ISI NKE 11
Enyemaka Site n’Aka Ndị Mmụọ Ozi Chineke
ỤFỌDỤ ndị na-ekwu na ha na-ekweta nanị ihe ha pụrụ ịhụ anya. Ma nke ahụ bụ nzuzu. E nwere ọtụtụ ihe dị adị n’ezie ndị anyị na-ejitụbeghị anya anyị hụ. Kpọgodị otu.—
Gịnị banyere ikuku anyị na-ekuru? Ànyị na-ama ma o kusa anyị n’ahụ́?— Wepụta aka gị, fụọ ya ọnụ. Ị̀ matara na o nwere ihe kusara gị?— Ị matara, ma ị pụghị ịhụ ikuku ahụ anya, ka ị̀ pụrụ?—
Anyị ekwuola banyere ndị mmụọ, ndị anyị na-apụghị ịhụ anya. Anyị mụtara na ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ọma ma ndị ọzọ bụ ndị ọjọọ. Kpọọ aha ụfọdụ ezigbo ndị mmụọ anyị na-apụghị ịhụ anya.— Ehee, e nwere Jehova Chineke, nwee Jizọs, nweekwa ezigbo ndị mmụọ ozi. È nwekwara ajọ ndị mmụọ ozi?— Bible na-ekwu na e nwere. Gwa m ihe ị maara maka ha.—
Otu ihe anyị ma bụ na ma ezigbo ndị mmụọ ozi ma ndị nke ọjọọ ka anyị ike. Onye Ozizi Ukwu ahụ ma ọtụtụ ihe banyere ndị mmụọ ozi. Ọ bụ n’ihi na ọ bụ mmụọ ozi tupu a mụọ ya dị ka nwa ọhụrụ n’ụwa. Ya na ndị mmụọ ozi ndị ọzọ bibu n’eluigwe. Ọ ma ọtụtụ nde n’ime ha. Ndị mmụọ ozi a nile hà nwechara aha?—
Anyị mụtara na Chineke nyere kpakpando aha. Ya mere, anyị pụrụ ijide n’aka na ndị mmụọ ozi nile nwechakwara aha. Anyị makwaara na ha pụrụ ịgwa ibe ha okwu n’ihi na Bible na-ekwu banyere ‘asụsụ nke ndị mmụọ ozi.’ (1 Ndị Kọrint 13:1) Olee ihe i chere ndị mmụọ ozi na-ekwurịta ná mkparịta ụka ha? Hà na-ekwu banyere anyị bụ́ ndị bi n’ụwa?—
Anyị ma na ndị mmụọ ozi Setan, bụ́ ndị mmụọ ọjọọ, na-anwa ime ka anyị nupụrụ Jehova isi. Ya mere, ha aghaghị ịdị na-ekwu otú ha pụrụ isi mee nke a. Ha chọrọ ime ka anyị dị ka ha ka Jehova wee ghara inwe mmasị n’ebe anyị onwe anyị kwa nọ. Ma olee banyere ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi nke Chineke? Ì chere na ha na-ekwukwa okwu banyere anyị?— Ee, ha na-ekwu. Ha na-achọ inyere anyị aka. Ka m kọọrọ gị otú ụfọdụ n’ime ndị mmụọ ozi Chineke si nyere ndị hụrụ Jehova n’anya ma jeere ya ozi, aka.
Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwoke aha ya bụ Daniel, onye biri na Babilọn. Ọtụtụ ndị nọ n’ebe ahụ ahụghị Jehova n’anya. Ndị mmadụ ọbụna tiri iwu nke ga-eme ka a taa onye ọ bụla kpegaara Jehova Chineke ekpere ahụhụ. Ma Daniel jụrụ ịkwụsị ikpegara Jehova ekpere. Ị̀ ma ihe ha mere Daniel?—
Ee, ndị ọjọọ mere ka a tụba Daniel n’ime olulu ọdụm. Daniel nọ ebe ahụ nanị ya, ya na ọdụm ụfọdụ agụụ ji. Ị̀ ma ihe mezirinụ?— Daniel sịrị na ‘Chineke zitere mmụọ ozi ya, wee kpuchie ọnụ ọdụm ndị ahụ.’ Ọ dịghị ihe ọ bụla mere ya! Ndị mmụọ ozi pụrụ ime ihe ndị dị ịtụnanya maka ndị na-ejere Jehova ozi.—Daniel 6:18-22.
Gịnị ka Chineke mere iji zọpụta Daniel?
Ọ dịkwa mgbe Pita nọ n’ụlọ mkpọrọ. Ì chetara na Pita bụ enyi nke Onye Ozizi Ukwu ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst? Ọ dịghị ụfọdụ ndị mma n’obi mgbe Pita gwara ha na Jizọs bụ Ọkpara Chineke. N’ihi ya, ha tụbara Pita n’ụlọ mkpọrọ. Ndị agha nọ na-eche Pita nche ka ọ ghara ịgbapụ. Ọ̀ dị onye pụrụ inyere ya aka?—
Pita nọ na-ehi ụra n’etiti ndị nche abụọ, a tụkwara ya ị́gà n’aka. Ma Bible na-ekwu, sị: ‘Lee! mmụọ ozi Jehova bịara, ìhè malitekwara inwu n’ime ụlọ mkpọrọ ahụ. Mgbe o bitụrụ Pita aka n’akụkụ, mmụọ ozi ahụ kpọtere ya, wee sị, “Bilie ọsọ ọsọ!”’
Olee otú mmụọ ozi si nyere Pita aka isi n’ụlọ mkpọrọ pụta?
Mgbe ahụ, ị́gà a tụrụ Pita si ya n’aka dapụ! Mmụọ ozi ahụ sịkwara ya: ‘Yiri uwe gị, gbara akpụkpọ ụkwụ gị, sowe m.’ Ndị nche ahụ apụghị ịkwụsị ha n’ihi na mmụọ ozi nọ na-enyere Pita aka. Ha ruteziri n’ọnụ ụzọ ámá e ji ígwè mee, otu ihe dị ịtụnanya mekwara. Ọnụ ụzọ ámá ahụ meghere n’onwe ya! Mmụọ ozi ahụ atọhapụla Pita ka o wee nwee ike ịnọgide na-eme nkwusa.—Ọrụ 12:3-11.
Ndị mmụọ ozi Chineke hà pụrụ inyekwara anyị aka?— Ee, ha pụrụ. Nke a ọ̀ pụtara na ha agaghị ekwe ka anyị merụọ ahụ́ mgbe ọ bụla?— Ee e, ndị mmụọ ozi adịghị egbochi anyị imerụ ahụ́ ma ọ bụrụ na anyị emee ihe nzuzu. Ma, ọ bụrụgodị na anyị emeghị ihe nzuzu, anyị ka pụkwara imerụ ahụ́. A gwaghị ndị mmụọ ozi ka ha ghara ikwe ka nke a mee. Kama nke ahụ, Chineke enyewo ha ọrụ pụrụ iche ha ga na-arụ.
Bible na-ekwu banyere otu mmụọ ozi nke na-agwa ndị mmadụ n’ebe nile ka ha na-efe Chineke. (Mkpughe 14:6, 7) Olee otú mmụọ ozi ahụ si na-agwa ha nke ahụ? Ọ̀ na-eti mkpu site n’eluigwe ka mmadụ nile na-anụ ihe ọ na-ekwu?— Ee e, kama nke ahụ, ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị nọ n’ụwa na-agwa ndị ọzọ banyere Chineke, ndị mmụọ ozi ahụ na-eduzikwa ha n’ọrụ ha. Ndị mmụọ ozi ahụ na-ahụ na ndị chọrọ ịmụta banyere Chineke n’ezie nwere ohere ịnụ banyere ya. Anyị pụrụ ikere òkè n’ọrụ ime nkwusa ahụ, ndị mmụọ ozi ga-enyekwara anyị aka.
Ma, gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ndị na-ahụghị Chineke n’anya enye anyị nsogbu? Gịnị ma ha tinye anyị n’ụlọ mkpọrọ? Ndị mmụọ ozi hà ga-atọhapụ anyị?— Ha pụrụ. Ma ọ bụghị ya ka ha na-eme mgbe nile.
Gịnị ka mmụọ ozi a na-agwa Pọl?
Ọ dị mgbe onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Pọl bụ onye mkpọrọ. O ji ụgbọ mmiri na-eme njem n’oge e nwere ajọ ifufe. Ma ndị mmụọ ozi emeghị ka o nwere onwe ya ozugbo. Nke a bụ n’ihi na e nwere ndị ọzọ ọ dị mkpa ka ha nụ banyere Chineke. Otu mmụọ ozi kwuru, sị: “Atụla egwu, Pọl. Ị ghaghị iguzo n’ihu Siza.” Ee, a ga-akpọga Pọl na nke onye ọchịchị na-achị ụwa, bụ́ Siza, ka Pọl wee nwee ike ikwusara ya ozi ọma. Ndị mmụọ ozi ahụ ma ebe Pọl nọ mgbe nile, ha nyekwaara ya aka. Ha ga-enyekwara anyị aka ma ọ bụrụ na anyị na-ejere Chineke ozi n’ezie.—Ọrụ 27:23-25.
E nwere ọrụ ọzọ dị mkpa ndị mmụọ ozi ga-arụ, ha ga-arụkwa ya n’isi nso. Oge Chineke ga-eji bibie ndị ajọ mmadụ dị nnọọ nso. A ga-ebibi ndị nile na-adịghị efe ezi Chineke ahụ ofufe. Ndị na-ekwu na ha ekweghị ná ndị mmụọ ozi n’ihi na ha apụghị ịhụ ha anya ga-achọpụta na ha hiere nnọọ ụzọ.—2 Ndị Tesalonaịka 1:6-8.
Olee ihe nke ahụ ga-apụtara anyị?— Ọ bụrụ na anyị na-akwado ndị mmụọ ozi nke Chineke, ha ga-enyere anyị aka. Ma, ànyị na-akwado ha?— Anyị na-akwado ha ma ọ bụrụ na anyị na-ejere Jehova ozi. Ọ bụrụkwa na anyị na-ejere Jehova ozi, anyị ga na-agwa ndị ọzọ ka ha onwe ha kwa na-ejere ya ozi.
Iji mụtakwuo banyere otú ndị mmụọ ozi si emetụta ndụ ndị mmadụ, gụọ Abụ Ọma 34:7; Matiu 4:11, 18:10; Luk 22:43; nakwa Ọrụ 8:26-31.