Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Kraịst Na-edu Ọgbakọ Ya
    Ụlọ Nche—2002 | Mach 15
    • 5, 6. (a) N’ọhụụ e mere ka Jọn onyeozi hụ, gịnị ka “ihe ndọba oriọna ọlaedo asaa ahụ” na “kpakpando asaa ahụ” na-ese onyinyo ha? (b) Gịnị ka eziokwu ahụ bụ́ na “kpakpando asaa ahụ” dị n’aka nri Jizọs na-egosi?

      5 Akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe na-egosi na ọ bụ Jizọs Kraịst kpọmkwem na-achịkwa ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche. N’ọhụụ e nyere ya banyere ‘ụbọchị Onyenwe anyị’ Jọn onyeozi hụrụ “ihe ndọba oriọna ọlaedo asaa, nakwa onye yiri nwa nke mmadụ n’etiti ihe ndọba oriọna ndị ahụ” bụ́ onye “chịkwa kpakpando asaa n’aka nri ya.” N’ịkọwara Jọn ọhụụ ahụ, Jizọs kwuru, sị: “Banyere ihe nzuzo dị nsọ nke kpakpando asaa ahụ ị hụrụ n’aka nri m, nakwa banyere ihe ndọba oriọna ọlaedo asaa ahụ: Kpakpando asaa ahụ pụtara ndị mmụọ ozi nke ọgbakọ asaa ahụ, ihe ndọba oriọna asaa ahụ pụtakwara ọgbakọ asaa.”—Mkpughe 1:1, 10-20.

      6 “Ihe ndọba oriọna ọlaedo asaa ahụ” na-ese onyinyo ezi ọgbakọ Ndị Kraịst nile e nwere “n’ụbọchị Onyenwe anyị,” bụ́ nke malitere na 1914. Gịnịkwanụ banyere “kpakpando asaa ahụ”? Na mbụ, ha nọchiri anya ndị nlekọta nile e ji mmụọ nsọ mụta ma tee mmanụ bụ́ ndị na-elekọta ọgbakọ ndị e nwere na narị afọ mbụ.a Ndị nlekọta ahụ nọ n’aka nri Jizọs—n’okpuru nchịkwa na nduzi ya. Ee, ọ bụ Kraịst Jizọs duziri òtù ohu ahụ ọtụtụ ndị mejupụtara. Otú ọ dị, ugbu a, ndị nlekọta ahụ e tere mmanụ dị ole na ole. Olee otú idu ndú Kraịst si erute ihe karịrị ọgbakọ 93,000 nke Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa?

      7. (a) Olee otú Jizọs si eji Òtù Na-achị Isi edu ọgbakọ dị iche iche n’ụwa nile? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ọ bụ mmụọ nsọ na-ahọpụta Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta?

      7 Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, obere ìgwè nke ndị ikom ruru eru bụ́ ndị si n’etiti ndị nlekọta ahụ e tere mmanụ, na-eje ozi ugbu a dị ka Òtù Na-achị Isi, na-anọchite anya ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche bụ́ nke ọtụtụ ndị mejupụtara. Onye Ndú anyị na-eji Òtù Na-achị Isi a eme ihe iji họpụta ndị ikom ruru eru—ma hà bụ ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ma ọ bụ na ha abụghị—dị ka ndị okenye n’ọgbakọ dị iche iche. Mmụọ nsọ, bụ́ nke Jehova nyeworo Jizọs ikike iji mee ihe, na-ekere òkè dị oké mkpa n’akụkụ a. (Ọrụ 2:32, 33) Nke mbụ, ndị nlekọta a aghaghị iru ihe ndị a chọrọ dị ka e depụtara ha n’Okwu Chineke, bụ́ nke e ji ike mmụọ nsọ dee. (1 Timoti 3:1-7; Taịtọs 1:5-9; 2 Pita 1:20, 21) A na-atụ aro nhọpụta ma na-eme nhọpụta mgbe e kpesịrị ekpere nakwa n’okpuru nduzi nke mmụọ nsọ. Ọzọkwa, ndị ahụ a họpụtara na-enye ihe àmà nke ịmịpụta mkpụrụ nke mmụọ ahụ. (Ndị Galeshia 5:22, 23) N’ihi ya, ndụmọdụ Pọl metụtara ndị okenye nile n’ụzọ ha nhata, ma hà bụ ndị e tere mmanụ ma ha abụghị: “Na-elezinụ onwe unu na ìgwè atụrụ ahụ dum anya, bụ́ nke mmụọ nsọ họpụtaworo unu ịbụ ndị nlekọta n’etiti ya.” (Ọrụ 20:28) Ndị ikom a a họpụtara ahọpụta na-enweta nduzi site n’aka Òtù Na-achị Isi ma jiri ọchịchọ obi ha na-azụ ọgbakọ dị ka atụrụ. N’ụzọ dị otú a, Kraịst nọnyeere anyị ugbu a ma na-edu nnọọ ọgbakọ ya.

  • Kraịst Na-edu Ọgbakọ Ya
    Ụlọ Nche—2002 | Mach 15
    • a “Kpakpando” ndị a na-ekwu okwu ha n’ebe a adịghị anọchi anya ndị mmụọ ozi nkịtị. Jizọs agatụghị eji mmadụ dekọọrọ ndị mmụọ e kere eke a na-adịghị ahụ anya ihe ọmụma. Ya mere, “kpakpando” ndị ahụ aghaghị ịnọchi anya ndị nlekọta, ma ọ bụ ndị okenye bụ́ mmadụ, nọ n’ọgbakọ dị iche iche, bụ́ ndị a na-ele anya dị ka ndị ozi Jizọs. Ọnụ ọgụgụ ha ịdị asaa na-egosi izu ezu dị ka ụkpụrụ Chineke si dị.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya