Akwụkwọ Sitere n’Aka Chineke
“Ọ dịghị amụma ọ bụla nke e ji ọchịchọ mmadụ buo mgbe ọ bụla: kama mmadụ sitere na Chineke kwuo okwu, mgbe Mmụọ Nsọ na-eme ka ha kwuo.”—2 PITA 1:21.
1, 2. (a) N’ihi gịnị ka ụfọdụ ji ajụ ma Bible ọ̀ dị irè maka ibi ndụ n’oge a? (b) Olee usoro ihe nnwapụta atọ anyị pụrụ iji gosipụta na Bible sitere n’aka Chineke?
BIBLE ọ̀ gbasara ndị dị ndụ na nso narị afọ nke 21? Ụfọdụ echeghị otú ahụ. “Ọ dịghị onye ga-akwado iji mbipụta 1924 nke akwụkwọ mmụta ọdịdị na mgbanwe ọnọdụ ihe mee ihe na klas mmụta ọdịdị na mgbanwe ọnọdụ ihe nke oge a—a mụtawo ihe karịrị akarị banyere ọdịdị na mgbanwe ọnọdụ ihe eri mgbe ahụ,” ka Dr. Eli S. Chesen dere, na-akọwa ihe mere o ji chee na oge Bible agafewo. N’elu elu, o yiri ka ezi uche ọ̀ dị n’arụmụka a. E kwuwerị, mmadụ amụtawo ihe dị ukwuu banyere sayensị, ahụ ike uche, na akparamàgwà mmadụ eri oge Bible. Ya mere, ụfọdụ na-ajụ, sị: ‘Olee otú akwụkwọ ochie dị otú ahụ pụrụ isi ghara inwe ihe ndị na-ezighị ezi na nkà mmụta sayensị? Olee otú ọ pụrụ isi nwee ndụmọdụ dị irè maka ịdị ndụ n’oge a?’
2 Bible n’onwe ya na-enye azịza ya. Na 2 Pita 1:21, a gwara anyị na ndị amụma Bible “sitere na Chineke kwuo okwu, mgbe Mmụọ Nsọ na-eme ka ha kwuo.” Bible si otú a na-egosi na ọ bụ akwụkwọ sitere n’aka Chineke. Ma, olee otú anyị pụrụ isi mee ka ndị ọzọ kwenye na ọ bụ otú o mere? Ka anyị tụlee ihe atọ na-anwapụta na Bible bụ Okwu Chineke: (1) O ziri ezi na nkà mmụta sayensị, (2) o bu ndụmọdụ ndị dabara n’oge nile bụ́ ndị dị irè maka ịdị ndụ n’oge a, na (3) o bu amụma ndị e mezuworo, dị ka ihe ndị mere eme n’akụkọ na-anwapụta.
Akwụkwọ Ya na Sayensị Na-ekwekọ
3. Olee ihe mere na nchọpụta sayensị eyibeghị Bible egwu?
3 Bible abụghị akwụkwọ ọgụgụ sayensị. Otú ọ dị, ọ bụ akwụkwọ eziokwu, eziokwu anaghịkwa agbanwe agbanwe. (Jọn 17:17) Nchọpụta sayensị dị iche iche eyibeghị Bible egwu. Mgbe o tinyere ọnụ n’okwu metụtara sayensị, ọ naghị enwetụ nchepụta “sayensị” oge ochie ndị ghọrọ nanị akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme. N’ezie, o nwere okwu ndị ọ na-abụghị nanị na ha ziri ezi na nkà mmụta sayensị kamakwa ha megidesiri echiche ndị a nakweere n’oge ndị ahụ ike. Tụlee, dị ka ihe atụ, nkwekọ dị n’etiti Bible na nkà sayensị ọgwụ na ahụ ike.
4, 5. (a) Gịnị ka ndị dibịa oge ochie na-aghọtaghị banyere ọrịa? (b) Olee ihe mere na ihe ịrụ ụka adịghị ya na Mosis maara otú ndị dibịa Ijipt si agwọ ọrịa?
4 Ndị dibịa oge ochie aghọtachaghị ụzọ ọrịa si agbasa, nke ha na-amata ịdị mkpa nke ịdị ọcha n’igbochi ọrịa. Ọtụtụ n’ime ụzọ e si agwọ ọrịa n’oge ochie ga-eyi nke ndị ime ọhịa ma e jiri ha tụnyere ndị nke ọgbara ọhụrụ. Otu n’ime akwụkwọ ọgwụ na ahụ ike kasị ochie bụ Ebers Papyrus, nchịkọta nke ihe ọmụma ọgwụ na ahụ ike ndị Ijipt, nke dị kemgbe ihe dị ka 1550 T.O.A. O nwere ọgwụ 700 maka ihe otiti dị iche iche “na-amalite n’arụ agụ iyi ruo n’ihe mgbu nke mbọ ụkwụ.” Ihe ka ukwuu n’ọgwụ ndị a adịghị irè ma ọlị, ma ụfọdụ n’ime ha dị oké ize ndụ. Maka ịgwọ ọnyá, otu n’ime usoro ọgwụgwọ ndị ahụ tụrụ aro ka e tee ya ngwakọta e ji nsị mmadụ na ihe ndị ọzọ mee.
5 E dere ihe odide a nke ọgwụ ndị Ijipt n’ihe dị ka n’otu oge ahụ e dere akwụkwọ ndị mbụ nke Bible, nke gụnyere Iwu Mosis. Mosis, onye a mụrụ na 1593 T.O.A., tolitere n’Ijipt. (Ọpụpụ 2:1-10) Dị ka onye a zụrụ n’ezinụlọ Fero, ‘e ziri Mosis ihe n’amamihe nile nke ndị Ijipt.’ (Ọrụ 7:22) Ọ maara “ndị dibịa” Ijipt. (Jenesis 50:1-3) Ihe omume ọgwụ na ahụ ike ha na-adịghị irè ma ọ bụ dị ize ndụ hà metụtara ihe ndị o dere?
6. Olee iwu nchịkwa ịdị ọcha dị n’Iwu Mosis sayensị ọgwụ na ahụ ike nke oge a ga-ewere n’ihe ezi uche dị na ya?
6 N’ụzọ megidere nke ahụ, Iwu Mosis gụnyere iwu nchịkwa ịdị ọcha ndị sayensị ọgwụ na ahụ ike nke oge a ga-ewere ná ndị ezi uche dị na ha. Dị ka ihe atụ, otu iwu banyere ọmụma ụlọikwuu ndị agha chọrọ ka a na-eli nsị n’ala ná mpụga ọmụma ụlọikwuu ahụ. (Deuterọnọmi 23:13) Nke a bụ usoro mgbochi ọgbara ọhụrụ magburu onwe ya. O nyere aka ịhụ na e metọghị ebe e si enweta mmiri ma nye nchebe pụọ n’ọrịa ọnyụnyụ ọbara ndị ijiji na-ekesa na ọrịa afọ ọsịsa ndị ọzọ ka na-ata isi ọtụtụ nde mmadụ kwa afọ, karịsịa n’ala ndị ka na-emepe emepe.
7. Olee iwu nchịkwa ịdị ọcha ndị dị n’Iwu Mosis nyere aka n’igbochi mgbasa nke ọrịa ndị na-efe efe?
7 Iwu Mosis ahụ nwere iwu nchịkwa ịdị ọcha ndị ọzọ nyere aka gbochie mgbasa nke ọrịa ndị na-efe efe. A na-ekewapụ onye bu ma ọ bụ onye a na-enyo enyo na o bu ọrịa na-efe efe iche. (Levitikọs 13:1-5) A ga-asa ákwà ma ọ bụ arịa ndị metụrụ anụ nwụụrụ onwe ya (ikekwe site n’ọrịa) tupu e jiri ha mee ihe ọzọ ma ọ bụ e bibie ha. (Levitikọs 11:27, 28, 32, 33) A na-ewere onye ọ bụla metụrụ ozu aka n’onye na-adịghị ọcha, ọ ghaghịkwa ịgbaso usoro ime ka a dị ọcha nke gụnyere ịsa ákwà ya na ịsa ahụ. N’ime oge ụbọchị asaa nke adịghị ọcha, ọ gaje izere imetụ ndị ọzọ ahụ.—Ọnụ Ọgụgụ 19:1-13.
8, 9. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ụkpụrụ ịdị ọcha nke Iwu Mosis bụ nke a na-amatụghị n’oge ya?
8 Ụkpụrụ ịdị ọcha a na-ekpughe amamihe ndị oge ahụ na-amaghị ma ọlị. Sayensị ọgwụ na ahụ ike nke oge a amụtawo ihe dị ukwuu banyere mgbasa na mgbochi nke ọrịa. Dị ka ihe atụ, ọganihu mmụta ọgwụ na narị afọ nke 19 dubara n’iwebata mgbochi nje—ịdị ọcha iji belata mbute ọrịa. Ihe ọ rụpụtara bụ mbelata dị ịrịba ama ná mbute ọrịa na ọnwụ nnwụchu. N’afọ 1900, afọ ndụ a na-atụ anya ya n’oge ọmụmụ n’ọtụtụ mba dị na Europe na United States erughị 50. Eri mgbe ahụ, ọ rịwo elu nke ukwuu, ọ bụghị nanị n’ihi ọganihu mmụta ọgwụ n’ịchịkwa ọrịa kamakwa n’ihi ọnọdụ ịdị ọcha na ibi ndụ ka mma.
9 Ma, ọtụtụ puku afọ tupu sayensị ọgwụ na ahụ ike amụta ụzọ dị iche iche ọrịa si agbasa, Bible nyere usoro mgbochi ndị ezi uche dị na ha dị ka ihe nchebe megide ọrịa. Ọ bụghị ihe ijuanya na Mosis pụrụ ikwu banyere ndị Israel n’ozuzu ha n’oge ya dị ka ndị na-adị ndụ afọ 70 ma ọ bụ 80. (Abụ Ọma 90:10) Olee otú Mosis pụrụ isiwo mata banyere iwu nchịkwa ịdị ọcha ndị dị otú ahụ? Bible n’onwe ya na-akọwa: “E sitekwara n’aka ndị mmụọ ozi nye” Iwu ahụ. (Ndị Galetia 3:19) Ee, Bible abụghị akwụkwọ amamihe mmadụ; ọ bụ akwụkwọ sitere n’aka Chineke.
Akwụkwọ Dị Irè Maka Ibi Ndụ n’Oge A
10. Ọ bụ ezie na e dezuru Bible ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga, gịnị bụ eziokwu banyere ndụmọdụ ya?
10 Akwụkwọ ndị na-enye okwu ndụmọdụ na-abụkarị ndị oge ha gafere, e wee dezigharịa ha ma ọ bụ dochie ha n’oge na-adịghị anya. Ma Bible pụrụ iche n’eziokwu. “Ihe àmà Gị nile kwesịrị ntụkwasị obi nke ukwuu,” ka Abụ Ọma 93:5 na-ekwu. Ọ bụ ezie na e dezuru Bible ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga, okwu ya ka dị irè. Ha na-enwekwa mmetụta hà nhata n’agbanyeghị ụcha akpụkpọ ahụ anyị ma ọ bụ mba ebe anyị bi. Tụlee ihe atụ ụfọdụ nke ndụmọdụ Bible dịịrị oge nile, ndị “kwesịrị ntụkwasị obi nke ukwuu.”
11. Ọtụtụ iri afọ gara aga, gịnị ka e dubara ọtụtụ nne na nna ikwenye banyere ọzụzụ nke ụmụaka?
11 Ọtụtụ iri afọ gara aga ọtụtụ nne na nna—n’ịbụ ndị “echiche ndị ọhụrụ” banyere ịzụ ụmụ kpaliri—chere na “ọ bụ arụ ịsị na ihe bụ arụ.” Ha tụrụ egwu na ịkpara ụmụaka ókè ga-akpata mkpasasị uche na nkụda mmụọ. Ndị ndụmọdụ nwere ezi nzube nọ na-esi ọnwụ ka ndị nne na nna kwụsị ihe ọ bụla karịrị inye ụmụ ha mgbazi olu kasị dị nro. Ọtụtụ n’ime ndị ọkachamara dị otú ahụ ugbu a “na-agba ndị nne na nna ume ka ha mesitụkwuo ihe ike, ka ha wegharakwa ike ọzọ,” ka The New York Times na-akọ.
12. Gịnị ka okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ọzụzụ” pụtara, n’ihi gịnịkwa ka ọzụzụ dị otú ahụ ji dị ụmụaka mkpa?
12 Ma, eri mgbe, Bible enyewo ndụmọdụ doro anya, nke ziri ezi n’okwu banyere inye ụmụ ọzụzụ. Ọ na-adụ ọdụ, sị: “Ndị bụ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Mkpọaha Grik a sụgharịrị ịbụ “ọzụzụ” pụtara “nzụlite, inye ọzụzụ, ntụziaka.” Bible na-asị na ọzụzụ, ma ọ bụ ntụziaka, bụ ihe àmà nke ịhụnanya ndị nne na nna. (Ilu 13:24) Ụmụaka na-eme nke ọma n’okpuru ụkpụrụ nduzi omume doro anya ndị na-enyere ha aka ịzụlite echiche nke ihe ọma na ihe ọjọọ. Ọzụzụ e nyere nke ọma na-enyere ha aka inwe mmetụta nke ịnọ ná nchebe; ọ na-agwa ha na nne na nna ha na-eche banyere ha nakwa banyere ụdị onye ha na-aghọ.—Tụlee Ilu 4:10-13.
13. (a) Mgbe a bịara n’inye ọzụzụ, olee ịdọ aka ná ntị Bible na-enye nne na nna? (b) Olee ụdị ọzụzụ Bible na-atụ aro ya?
13 Ma Bible na-adọ ndị nne na nna aka ná ntị n’okwu a bụ́ banyere ọzụzụ. Ịbụisi nne na nna ekwesịghị ịdị na-emerụ ahụ ma ọlị. (Ilu 22:15) Ọ dịghị nwatakịrị e kwesịrị ịta ahụhụ obi ọjọọ ma ọlị. Ime ihe ike anụ ahụ enweghị ọnọdụ n’ezinụlọ na-ebi ndụ kwekọrọ na Bible. (Abụ Ọma 11:5) Otú ahụkwa ka ọ dị mmeso na-aghasa uche—okwu na-agbakasị ahụ, nkatọ mgbe nile, na okwu mkparị na-agba agba, bụ́ ndị pụrụ igwepịa mmụọ nke nwatakịrị. (Tụlee Ilu 12:18.) N’amamihe, Bible na-adọ ndị nne na nna aka ná ntị, sị: “Akpasula ụmụ unu iwe, ka obi ghara ifu ha [ma ọ bụ, “unu ga-eme ka obi fuo ha kpam kpam,” Phillips].” (Ndị Kọlọsi 3:21) Bible na-atụ aro ime ihe mgbochi. Na Deuterọnọmi 11:19, a na-agba ndị nne na nna ume iji oge ntụsara ahụ kụbanye ụkpụrụ nke omume na nke ime mmụọ n’ime ụmụ ha. Ndụmọdụ dị otú a doro anya, ezi uche dị na ya banyere ịzụ ụmụ dị mkpa taa dị ka ọ dị n’oge Bible.
14, 15. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Bible si na-enye ihe karịrị nanị ndụmọdụ amamihe? (b) Nkụzi Bible dịgasị aṅaa pụrụ inyere ndị ikom na ndị inyom si n’agbụrụ na mba dị iche iche aka ile ibe ha anya dị ka ndị hà nhata?
14 Bible na-enye ihe karịrị nanị ndụmọdụ amamihe. Ozi ya na-eru n’obi. Ndị Hibru 4:12 na-asị: “Okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ọ bụla nke nwere ihu abụọ, na-adụkwa ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, ma nkwonkwo ma ụmị, bụrụkwa ihe nwere ike ịtụpụta echiche na izu nile nke obi.” Tụlee otu ihe atụ nke ike na-akpali akpali nke Bible.
15 Ihe mgbochi agbụrụ, mba, na ebo kewara ndị mmadụ taa. Mgbidi mmadụ mere dịgasị otú ahụ esowo kpata oké mgbukpọ nke ndị aka ha dị ọcha n’agha n’ụwa nile. Bible, n’aka nke ọzọ, bu nkụzi ndị na-enyere ndị ikom na ndị inyom nke agbụrụ na mba nile aka ile onwe ha anya dị ka ndị hà nhata. Dị ka ihe atụ, Ọrụ 17:26 na-ekwu na Chineke ‘sitere n’otu onye kee mba nile n’otu n’otu nke mmadụ.’ Nke ahụ na-egosi na e nwere n’ezie nanị otu agbụrụ—agbụrụ mmadụ! Bible gakwara n’ihu ịgba anyị ume ‘ịbụ ndị na-eṅomi Chineke,’ onye ọ na-ekwu banyere ya, sị: “[Ọ dịghị] ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.” (Ndị Efesọs 5:1; Ọrụ 10:34, 35) Nye ndị na-achọ n’ezie ibi ndụ kwekọrọ ná nkụzi Bible, ihe ọmụma a nwere mmetụta na-ejikọta ejikọta. Ọ na-arụ ọrụ n’ebe mikarịsịrị emi—n’ime obi—na-agbaze ihe mgbochi ndị mmadụ guzobere bụ́ ndị na-ekewa ndị mmadụ. Ọ̀ dị irè n’ezie n’ụwa nke taa?
16. Kọọ otu ahụmahụ na-egosi na Ndịàmà Jehova bụ ezi òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ.
16 N’ezie ọ dị! A ma Ndịàmà Jehova nke ọma maka òtù ụmụnna ha zuru ụwa ọnụ, nke na-ejikọta ndị nwere nzụlite dịgasị iche iche bụ́ ndị na-agaraghị n’onwe ha esoro ibe ha nọrọ n’udo. N’oge ọgụ agbụrụ na Rwanda, dị ka ihe atụ, Ndịàmà Jehova nke agbụrụ nke ọ bụla chebere ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst bụ́ ndị agbụrụ nke ọzọ, na-etinye ndụ nke ha n’ihe ize ndụ ka ha na-eme ya. N’otu ọnọdụ, Onyeàmà bụ́ onye Hutu zoro otu ezinụlọ dị mmadụ isii bụ́ ndị Tutsi si n’ọgbakọ ya n’ụlọ ya. Ọ bụ ihe mwute na e mesịrị chọta ezinụlọ ndị Tutsi ahụ ma gbuo ha. Nwanna ahụ bụ́ onye Hutu na ezinụlọ ya cheziri ọnụma ndị ogbu ọchụ ahụ ihu, ha aghaghịkwa ịgbalaga Tanzania. A kọrọ ọtụtụ ihe atụ yiri nke a. Ndịàmà Jehova na-ekwere ngwa ngwa na ịdị n’otu dị otú ahụ kwere omume n’ihi na ike na-akpali akpali nke ozi Bible emetụwo obi ha n’ụzọ miri emi. Na Bible pụrụ ijikọta ndị mmadụ n’ụwa nke a jupụtara na mkpọrọmasị bụ ihe akaebe dị ike na o sitere n’aka Chineke.
Akwụkwọ nke Ezi Amụma
17. Olee otú amụma Bible na-esighị dị ka ihe ndị mmadụ kwuru ga-eme n’ọdịnihu?
17 “Ọ dịghị amụma ọ bụla n’ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ nke mmadụ pụrụ ịkọ isi ya site na nanị uche nke aka ya,” ka 2 Pita 1:20 na-ekwu. Ndị amụma Bible enyochaghị otú ihe si na-aga n’ụwa dịnụ wee kọọ nkọ sitere n’ọgụgụ isi dabere ná nkọwa nke ha nke ihe omume ndị a. Ha ekwughịkwanụ okwu ndị na-edoghị anya bụ́ ndị a pụrụ ime ka ha kwekọọ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe ọ bụla mere n’ọdịnihu. Ka anyị tụlee, dị ka ihe atụ, otu amụma Bible kpọrọ okwu aha n’ụzọ dị ịrịba ama na nke buru amụma kpọmkwem ihe dị iche n’ihe ndị dị ndụ mgbe ahụ pụrụ ịtụwo anya ya.
18. Gịnị ka o doro anya mere ndị Babilọn oge ochie ji chee na ha nọ nnọọ ná nchebe, ma gịnị ka Aịsaịa buru n’amụma banyere Babilọn?
18 Ka ọ na-erule narị afọ nke asaa T.O.A., Babilọn bụ isi obodo yiri ka a pụghị imeri ya emeri nke Alaeze Ukwu Babilọn. Obodo ahụ nọ n’akụkụ abụọ nke Osimiri Yufretis, e jikwa mmiri osimiri ahụ wuo ékpè miri emi na njikọ nke ọwa mmiri. E jikwa nnukwute usoro mgbidi abụọ, ndị e ji ọtụtụ ụlọ elu nchebe wusie ike, chebe obodo ahụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na o yiri ndị bi na Babilọn ka ha nọ ná nchebe. Ka o sina dị, na narị afọ nke asatọ T.O.A., ọbụna tupu Babilọn etoruo ebube ya kasịnụ, Aịsaịa onye amụma buru amụma, sị: “Babilọn . . . ga-adị ka mgbe Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra. Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi; a gaghị ebikwa n’ime ya ruo ọgbọ nile: onye Arebia agaghị amakwa ụlọikwuu ya n’ebe ahụ; ndị ọzụzụ atụrụ agaghị emekwa ka atụrụ ha makpuo n’ebe ahụ.” (Aịsaịa 13:19, 20) Rịba ama na amụma ahụ bu ụzọ kwuo na ọ bụghị nanị na a ga-ebibi Babilọn kamakwa na ọ gaghị abụkwa ebe obibi ruo mgbe ebighị ebi. Lee iji anyaike kwuo ihe ga-eme n’ọdịnihu ọ bụ! Aịsaịa ọ̀ pụrụ idewo amụma ya mgbe ọ hụsịworo ntọgbọrọ n’efu nke Babilọn? Akụkọ ihe mere eme na-aza mba!
19. N’ihi gịnị ka amụma Aịsaịa ji ghara imezucha n’October 5, 539 T.O.A.?
19 N’anyasị nke October 5, 539 T.O.A., Babilọn dara n’aka ndị agha Medo-Peasia n’okpuru Saịrọs Onye Ukwu. Otú ọ dị, amụma Aịsaịa emezuchaghị n’oge ahụ. Mgbe Saịrọs weresịịrị ya, Babilọn ndị mmadụ bi—ọ bụ ezie na ọ bụ nke na-adịchaghị ike—dịgidere ruo ọtụtụ narị afọ. Na narị afọ nke abụọ T.O.A., ihe dị ka n’oge e depụtaghachiri Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ ahụ nke Aịsaịa, ndị Patia weghaara Babilọn, bụ́ nke a na-ele anya n’oge ahụ dị ka ihe nrite nke mba ndị dị gburugburu na-alụrụ ọgụ. Onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus kọrọ na “ọnụ ọgụgụ dị ukwuu” nke ndị Juu bi n’ebe ahụ na narị afọ mbụ T.O.A. Dị ka akwụkwọ The Cambridge Ancient History na-ekwu, ndị ahịa si Palmyra guzobere otu ógbè azụmahịa na-aga n’ihu na Babilọn na 24 O.A. Ya mere, rute na narị afọ mbụ O.A., Babilọn atọgbọrọbeghị n’efu kpam kpam; ma e dezuwo akwụkwọ Aịsaịa ogologo oge tupu mgbe ahụ.—1 Pita 5:13.
20. Olee ihe àmà e nwere na Babilọn mesịrị ghọọ “obo ihe obo ihe”?
20 Aịsaịa anọgideghị ndụ hụ ka Babilọn na-enweghị onye obibi. Ma n’imezu amụma, Babilọn mesịrị ghọọ “obo ihe obo ihe.” (Jeremaịa 51:37) Dị ka ọkà mmụta bụ́ onye Hibru bụ́ Jerome (onye a mụrụ na narị afọ nke anọ O.A.) kwuru, ka ọ na-erule ụbọchị ya Babilọn aghọọla ebe ịchụ nta bụ́ ebe “ụdị anụ ọhịa nile” na-awagharị, ọ ka tọgbọkwa n’efu ruo taa. Mwughachi ọ bụla nke Babilọn dị ka ihe ndọrọ ndị nleta pụrụ ịrata ndị ọbịa, ma “ụmụ na ụmụ ụmụ” Babilọn efunyụwo anya, dị ka Aịsaịa buru n’amụma.—Aịsaịa 14:22.
21. N’ihi gịnị ka ndị amụma kwesịrị ntụkwasị obi ji nwee ike ikwu ọdịnihu n’izi ezi n’ehieghị ụzọ?
21 Aịsaịa onye amụma akọghị nkọ sitere n’ọgụgụ isi. O degharịghịkwanụ akụkọ ihe mere eme iji mee ka o yie amụma. Aịsaịa bụ ezi onye amụma. Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị amụma nile ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi nke Bible. N’ihi gịnị ka ndị ikom a ji nwee ike ime ihe ọ na-adịghị mmadụ ọzọ pụrụ ime—ịkọ ọdịnihu n’izi ezi n’ehieghị ụzọ? Azịza ya doro anya. Amụma ndị ahụ sitere n’ọnụ Chineke nke amụma, bụ́ Jehova, “[Onye] na-egosi ikpeazụ site na mbụ.”—Aịsaịa 46:10.
22. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji gbaa ndị nwere obi eziokwu ume inyocha Bible n’onwe ha?
22 Ya mere Bible ò kwesịrị nnyocha? Anyị maara na o kwesịrị! Ma ọtụtụ ndị ekwenyeghị. Ha ekpebiwo echiche ha banyere Bible ọ bụ ezie na ikekwe ha agụtụbeghị ya. Cheta prọfesọ ahụ a kpọtụrụ uche ná mmalite isiokwu bu ụzọ. O kwetara inwe ọmụmụ Bible, mgbe o jisịkwara nlezianya nyochaa Bible, ọ bịara ná nkwubi okwu bụ́ na ọ bụ akwụkwọ sitere n’aka Chineke. O mesịrị bụrụ onye e mere baptism dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, taakwa ọ na-eje ozi dị ka onye okenye! Ka anyị mee ike anyị nile iji gbaa ndị nwere obi eziokwu ume inyochara onwe ha Bible wee kpebie echiche ha banyere ya. Obi siri anyị ike na ọ bụrụ na ha emee nnyocha n’onwe ha site n’obi eziokwu, ha ga-abịa ghọta na akwụkwọ a pụrụ iche, bụ́ Bible, bụ n’ezie akwụkwọ dịịrị mmadụ nile!
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Olee otú ị pụrụ isi jiri Iwu Mosis gosi na Bible esiteghị n’aka mmadụ?
◻ Olee ụkpụrụ Bible kwesịrị oge nile bụ́ ndị dị irè maka ibi ndụ n’oge a?
◻ N’ihi gịnị ka amụma dị n’Aịsaịa 13:19, 20 na-apụghị iji bụrụ nke e dere mgbe ihe mesịworo?
◻ Gịnị ka anyị kwesịrị ịgba ndị nwere obi eziokwu ume ime, n’ihi gịnịkwa?
[Igbe dị na peeji nke 19]
Gịnị Banyere Ihe A Na-apụghị Ịnwapụta?
Bible nwere okwu dị iche iche na-enweghị ihe àmà a na-ahụ anya kwụụrụ onwe ha. Dị ka ihe atụ, a pụghị iji sayensị nwapụta—ma ọ bụ gbaghaa—ihe ọ na-ekwu banyere ógbè a na-adịghị ahụ anya ebe ndị bụ mmụọ e kere eke bi. Izo aka ndị dị otú ahụ a na-apụghị ịnwapụta hà na-eme ka Bible na sayensị ghara ikwekọ?
Nke a bụ ajụjụ na-eche otu ọkà mmụta ọdịdị mbara ụwa bụ́ onye malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible afọ ole na ole gara aga ihu. “Aghaghị m ikweta na ịnakwere Bible siiri m ike na mbụ n’ihi na apụghị m iji sayensị nwapụta okwu Bible ụfọdụ,” ka ọ na-echeta. Nwoke a nwere obi eziokwu nọgidere na-amụ Bible ma mesịa kwenye na ihe àmà e nwere na-egosi na ọ bụ Okwu Chineke. “Nke a belatara oké ọchịchọ m ịhụ na a nwapụtara eziokwu Bible ọ bụla n’onwe ya,” ka ọ na-akọwa. “Onye na-echekarị echiche n’ụzọ nkà sayensị aghaghị ịdị njikere inyocha Bible site n’ụzọ nke ime mmụọ, ma ọ bụghị ya ọ gaghị anabata eziokwu ma ọlị. A pụghị ịtụ anya ka sayensị nwapụta okwu ọ bụla dị na Bible. Ma nanị n’ihi na a pụghị ịnwapụta okwu ụfọdụ apụtaghị na ha abụghị eziokwu. Ihe dị mkpa bụ na n’ebe ọ bụla o kwere nnwapụta, a na-akwado izi ezi nke Bible.”
[Foto dị na peeji nke 17]
Mosis dekọrọ iwu nchịkwa ịdị ọcha ndị a na-amatụghị n’oge ya