—Matiu 6:13.
Ịdị Mma na Echiche Anyị
9. Omume dị mma chọrọ ka a na-eche ụdị echiche dị aṅaa?
9 Ịdị mma na-amalite site n’ụzọ mmadụ si eche echiche. Iji nweta amara Chineke, anyị aghaghị iche echiche banyere ezi omume, ihe ọma, ihe ndị dị mma. Pọl sịrị: “Ụmụnna m, ka ihe bụ eziokwu hà, ka ha hà, bụ́ ihe kwesịrị nsọpụrụ, ka ha hà, bụ́ ihe ziri ezi, ka ha hà, bụ́ ihe dị ọcha, ka ha hà, bụ́ ihe kwesịrị ịhụnanya, ka ha hà, bụ́ ihe e kwuru nke ọma; ọ bụrụ na ịdị mma ọ bụla dị, ọ bụrụkwa na otuto ọ bụla dị, na-agụkọnụ ihe ndị a.” (Ndị Filipaị 4:8) Ọ dị anyị mkpa ịtụkwasị uche anyị n’ihe ziri ezi, dịkwa ọcha, ihe ọ bụla nke na-adịghị mma ekwesịghị ịdọrọ mmasị anyị. Pọl pụrụ ikwu, sị: “Ihe unu matara, nke unu natakwara, nke unu nụkwara, nke unu hụkwara n’ahụ m, na-emenụ ihe ndị a.” Ọ bụrụ na anyị dị ka Pọl—na-eche echiche, na-ekwu okwu, ma na-eme omume ndị dị mma—anyị ga-abụ ndị mkpakọrịta ọma na ezi ihe nlereanya n’ibi ndụ ndị Kraịst, ‘Chineke nke udo ga-anọnyekwara anyị.’—Ndị Filipaị 4:9.
10. Olee ụzọ anyị itinye 1 Ndị Kọrint 14:20 n’ọrụ n’onwe anyị ga-esi nyere anyị aka ịnọgide na-eme ihe dị mma?
10 Ọ bụrụ na ọ bụ ọchịchọ anyị ịnọgide na-eche echiche dị mma wee si otú ahụ na-eme ihe na-atọ Nna anyị eluigwe ụtọ, ọ dị mkpa ka anyị tinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ: “Unu abụla ụmụntakịrị n’uche unu: kama bụrụnụ ụmụ ọhụrụ n’obi ọjọọ, ma n’uche unu bụrụnụ ndị tozuru okè.” (1 Ndị Kọrint 14:20) Nke a pụtara na dị ka ndị Kraịst anyị adịghị achọ inwe ihe ọmụma ma ọ bụ ahụmahụ nke ajọ omume. Kama ikwe ka e metọọ uche anyị n’ụzọ dị otú a, anyị na-eji amamihe na-ahọrọ ịnọ n’enweghị ahụmahụ nakwa n’amaghị nke a na-akọ dị ka ụmụ ọhụrụ n’akụkụ nke a. N’otu oge ahụ, anyị na-aghọta n’ụzọ zuru ezu na omume rụrụ arụ na ajọ omume bụ mmehie n’anya Jehova. Ọchịchọ dị omimi nke sitere n’obi nke ime ihe na-atọ ya ụtọ site n’ịdị mma ga-abara anyị uru, n’ihi na ọ ga-akpali anyị izere ụdị nile na-adịghị ọcha nke ntụrụndụ na mmetụta ndị ọzọ na-emetọ uche nke ụwa nke a nọ n’ike Setan.—1 Jọn 5:19.
Ịdị Mma na Okwu Ọnụ Anyị
11. Ịbụ ndị dị mma chọrọ ụdị okwu dị aṅaa, n’akụkụ nke a kwa, ihe nlereanya dị aṅaa ka anyị nwere n’ebe Jehova Chineke na Jisọs Kraịst nọ?
11 Ọ bụrụ na echiche anyị dị mma, nke a kwesịrị inwe mmetụta miri emi n’ihe anyị na-ekwu. Ịdị mma na-achọ n’aka mmadụ okwu ọnụ dị ọcha, dị mma, bụrụ eziokwu, na-ewuli elu. (2 Ndị Kọrint 6:3, 4, 7) Jehova bụ “Chineke nke eziokwu.” (Abụ Ọma 31:5) Ọ na-ekwesị ntụkwasị obi n’ihe nile ọ na-eme, nkwa ya nile bụkwa ndị e ji n’aka n’ihi na ọ pụghị ikwu okwu ụgha. (Ọnụ Ọgụgụ 23:19; 1 Samuel 15:29; Taịtọs 1:2) Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, “jupụtara n’amara na eziokwu.” Mgbe ọ nọ n’elu ụwa, o kwuru eziokwu mgbe nile dị ka ọ nataworo ya site n’aka Nna ya. (Jọn 1:14; 8:40) Ọzọkwa, Jisọs ‘emeghị mmehie ọ bụla, a hụghịkwa aghụghọ n’ọnụ ya.’ (1 Pita 2:22) Ọ bụrụ na anyị bụ ndị ohu Chineke na Kraịst n’ezie, anyị ga na-ekwu eziokwu ma na-eme ezi omume, dị ka à ga-asị na ‘anyị kere eziokwu n’úkwù.’—Ndị Efesọs 5:9; 6:14.
12. Ọ bụrụ na anyị ga-abụ ndị dị mma, ụdị okwu dịgasị aṅaa ka anyị na-aghaghị izere?
12 Ọ bụrụ na anyị dị mma, e nwere ụdị okwu ndị anyị ga-ezere. Anyị ga-abụ ndị a na-achịkwa site na ndụmọdụ Pọl: “Ka e wepụ ihe ilu na ọnụma na iwe na iti mkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọọ nile, n’etiti unu.” “Ịkwa iko, na adịghị ọcha nile, ma ọ bụ anyaukwu, ka a ghara ịkpọ ọbụna aha ya n’etiti unu, dị ka o kwesịrị ndị nsọ; ma ọ bụ ihe ihere, ma ọ bụ ikwu okwu nzuzu, ma ọ bụ okwu na-abaghị n’ihe nke na-ekwesịghị: ma kama nke ahụ ikele ekele.” (Ndị Efesọs 4:31; 5:3, 4) Ndị ọzọ ga-enweta izu ike ịnọ ná mkpakọrịta anyị n’ihi na obi ezi omume anyị na-akpali anyị izere okwu ndị na-ekwesịghịrị ndị Kraịst.
13. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst na-aghaghị iji chịkwa ire?
13 Ọchịchọ nke ime ihe na-atọ Chineke ụtọ na ikwu ihe ndị dị mma ga-enyere anyị aka ịchịkwa ire anyị. N’ihi mkpali nke ime mmehie, anyị nile na-asụ ngọngọ n’okwu mgbe ụfọdụ. Ma, Jemes onye na-eso ụzọ na-asị na ‘ọ bụrụ na anyị etinye bridle n’ọnụ ịnyịnya,’ ha na-eji nrubeisi aga n’ebe anyị duziiri ha ịga. Ya mere, anyị kwesịrị ịrụsi ọrụ ike ịkwa ire anyị ngá ma gbalịa iji ya na-eme ihe nanị n’ụzọ ndị dị mma. Ire nke a na-apụghị ịchịkwa achịkwa ‘bụ ụwa nke ajọ omume.’ (Jemes 3:1-7) E ji ụdị àgwà ọjọọ ọ bụla nke ụwa nke a na-adịghị asọpụrụ Chineke mara ire nke a na-akwaghị ngá. Ọ bụ ya na-akpata ihe ndị na-emebi ihe dị ka àmà ụgha, okwu mkparị, na nkwutọ. (Aịsaịa 5:20; Matiu 15:18-20) Mgbe ire a na-azụghị azụ kwukwara okwu mkparị, nke na-akpasu iwe, ma ọ bụ nkwutọ, o jupụtara ná nsí na-egbu egbu.—Abụ Ọma 140:3; Ndị Rom 3:13; Jemes 3:8.
14. Ụkpụrụ abụọ dịrịtara iche ndị dị aṅaa n’okwu ka ndị Kraịst na-aghaghị izere?
14 Dị ka Jemes gosipụtara, ọ ga-abụ ihe na-ekwekọghị ekwekọ ‘ịgọzi Jehova’ site n’ikwu ihe dị mma banyere Chineke ma mgbe ahụ jiri ire mee ihe na-adịghị mma ‘ịbụ mmadụ ọnụ’ site n’ịkpọ ha iyi. Lee aha mmehie ọ bụ ịbụ abụ otuto nke Chineke ná nzukọ dị iche iche ma pụọkwa wee kwuo ajọ ihe banyere ndị kwere ekwe ibe anyị! Mmiri dị ụtọ na nke dị ilu apụghị ịgbapụta site n’otu isi iyi. Ọ bụrụ na anyị na-ejere Jehova ozi, ndị ọzọ nwere ikike ịtụ anya ka anyị na-ekwu ihe ndị dị mma kama ịdị na-ekwu okwu ndị na-adịghị mma ná ntị. Ya mere ka anyị jụ ajọ okwu ma chọọ ikwu ihe ndị ga-abara ndị anyị na ha na-akpakọrịta uru ma wulie ha elu n’ụzọ ime mmụọ.—Jemes 3:9-12.
Ịdị Mma na Omume Anyị
15. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa izere ime ihe n’ụzọ aghụghọ?
15 Ebe echiche na okwu ndị Kraịst na-aghaghị ịdị mma, gịnị banyere omume anyị? Ịdị mma n’omume bụ nanị ụzọ isi nweta amara Chineke. Ọ dịghị ohu Jehova ọ bụla pụrụ ịhapụ ịdị mma, malite ịghọ aghụghọ na emeghị ihe n’eziokwu, ma chee n’ụzọ ziri ezi na Chineke ga-anakwere ihe ndị dị otú ahụ. Ilu 3:32 na-asị: “Ihe arụ n’anya Jehova ka onye sihiere esihie bụ: ma n’aka ndị ziri ezi ka izu nzuzo Ya dị.” Ọ bụrụ na anyị ejiri mmekọrịta anyị na Jehova Chineke kpọrọ ihe, okwu ndị ahụ na-akpali iche echiche kwesịrị igbochi anyị ka anyị ghara ịkpa nkata ajọ ihe ma ọ bụ ime ihe aghụghọ ọ bụla. Leenụ, n’ime ihe asaa ndị ahụ bụ ihe arụ nye mkpụrụ obi Jehova e nwere “obi nke na-echepụta echiche ajọ ihe”! (Ilu 6:16-19) N’ihi nke ahụ, ka anyị zere omume ndị dị otú ahụ ma mee ihe dị mma, n’ihi abamuru nke ụmụ mmadụ ibe anyị na otuto nke Nna anyị bi n’eluigwe.
16. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst na-agaghị eji tinye aka n’omume ihu abụọ ọ bụla?
16 Igosipụta ịdị mma chọrọ n’aka anyị ime ihe n’eziokwu. (Ndị Hibru 13:18) Onye ihu abụọ, nke omume ya nile na-adịghị ekwekọ n’okwu ya, abụghị onye dị mma. Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ihu abụọ” (hy·po·kri·tesʹ) pụtara “onye na-aza,” ọ pụtakwara onye na-eme ihe nkiri. Ebe ọ bụ na ndị Grik na ndị Rom na-eme ihe nkiri na-eyi ihe mkpuchi ihu, a malitere iji okwu nke a na-eme ihe n’ụzọ ihe ntụnyere maka onye na-ezochi ihe ọ bụ. Ndị ihu abụọ bụ “ndị na-ekwesịghị ka a tụkwasị ha obi.” (Jiri Luk 12:46 tụlee Matiu 24:50, 51.) Omume ihu abụọ (hy·poʹkri·sis) nwekwara ike ịpụta ajọ omume na aghụghọ. (Matiu 22:18; Mak 12:15; Luk 20:23) Lee ihe mwute ọ bụ mgbe a ghọgburu onye tụkwasịrị mmadụ obi site n’ihu ọchị, ire ụtọ, na omume ndị bụ nanị aghụghọ! Ma ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ mgbe anyị maara na anyị na onye Kraịst a pụrụ ịtụkwasị obi na-emekọ ihe. Chineke na-agọzikwa anyị maka ịdị mma na enweghị ihu abụọ. Nwapụta ya na-adịkwasị ndị na-egosipụta ‘ịhụnanya ụmụnna nke ihu abụọ na-adịghị ya’ ma na-enwe “okwukwe nke ihu abụọ na-adịghị ya.”—1 Pita 1:22; 1 Timoti 1:5.
Ịdị Mma Bụ Ihe Ọma Dị Irè
17, 18. Ka anyị na-egosipụta mkpụrụ mmụọ nsọ nke ịdị mma, olee ụzọ anyị ga-esi na-emeso ndị ọzọ?
17 Ọ bụrụ na anyị enyezuo ịdị mma n’okwukwe anyị, anyị ga-agba mbọ izere iche echiche, ikwu okwu, na ime ihe ndị Chineke na-adịghị anakwere. Otú ọ dị, igosipụta ịdị mma ndị Kraịst chọkwara n’aka anyị ime ihe ọma dị irè. N’ezie, a kọwawo ịdị mma dị ka ihe ọma. Ịdị mma bụkwa otu mkpụrụ nke mmụọ nsọ Jehova, ọ bụghị ihe nke mgbalị mmadụ nkịtị mepụtara. (Ndị Galetia 5:22, 23) Ka anyị na-egosi mkpụrụ mmụọ nsọ nke ịdị mma, a ga-akpali anyị iche echiche mara mma banyere ndị ọzọ na ịja ha mma maka àgwà ọma ha n’agbanyeghị ezughị okè ha. Hà ejeworo Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ? Mgbe ahụ anyị kwesịrị igosi ha nkwanye ùgwù ma na-ekwu ihe dị mma banyere ha na ije ozi nye Chineke. Nna anyị nke eluigwe na-arịba ama ịhụnanya ha gosiri maka aha ya na ọrụ ha nile dị mma nke okwukwe, anyị kwesịkwara ime otú ahụ.—Nehemaịa 13:31b; Ndị Hibru 6:10.
18 Ịdị mma na-eme ka anyị nwee ndidi, nghọta, ọmịiko. Ọ bụrụ na onye anyị na ya na-efekọ Jehova nọ n’ihe isi ike ma ọ bụ ịda mbà n’obi, anyị ga-ekwu okwu ngụgụ ma chọọ ụzọ isi nye ya nkasi obi ụfọdụ, ọbụna dị ka Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya na-akasi anyị obi. (2 Ndị Kọrint 1:3, 4; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Anyị na-emechitere ndị na-eru újú ebere, eleghị anya n’ihi ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya. Ọ bụrụ na anyị pụrụ ime ihe ọ bụla iji belata nhụjuanya ha, anyị ga-eme ya, n’ihi mmụọ ịdị mma na-akpali omume ịhụnanya, nke na-eme ihe ọma.
19. Olee ụzọ o yikarịrị ka ndị ọzọ ga-esi mesoo anyị ma ọ bụrụ na anyị adịrị mma n’echiche, okwu, na omume?
19 Dị nnọọ ka anyị na-agọzi Jehova site n’ikwu ihe dị mma banyere ya, o yiri ka ndị ọzọ hà ga-agọzi anyị ma ọ bụrụ na anyị adị mma n’echiche, okwu, na omume. (Abụ Ọma 145:10) Otu ilu amamihe na-asị: “Ngọzi nile na-adịrị isi onye ezi omume: ma ihe ike na-ekpuchi ọnụ ndị na-emebi iwu.” (Ilu 10:6) Onye ajọ omume nke na-emekwa ihe ike enweghị ịdị mma nke ga-adọta ya nso n’ebe ndị ọzọ nọ. Ọ na-aghọrọ ihe ọ kụrụ, n’ihi na ndị mmadụ apụghị iji obi eziokwu nye ya ngọzi ha site n’ikwu ihe dị mma banyere ya. (Ndị Galetia 6:7) Lee ka o si ka mma nye ndị na-eche echiche, na-ekwu okwu, ma na-eme omume n’ụzọ ndị dị mma dị ka ndị ohu Jehova! Ha na-enweta ịhụnanya, ntụkwasị obi, na nkwanye ùgwù nke ndị ọzọ, bụ́ ndị a na-akpali ịgọzi ha na ikwu ihe dị mma banyere ha. Ọzọkwa, ịdị mma Chineke ha na-arụpụta ngọzi dị oké ọnụ ahịa nke Jehova.—Ilu 10:22.
20. Echiche, okwu, na omume ndị dị mma pụrụ inwe mmetụta dị aṅaa n’ọgbakọ nke ndị Jehova?
20 Echiche, okwu, na omume ndị dị mma ga-abara ọgbakọ nke ndị Jehova uru n’ezie. Mgbe ndị kwere ekwe ibe anyị nwere echiche ịhụnanya, nke nkwanye ùgwù n’ebe ibe ha nọ, ịhụnanya ụmụnna na-aba ụba n’etiti ha. (Jọn 13:34, 35) Okwu dị mma, tinyere ịja mma na agbamume sitere n’ezi obi, na-akwalite mmetụta na-ekpo ọkụ nke mmekọrịta na ịdị n’otu. (Abụ Ọma 133:1-3) Omume na-enye obi ụtọ, nke dị mma na-akpali ndị ọzọ imeghachi omume n’otu ụzọ ahụ. Karịsịa, itinye ịdị mma ndị Kraịst n’omume na-arụpụta nnwapụta na ngọzi nke Nna anyị nke eluigwe dị mma, bụ́ Jehova. Ya mere ka anyị mee ya nzube anyị ịnara nkwa nile dị oké ọnụ ahịa nke Chineke site n’igosipụta okwukwe. N’ezie ka anyị tinyesie mgbalị ike inyezu ịdị mma n’okwukwe anyị.
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ Olee ụzọ ị ga-esi kọwaa “ịdị mma,” n’ihi gịnịkwa ka ndị na-ezughị okè pụrụ iji dị mma?
◻ Ịdị mma chọrọ ụdị echiche dịgasị aṅaa?
◻ Olee ụzọ ịdị mma kwesịrị isi metụta okwu anyị?
◻ Mmetụta dị aṅaa ka ịdị mma kwesịrị inwe n’omume anyị?
◻ Gịnị bụ uru ụfọdụ a na-erite n’ịbụ ndị dị mma?
[Foto dị na peeji nke 21]
Ebe ọ bụ na mmiri dị ụtọ na nke dị ilu apụghị ịgbapụta site n’otu isi iyi, o ziri ezi ndị ọzọ ịtụ anya ka ndị ohu Jehova na-ekwu nanị ihe ndị dị mma