Hell Mmekpọ Ọnụ Ebighị Ebi Ka Ọ̀ Bụ Ili Nkịtị?
ÀGWAWO gị na Ndị Nna Chọọchị, ndị ọkà mmụta okpukpe nke mgbe ụwa na-emepechabeghị anya, na Ndị Ome Mgbanwe rụrụ ụka na ntaramahụhụ a na-enwe na hell na-adịru ebighị ebi? Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, ọ pụrụ ịbụrụ gị ihe ijuanya ịmata na ụfọdụ ndị mmụta Bible a na-asọpụrụ n’ụzọ dị ukwuu na-ama echiche ahụ aka ugbu a. Na Britain, otu n’ime ha, bụ́ John R. W. Stott, na-ede na “Akwụkwọ Nsọ na-atụ aka n’ebe mkpochapụ dị, nakwa na ‘ntaramahụhụ ebighị ebi nke a na-anụ ụfụ ya’ bụ ozizi si n’aka fere n’aka bụ́ nke ga-enye ohere maka ikike kasị elu nke Akwụkwọ Nsọ.”—Essentials—A Liberal-Evangelical Dialogue.
Gịnị dugara ya n’ikwubi na ntaramahụhụ ebighị ebi abụghị nke dabeere na Bible?
Ihe Mmụta nke Asụsụ
Ihe ịrụ ụka mbụ ya metụtara asụsụ. Ọ na-akọwa na mgbe Bible na-ezo aka n’akụkụ ikpeazụ nke ọmụma ikpe (“Gehena”; lee igbe, peji nke 8), ọ na-ejikarị okwu bụ́ “mbibi” na-eme ihe, “ngwaa bụ́ apollumi (ibibi ihe) na mkpọaha bụ apòleia (mbibi)” nke asụsụ Grik. Okwu ndị a hà na-ezo aka ná ntaramahụhụ? Stott na-eme ka ọ pụta ìhè na mgbe ngwaa okwu ahụ bụ́ nke na-egosi ime ihe, na ihe e mere ihe ahụ, “apollumi” pụtara “igbu.” (Matiu 2:13; 12:14; 21:41) Otú a, na Matiu 10:28, ebe nsụgharị King James Version na-ekwu okwu banyere Chineke ibibi “ma mkpụrụ obi ma ahụ n’ime hell,” echiche dị n’ime ya bụ ibibi n’ọnwụ, ọ bụghị n’ịta ahụhụ ebighị ebi. Na Matiu 7:13, 14, Jisọs mere ka e nwee ọdịiche “n’ọnụ ụzọ dị warara . . . nke na-eduba ná ndụ” na “obosara . . . ọnụ ụzọ . . . nke na-eduba n’ịla n’iyi.” Stott na-ekwu, sị: “N’ihi ya, ọ ga-eyi ihe na-atụ n’anya ma ọ bụrụ na ndị a sị na ha na-ata ahụhụ mbibi bụ n’ezie ndị a na-ebibighị ebibi.” N’inwe ezi ihe kpatara ya, o ruru ná nkwubi okwu bụ: “Ọ bụrụ na igbu mmadụ bụ ịnapụ anụ ahụ ndụ, hell yiri ka ọ ga-abụ nnapụ nke ndụ nke anụ ahụ na nke ime mmụọ, ya bụ, mbipụ nke ịdị adị.”—Essentials, peji nke 315-316.
Ịkọwa Ihe Onyinyo Dị Iche Iche nke Ọkụ Na-enwusi Ike
Ka ọ ka dị, ọtụtụ ndị okpukpe ga-ekwenyere ihe onye isi oche chọọchị Southern Baptist Convention bụ́ Morris H. Chapman, bụ́ onye kwuru, sị: “M na-ekwusa banyere hell nkịtị.” O kwukwara, sị: “Bible na-akpọ ya ‘ọdọ ọkụ ahụ,’ echeghịkwa m na a pụrụ ịtụkwasị ihe ná nkọwa ahụ.”
N’ezie ihe atụ nke ọkụ bụ́ nke e ji mee ihe na Bible pụrụ ịkpali ihe onyinyo nke ntaramahụhụ n’uche. Otú ọ dị, akwụkwọ bụ́ Essentials na-ekwu, sị: “Ọ bụ ihe a na-adịghị arụ ụka n’ihi na anyị nile enwewo ahụmahụ nke oké ahụ ụfụ nke ịbụ onye ọkụ hụrụ, n’ime uche anyị ọkụ ahụ nwere ihe njikọ n’ebe ‘ntaramahụhụ a na-anụ ụfụ ya’ dị. Ma ọrụ bụ isi nke ọkụ abụghị ịkpata ahụ ụfụ, kama ọ bụ iji hụ na e nwere mbibi, dị ka ebe nile a na-esu ihe ọkụ n’ụwa na-agba àmà ya.” (Peji nke 316) Iburu n’uche ọdịiche ahụ dị mkpa ga-enyere gị aka izere ịghọta ihe dị iche n’ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, bụ́ nke na-adịghị n’ebe ahụ n’eziokwu. Ụfọdụ ihe atụ:
Banyere ndị ahụ a tụbara n’ime Gehena, Jisọs kwuru na ‘n’ebe ahụ ikpuru nke na-eri ha adịghị anwụ, ọkụ anyụghịkwa anyụ.’ (Mak 9:47, 48) N’ịbụ ndị okwu ndị ahụ dị n’akwụkwọ ahụ a na-edeghị n’ike mmụọ nsọ bụ́ Judith nwere mmetụta n’echiche ha (“Ọ ga-ezite ọkụ na ikpuru n’anụ ahụ ha, ha ga-akwakwa ákwá n’ihi ahụ ụfụ ruo mgbe ebighị ebi.”—Judith 16:17, The Jerusalem Bible), akwụkwọ nkọwa ụfọdụ nke Bible na-ekwu na okwu Jisọs na-egosi ntaramahụhụ ebighị ebi. Otú ọ dị, akwụkwọ ahụ a na-edeghị n’ike mmụọ nsọ bụ́ Judith, nke ihe dị n’ime ya na-esighị n’uche Chineke pụta, abụghị ihe mgbakwasị ụkwụ maka ikpebi ihe ihe odide nke Mak pụtara. Aịsaịa 66:24, bụ́ akụkụ akwụkwọ nsọ nke o yiri ka Jisọs ò zoro aka na ya, na-ekwu na ọkụ na ikpuru ahụ na-ebibi anụ ahụ ndị ahụ nwụrụ anwụ (“ozu nile,” ka Aịsaịa na-ekwu) nke ndị iro Chineke. A kpọtụghị aha ntaramahụhụ a na-anụ ụfụ ya bụ́ nke na-adịru ebighị ebi ma n’okwu ndị ahụ nke Aịsaịa ma ọ bụ na ndị ahụ Jisọs kwuru. Okwu ihe atụ nke ọkụ na-anọchi anya mbibi ebighị ebi.
Mkpughe 14:9-11 na-ekwu banyere ụfọdụ ndị bụ́ ndị “a ga-ejikwa ọkụ na brimstone mekpaa [ha] ahụ . . . anwụrụ ọkụ nke mmekpa ahụ ha na-arịgo ruo mgbe nile ebighị ebi.”a Nke a ọ̀ na-egosipụta ntaramahụhụ a na-anụ ụfụ ya n’ime ọkụ ala mmụọ? N’ezie, nanị ihe akụkụ okwu nke a na-ekwu bụ na a na-ata ndị ajọ omume ahụhụ, ọ bụghị na a na-ata ha ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi. Akụkụ ihe odide ahụ na-ekwu na ọ bụ anwụrụ ọkụ—ihe àmà nke na-egosi na ọkụ arụwo ọrụ ya nke mbibi—na-adịru ebighị ebi, ọ bụghị ntaramahụhụ ọkụ ahụ.
Mkpughe 20:10-15 na-ekwu na n’ime “ọdọ ọkụ na brimstone, . . . a ga-emekpakwa ha ahụ ehihie na abalị ruo mgbe nile ebighị ebi.” Na nke mbụ a gụrụ ya, nke a pụru iyi ihe na-egosipụta na e nwere ntaramahụhụ ọkụ nke a na-anụ ụfụ ya bụ́ nke na-adịru ebighị ebi, ma n’ezie ọ bụghị. N’ihi gịnị? Tinyere ihe ndị ọzọ kpatara ya, “anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ahụ” na “ọnwụ na Hedis” ga-ejedebe n’ime ihe a kpọrọ n’ebe a “ọdọ ọkụ ahụ.” Dị ka ọ pụrụ ịdịrị gị mfe ikwubi, anụ ọhịa ahụ, onye amụma ụgha ahụ, ọnwụ, na Hedis abụghị ndị mmadụ nkịtị; n’ihi ya, ha apụghị ịnụ ụfụ nke ntaramahụhụ. Kama nke ahụ, dị ka G. B. Caird na-ede n’akwụkwọ bụ́ A Commentary on the Revelation of St. John the Divine, “ọdọ ọkụ ahụ” pụtara “ịpụ n’ịdị adị na nchefu zuru ezu.” Nghọta nke a kwesịrị ịbụ nke e nwetara n’ụzọ dị mfe, n’ihi na Bible n’onwe ya na-ekwu banyere ọdọ ọkụ nke a, sị: “Nke a bụ ọnwụ nke abụọ ahụ, bụ́ ọdọ ọkụ ahụ.”—Mkpughe 20:14.
Ikewa Ejima nke Nkà Mmụta Okpukpe
N’agbanyeghị ihe ịrụ ụka ndị a, ọtụtụ ndị kwere n’ozizi ahụ na-ekwesi olu ike na “mbibi” apụtaghị ihe okwu ahụ na-ekwu kama ọ pụtara ntaramahụhụ ebighị ebi. N’ihi gịnị? Ihe mere ha ji enwe echiche ahụ bụ ozizi okpukpe nke ya na ọkụ ala mmụọ bụ ejima—bụ́ ozizi nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ. Ebe ọ bụkwa na chọọchị ha emewo ka ejima ndị a tolite ruo ọtụtụ narị afọ, ha pụrụ iche na ihe akụkụ ihe odide ndị na-ekwu banyere mbibi na-ekwu n’ezie pụtara ntaramahụhụ ebighị ebi. Ekwuwerịị, mkpụrụ obi mmadụ nke na-adịghị anwụ anwụ apụghị ịkwụsị ịdị adị—ma ọ bụ ọ bụ otú a ka ọtụtụ ndị cheworo.
Ma rịba ama ihe onye ụkọchukwu Anglikan bụ́ Philip E. Hughes kwuru: “Ịrụ ụka na mkpụrụ obi mmadụ bụ nanị ihe dị n’ime nke na-adịghị anwụ anwụ bụ ịnọgide na-eguzo n’ebe na-enweghị nkwado ná nkụzi nke Akwụkwọ Nsọ, n’ihi na ná nkọwa nke Bible, ọdịdị nke mmadụ bụ nke a na-ahụkarị dị ka nke e jikọtara ma nke ime mmụọ ma nke anụ ahụ. . . . Ịdọ aka ná ntị Chineke ná mmalite banyere osisi ahụ a machibidoro iwu, ‘N’ụbọchị ahụ nke ị ga-eri site na ya ị ga-anwụ,’ bụ nke a gwara mmadụ dị ka ihe e kere eke nke nwere ọnọdụ nke anụ ahụ na ime mmụọ—ma ọ bụrụ na o rie site na ya, ọ bụ n’ọnọdụ dị otú ahụ ka ọ ga-anwụ. Ọ dịghị ihe na-atụ aro na ọ dị akụkụ ya nke na-adịghị anwụ anwụ, na n’ihi ya na ịnwụ ọnwụ ya ga-abụ n’otu akụkụ nanị.”—The True Image—The Origin and Destiny of Man in Christ.
N’otu aka ahụ, onye ọkà mmụta okpukpe bụ́ Clark Pinnock na-ekwu, sị: “Echiche nke a [na mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ anwụ] enwewo mmetụta n’ebe nkà mmụta okpukpe dị eri ogologo oge nke ukwuu, ma ọ dịghị na Bible. Bible adịghị akụzi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi dị ka okike si dị.” Ezikiel 18:4, 20 na Matiu 10:28 na-akwado nke a. Ọzọ, Jisọs n’onwe ya kwuru okwu banyere enyi ya nwụrụ anwụ bụ Lazarọs dị ka onye “daworo n’ụra,” ma ọ bụ nọ n’ụra. Jisọs kwuru na ọ gaje ‘ịkpọte ya n’ụra.’ (Jọn 11:11-14) Ya mere mmadụ ahụ, ma ọ bụ mkpụrụ obi ahụ bụ́ mmadụ, bụ́ Lazarọs anwụwo, ma ọbụna mgbe oge ụfọdụ gasịrị, a pụrụ ịkpọlite ya n’ọnwụ, weghachi ya ná ndụ ọzọ. Ihe ndị mere eme na-egosipụta nke ahụ. Jisọs kpọlitere Lazarọs site ná ndị nwụrụ anwụ.—Jọn 11:17-44.
Olee otú isi ihe ndị a si emetụta ozizi nke ntaramahụhụ ebighị ebi? Laa azụ na narị afọ nke 17, onye na-ede edemede bụ́ William Temple kwuru, sị: “E nwere [akụkụ akwụkwọ nsọ] ndị na-ekwu banyere ịbụ ihe a tụbara n’ọkụ na-adịghị anyụ anyụ. Ma ọ bụrụ na anyị atụleghị ndị a na-eburu n’uche na ihe a tụbara otú a bụ ihe a na-apụghị ibibi ebibi, anyị ga-enwe echiche nke na a ga-ebibi ya, ọ bụghị na ọkụ ga-ere ya ruo ebighị ebi.” Ntụle ahụ ziri ezi ka bụkwa eziokwu, n’ihi na ọ bụ ihe Bible na-akụzi n’ezie.
N’ụzọ a na-apụghị ịgọnahụ agọnahụ, i nwere ihe ndị na-arụgide arụgide mere ị ga-eji rụọ echiche nke ntaramahụhụ a na-anụ ụfụ ya nke na-adịru ebighị ebi n’ime hell ụka. Ma ọ bụ ma eleghị anya ị chọrọ ịgabiga ịjụ nanị ajụjụ ma gbasoo okwu ndụmọdụ nke onye profesọ nke nkà mmụta okpukpe bụ́ Pinnock, bụ́ onye sịrị: “Usoro dum nke nkwenkwe gbara hell gburugburu, tinyere mmekpọ ọnụ na-adịghị agwụ agwụ, . . . bụ nke e kwesịrị iwezụga ná ndabere nke ozizi ndị ziri ezi.” Ee, omume ọma, ikpe ziri ezi, na—nke kasị mkpa—Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-agwa gị ka i mee nnọọ nke ahụ.
Ọ bụrụ na i mee otú a, ị ga-ahụ na ihe bụ ọdịdị nke hell n’ezie ziri ezi. Ị pụrụ ịchọta ihe ọmụma na-enye aka n’isiokwu nke a n’ime akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala.b Biko jụọ maka ya mgbe i zutere Ndịàmà Jehova. Gụọ isi akwụkwọ ndị bụ “Gịnị Na-eme n’Ọnwụ?” “Hell—Ọ̀ Dị Adị n’Ezie?” na “Mbilite n’Ọnwụ—Maka Ole Ndị, n’Olee Ebe?” Ị ga-achọpụta na ọdịdị nke hell n’ezie abụghị nanị nke ziri ezi kama nke na-ekwekwa nkwa.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’akụkụ okwu nke a nke Bible, ‘iji ọkụ mekpaa ahụ’ na-ezo aka n’ụzọ bụ isi ná ntaramahụhụ ime mmụọ, ma bụrụ nke na-agwụ agwụ. Iji nwetakwuo nkọwa, lee akwụkwọ Revelation—Its Grand Climax At Hand! nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Igbe dị na peeji nke 8]
ỊKỌWA OKWU NDỊ AHỤ
N’isiokwu a okwu ndị ahụ bụ́ “hell” na “ọkụ ala mmụọ” dị ka ndị ọkà mmụta okpukpe na Krisendọm si eji ya eme ihe na-ezo aka n’okwu Grik bụ́ geʹen·na, bụ́ nke pụtara ugbo 12 n’ime “Agba Ọhụrụ.” (Matiu 5:22, 29, 30; 10:28; 18:9; 23:15, 33; Mak 9:43, 45, 47; Luk 12:5; Jemes 3:6) Ọ bụ ezie na ọtụtụ nsụgharị Bible sụgharịrị okwu Grik nke a ịbụ “hell,” nsụgharị ndị ọzọ ji mkpụrụ akwụkwọ nke asụsụ ha degharịa ya ịbụ “Gehena.” Ya na “ọnwụ nke abụọ ahụ, bụ́ ọdọ ọkụ ahụ,” bụ́ ihe atụ nke mbibi ebighị ebi nke a na-achọta n’akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, nwere nkwekọ.—Mkpughe 20:14.
Banyere okwu abụọ ndị ọzọ a sụgharịrị ịbụ “hell” mgbe ụfọdụ, akwụkwọ ahụ bụ́ A Dictionary of the Bible (1914), nke William Smith haziri mbipụta ya na-ekwu, sị: “Hell . . . bụ okwu ndị nsụgharị anyị ji mee ihe n’ozuzu na n’ụzọ dị imere ebere n’ịsụgharị okwu Hibru ahụ bụ́ Sheol. Ma eleghị anya ọ gaara aka mma ịhapụ ka okwu Hibru ahụ bụ́ Sheol dịrị, ma ọ bụ ọ bụkwanụ sụgharịa ya mgbe nile dị ka ‘ili’ ma ọ bụ ‘olulu’. . . . N’ime A[gba] Ọ[hụrụ], okwu ahụ bụ́ Hedis, dị ka Sheol, mgbe ụfọdụ pụtara nanị ‘ili’ . . . Ọ bụ n’echiche nke a ka nkwupụta okwukwe ahụ ji na-asị banyere Onyenwe anyị ‘Ọ rịdara gaa hell,’ nke pụtara ọnọdụ nke ndị nwụrụ anwụ n’ozuzu ha.”
N’adịghị ka Gehena, nke bụ ihe atụ nke mbibi ebighị ebi, Sheol na Hedis na-ezo aka n’ọnwụ n’ime ili nke ọha ihe a kpọrọ mmadụ, na-enwe olileanya nke ịbụ onye a kpọlitere gaa ná ndụ ọzọ.—Mkpughe 20:13.
[Foto dị na peeji nke 9]
Jisọs kpọtere Lazarọs site n’ụra nke ọnwụ