Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 171
  • Olee Otú Ekwensu Dị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Ekwensu Dị?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Olee otú Baịbụl si kọwaa onye Ekwensu bụ?
  • Guzogide Setan, Ọ Ga-agbapụkwa!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • “Na-eguzogidenụ Ekwensu” Dị Ka Jizọs Mere
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 171

Olee Otú Ekwensu Dị?

Ihe Baịbụl kwuru

Ekwensu bụ mmụọ a na-adịghị ahụ anya, nke pụtara na o nweghị ahụ́ nkịtị a na-ahụ anya.​—⁠Ndị Efesọs 6:​11, 12.

Otú ndị mmadụ si esekarị Ekwensu ebe o ji ogologo fọk n’aka. O yiri ewu nwere mpi na ogologo ọdụ.

Ọtụtụ mgbe, ndị mmadụ sewe Ekwensu n’akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ọzọ, ha na-ese ya ka o yie ewu nwere mpi na ogologo ọdụ, jidekwa fọk toro ogologo n’aka. Ụfọdụ ndị kwuru na ọ bụ ndị na-ese ihe n’oge ochie malitere ise ya otú ahụ. Ọ bụkwanụ akụkọ ifo na akụkọ ndị mgbe ochie ndị ha nụrụ mere ha ji sewe ya otú ahụ.

  • Olee otú Baịbụl si kọwaa onye Ekwensu bụ?

  • Amaokwu Baịbụl ndị kwuru gbasara Ekwensu

Olee otú Baịbụl si kọwaa onye Ekwensu bụ?

E nwere ọtụtụ ụzọ Baịbụl si kọwaa onye Ekwensu bụ. Ụzọ ndị ahụ e si kọwaa ya na-enyere anyị aka ịmata ụdị onye ọ bụ, ọ bụghị otú ọ dị. Ụzọ ụfọdụ e si kọwaa ya bụ:

  • Mmụọ ozi nke ìhè. Ọ na-eme ka o yie ka ọ na-enye ndị mmadụ ihe ndị dị mma, ma ọ chọrọ iji ya rata ha ka ha kweta n’ihe ndị ọ na-agwa ha kama iso ihe Chineke na-agwa ha.​—⁠2 Ndị Kọrịnt 11:⁠14.

  • Ọdụm na-ebigbọ ebigbọ. Ọ na-eji obi ọjọọ na-emegide ndị na-efe Chineke.​—⁠1 Pita 5:⁠8.

  • Dragọn ukwu. Ọ dị ike, na-eyi egwu, na-emebisikwa ihe.​—Mkpughe 12:⁠9.

Amaokwu Baịbụl ndị kwuru gbasara Ekwensu

  • 2 Ndị Kọrịnt 11:14: “Setan n’onwe ya na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè.”

    Ihe ọ pụtara: Setan na-eme ka o yie ka ọ na-eme ihe ọma, ma o ji ya na-arata ndị mmadụ ka ha mewe ihe ndị ọ na-agwa ha kama ime nke Chineke kwuru.

  • Ndị Efesọs 6:11: “Yirinụ ekike agha zuru ezu nke si n’aka Chineke, ka unu wee nwee ike iguzosi ike megide atụmatụ aghụghọ nke Ekwensu.”

    Ihe ọ pụtara: Ekwensu na-eji ụzọ aghụghọ na-arafu ndị mmadụ ka ha nupụrụ Chineke isi.

  • Jems 4:7: “Doonụ onwe unu n’okpuru Chineke; ma na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.”

    Ihe ọ pụtara: Mmadụ nwere ike imeri Setan ma onye ahụ na-eme ihe ndị Chineke kwuru kama ime ihe Ekwensu chọrọ ka o mee.

  • 1 Pita 5:8: “Onye mmegide unu, bụ́ Ekwensu, na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.”

    Ihe ọ pụtara: Ekwensu kpọrọ ndị na-eme ihe Chineke chọrọ asị, ọ na-agbalịkwa ka o mee ka ha na Chineke kwụsị ịdị ná mma.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya