-
Ihe Ụbọchị Jehova Ga-ekpugheỤlọ Nche—2010 | Julaị 15
-
-
2 Pita onyeozi dere, sị: “Ụbọchị Jehova ga-abịa dị ka onye ohi, bụ́ mgbe eluigwe ga-eji oké ụzụ gabiga, ma ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa ga-adị oké ọkụ wee gbazee, a ga-ekpughekwa ụwa na ọrụ ndị a rụrụ n’ime ya.” (2 Pita 3:10) Gịnị bụ “eluigwe” na “ụwa” e kwuru okwu ha ebe a? Gịnị bụ “ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa” bụ́ ndị a ga-agbaze? Oleekwa ihe Pita bu n’uche mgbe o kwuru na ‘a ga-ekpughe ụwa na ọrụ ndị a rụrụ n’ime ya’? Ịmata azịza nke ajụjụ ndị a ga-enyere anyị aka ijikere maka ihe ndị dị egwu ga-eme n’oge na-adịghị anya.
Eluigwe na Ụwa Ndị Ga-agabiga
3. Gịnị bụ “eluigwe” e kwuru okwu ya na 2 Pita 3:10, oleekwa otú ọ ga-esi agabiga?
3 Mgbe e ji okwu ahụ bụ́ eluigwe mee ihe atụ na Baịbụl, ọ na-anọchikarị anya ndị na-achị achị, bụ́ ndị ka ndị ha na-achị elu. (Aịza. 14:13, 14; Mkpu. 21:1, 2) ‘Eluigwe nke ga-agabiga’ na-anọchi anya ọchịchị ụmụ mmadụ nke na-achị ndị na-anaghị efe Chineke. Ngabiga nke ọ ga-eji “oké ụzụ” gabiga, ma ọ bụ “oké mbigbọ,” dị ka nsụgharị ọzọ si kwuo ya, nwere ike ịpụta na a ga-ebibi ya ngwa ngwa.
4. Gịnị bụ “ụwa” e kwuru okwu ya na 2 Pita 3:10, oleekwa otú a ga-esi bibie ya?
4 “Ụwa” na-anọchi anya ụmụ mmadụ ndị ha na Chineke na-adịghị ná mma. E nwere ụdị ụwa a n’oge Noa, Iju Mmiri lakwara ya n’iyi mgbe Chineke nyere iwu ka nke a mee. “Site n’otu okwu ahụ, eluigwe na ụwa dị ugbu a ka e debeere ọkụ, a na-edebekwa ha ruo ụbọchị ikpe na ụbọchị mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 3:7) N’agbanyeghị na Iju Mmiri lara ndị niile na-anaghị asọpụrụ Chineke n’iyi n’otu mgbe, “n’oké mkpagbu ahụ,” a gaghị ebibi ndị niile na-anaghị asọpụrụ Chineke otu mgbe. (Mkpu. 7:14) Ná mmalite nke oké mkpagbu ahụ, Chineke ga-eme ka ndị ọchịchị bibie “Babịlọn Ukwu ahụ.” Ọ ga-esi otú a gosi na ya kpọrọ okpukpe ahụ yiri nwaanyị akwụna asị. (Mkpu. 17:5, 16; 18:8) Nke a gachaa, n’agha Amagedọn, nke ga-abụ agba nke ikpeazụ nke oké mkpagbu ahụ, Jehova ga-eji aka ya bibie ihe ndị fọdụrụ n’ụwa Setan.—Mkpu. 16:14, 16; 19:19-21.
‘Ihe Ndị Dị n’Eluigwe na Ụwa Ga-agbaze’
5. Gịnị bụ ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa?
5 Olee “ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa” bụ́ ndị ‘ga-agbaze’? “Ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa” ndị Pita kwuru okwu ha bụ ihe ndị mere ka ụwa bụrụ nke na-anaghị asọpụrụ Chineke. Ha gụnyere àgwà a na-akpa na ya, otú e si eme ihe na ya, na ihe ndị a na-achụso n’ime ya. “Ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa” gụnyekwara “mmụọ nke ụwa,” bụ́ “nke na-arụ ọrụ ugbu a n’ime ụmụ nnupụisi.” (1 Kọr. 2:12; gụọ Ndị Efesọs 2:1-3.) Mmụọ ahụ, ma ọ bụ “ikuku,” juru n’ụwa Setan. Ọ na-eme ka ndị mmadụ na-eche echiche, na-eme atụmatụ, na-ekwu okwu, na-emekwa ihe kwekọrọ n’uche Setan, bụ́ onye mpako obi fere azụ nke “na-achị ikike nke ikuku.”
6. Olee otú e si ama onye nwere mmụọ nke ụwa?
6 N’ihi ya, ma ndị nwere mmụọ ụwa hà ma ma ọ̀ bụ na ha amaghị, ha ekwetala ka Setan na-eduzi uche ha na obi ha ka ha wee na-eche echiche ma na-akpa àgwà ka ya. Nke a na-eme ka ha na-eme ihe ọ bụla dị ha mma n’achọghị ịma ihe bụ́ uche Chineke. Ha dị mpako ma na-achọ ihe ga-adịrị naanị ha mma. Ha na-enupụrụ ndị na-achị achị isi, na-emekwa ihe ‘anụ ahụ́ ha na anya ha chọrọ.’—Gụọ 1 Jọn 2:15-17.a
7. Olee ihe mere anyị ji kwesị ‘ichebe obi anyị’?
7 Ya mere, ọ dị oké mkpa ka anyị “chebe obi” anyị site n’ime ihe ndị ga-amasị Chineke mgbe anyị na-emete ndị enyi, mgbe anyị na-ahọrọ ụdị akwụkwọ anyị ga-agụ, ụdị ihe ndị anyị ga-eji atụrụ ndụ, na ebe ndị anyị ga-aga n’Ịntanet. (Ilu 4:23) Pọl onyeozi dere, sị: “Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu, dị ka ọdịnala mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ nke ụwa si dị, ọ bụghị dị ka Kraịst si dị.” (Kọl. 2:8) Nke a dị mkpa nke ukwuu ugbu a ụbọchị Jehova na-eru nso, n’ihi na ‘oké ọkụ’ ya ga-agbaze “ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa” Setan. Ọ na-egosi na ha agaghị alanahụli iwe na-ere ka ọkụ nke Chineke ga-eweso ha n’ụbọchị ahụ. Nke a na-echetara anyị ihe e dere na Malakaị 4:1, bụ́ ebe sịrị: “Ụbọchị nke na-ere dị ka oké ọkụ na-abịa, ndị niile dị mpako na ndị niile na-eme ajọ omume ga-adị ka ahịhịa ọka. Ụbọchị ahụ nke na-abịa ga-erepịakwa ha.”
“A Ga-ekpughekwa Ụwa na Ọrụ Ndị A Rụrụ n’Ime Ya”
8. Olee otú a ga-esi ‘kpughee’ ụwa na ọrụ ndị a rụrụ n’ime ya?
8 Gịnị ka Pita bu n’uche mgbe o kwuru na “a ga-ekpughekwa ụwa na ọrụ ndị a rụrụ n’ime ya”? Okwu ahụ bụ́ ‘ikpughe’ nwekwara ike ịpụta ‘ịchọpụta’ ma ọ bụ ‘ịgba ihe n’anwụ.’ Ihe Pita na-ekwu bụ na n’oké mkpagbu ahụ, Jehova ga-agba ụwa Setan n’anwụ, mee ka a mara na ọ na-emegide ya na Alaeze ya, bụ́ nke na-egosi na e kwesịrị ibibi ya. Amụma dị n’Aịzaya 26:21 sịrị: “Jehova si n’ebe ọ nọ na-abịa ime ka ndị bi n’ala a zaa ajụjụ maka njehie ha. Ala a ga-ekpughekwa ọbara ndị ọ wụfuru, ọ gakwaghị ekpuchi ndị ya e gburu egbu ọzọ.”
9. (a) Olee ihe ndị anyị kwesịrị izere, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Olee ihe anyị kwesịrị inwe, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
9 N’ụbọchị Jehova, ndị ụwa na mmụọ ya mere ka ha bụrụ ndị ọjọọ ga-egosi ụdị ndị ha bụ n’ezie, ha ga-egbudị ibe ha. N’eziokwu, o yiri ka ihe ntụrụndụ ndị na-ewu ewu taa, bụ́ ndị na-egosi ime ihe ike, na-azụ uche ọtụtụ mmadụ maka mgbe ahụ onye ọ bụla ‘ga-emegide ibe ya.’ (Zek. 14:13) Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka anyị jụ fim, akwụkwọ, egwuregwu vidio, na ihe ndị ọzọ, bụ́ ndị nwere ike ime ka anyị na-akpa àgwà ndị na-anaghị amasị Chineke, dị ka mpako na ịhụ ihe ike n’anya. (2 Sam. 22:28; Ọma 11:5) Kama ime ihe ndị na-anaghị amasị Chineke, ka anyị nwee mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke n’ihi na ọkụ ihe atụ ahụ agaghị akpa àgwà ndị e ji ama onye nwere mkpụrụ nke mmụọ nsọ aka.—Gal. 5:22, 23.
-
-
Ihe Ụbọchị Jehova Ga-ekpugheỤlọ Nche—2010 | Julaị 15
-
-
Jikere Maka Oké Ụbọchị Jehova
12. Olee ihe mere ụbọchị Jehova ga-eji bịakwasị ụwa na mberede?
12 Ma Pọl ma Pita buru amụma na ụbọchị Jehova ga-abịa “dị ka onye ohi,” ya bụ na ọ ga-abịa mgbe a na-atụghị anya ya. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:1, 2.) Ọ ga-abịakwasịdị ezigbo Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-atụ anya ụbọchị ahụ, na mberede. (Mat. 24:44) Ma, ọ ga-eme ụwa ihe karịrị ịda ha na mberede. Pọl dere, sị: “Mgbe ọ bụla ha [ya bụ, ndị ha na Jehova na-adịghị ná mma] na-asị: ‘Udo na obi iru ala!’ mgbe ahụ ka mbibi mberede ga-abịakwasị ha n’otu ntabi anya dị nnọọ ka ihe mgbu nke na-abịakwasị nwaanyị dị ime; ha agaghịkwa agbanahụ ya ma ọlị.”—1 Tesa. 5:3.
-