Isi nke 26
Ihe Omimi nke Chineke—Mmezu Ya Dị Ebube!
1. (a) Olee ụzọ Jọn si gwa anyị na e wetawo ihe omimi ahụ ná mmezu ya? (b) N’ihi gịnị ka ìgwè ndị mmụọ ozi ji kwuo okwu n’olu dara ụda?
Ị̀ NA-ECHETA iyi ahụ mmụọ ozi ahụ siri ike ṅụrụ nke e dekọrọ ná Mkpughe 10:1, 6, 7? O kwuru, sị: “[Igbu, NW] oge agaghị adịkwa ọzọ: ma n’ụbọchị nke olu mmụọ ozi nke asaa ahụ, mgbe ọ gaje ịfụ opi, a ga-emekwa ka ihe omimi nke Chineke zuo okè, dị ka o ziri ozi ọma nye ndị ohu ya, bụ́ ndị amụma ya.” Oge Jehova kara akara eruwo ka a fụọ opi nke ikpeazụ ahụ! N’ihi ya, olee otú o si bụrụ na a na-eme ka ihe omimi nke Chineke zuo okè? Jọn nwere obi ụtọ dị ukwuu n’ezie ịgwa anyị! O dere, sị: “Mmụọ ozi nke asaa wee fụọ opi; oké olu wee daa n’eluigwe, ha wee sị, Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị, na nke Kraịst ya: Ọ ga-abụkwa eze ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Mkpughe 11:15) Ìgwè ndị mmụọ ozi ahụ nwere ezi ihe mere ha ga-eji kwuo okwu n’olu dara ụda, ọbụna n’olu ndị dị ka égbè eluigwe! N’ihi na ịdị mkpa nke ịma ọkwa nke a metụtara eluigwe na ala. O metụtara ihe ọ bụla dị ndụ e kere eke.
2. Olee mgbe, ọ bụkwa n’ihe omume dị aṅaa ka e wetara ihe omimi ahụ ná mmezu dị ebube?
2 Ihe omimi ahụ na-abịaru mmezu obi ụtọ ya! N’ụzọ dị ebube, n’ụzọ dị oké egwu, e wetara ya ná mmezu dị ebube na 1914 mgbe Onyenwe anyị Jehova dokwasịrị Kraịst ya n’ocheeze dị ka Eze so ya na-achị. N’ịrụchitere Nna ya ọrụ, Jisọs Kraịst na-eweghara ọchịchị n’etiti ndị iro ya nọ n’ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ. Dị ka Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, ọ natara ike Alaeze ka o wee tipịa Agwọ ahụ na ndị òtù ya wee weghachi udo nke paradaịs n’elu ala nke a. (Jenesis 3:15; Abụ Ọma 72:1, 7) Dị ka Eze Mesaịa, Jisọs ga-esi otú a mezuo Okwu Jehova wee wepụta Nna ya n’ụta, bụ́ “Eze nke mgbe nile,” onye na-aghaghị ịchị achị dị ka Eze Onyenwe anyị “ruo mgbe nile ebighị ebi.”—1 Timoti 1:17.
3. Ọ bụ ezie na ọ nọgidewo na-abụ Eze, n’ihi gịnị ka Jehova Chineke jiworo kwe ka ọbụbụeze ndị ọzọ dịrị n’elu ala?
3 Ma n’ụzọ dị aṅaa ka o si bụrụ na “alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị,” bụ́ Jehova? Ọ̀ bụ na Jehova Chineke anọbeghị na-abụ Eze eri oge? Nke ahụ bụ eziokwu, n’ihi na Esaf bụ onye Livaị bụrụ abụ, sị: “Chineke bụ Eze m site na mgbe ochie.” Onye ọbụ abụ ọzọ kwupụtakwara, sị: “Jehova bụ eze; . . . ocheeze gị eguzosiwo ike site na mgbe ochie: site na mgbe ebighị ebi ka ị nọ.” (Abụ Ọma 74:12; 93:1, 2) Otú ọ dị, Jehova ejiriwo amamihe ya kwere ka ọbụbụeze ndị ọzọ dịrị n’elu ala. N’ụzọ dị otú a, a nwapụtazuwo ihe iseokwu ahụ e welitere n’Iden banyere ajụjụ ahụ bụ ma mmadụ ọ̀ ga-enwe ike ịchị onwe ya n’adabereghị na Chineke. Ọchịchị mmadụ akụwo nnọọ afọ n’ala. N’ezie, okwu onye amụma Chineke abụwo eziokwu, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Maliterị n’oge ahụ nne na nna anyị mbụ wepụgara onwe ha, ụwa dum mmadụ bi anọwo n’okpuru nduzi nke “agwọ ochie ahụ,” bụ́ Setan. (Mkpughe 12:9; Luk 4:6) Ugbu a, oge eruwo ka e nwee oké mgbanwe! Iji wee kwadoo ọnọdụ ya ziri ezi, Jehova na-amalite iji ọbụbụeze ya mee ihe n’elu ala n’ụzọ ọhụrụ, site n’Alaeze Mesaịa ahụ ọ họpụtaworo.
4. Mgbe a malitere ịfụ opi ndị ahụ na 1922, gịnị ka e mere ka ọ pụta ìhè karịsịa? Kọwaa.
4 Mgbe ịfụ opi asaa ahụ malitere na 1922, ná mgbakọ Ndị Mmụta Bible nwere na Cedar Point, Ohio, e nwere okwu J. F. Rutherford kwuru nke dabeere n’ihe ahụ e dere n’akwụkwọ nsọ bụ “Alaeze eluigwe dị nso.” (Matiu 4:17) O ji okwu ndị a mechie okwu ya, sị: “Ya mere laghachinụ n’ubi, unu ụmụ nke Chineke onye kasị ihe nile elu! Yikwasịnụ ihe agha unu! Nweenụ anya udo, mụrụnụ anya, na-arụsinụ ọrụ ike, nweenụ anya ike. Bụrụnụ ezi ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi nke Onyenwe anyị. Gaanụ n’ihu n’agha ahụ ruo mgbe akụkụ nile nke Babilọn ghọrọ ihe tọgbọrọ n’efu. Zisaanụ ozi ahụ n’ebe nile. Ụwa aghaghị ịmara na Jehova bụ Chineke, na Jisọs Kraịst bụkwa Eze kasị ndị eze nile na Onyenwenụ kasị ndị nwenụ nile. Nke a bụ ụbọchị kasị ụbọchị nile. Lee, Eze ahụ na-achị achị! Unu bụ ndị mgbasa ozi ya. Ya mere, kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ, Eze ahụ na alaeze ya.” E si otú a debe Alaeze Chineke nke dị n’aka Kraịst Jisọs n’ọnọdụ mbụ, nke ahụ malitekwara oké ọrụ nkwusa Alaeze nke gụnyekọtaworo okwu amamikpe nke opi asaa ndị mmụọ ozi ahụ kpọsara.
5. Na 1928, gịnị mere ná mgbakọ Ndị Mmụta Bible nke mere ka ụda opi nke asaa ahụ pụta ìhè?
5 E gosipụtara ihe sitere n’opi mmụọ ozi nke asaa ahụ ná mgbakọ Ndị Mmụta Bible mere na Detroit, Michigan, na July 30 ruo August 6, 1928. N’oge ahụ, e jikọtara ụlọ mgbasa ozi redio dị 107 n’ihe akwụkwọ akụkọ The New York Times kọwara dị ka ‘njikọ kasị ukwuu, nke e mefukwaara ego kasị ukwuu n’akụkọ ihe mere eme.’ Ndị bịara mgbakọ ahụ ji oké ịnụ ọkụ n’obi nabata nkwupụta siri ike nke bụ “Nkwupụta Okwu E Meere Jehova Megide Setan,” na-ezo aka gaa n’oge a ga-emeri Setan na ajọ òtù ya, ma napụta ndị nile hụrụ ezi omume n’anya, n’Amagedọn. O nyere ndị nile nọ n’okpuru Alaeze Chineke obi ụtọ ịnata otu akwụkwọ e wepụtara ná mgbakọ ahụ, bụ́ akwụkwọ nwere 368 peji, bụ́ Government. Akwụkwọ nke a nyere nkọwa ndị kasị doo anya “na Chineke dokwasịrị Eze o Tere Mmanụ n’ocheeze ya na 1914.”
Jehova Eweghara Ike Ọchịchị
6. Olee otú Jọn si kọọ banyere ịma ọkwa nke ndokwasị e dokwasịrị Kraịst n’ocheeze n’Alaeze Chineke?
6 E dokwasịrị Kraịst n’ocheeze nke Alaeze Chineke—lee nnọọ oké ọṅụ ịma ọkwa nke a na-akpata! Jọn kọrọ, sị: “[Iri ndị okenye abụọ na anọ] ahụ, ndị na-anọdụ n’ihu Chineke n’elu ocheeze ha, wee daa kpuchie ihu ha n’ala, wee kpọọ isiala nye Chineke, sị, Anyị na-ekele gị, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile, Onye na-adị adị, Onye dịkwararịị; n’ihi na i werewo oké ike gị, ị bụkwara eze.”—Mkpughe 11:16, 17.
7. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị a si nye Jehova Chineke ekele (a) ihe fọdụrụ na 24 ndị okenye ihe atụ ahụ n’elu ala? (b) ndị so na 24 ndị okenye ihe atụ ahụ, ndị biliteworo n’ọnwụ gaa n’ọnọdụ ha dị iche iche n’eluigwe?
7 Ndị nyere Jehova Chineke ekele nke a bụ 24 ndị okenye ahụ, na-ese onyinyo ụmụnna Kraịst e tere mmanụ ndị nọ n’ọnọdụ ha n’eluigwe. Malite na 1922 gaa n’ihu, ihe fọdụrụ n’ime 144,000 ndị a ndị ka nọ n’elu ala, bụ́ ndị e tere mmanụ, tinyere onwe ha n’ọrụ ahụ nke ụda opi ndị ahụ malitere. Ha ghọtara n’ụzọ zuru ezu mkpa nke ihe ịrịba ama e kwuru okwu ya na Matiu 24:3–25:46. Ọbụna n’oge mmalite nke ụbọchị Onyenwe anyị ahụ, a kpọlitere ndịàmà ibe ha ndị ‘nọgideworo n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ’ gaa n’ọnọdụ ha dị iche iche n’eluigwe, ka ha nwee ike ịnọchite anya ìgwè ahụ dum nke 144,000 n’ịda kpuo ihu ha n’ala iji kwanyere Jehova ùgwù. (Mkpughe 1:10; 2:10) Lee ka ha si nwee obi ụtọ na Eze Onyenwe ha atụfubeghị oge ọ bụla n’iweta ihe omimi ya ná mmezu dị ebube!
8. (a) Mmetụta dị aṅaa ka ịfụ opi nke asaa ahụ nwere n’ahụ mba nile? (b) Megide olee ndị ka mba nile gosipụtara iwe ha?
8 N’aka nke ọzọ, ịfụ opi nke asaa ewetaghịrị ndị mba nile ọṅụ. Oge eruwo ka ha wee nata oké iwe Jehova. Dị ka Jọn kọrọ: “Mba nile wee wee iwe, iwe gị wee bịa, ya na oge ikpe ndị nwụrụ anwụ ikpe, na inye ndị ohu gị, bụ́ ndị amụma, na ndị nsọ, na ndị na-atụ egwu aha gị, ndị nta na ndị ukwu, ụgwọ ọrụ ha; na imebi ndị ahụ na-emebi ụwa.” (Mkpughe 11:18) Malite na 1914 gaa n’ihu, mba nile nke ụwa egosipụtawo iwe ha megiderịta ibe ha n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ, megide Alaeze Chineke, karịsịakwa, megide ndịàmà abụọ nke Jehova.—Mkpughe 11:3.
9. N’ụzọ dị aṅaa ka mba nile siworo nọgide na-emebi ụwa, gịnịkwa ka Chineke kpebiworo ime banyere nke a?
9 N’akụkọ ihe mere eme nile, mba dị iche iche anọgidewo na-emebi ụwa site n’ịlụ agha n’akwụsịghị akwụsị na iji ihe eme ihe n’ụzọ na-adịghị mma. Otú ọ dị, kemgbe 1914, mbibi nke a arịwo elu ruo n’ókè na-eyi egwu. Anyaukwu na arụrụala akpatawo ọzara ndị na-agbasa agbasa na oké mfù nke ala ebe a pụrụ ịkọ ihe oriri. Nsí nke na-ezo ka mmiri na igwe ojii ndị nwere ike ụzarị ọkụ n’ime ha ebibiwo ókèala bara ụba. E metọwo ebe dị iche iche a na-esi enweta nri. E metọwo ikuku anyị na-ekuru na mmiri anyị na-aṅụ. Unyi ndị si n’ụlọ mmepụta ihe dị iche iche na-apụta na-eyi ndụ dị n’elu ala na n’oké osimiri egwu. N’otu oge, mba ndị bụ́ dike yiri ihe a kpọrọ mmadụ egwu mgbuchapụ site n’agha nuklia. Ọ bụ ihe obi ụtọ na Jehova ‘ga-emebi ndị na-emebi ụwa’; ọ ga-emezu ihe o kpere n’ikpe megide mmadụ ndị ahụ dị mpako, ndị na-adịghị atụ egwu Chineke, ndị ọ bụ ha kpatara ọnọdụ ọjọọ ụwa nọ n’ime ya. (Deuterọnọmi 32:5, 6; Abụ Ọma 14:1-3) N’ihi nke a, Jehova mere ndokwa maka ahụhụ nke atọ, ime ka ndị a na-eme ihe ọjọọ bịa zara ọnụ ha.—Mkpughe 11:14.
Ahụhụ Nye Ndị Na-emebi Ihe!
10. (a) Gịnị bụ ahụhụ nke atọ ahụ? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka ahụhụ nke atọ ahụ si eweta ihe karịrị ahụhụ?
10 Ya mere, nke a bụ ahụhụ nke atọ ahụ. Ọ na-abịa ọsọ ọsọ! Ọ bụ ụzọ Jehova ga-eji mee ihe iwetara ndị ahụ na-emetọ “ihe mgbakwasị ụkwụ” ya, bụ́ elu ụwa nke a mara mma anyị bi n’ime ya, mbibi. (Aịsaịa 66:1) Ihe malitere ya bụ Alaeze Mesaịa ahụ—bụ́ ihe omimi nke Chineke. E nyewo ndị iro Chineke ahụhụ, karịsịa, ndị ndú Krisendọm site n’ahụhụ abụọ ndị bu ụzọ—ndị sitere n’ụzọ bụ isi, n’ihe otiti nke igurube na usuu ndị agha ahụ; ma ahụhụ nke atọ, nke Alaeze Jehova n’onwe ya ga-eweta, na-eweta ihe karịrị ntaramahụhụ. (Mkpughe 9:3-19) Ọ na-eweta ihe otiti ntigbu site n’ikpochapụ agbụrụ mmadụ ndị na-emebi ihe na ndị ọchịchị ha. Nke a ga-abịa dị ka ọgwụgwụ nke ikpe ikpe Jehova ahụ n’Amagedọn. Ọ bụ nnọọ dị ka Daniel buru n’amụma, sị: “Ma n’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a [ndị ọchịchị na-emebi ụwa], ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebịghị ebi.” Dị ka ugwu dị oké elu, Alaeze Chineke ga-achị ụwa nke e meworo ka ọ dị ebube, na-ewepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta, na-ewetakwara ihe a kpọrọ mmadụ ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi.—Daniel 2:35, 44; Aịsaịa 11:9; 60:13.
11. (a) Usoro ihe omume obi ụtọ ndị dị aṅaa ka amụma ahụ kọwara? (b) Obi ebere dị aṅaa nke na-erughịrị mmadụ ka e nwetara, n’ụzọ dị aṅaa, ọ̀ bụkwa nye olee ndị?
11 Ihe so ahụhụ nke atọ ahụ bụ usoro ihe omume obi ụtọ dị iche iche ndị ga-anọgide na-aga n’ihu n’oge nile nke ụbọchị Onyenwe anyị ahụ. Ọ bụ ‘oge ikpe ndị nwụrụ anwụ ikpe, na oge Chineke ga-enye ndị ohu ya ụgwọ ọrụ ha, bụ́ ndị amụma, na ndị nsọ, na ndị na-atụ egwu aha ya.’ Nke ahụ pụtara mbilite n’ọnwụ! Nye ndị nsọ ahụ e tere mmanụ, ndị daworo n’ụra ọnwụ, nke a mere n’oge mmalite nke ụbọchị Onyenwe anyị. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:15-17) Mgbe oge ya ruru, ndị nsọ fọdụrụnụ ga-esonyere ndị a site n’ịbụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ ozugbo ha nwụrụ. E nyekwara ndị ọzọ ụgwọ ọrụ, gụnyere ndị ohu Chineke na ndị amụma nke oge ochie na mmadụ ndị ọzọ nile tụrụ egwu aha Jehova, ma hà so n’oké ìgwè mmadụ ahụ ndị ga-agabiga oké mkpagbu ahụ ma hà so ná ‘ndị nwụrụ anwụ, ndị nta na ndị ukwu,’ ndị a ga-akpọlite bịa ná ndụ n’oge Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst. Ebe ọ bụ na Eze Mesaịa nke Chineke nwere mkpịsị ugodi nile nke ọnwụ na nke Hedis, ọchịchị Alaeze ya na-emeghere ya ụzọ inye ndị nile ndụ ebighị ebi, bụ́ ndị ruru eru ịnata onyinye ahụ dị oké ọnụ ahịa. (Mkpughe 1:18; 7:9, 14; 20:12, 13; Ndị Rom 6:22; Jọn 5:28, 29) Ma ọ̀ bụ ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe ma ọ̀ bụ ndụ ebighị ebi n’elu ala, nke a bụ obi ebere na-erughịrị mmadụ site n’aka Jehova, nke onye ọ bụla natara ya ga-enwe ekele maka ya ruo mgbe ebighị ebi!—Ndị Hibru 2:9.
Lee Igbe nke Ọgbụgba Ndụ Ya!
12. (a) Dị ka Mkpughe 11:19 si kọọ, gịnị ka Jọn hụrụ n’eluigwe? (b) Gịnị ka igbe ọgbụgba ndụ ahụ bụ ihe atụ ya, gịnị mekwara ya mgbe Israel gara ná ndọta n’agha na Babilọn?
12 Jehova na-achị achị! Site n’Alaeze Mesaịa ya, ọ na-eji ọbụbụeze ya na-eme ihe n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ n’ụzọ dị ebube. E mesiri nke a ike site n’ihe ọzọ Jọn hụrụ: “E wee meghee ụlọ nsọ nke Chineke nke dị n’eluigwe; e wee hụ igbe nke ọgbụgba ndụ ya n’ụlọ nsọ ya; àmụ̀mà, na olu, na égbè eluigwe, na ala ọma jijiji, na oké akụ mmiri igwe wee soo.” (Mkpughe 11:19) Ọ bụ nanị n’ebe a n’akwụkwọ Mkpughe ka a kpọtụrụ igbe ọgbụgba ndụ Chineke aha. N’oge ochie, Igbe ahụ bụ ihe nnọchianya a na-ahụ anya nke ọnụnọ Jehova n’etiti ndị ya bụ Israel. N’ụlọ ikwuu ahụ, e mesịakwa, n’ụlọ nsọ ahụ Solomọn wuru, a na-edebe ya n’ime Ebe Kasị Nsọ. Ma mgbe a dọọrọ Israel n’agha laa Babilọn n’afọ 607 T.O.A., e bibiri Jerusalem, a maghịkwa ebe igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị ọzọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka ndị nnọchianya nke ụlọ Devid kwụsịrị ‘ịnọkwasị n’ocheeze Jehova dị ka eze.’—1 Ihe Emere 29:23.a
13. Gịnị ka e gosiri site n’eziokwu ahụ bụ na a hụrụ igbe nke ọgbụgba ndụ Chineke n’ime ụlọ nsọ nke Chineke nke dị n’eluigwe?
13 Ugbu a, mgbe ihe karịrị afọ 2,600 gasịworo, a hụkwara Igbe ahụ ọzọ. Ma n’ọhụụ Jọn, Igbe nke a adịghị n’ime ụlọ nsọ dị n’elu ala. A hụrụ ya n’ime ụlọ nsọ nke Chineke nke dị n’eluigwe. Ọzọkwa, Jehova na-achị achị site n’aka eze nke sitere n’usoro ndị eze nke Devid. Otú ọ dị, n’oge a, Eze ahụ, bụ́ Kraịst Jisọs, na-anọkwasị n’ocheeze dị na Jerusalem nke dị n’eluigwe—ọnọdụ ahụ e buliri elu ebe ọ nọ na-emezu ihe ndị Jehova kpere n’ikpe. (Ndị Hibru 12:22) Isiakwụkwọ Mkpughe ndị na-esochinụ kpugheere anyị ihe ndị ahụ.
14, 15. (a) Na Jerusalem oge ochie, ònye ka ọ bụ nanị ya na-ahụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) N’ime ụlọ nsọ nke Chineke nke dị n’eluigwe, olee ndị hụrụ igbe nke ọgbụgba ndụ ya ahụ?
14 Na Jerusalem oge ochie nke dị n’elu ala, ọ bụghị ndị Israel nile na-ahụ Igbe ahụ anya, ọ bụghị ọbụna ndị nchụàjà nile na-eje ozi n’ime ụlọ nsọ ahụ, n’ihi na ọ dị n’ime Ebe Kasị Nsọ nke e ji ákwà mgbochi kebie ya na Ebe Nsọ. (Ọnụ Ọgụgụ 4:20; Ndị Hibru 9:2, 3) Ọ bụ nanị onyeisi nchụàjà na-ahụ ya mgbe ọ banyere n’ime Ebe Kasị Nsọ n’ụbọchị ememe a na-eme kwa afọ nke Ụbọchị Mkpuchi Mmehie. Ma otú ọ dị, mgbe e meghere ụlọ nsọ ahụ dị n’eluigwe, ọ bụghị nanị Onyeisi Nchụàjà Jehova, bụ́ Jisọs Kraịst, hụrụ igbe ihe atụ ahụ, kamakwa ndị nchụàjà nọ n’okpuru ya, bụ́ 144,000 ahụ, gụnyere Jọn, hụrụ ya.
15 Ndị mbụ ahụ a kpọliteworo gaa n’eluigwe hụrụ igbe ihe atụ ahụ n’ebe dị nnọọ nso, n’ihi na ha ewerewo ọnọdụ ha dị ka akụkụ nke 24 ndị okenye ahụ nọ gburugburu ocheeze Jehova. Mmụọ Jehova enyewokwa òtù Jọn ahụ nọ n’elu ala ìhè iji ghọta ọnụnọ Ya n’ime ụlọ nsọ ime mmụọ Ya. E nwewokwa ihe ịrịba ama ndị mere ka ihe dum a kpọrọ mmadụ mara maka ihe ebube nke a na-emenụ. Ọhụụ Jọn kwuru okwu banyere àmụ̀mà, olu, égbè eluigwe, ala ọma jijiji, na akụ mmiri igwe. (Tụlee Mkpughe 8:5.) Gịnị ka ihe ndị a sere onyinyo ha?
16. N’ụzọ dị aṅaa ka e siworo nwee àmụ̀mà, olu, égbè eluigwe, ala ọma jijiji, na oké akụ mmiri igwe?
16 Kemgbe 1914, e nwewo oké ọgba aghara n’etiti okpukpe. Otú ọ dị, ọ bụ ihe obi ụtọ ịmara na ihe sochiri “ala ọma jijiji” nke a abụrụwo olu ndị a raara nye izisa ozi pụtara ìhè banyere Alaeze Chineke nke e guzobeworo. E jiriwo oké olu kpọsaa ‘oké ifufe ịdọ aka ná ntị’ sitere na Bible. Dị ka àmụ̀mà, a hụwo, kpọsaakwa oké ìhè nke nghọta n’ihe banyere Okwu amụma Chineke. A tọhapụwokwa oké “akụ mmiri igwe” nke ihe ndị Chineke kpere n’ikpe megide Krisendọm na okpukpe ụgha nile ọzọ. Ihe ndị a nile kwesịrị ịdọrọworịị mmasị ụmụ mmadụ. Otú ọ dị, ọ bụ ihe mwute ịhụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ—dị ka ndị bi na Jerusalem n’oge Jisọs—aghọtabeghị mmezu nke ihe ịrịba ama nke Mkpughe ndị a.—Luk 19:41-44.
17, 18. (a) Ibu ọrụ dị aṅaa ka ịfụ opi nke ndị mmụọ ozi asaa ahụ bokwasịworo ndị Kraịst raara onwe ha nye? (b) Olee ụzọ ndị Kraịst ndị a si na-arụzu ọrụ ha?
17 Ndị mmụọ ozi asaa ahụ nọgidere na-afụ opi ha, na-agba àmà oké ihe omume dị iche iche n’elu ala ebe a. Ndị Kraịst raara onwe ha nye nwere oké ibu ọrụ nke ịnọgide na-akpọsa ịma ọkwa ndị a nye ụwa. Lee nnọọ ka ha si jiri obi ụtọ na-arụzu ọrụ ahụ! A na-egosipụta nke a n’eziokwu ahụ bụ na n’ime afọ iri abụọ, malite na 1986 ruo 2005, ha tinyere ihe fọrọ nke nta ka o jiri okpukpu abụọ karịa hour ha na-etinye kwa afọ n’ozi—site na 680,837,042 ruo 1,278,235,504—bụ́ mmụba nke 150 pasentị. N’ezie, a na-eme ka a mara ‘ihe omimi nke Chineke dị ka ozi ọma ahụ si dị’ ruo “nsọtụ nile nke elu ụwa dum mmadụ bi.”—Mkpughe 10:7; Ndị Rom 10:18.
18 Ọhụụ ndị ọzọ na-echere anyị ugbu a ka a nọgidere na-ekpughe nzube nile nke Alaeze Chineke.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Onye Rom bụ ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Tacitus kọrọ na mgbe e weghaara Jerusalem n’afọ 63 T.O.A., mgbe Cneius Pompeius banyekwara n’ime ebe nsọ nke ụlọ nsọ ahụ, ọ hụrụ na ọ dịghị ihe dị n’ebe ahụ. Ọ dịghị igbe ọgbụgba ndụ ọ bụla dị n’ime ya.—Tacitus History, 5.9.
Igbe dị na peeji nke 173]
Isi Ihe Ndị Dị ná Nkwupụta Ikpe Ọmụma Jehova Ndị Yiri Ọfụfụ Opi
1. 1922 Cedar Point, Ohio: Ịma aka nye ndị ndú Krisendọm nọ n’okpukpe, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na oké azụmahịa ịkọwa ihe mere na ha enweghị ike iweta udo, ihe ịga nke ọma, na obi ụtọ. Alaeze Mesaịa bụ ihe ngwọta dịịrị ya.
2. 1923 Los Angeles, California: Okwu ihu ọha ahụ bụ “Mba Nile Na-azọ Ije Ugbu A Iru Amagedọn, ma Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Anwụ Ma Ọlị,” kpọkuru “atụrụ” ndị hụrụ udo n’anya ka ha hapụ oké osimiri na-akpata ọnwụ nke ụmụ mmadụ.
3. 1924 Columbus, Ohio: A katọrọ ndị òtù okpukpe dị iche iche n’ihi ibuli onwe ha elu na ọjụjụ ha jụrụ ikwusa Alaeze Mesaịa. Ezi ndị Kraịst aghaghị ikwusa ịbọ ọ́bọ̀ Chineke, kasiekwa ihe a kpọrọ mmadụ na-eru újú obi.
4. 1925 Indianapolis, Indiana: Ozi nke olileanya nke gosipụtara ọdịiche dị n’ọchịchịrị ime mmụọ dị na Krisendọm na nkwa Alaeze ahụ na-egbukepụ egbukepụ nke ga-eweta udo, ihe ịga nke ọma, ahụ ike, ndụ, nnwere onwe, na obi ụtọ ebighị ebi.
5. 1926 London, England: Ihe otiti yiri igurube nye Krisendọm na ndị ụkọchukwu ya, na-ekpughe ọjụjụ ha jụrụ Alaeze Chineke, na-akpọsakwa ọmụmụ nke ọchịchị eluigwe ahụ.
6. 1927 Toronto, Canada: Ọkpụkpọ òkù, nke ndị yiri usuu ndị agha kpọsara, na-akpọku ndị mmadụ ka ha gbakụta ‘Iso Ụzọ Kraịst a haziri ahazi’ azụ wee jiri obi ha nye Jehova Chineke nrubeisi ha, nyekwa Eze na Alaeze ya.
7. 1928 Detroit, Michigan: Mkpọsa e mere iji megide Setan na iji kwadoo Jehova, na-eme ka ọ pụta ìhè na Eze Chineke tere mmanụ, nke nọkwasịrị n’ocheeze na 1914, ga-ebibi ajọ òtù Setan wee napụta ihe a kpọrọ mmadụ.
Igbe dị na peeji nke 175]
Imebi Ụwa
“N’ime sekọnd atọ ọ bụla otu akụkụ nke oké ọhịa ndị mbụ e nwere, ihe hà ka otu ama egwuregwu bọọlụ, na-apụ n’anya. . . . Mfụ nke oké ọhịa ndị a na-ebibi ọtụtụ puku ụdị osisi na anụmanụ dị iche iche ndị a na-agaghị ahụkwa mgbe ọ bụla ọzọ n’elu ala.”—Illustrated Atlas of the World (Rand McNally).
“N’ime narị afọ abụọ nke mmadụ biworo gburugburu ya, [Oké Ọdọ Mmiri ndị ahụ] aghọwokwa ebe mkpofu unyi kasị ukwuu dị n’elu ụwa.”—The Globe and Mail (Canada).
N’April 1986 otu ntiwapụ na ọkụ ọgbụgba mere n’ụlọ ọrụ ike nuklia dị na Chernobyl, U.S.S.R., “bụ ihe omume nuklia kasị pụta ìhè . . . kemgbe a tụrụ bọmbụ na Hiroshima na Nagasaki,” na-awụbanye “ike ụzarị ọkụ na-adị ogologo oge n’ime ikuku dị n’ụwa, ájá dị n’elu ala na mmiri nke ha ka nnwale nuklia na bọmbụ nile e metụworo.”—JAMA; The New York Times.
N’obodo Minamata, Japan, otu ụlọ ọrụ mmiri ọgwụ wụbanyere mmiri ọgwụ methylmercury n’ọnụ mmiri dị n’ebe ahụ. Iri azụ na anụ mmiri ndị ọzọ mmiri ọgwụ ahụ metọrọ kpatara ọrịa a kpọrọ Minamata (MD) bụ́ “ọrịa na-adịghị ala ala nke na-emebisi usoro akwara. . . . Ruo ugbu a [1985], a chọpụtawo kpọmkwem na 2578 mmadụ gburugburu Japan nwere ọrịa MD.”—International Journal of Epidemiology.
Igbe dị na peeji nke 176]
Oké nkwupụta okwu ndị ahụ dị ná Mkpughe 11:15-19 bụ okwu mmeghe nye ọhụụ ndị na-esochi. Mkpughe isi nke 12 bụ nchetaghachi ihe nke mere ka oké ịma ọkwa ndị ahụ e mere ná Mkpughe 11:15, 17 pụtakwuo ìhè. Isi nke 13 nyere nkọwa ndị ọzọ banyere 11:18, mgbe ọ na-akọwa mmalite na ntolite nke usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị Setan nke wetawooro elu ala mbibi. Isi nke 14 na 15 kọwakwuru amamikpe ndị ọzọ Alaeze ahụ ga-eweta, ndị e jikọtara ha na ịfụ opi nke asaa ahụ na ahụhụ nke atọ ahụ.
[Foto ndị dị na peeji nke 174]
Jehova ‘ga-emebi ndị ahụ na-emebi ụwa’