Isi nke 12
“Jidesie Ihe I Nwere Ike”
FILADELFỊA
1. Ọgbakọ dị n’obodo dị aṅaa ka e zigaara ozi nke isii nke Jisọs, gịnịkwa ka aha obodo ahụ pụtara?
ỊHỤNANYA ỤMỤNNA—lee nnọọ àgwà a na-achọsi ike ọ bụ! Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ nke a ka Jisọs bu n’uche mgbe ọ na-ezi ozi nke isii ya, bụ́ nke e zijeere ọgbakọ dị na Filadelfịa, n’ihi na aha ahụ pụtara “Ịhụnanya Ụmụnna.” Jọn ahụ meworo agadi ka chetara oge ahụ, ihe karịrị 60 afọ tupu mgbe ahụ, mgbe Pita kwusiri ike ugbo atọ gwa Jisọs na ya onwe ya, bụ́ Pita, nwere ezi ịhụnanya n’ebe Onyenwe ya nọ. (Jọn 21:15-17) Ndị Kraịst ndị a nọ na Filadelfịa, hà na-egosikwa ịhụnanya ụmụnna? Ihe àmà gosiri na ha na-eme otú ahụ!
2. Obodo dị aṅaa ka Filadelfịa bụ, ụdị ọgbakọ dị aṅaa dị n’ebe ahụ, gịnịkwa ka Jisọs gwara mmụọ ozi nke ọgbakọ a?
2 Filadelfịa nke dị n’oge Jọn bụ obodo ihe na-agara nnọọ nke ọma, nke dị ihe dị ka 50 kilomita na ndịda ọwụwa anyanwụ nke Sadis (ebe e nwere obodo Alasehir nke oge a nke dị na Turkey). Otú ọ dị, ihe e ji mara ya karị bụ ihe ịga nke ọma nke ọgbakọ ndị Kraịst dị n’ebe ahụ. Ha aghaghị ijiworị oké ọṅụ nata onye ahụ na-eje ozi nke pụrụ isiworị ụzọ Sadis bịakwute ha! Ozi ahụ o wetaara ha nyere ndụmọdụ na-akpali akpali. Ma o bu ụzọ kọwapụta ikike nke Onye Zitere ya. Ọ sịrị: “Degakwara mmụọ ozi nke nzukọ Kraịst dị na Filadelfịa akwụkwọ, sị, Ihe ndị a ka ọ na-ekwu, bụ́ onye dị nsọ, onye eziokwu, onye nwere mkpịsị ugodi nke Devid, onye na-emeghe, ọ dịghịkwa onye ọ bụla ga-emechi, onye na-emechikwa, ọ dịghịkwa onye ọ bụla na-emeghe.”—Mkpughe 3:7.
3. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ịkpọ Jisọs “onye dị nsọ,” oleekwa ụzọ a pụrụ isi kwuo na ọ bụ “onye eziokwu”?
3 Jọn anụworị mgbe Pita gwara nwoke ahụ bụ Jisọs Kraịst, sị: “I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi. Ọzọ, anyị onwe anyị ekwerewo marakwa na gị onwe gị bụ Onye Nsọ ahụ nke Chineke.” (Jọn 6:68, 69) Ebe Jehova Chineke bụ ịdị nsọ n’onwe ya, Ọkpara ọ mụrụ nanị ya aghaghịkwa ‘ịdị nsọ.’ (Mkpughe 4:8) Jisọs bụkwa “onye eziokwu.” Okwu Grik e ji mee ihe n’ebe a (a·le·thi·nosʹ) na-egosi izi ezi. N’echiche nke a, Jisọs bụ ìhè ahụ bụ ezie na ezi achịcha ahụ nke si n’eluigwe rịdata. (Jọn 1:9; 6:32) Ọ bụ ezi vine ahụ. (Jọn 15:1) Jisọs bụkwa onye eziokwu n’echiche ahụ nke bụ na ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ọ na-ekwu eziokwu mgbe nile. (Lee Jọn 8:14, 17, 26.) Ọkpara Chineke nke a ruru eru n’ezie ije ozi dị ka Eze na Onyeikpe.—Mkpughe 19:11, 16.
“Mkpịsị Ugodi nke Devid”
4, 5. Ọgbụgba ndụ dị aṅaa ka e jikọtara ya na “mkpịsị ugodi nke Devid”?
4 Jisọs nwere “mkpịsị ugodi nke Devid.” N’iji ya eme ihe, ọ “na-emeghe, ọ dịghịkwa onye ọ bụla ga-emechi, na-emechikwa, ọ dịghịkwa onye ọ bụla na-emeghe.” Gịnị bụ “mkpịsị ugodi nke Devid” nke a?
5 Ọ bụ Eze Devid nke Israel ka Jehova soro banye n’ọgbụgba ndụ maka alaeze ga-adịru mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 89:1-4, 34-37) Ezinụlọ Devid nọdụrụ n’ocheeze Jehova dị na Jerusalem na-achị achị site na 1070 ruo 607 T.O.A., ma n’oge ahụ, e mezuru ihe Chineke kpere n’ikpe megide alaeze ahụ n’ihi na ọ dabara ná mmebi iwu. Jehova si otú ahụ malite imezu amụma ya nke dị n’Ezikiel 21:27: “Mkpu ihu, mkpu ihu, mkpu ihu ka m ga-ekpu ya [Jerusalem elu ala]: nke a kwa [mkpanaka nke ọbụbụeze dị n’usoro ọmụmụ Devid], ọ gaghị adị ruo mgbe ọ ga-abịa, bụ́ onye ahụ o ruru aka; m ga-ewerekwa ya nye ya.”
6, 7. Olee mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka “onye o ruru aka” ga-esi bịa?
6 Olee mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka onye “ahụ o ruru aka” ga-apụta? N’ụzọ dị aṅaa ka a ga-esi nye ya mkpanaka nke alaeze Devid?
7 Mgbe ihe dị ka 600 afọ gasịrị, otu onye si n’usoro ọmụmụ Eze Devid, bụ́ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ onye Juu ahụ bụ Meri, tụụrụ ime site n’ike mmụọ nsọ. Chineke zijere mmụọ ozi bụ Gebriel ịkọrọ Meri na ọ gaje ịmụ nwa nwoke nke a ga-akpọ aha ya Jisọs. Gebriel kwukwara, sị: “Nwa nwoke ahụ ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kachasị Ihe Nile Elu: Onyenwe anyị Chineke ga-enyekwa ya ocheeze nna ya Devid: ọ ga-abụkwa eze ụlọ Jekọb ruo mgbe nile ebighị ebi; alaeze ya agaghị agwụkwa agwụ.”—Luk 1:31-33.
8. Olee otú Jisọs si gosi onwe ya onye ruru eru iketa ọbụbụeze Devid?
8 Mgbe e mere Jisọs baptism n’Osimiri Jọdan, teekwa ya mmanụ n’afọ 29 O.A., ọ ghọrọ Onye A Họpụtara ịbụ Eze n’usoro ọmụmụ Devid. O gosipụtara ịnụ ọkụ n’obi bụ ezi ihe nlereanya n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ, nyekwa ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ime nkwusa dị otú ahụ. (Matiu 4:23; 10:7, 11) Jisọs wedara onwe ya ala ọbụna ruo ọnwụ n’elu osisi ịta ahụhụ, wee si otú a na-egosipụta onwe ya ịbụ onye ruru eru ịnata ọbụbụeze ahụ dị n’usoro ọmụmụ Devid. Jehova kpọlitere Jisọs n’ọnwụ dị ka mmụọ na-adịghị anwụ anwụ wee bulie ya elu gaa n’aka nri nke Ya onwe ya n’eluigwe. N’ebe ahụ ka ọ nọ nata ikike na ihe ùgwù nile nke alaeze Devid. Mgbe oge ya ruru, Jisọs ga-eji ike ya mee ihe ‘inwe mmeri n’ahụ mmadụ n’etiti ndị iro ya.’—Abụ Ọma 110:1, 2; Ndị Filipaị 2:8, 9; Ndị Hibru 10:13, 14.
9. N’ụzọ dị aṅaa ka o si bụrụ na Jisọs na-eji mkpịsị ugodi nke Devid na-emeghe, na-emechikwa?
9 Tupu oge ahụ, Jisọs aghaghị iji mkpịsị ugodi nke Devid mee ihe imeghe ohere na ihe ùgwù ndị e jikọtara ha na Alaeze Chineke. Site n’aka Jisọs, Jehova ga-azọpụta ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’elu ala ugbu a site “n’ike nke ọchịchịrị,” wee kpọba ha “n’alaeze nke Ọkpara nke ịhụnanya ya.” (Ndị Kọlọsi 1:13, 14) A ga-ejikwa mkpịsị ugodi ahụ mee ihe n’ịkpọchi ihe ùgwù ndị dị otú ahụ ka onye ọ bụla nke dabara n’ekwesịghị ntụkwasị obi ghara inweta ha. (2 Timoti 2:12, 13) Ebe onye nketa nke a na-adịgide adịgide nke alaeze Devid nwere nkwado Jehova, ọ dịghị ihe ọ bụla e kere eke pụrụ igbochi ya ịrụzu ọrụ ya nile.—Tụlee Matiu 28:18-20.
10. Agbamume dị aṅaa ka Jisọs nyere ọgbakọ ahụ dị na Filadelfịa?
10 Ebe ha sitere n’ọnụ onye nwere ike otú a, okwu Jisọs gwara ndị Kraịst nọ na Filadelfịa aghaghị ịbụ ihe agbamume pụrụ iche! Ọ jara ha mma, na-asị: “Amatara m ọrụ gị nile (lee, enyewo m gị ọnụ ụzọ nke e megheworo n’ihu gị, nke onye ọ bụla na-apụghị imechi), na i nwere ike nta, i debekwara okwu m, ị gọnarịghịkwa aha m.” (Mkpughe 3:8) Ọgbakọ ahụ anọwo na-arụsi ọrụ ike, e meghewokwa otu ọnụ ụzọ n’ihu ya—nke ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ bụ ọnụ ụzọ nke na-eduba n’ohere nke ije ozi dị ka ndị na-eje ozi. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 16:9; 2 Ndị Kọrint 2:12.) N’ihi nke a, Jisọs gbara ndị okenye ahụ ume ijiri ohere ahụ mee ihe n’ụzọ zuru ezu ikwusa ozi ọma. Ha enwewo ntachi obi, gosikwa na ha nwere ike zuru ezu, site n’enyemaka nke mmụọ Chineke, ịnọgide na-arụ “ọrụ” ndị ọzọ n’ozi Jehova. (2 Ndị Kọrint 12:10; Zekaraịa 4:6) Ha erubewo isi n’iwu nile nke Jisọs, ha agọnarịghịkwa Kraịst, site n’okwu ọnụ ma ọ bụ n’omume ha.
“Ha Ga-akpọ Isiala nye Gị”
11. Ngọzi dị aṅaa ka Jisọs kwere ndị Kraịst ahụ ná nkwa, è sikwa aṅaa nweta nke a?
11 N’ihi nke a, Jisọs kwere ha nkwa ịmịpụta mkpụrụ: “Lee, ana m enye ụfọdụ n’ime ụlọ nzukọ ahụ nke Setan, n’ime ndị sị na ha bụ ndị Juu, ma ha abụghị, kama ha na-ekwu okwu ụgha; lee, m ga-eme ka ha bịa kpọọ isiala n’ihu ụkwụ gị, ka ha marakwa na mụ onwe m hụrụ gị n’anya.” (Mkpughe 3:9) Ma eleghị anya, dị ka ọ dị na Smụana, ọgbakọ ahụ na-enwe nsogbu site n’aka ndị Juu bi n’ógbè ahụ. Jisọs kpọrọ ndị a “ụlọ nzukọ ahụ nke Setan.” Ma n’agbanyeghị nke a, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ụfọdụ n’ime ndị Juu ahụ gaje ịghọta n’oge na-adịghị anya na ihe ndị Kraịst ahụ nọworo na-ekwusa banyere Jisọs bụ eziokwu. O yiri ka ha ‘ịkpọ isiala’ ga-abụworị n’ụzọ ahụ Pọl kọwara ná 1 Ndị Kọrint 14:24, 25, nke mere na ha ga-echegharị n’ezie wee ghọọ ndị Kraịst, na-aghọtazu ịhụnanya dị ukwuu Jisọs nwere n’ịtọgbọ ọbụna ndụ ya maka ndị na-eso ụzọ ya.—Jọn 15:12, 13.
12. N’ihi gịnị ka ọ ga-eji ju ndị so n’ụlọ nzukọ ndị Juu ahụ dị na Filadelfịa anya ịmata na ụfọdụ n’ime ha ‘ga-akpọ isiala’ nye ìgwè ndị Kraịst nọ n’obodo ahụ?
12 O yiri ka ndị so n’ụlọ nzukọ ndị Juu dị na Filadelfịa gaje inwe ihe ijuanya ịmata na ụfọdụ n’ime ha gaje ‘ịkpọ isiala’ nye òtù ndị Kraịst nọ n’ógbè ha. N’ihi eziokwu ahụ bụ na a ghaghị inweworị ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Juu n’ọgbakọ ahụ, ha ga-atụ anya na ọ bụ nnọọ ihe megidere nke a gaje ime. N’ihi gịnị? N’ihi na Aịsaịa buru amụma, sị: “Ndị eze [na-abụghị ndị Juu] ga-abụkwa nna na-azụ ụmụ gị [ndị Israel], ndị eze nwanyị ha ga-abụkwa ndị inyom na-enye ụmụ gị ara: ha ga-akpọ isiala nye gị, kpuo ihu ha n’ala.” (Aịsaịa 49:23; 45:14; 60:14) N’otu aka ahụ, a kpalikwara Zekaraịa ide, sị: “Na mgbe ahụ ka ndị ikom iri [na-abụghị ndị Juu] ga-esi n’asụsụ nile nke mba nile jide, ọbụna ijide ọnụ ọnụ ala uwe nwoke bụ onye Juu, sị, Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.” (Zekaraịa 8:23) Ee, ndị na-abụghị ndị Juu gaje ịkpọ isiala nye ndị Juu, ọ bụghị ndị Juu ịkpọ isiala nye ha!
13. Olee ndị bụ ndị Juu ahụ ga-ahụ mmezu nke amụma ndị ahụ e buuru Israel oge ochie?
13 Ọ bụ mba Chineke họpụtara ka e buuru amụma ndị ahụ. Mgbe e buru ha, Israel nọ n’ọnọdụ ahụ dị ùgwù. Ma mgbe mba ndị Juu jụrụ Mesaịa ahụ, Jehova chụpụrụ ha. (Matiu 15:3-9; 21:42, 43; Luk 12:32; Jọn 1:10, 11) Na Pentikọst nke 33 O.A., ọ họpụtara dị ka ndị ga-anọchi anya ha, ezi Israel nke Chineke ahụ, bụ́ ọgbakọ ndị Kraịst. Ndị nọ n’ime ya bụ ndị Juu ime mmụọ ndị e biri úgwù n’ezie n’obi ha. (Ọrụ 2:1-4, 41, 42; Ndị Rom 2:28, 29; Ndị Galetia 6:16) Mgbe nke a gasịrị, nanị ụzọ ndị Juu anụ ahụ pụrụ isi bịaghachi n’ọnọdụ dị mma nke ha na Jehova bụ site n’inwe okwukwe na Jisọs dị ka Mesaịa ahụ. (Matiu 23:37-39) Ihe àmà gosiri na nke a gaje ime n’ebe mmadụ ụfọdụ nọ na Filadelfịa nọ.a
14. N’ụzọ dị aṅaa ka Aịsaịa 49:23 na Zekaraịa 8:23 siworo nwee mmezu pụtara ìhè n’oge anyị a?
14 N’oge anyị a, amụma ndị dị ka Aịsaịa 49:23 na Zekaraịa 8:23 enwewo nnọọ mmezu pụtara ìhè. Dị ka ihe si n’ọrụ nkwusa nke òtù Jọn ahụ, ọnụ ọgụgụ mmadụ dị ukwuu abanyewo site n’ọnụ ụzọ ahụ e megheworo gaa n’ọrụ Alaeze.b Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị a esiwo na Krisendọm pụta, bụ́ nke okpukpe ya nile na-eme nzọrọ na-abụghị eziokwu na ha bụ Israel ime mmụọ. (Tụlee Ndị Rom 9:6.) Ndị a, dị ka oké ìgwè mmadụ, sara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha site n’inwe okwukwe n’ọbara Jisọs ji chụọ àjà. (Mkpughe 7:9, 10, 14) Site n’irubere ọchịchị Alaeze Kraịst isi, ha nwere olileanya ịnata ngọzi ya n’elu ala ebe a. Ha na-abịakwute ụmụnna Jisọs ndị e tere mmanụ, ‘na-akpọkwa isi ala’ nye ha n’ụzọ ime mmụọ, n’ihi na ‘ha anụwo na Chineke nọnyeere ha.’ Ha na-ejere ndị a e tere mmanụ ozi, bụ́ ndị a na-ejikọta ha na ha dị ka otu òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ.—Matiu 25:34-40; 1 Pita 5:9.
“Oge Hour nke Ọnwụnwa Ahụ”
15. (a) Gịnị ka Jisọs kwere ná nkwa nye ndị Kraịst ahụ nọ na Filadelfịa, gịnị ka a gbakwara ha ume ime? (b) “Okpueze” dị aṅaa ka ndị Kraịst ahụ na-enwe olileanya ịnata?
15 Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “N’ihi na i debere okwu nke ntachi obi m, mụ onwe m ga-edebekwa gị ka ị ghara ịba n’oge hour nke ọnwụnwa ahụ, bụ́ oge hour nke gaje ịbịakwasị elu ụwa dum mmadụ bi, ịnwa ndị bi n’elu ụwa. Ana m abịa ọsọ ọsọ: jidesie ihe i nwere ike, ka onye ọ bụla ghara ịnara okpueze gị.” (Mkpughe 3:10, 11) Ọ bụ ezie na ndị Kraịst ndị nọ n’oge Jọn agaghị adị ndụ ruo ụbọchị Onyenwe anyị (nke malitere na 1914), olileanya siri ike ha nwere na Jisọs gaje ịbịa ga-enye ha ike ịnọgide na-ekwusa ozi ọma. (Mkpughe 1:10; 2 Timoti 4:2) “Okpueze” ahụ, ma ọ bụ ihe mgbata n’ọsọ nke ndụ ebighị ebi, na-echere ha n’eluigwe. (Jemes 1:12; Mkpughe 11:18) Ọ bụrụ na ha ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, ọ dịghị onye pụrụ ịnapụ ha ụgwọ ọrụ ahụ.—Mkpughe 2:10.
16, 17. (a) Gịnị bụ “oge hour nke ọnwụnwa ahụ, bụ́ oge hour nke gaje ịbịakwasị elu ụwa dum mmadụ bi”? (b) Gịnị bụ ọnọdụ nke ndị ahụ e tere mmanụ ná mmalite nke “oge hour nke ọnwụnwa ahụ”?
16 Ma, gịnị bụ ‘oge hour nke ọnwụnwa ahụ’? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị Kraịst ahụ nọ n’Esia nagidere oké ntiwapụ ọzọ nke ajọ mkpagbu site n’aka ndị ọchịchị aka ike nke Rom.c Ma, mmezu ya bụ isi bụ oge hour nke myọcha na ikpe ikpe nke bịara n’ikpeazụ n’ime ụbọchị Onyenwe anyị ahụ, nke ruru mmezu malite na 1918 gaa n’ihu. Ọnwụnwa ahụ bụ iji chọpụta ma mmadụ ọ̀ dịịrị Alaeze Chineke e guzobeworo ma ọ bụ na ọ dịịrị ụwa nke Setan. Ọ ga-adịru nwa oge, otu “hour,” ma ọ gabigabeghị. Ruo mgbe ọ gabigara, anyị ekwesịghị ichefu na anyị na-ebi “n’oge hour nke ọnwụnwa ahụ.”—Luk 21:34-36.
17 Na 1918, òtù Jọn nke ndị Kraịst e tere mmanụ—dị ka ọgbakọ ahụ kwụsiri ike nke dị na Filadelfịa—chere nsogbu dị iche iche ihu site n’aka ‘ụlọ nzukọ nke Setan’ nke oge a. Ndị ndú okpukpe nke Krisendọm, bụ́ ndị na-azọrọ na ha bụ ndị Juu ime mmụọ, ji aghụghọ rara ndị ọchịchị gaa n’ịkpagbu ezi ndị Kraịst ahụ. Ma n’agbanyeghị nke a, ha anọwo na-agbalịsi ike ‘idebe okwu ntachi obi nke Jisọs’; n’ihi ya, site n’enyemaka ime mmụọ, bụ́ “ike nta” a hụrụ anya, ha gabigara oge ahụ, e wee kpaliekwa ha ịbanye n’ọnụ ụzọ ahụ nke ghere oghe ugbu a n’ihu ha. N’ụzọ dị aṅaa?
“Ọnụ Ụzọ nke E Megheworo”
18. Nhọpụta dị aṅaa ka Jisọs mere na 1919, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka onye ahụ a họpụtara si si otú a yie onye ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nke na-ejere Hezekaịa ozi?
18 Na 1919, Jisọs mezuru nkwa ya, matakwa òtù nta ahụ nke ezi ndị Kraịst e tere mmanụ dị ka “ohu [ya] kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Ndị a banyere n’ihe ùgwù nke yiri nke ahụ onye oje ozi ahụ kwesịrị ntụkwasị obi n’oge Eze Hezekaịa, bụ Elaịakim nwere.d Jehova kwuru banyere Elaịakim, sị: “M ga-atụkwasịkwa mkpịsị ugodi ụlọ Devid n’ubu ya; o wee meghee, ọ dịghịkwa onye na-emechi; o wee mechie, ọ dịghịkwa onye na-emeghe.” Elaịakim buuru Hezekaịa, bụ́ nwa nke eze Devid, nnukwu ibu ọrụ dị iche iche. Otú ahụkwa taa, a tụkwasịwo “mkpịsị ugodi ụlọ Devid” n’ubu òtù Jọn ahụ e tere mmanụ n’echiche nke bụ na e jiriwo ntụkwasị obi nyefee ya ọdịmma elu ala nile nke Alaeze Mesaịa ahụ. Jehova ewusiwo ndị ohu ya ike maka ihe ùgwù nke a, na-akwalite ike nta ha ịghọ ike dị ukwuu nke ga-ezu iji gbaa oké àmà n’ụwa nile.—Aịsaịa 22:20, 22; 40:29.
19. Olee otú òtù Jọn ahụ si rụzuo ibu ọrụ ndị Jisọs nyere ya na 1919, gịnị sikwa n’ime ya pụta?
19 Site 1919 gaa n’ihu, ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ, n’ịgbaso ihe nlereanya Jisọs, malitere ime oké mkpọsa n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. (Matiu 4:17; Ndị Rom 10:18) Dị ka ihe si na nke a pụta, ụfọdụ ndị nọ n’ime ụlọ nzukọ Setan nke oge a, bụ́ Krisendọm, bịakwutere ihe a fọdụrụ e tere mmanụ, chegharịa, wee ‘kpọọ isiala,’ na-anakwere ikike nke ohu ahụ nwere. Ha onwe ha bịakwara sonyere ndị meworo okenye karị n’òtù Jọn ahụ n’ijere Jehova ozi. Nke a nọgidere na-aga n’ihu ruo mgbe a chịkọtazuru ọnụ ọgụgụ nke ụmụnna Jisọs e tere mmanụ. Mgbe nke a gasịrị, “oké ìgwè mmadụ . . . ndị si ná mba nile ọ bụla” bịara ‘ịkpọ isiala’ nye ohu ahụ e tere mmanụ. (Mkpughe 7:3, 4, 9) N’ịdị n’otu, ohu ahụ na oké ìgwè mmadụ nke a na-eje ozi dị ka otu ìgwè nke Ndịàmà Jehova.
20. N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova taa na-aghaghị iguzosi ike n’okwukwe, na-arụsikwa ọrụ ike n’ozi Chineke?
20 N’ịbụ ndị e jikọtara n’ihe nkekọ nke ezi ịhụnanya ụmụnna dị ka ndị Kraịst ahụ nọ na Filadelfịa, Ndịàmà Jehova taa ghọtara na a ghaghị ịrụ ọrụ nkwusa ha ngwa ngwa. N’oge na-adịghị anya, oké mkpagbu ahụ ga-abịakwasị ụwa ajọ omume nke Setan. N’oge ahụ, ka ọ bụrụkwa na a ga-ahụ onye ọ bụla n’ime anyị dị ka ndị guzosiri ike n’okwukwe, na-arụsikwa ọrụ ike n’ozi Chineke ka e wee ghara ihichapụ aha anyị n’akwụkwọ ndụ nke Jehova. (Mkpughe 7:14) Ka anyị jiri ndụmọdụ Jisọs nyere ọgbakọ ahụ dị na Filadelfịa kpọrọ ihe, ka anyị wee jigidesie ihe ùgwù ije ozi nile anyị nwere ike, nwetakwa ụgwọ ọrụ ahụ nke bụ ndụ ebighị ebi.
Ngọzi nke Ndị Nwere Mmeri
21. Olee ụzọ ndị Kraịst e tere mmanụ taa siworo ‘debe okwu banyere ntachi obi Jisọs,’ olileanya dịkwa aṅaa na-echere ha?
21 Òtù Jọn ahụ nke oge a ‘edebewo okwu banyere ntachi obi Jisọs,’ nke bụ na ha agbasowo ihe nlereanya ya, nweekwa ntachi obi. (Ndị Hibru 12:2, 3; 1 Pita 2:21) N’ihi nke a, ha abụwo ndị a gbara ume nke ukwuu site n’okwu ọzọ Jisọs gwara ọgbakọ ahụ dị na Filadelfịa: “Onye na-emeri emeri, ya ka m ga-eme ka ọ bụrụ ide n’ụlọ nsọ nke Chineke m, ọ gaghị esikwa n’ebe ahụ pụọ ọzọ ma ọlị.”—Mkpughe 3:12a.
22. (a) Gịnị bụ ụlọ nsọ nke Chineke nke Jisọs? (b) Olee otú ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị nwere mmeri, ga-esi ghọọ ide n’ụlọ nsọ a?
22 Lee nnọọ ihe ùgwù ọ bụ mmadụ ịbụ ide n’ụlọ nsọ nke Jehova! Na Jerusalem oge ochie, ụlọ nsọ ahụ a na-ahụ anya bụ ebe bụ isi nke ofufe Jehova. N’ime ụlọ nsọ ahụ, onyeisi nchụàjà na-awụsa ọbara nke anụmanụ ndị ahụ e ji chụọ àjà, otu ụbọchị kwa afọ, n’ihu ọkụ ahụ na-enwu n’ụzọ ọrụ ebube, nke nọchiri anya ọnụnọ Jehova n’ime “Ebe Nsọ kachasị ebe nsọ nile.” (Ndị Hibru 9:1-7) N’oge e mere Jisọs baptism, a malitere inwe ụlọ nsọ ọzọ, oké ndokwa ime mmụọ yiri ụlọ nsọ maka ofufe Jehova. Ebe nsọ kachasị ebe nsọ nile nke ụlọ nsọ nke a dị n’eluigwe, ebe Jisọs mesịrị gosi onwe ya “n’ihu Chineke.” (Ndị Hibru 9:24) Jisọs bụ Onyeisi Nchụàjà ahụ, e nwekwara nanị otu àjà a chụrụ maka mkpuchi mmehie nile: ọbara nwoke ahụ zuru okè bụ Jisọs nke a wụpụrụ. (Ndị Hibru 7:26, 27; 9:25-28; 10:1-5, 12-14) Ruo ogologo oge ha nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi, ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’elu ala na-eje ozi dị ka ndị nchụàjà nọ n’okpuru ya, n’ogige elu ala nke ụlọ nsọ nke a. (1 Pita 2:9) Ma ozugbo ha nwere mmeri, ha onwe ha na-abanyekwa n’ebe nsọ ahụ kachasị ebe nsọ nile nke dị n’eluigwe, wee ghọọ ihe nkwado a na-apụghị ifopụ efopụ, dị ka ide, nke ndokwa ahụ yiri ụlọ nsọ nke e mere maka ife ofufe. (Ndị Hibru 10:19; Mkpughe 20:6) E nweghịkwa ihe ize ndụ na ‘ha ga-esi n’ebe ahụ pụọ ọzọ ma ọlị.’
23. (a) Nkwa dị aṅaa ka Jisọs gara n’ihu ikwe ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị nwere mmeri? (b) Gịnị si n’odide e dekwasịrị aha Jehova na aha nke Jerusalem ọhụrụ ahụ n’elu ndị Kraịst ahụ na-enwe mmeri pụta?
23 Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “M ga-edekwasịkwa ya aha Chineke m, na aha obodo Chineke m, bụ́ Jerusalem ọhụrụ, nke si n’eluigwe rịdata site n’ebe Chineke m nọ, m ga-edekwasịkwa ya aha ọhụrụ nke m.” (Mkpughe 3:12b) Ee, a na-edekwasị ndị a na-enwe mmeri aha Jehova—Chineke ha nakwa Chineke nke Jisọs. Nke a na-egosi n’ụzọ doro anya na Jehova na Jisọs bụ ndị abụọ dịrịta iche iche, na ha abụghịkwa akụkụ abụọ nke Chineke dị atọ n’ime otu, ma ọ bụ Atọ n’Ime Otu. (Jọn 14:28; 20:17) Ihe nile e kere eke aghaghị ịhụ na ndị a e tere mmanụ dịịrị Jehova. Ha bụ ndịàmà ya. E dekwasịkwara ha aha nke Jerusalem ọhụrụ ahụ, bụ́ obodo ahụ dị n’eluigwe nke si n’eluigwe rịdata n’echiche nke bụ na ọ na-eme ka ọchịchị obi ọma ya gbasaa ruo ihe nile a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi. (Mkpughe 21:9-14) Ndị Kraịst nile bụ atụrụ n’elu ala ga-esikwa otú a mara na ndị a na-emeri emeri e tere mmanụ bụ ndị Alaeze ahụ, bụ́ Jerusalem ahụ nke dị n’eluigwe.—Abụ Ọma 87:5, 6; Matiu 25:33, 34; Ndị Filipaị 3:20; Ndị Hibru 12:22.
24. Gịnị ka aha ọhụrụ nke Jisọs nọchiri anya ya, è sikwa aṅaa edekwasị ya n’elu ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị na-ekwesị ntụkwasị obi?
24 N’ikpeazụ, a na-edekwasị ndị a e tere mmanụ na-enwe mmeri aha ọhụrụ nke Jisọs. Nke a na-ezo aka n’ọkwa ọhụrụ Jisọs nwere, nakwa n’ihe ùgwù pụrụ iche ndị Jehova nyere ya. (Ndị Filipaị 2:9-11; Mkpughe 19:12) Ọ dịghị onye ọzọ ga-amara aha ahụ, n’echiche nke bụ na ọ dịghị onye ọzọ na-enwe ahụmahụ ndị ahụ ma ọ bụ onye e nyere ihe ùgwù ndị ahụ. Otú ọ dị, mgbe Jisọs dekwasịrị aha ya n’elu ụmụnna ya ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ha na ya na-amalite inwe mmekọrịta chiri anya n’ime eluigwe ebe ahụ, ọbụnakwa na-ekerịta ihe ùgwù ya nile. (Luk 22:29, 30) Ọ bụghị ihe ijuanya na Jisọs na-emechi ozi o zigaara ndị ahụ e tere mmanụ site n’ikwughachi okwu agbamume ahụ, sị: “Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa nzukọ Kraịst.”—Mkpughe 3:13.
25. Olee otú onye Kraịst ọ bụla taa pụrụ isi tinye ụkpụrụ dị na ndụmọdụ ahụ Jisọs nyere ọgbakọ ahụ dị na Filadelfịa n’ọrụ?
25 Lee nnọọ oké agbamume ozi ahụ na-aghaghị ịbụworị nye ndị Kraịst ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi na Filadelfịa! O dokwara anya na o nwere ihe mmụta siri ike nye òtù Jọn nke oge a, n’ime ụbọchi Onyenwe anyị ahụ. Ma ụkpụrụ ndị dị na ya dị mkpa nye onye Kraịst ọ bụla, ma ò so ná ndị ahụ e tere mmanụ ma ọ bụ n’atụrụ ọzọ ahụ. (Jọn 10:16) Onye ọ bụla n’ime anyị ga-eme nke ọma ịnọgide na-amịpụta mkpụrụ Alaeze dị ka ndị Kraịst ahụ nọ na Filadelfịa. Ma ọ dịghị ihe ọzọ, anyị nile nwere ike nta. Ọ dị ihe anyị nile pụrụ ime n’ozi Jehova. Ka anyị jiri ike nke a mee ihe! N’ihe banyere ihe ùgwù Alaeze bawanyere ụba, ka anyị mụrụ anya n’ihe banyere ịbanye n’ọnụ ụzọ ọ bụla nke megheere anyị. Anyị pụrụ ọbụna ikpe ekpere ka Jehova megheere anyị ọnụ ụzọ dị otú ahụ. (Ndị Kọlọsi 4:2, 3) Ka anyị nọgidere na-agbaso ihe nlereanya nke ntachi obi Jisọs, na-emekwa ihe kwekọrọ n’aha ya, anyị ga-egosi na anyị onwe anyị nwekwara ntị ịnụ ihe mmụọ nsọ Chineke na-agwa nzukọ Kraịst.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’oge Pọl, Sosthenes, bụ́ onyeisi oche nke ụlọ nzukọ ndị Juu dị na Kọrint, ghọrọ nwanna onye Kraịst.—Ọrụ 18:17; 1 Ndị Kọrint 1:1.
b Magazin Ụlọ Nche nke òtù Jọn ahụ na-ebipụta, anọgidewo na-emesi ike ịdị ngwa nke iji ohere a kere òkè n’ụzọ zuru ezu ruo ókè o kwere mee n’ọrụ nkwusa ahụ; dị ka ihe atụ, lee isiokwu bụ́ “Ka Mmadụ Nile Kpọsaa Ebube Jehova” nakwa “n’Ime Ụwa Dum Ka Ụda Ha Garuru,” bụ́ ndị dị ná mbipụta January 1, 2004. Ná mbipụta June 1, 2004, n’isiokwu bụ́ “Ndị A Gọziri Agọzi Ka Ndị Na-enye Chineke Otuto Bụ,” e mesiri mkpa ọ dị ike ịbanye ‘n’ọnụ ụzọ nke e megheworo’ nke na-eduba n’ozi oge nile. E nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 1,093,552 ndị ọsụ ụzọ nyere akụkọ ozi dị otú ahụ n’ime otu ọnwa n’afọ 2005.
c Akwụkwọ Cyclopedia nke McClintock na Strong (Mpịakọta nke Iri, peji nke 519) kọrọ, sị: “A manyere ndị eze ịmara banyere Iso Ụzọ Kraịst site n’ọgba aghara ndị isi nchụàjà nke ndị na-ekpere arụsị kpaliri n’etiti ụmụ mmadụ, bụ́ ndị ji egwu hụta ọganihu pụrụ iche nke okwukwe ahụ, e sikwa otú a duba Trajan [98-117 O.A.] inye iwu ka e jiri nwayọ nwayọ bịanyụọ ozizi ọhụrụ ahụ nke na-agbanwe ụmụ mmadụ gaa n’ịbụ ndị kpọrọ chi ụgha dị iche iche asị. Ọchịchị nke Pliny nke nta dị ka onye na-achị Bithynia [nke ya na ókèala Rom dị n’Esia nwere agbata obi n’ebe ugwu] nwere ihe isi ike dị iche iche banyere okwu ndị na-ebilite n’ihi mgbasa dị ngwa nke Iso Ụzọ Kraịst na iwe nke a kpasuru ndị na-ekpere arụsị bi n’ókèala ya.”
d Aha ahụ bụ Hezekaịa pụtara “Jehova Na-enye Ike.” Lee 2 Ndị Eze 16:20, nkọwa ala ala peji, New World Translation Reference Bible.
Igbe dị na peeji nke 63]
Inyere Ọtụtụ Ndị Aka Ịkpọ Isiala
N’ime 144,000 ahụ e tere mmanụ, ndị ga-eketa Alaeze eluigwe, o yiri ka ihe fọdụrụnụ, òtù Jọn ahụ, nke ihe na-erughị 9,000 mmadụ ejezuchabeghị ozi ha n’elu ala. N’otu mgbe ahụ, oké ìgwè mmadụ ahụ agbasawo gaa n’ịghọ ìgwè nke ihe karịrị 6,600,000 mmadụ. (Mkpughe 7:4, 9) Gịnị nyeworo aka inweta oké ịba ụba dị otú a? Ụlọ akwụkwọ dị iche iche Ndịàmà Jehova na-eduzi enyewo aka n’ụzọ dị ukwuu. N’ụzọ na-eyighị nnọọ ụlọ akwụkwọ ndị ụkọchukwu nke Krisendọm ndị na-ezi ọkà nchepụta echiche ụwa, na-ewedakwa Bible ala, ụlọ akwụkwọ Ndịàmà ndị a na-azụlite okwukwe dị omimi n’Okwu Chineke. Ha na-egosi ụzọ o si baa uru n’ihe banyere ịdị ndụ dị ọcha na ịrara onwe onye nye ijere Chineke ozi. Gburugburu ụwa kemgbe 1943, ọgbakọ ọ bụla nke Ndịàmà Jehova na-eduzi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ya, Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nke ya. Ọtụtụ nde mmadụ na-eje ụlọ akwụkwọ a kwa izu, na-agbaso usoro ihe omume nke ọmụmụ Bible e jikọrọ ọnụ.
Kemgbe 1959 Ndịàmà Jehova eduziwokwa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze dị iche iche iji zụọ ndị okenye ọgbakọ na ndị ohu na-eje ozi. Kemgbe 1977, Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ azụpụtawokwa ọtụtụ narị puku ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị, ndị, n’inwe ezi mmụọ nke ndị Filadelfịa ahụ, na-ejere Jehova ozi oge nile n’ọrụ nkwusa ahụ. Na 1987, a malitere Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi iji zụpụta ụmụnna nwoke maka ọrụ ndị pụrụ iche n’ubi bụ́ ụwa.
Otu nke pụworo iche n’ụlọ akwụkwọ ndị Ndịàmà Jehova na-eduzi abụwo Watchtower Bible School of Gilead. Kemgbe 1943, ụlọ akwụkwọ ndị ozi ala ọzọ nke a nke dị na New York State, azụpụtawo ìgwè abụọ nke ndị mmụta kwa afọ. Ná ngụkọta, ọ zụwo ihe karịrị 7,000 ndị ozi Jehova maka ije ozi ala ọzọ. Ndị a zụpụtaworo n’ụlọ akwụkwọ a ejewo ozi n’ihe karịrị otu narị mba, nke ha na-enye aka n’ọtụtụ n’ime ha n’ịmalite ọrụ Alaeze ahụ. Ka ihe dị ka afọ 60 gasịrị, ụfọdụ n’ime ndị ozi ala ọzọ ndị mbụ ahụ ka nọkwa n’ọrụ ha, na-eso ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ na-ekere òkè n’ime ka mgbasa nke nzukọ Jehova n’ụwa nile gakwuo n’ihu. Leekwa nnọọ mgbasapụ dị ebube nke a bụworo!
[Chaatị dị na peeji nke 64]
Na 1919 eze ahụ na-achị achị bụ́ Jisọs meghere ụzọ nke na-eduba n’ozi ndị Kraịst. Ọnụ ọgụgụ na-abawanye ụba nke ndị Kraịst raara onwe ha nye ejiwo ohere ahụ mee ihe.
1918 14 3,868 591
1928 32 23,988 1,883
1938 52 47,143 4,112
1948 96 230,532 8,994
1958 175 717,088 23,772
1968 200 1,155,826 63,871
1978 205 2,086,698 115,389
1988 212 3,430,926 455,561
1998 233 5,544,059 698,781
2005 235 6,390,022 843,234
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
e Ọnụ ọgụgụ ndị dị n’elu bụ nkezi e nwere kwa ọnwa.
f Ọnụ ọgụgụ ndị dị n’elu bụ nkezi e nwere kwa ọnwa.
[Chaatị dị na peeji nke 65]
Ọrụ Ndịàmà Jehova bụ nke e ji obi nile na-arụ. Dị ka ihe atụ, tụlee ọnụ ọgụgụ hour ha tinyere n’ọrụ nkwusa na izi ihe na ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ọmụmụ Bible ndị ha duziwooro ndị mmadụ n’efu.
Hour E Tinyere Ọmụmụ Bible
n’Ọrụ Nkwusa E Duziri
Afọ (Ngụkọta nke Afọ Dum) (Nkezi Kwa Ọnwa)
1918 19,116 E Dekọghị Ya
1928 2,866,164 E Dekọghị Ya
1938 10,572,086 E Dekọghị Ya
1948 49,832,205 130,281
1958 110,390,944 508,320
1968 208,666,762 977,503
1978 307,272,262 1,257,084
1988 785,521,697 3,237,160
1998 1,186,666,708 4,302,852
2005 1,278,235,504 6,061,534
[Foto dị na peeji nke 59]
Otu mkpịsị ugodi ndị Rom nke narị afọ mbụ