-
Iwu KraịstỤlọ Nche—1996 | Septemba 1
-
-
Iwu Kraịst
“Anọ m n’okpuru iwu n’ebe Kraịst nọ.”—1 NDỊ KỌRINT 9:21.
1, 2. (a) Olee otú a gaara esi gbochie ọtụtụ n’ime ihie ụzọ nke ihe a kpọrọ mmadụ? (b) Gịnị ka Krisendọm na-amụtaghị site n’akụkọ ihe mere eme nke okpukpe ndị Juu?
“NDỊ mmadụ na gọọmenti dị iche iche amụtabeghị ihe ọ bụla site n’akụkọ ihe mere eme, ma ọ bụ jiri ụkpụrụ ndị e si na ya nweta mee ihe.” Ọ bụ ihe onye Germany bụ́ onye ọkà ihe ọmụma na narị afọ nke 19 kwuru. N’ezie, a kọwawo otú akụkọ ihe mere eme nke ụmụ mmadụ si aga dị ka “njem nzuzu,” ọtụtụ mmehie ihe na ọdachi ndị jọgburu onwe ha, ndị a gaara egbochiworị ọtụtụ n’ime ha a sị na ihe a kpọrọ mmadụ dị nnọọ njikere ịmụta ihe site n’ihie ụzọ ndị gara aga.
2 Otu ọjụjụ ahụ a jụrụ ịmụta ihe site n’ihie ụzọ ndị gara aga na-apụta ná ntụle a na-atụle iwu Chineke. Jehova Chineke ji ọbụna iwu ka mma—iwu Kraịst—dochie anya Iwu Mosis. Ma, ndị ndú Krisendọm, ndị na-azọrọ ịkụzi na ibi ndụ kwekọrọ n’iwu a, amụtabeghị ihe site n’ajọ nzuzu nke ndị Farisii. Ya mere Krisendọm ahịgharịwo ma metọọ iwu Kraịst dị nnọọ ka okpukpe ndị Juu mere Iwu Mosis. N’ụzọ dị aṅaa? Nke mbụ, ka anyị tụlee iwu a n’onwe ya—ihe ọ bụ, ndị ọ na-achị na ụzọ o si achị ha, na ihe mere ka ọ dị iche n’ebe Iwu Mosis dị. Mgbe ahụ anyị ga-atụle otú Krisendọm siworo metọọ ya. Ka anyị si otú a mụta ihe site n’akụkọ ihe mere eme ma rite uru site na ya!
Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Ahụ
3. Nkwa dị aṅaa ka Jehova kwere banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ?
3 Ònye ma e wezụga Jehova Chineke nwere ike imeziwanye Iwu zuru okè? Ọgbụgba ndụ Iwu Mosis ahụ zuru okè. (Abụ Ọma 19:7) N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova kwere nkwa, sị: “Lee, ụbọchị na-abịa, . . . mgbe Mụ na ụlọ Israel na ụlọ Juda ga-agba ọgbụgba ndụ ọhụrụ: ọ bụghị dị ka ọgbụgba ndụ ahụ si dị nke Mụ na ndị bụ nna ha gbara.” E dere Iwu Iri ahụ—isi sekpụ ntị n’Iwu Mosis ahụ—n’elu mbadamba nkume. Ma banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, Jehova kwuru, sị: “M ga-etinye iwu m n’ime ha, ọ bụkwa n’obi ha ka M ga-edekwasị ya.”—Jeremaịa 31:31-34.
4. (a) Olee Israel nke so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? (b) Olee ndị ọzọ nọ n’okpuru iwu Kraịst ma e wezụga Israel ime mmụọ?
4 Ole ndị ka a ga-akpọbata n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ a? N’ezie ọ bụghị “ụlọ Israel” nkịtị, bụ́ ndị jụrụ Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ a. (Ndị Hibru 9:15) Ee e, “Israel” ọhụrụ a ga-abụ “Israel nke Chineke,” mba nke ndị Israel ime mmụọ. (Ndị Galetia 6:16; Ndị Rom 2:28, 29) “Oké ìgwè mmadụ” si ná mba nile bụ́ ndị ga-achọkwa ife Jehova ga-emesịa sonyere ntakịrị ìgwè a nke ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. (Mkpughe 7:9, 10; Zekaraịa 8:23) Ọ bụ ezie na ha esoghị n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, iwu jikwa ndị a. (Tụlee Levitikọs 24:22; Ọnụ Ọgụgụ 15:15.) Dị ka “otu ìgwè atụrụ” n’okpuru “otu Onye ọzụzụ atụrụ,” ha nile ga-anọ “n’okpuru iwu n’ebe Kraịst nọ,” dị ka Pọl onyeozi dere. (Jọn 10:16; 1 Ndị Kọrint 9:21) Pọl kpọrọ ọgbụgba ndụ ọhụrụ a “ọgbụgba ndụ ka mma.” N’ihi gịnị? Otu bụ na ọ dabeere ná nkwa ndị e mezuru kama ịbụ n’onyinyo nke ihe ndị gaje ịbịa.—Ndị Hibru 8:6; 9:11-14.
5. Gịnị bụ nzube nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, gịnịkwa mere ọ ga-eji gaa nke ọma?
5 Gịnị bụ nzube nke ọgbụgba ndụ a? Ọ bụ iwepụta mba nke ndị eze na ndị nchụàjà iji gọzie ihe nile a kpọrọ mmadụ. (Ọpụpụ 19:6; 1 Pita 2:9; Mkpughe 5:10) Ọgbụgba ndụ Iwu Mosis ahụ adịghị mgbe o wepụtara mba a n’echiche kasị zuo ezu, n’ihi na Israel n’ozuzu ha nupụrụ isi wee tụfuo ohere ha. (Tụlee Ndị Rom 11:17-21.) Otú ọ dị, ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ aghaghị ịga nke ọma, n’ihi na e jikọtara ụdị iwu dị nnọọ iche. Ọ̀ dị iche n’ụzọ dịgasị aṅaa?
Iwu nke Inwe Onwe
6, 7. Olee otú iwu Kraịst si enye nnwere onwe dị ukwuu karịa ka Iwu Mosis nyere?
6 Ugboro ugboro a na-ejikọta iwu Kraịst na nnwere onwe. (Jọn 8:31, 32) E zoro aka n’ebe ọ dị dị ka “iwu nke inwe onwe onye” na “iwu zuru okè, bụ iwu nke inwe onwe.” (Jemes 1:25; 2:12) N’ezie, nnwere onwe nile n’etiti ụmụ mmadụ bụ nke a kpaara ókè. N’agbanyeghị nke ahụ, iwu a na-enye nnwere onwe ka nnọọ ukwuu karịa nke bu ya ụzọ, bụ́ Iwu Mosis. N’ụzọ dị aṅaa?
7 Otu bụ na ọ dịghị onye a na-amụnye n’okpuru iwu Kraịst. Ihe ndị dị ka agbụrụ na ebe a mụrụ mmadụ adịghị mkpa. Ezi ndị Kraịst na-eji onwe ha ahọrọ n’ime obi ha ịnakwere yoke nke irube isi n’iwu a. N’ime otú a, ha na-ahụ na ọ bụ yoke na-adịghị egbu mgbu, ibu dị mfe. (Matiu 11:28-30) E kwuwerị, a hazikwara Iwu Mosis ahụ ịkụziri mmadụ na ọ na-eme mmehie ma nwee oké mkpa nke àjà mgbapụta iji gbapụta ya. (Ndị Galetia 3:19) Iwu Kraịst na-akụzi na Mesaịa ahụ abịawo, jiri ndụ ya kwụọ ụgwọ mgbapụta ahụ, wee meghee ụzọ ka a tọhapụ anyị ná mmegbu ọjọọ nke mmehie na ọnwụ! (Ndị Rom 5:20, 21) Iji rite uru, ọ dị anyị mkpa ‘inwe okwukwe’ n’àjà ahụ.—Jọn 3:16.
8. Gịnị ka iwu Kraịst na-agụnye, ma gịnị mere ibi ndụ kwekọrọ na ya na-ejighị chọọ iburu ọtụtụ narị ntụzi n’isi?
8 ‘Inwe okwukwe’ na-agụnye ibi ndụ kwekọrọ n’iwu Kraịst. Nke ahụ na-agụnye irube isi n’iwu Kraịst nile. Nke a ọ̀ pụtara iburu ọtụtụ narị iwu na ntụzi n’isi? Ee e. Ọ bụ ezie na Mosis, bụ́ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ochie ahụ, deturu Iwu Mosis, Jisọs, bụ́ Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, edetughị otu mkpụrụ iwu. Kama nke ahụ, o biri ndụ kwekọrọ n’iwu a. Site n’ụzọ ndụ ya zuru okè, ọ tọgbọrọ ihe nlereanya ka mmadụ nile gbasoo. (1 Pita 2:21) Ikekwe ọ bụ ya mere e ji zoo aka n’ofufe nke ndị Kraịst oge mbụ dị ka “Ụzọ.” (Ọrụ 9:2; 19:9, 23; 22:4; 24:22) Nye ha, e nyere ihe atụ nke iwu Kraịst ná ndụ Kraịst. Iṅomi Jisọs bụ irube isi n’iwu a. Ịhụnanya siri ike ha nwere n’ebe ọ nọ pụtara na e dere iwu a n’ezie n’ime obi ha, dị ka e buru n’amụma. (Jeremaịa 31:33; 1 Pita 4:8) Onye na-erubekwa isi n’ihi ịhụnanya adịghị eche na a na-emegbu ya—ihe ọzọ mere a pụrụ iji kpọọ iwu Kraịst “iwu nke inwe onwe onye.”
9. Gịnị bụ nnọọ ihe kasị mkpa n’iwu Kraịst, oleekwa ụzọ iwu a si metụta iwu ọhụrụ?
9 Ọ bụrụ na ịhụnanya dị mkpa n’Iwu Mosis, ọ bụ ihe kasị mkpa n’iwu ndị Kraịst. Ya mere iwu Kraịst na-agụnye iwu ọhụrụ—ndị Kraịst ga-enwe ịhụnanya iji onwe onye achụ àjà maka ibe ha. Ha ga-ahụ n’anya dị ka Jisọs hụrụ; o ji ọchịchọ obi tọgbọ ndụ ya n’ihi ndị enyi ya. (Jọn 13:34, 35; 15:13) Ya mere a pụrụ ikwu na iwu Kraịst bụ ọbụna ngosipụta ka mma nke ọchịchị Chineke karịa otú Iwu Mosis bụ. Dị ka magazin a meworo ka ọ pụta ìhè na mbụ: “Ọchịchị Chineke bụ ịchịisi nke Chineke; Chineke bụ ịhụnanya; n’ihi ya ọchịchị Chineke bụ ịchịisi site n’ịhụnanya.”
Jisọs na Ndị Farisii
10. Olee otú izi ihe Jisọs si dị iche na nke ndị Farisii?
10 Ya bụrụ otú ahụ ọ bụghị ihe ijuanya na Jisọs na ndị ndú okpukpe ndị Juu nke oge ya kwatara. “Iwu zuru okè, bụ iwu nke inwe onwe” abatatụghị ma ọlị n’uche ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii. Ha gbalịrị ịchịkwa ndị ahụ site n’iwu nduzi ndị mmadụ mere. Ozizi ha ghọrọ nke mmegbu, nke nkatọ, nke na-adịghị mma. N’ụzọ dị nnọọ iche, ozizi Jisọs na-ewuli elu ma baa uru nke ukwuu! Ọ ghọtara ọnọdụ ndị dịnụ ma leba anya ná mkpa na nchegbu ndị mmadụ nwere n’ezie. O ziri ihe n’ụzọ dị mfe ma jiri ezi mmetụta, na-eji ihe atụ ndị sitere ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị ma na-eji ikike nke Okwu Chineke eme ihe. N’ihi ya, “ibobo ozizi Ya nwụrụ ìgwè mmadụ nile n’ahụ.” (Matiu 7:28) Ee, izi ihe Jisọs ruru ha n’obi!
11. Olee otú Jisọs si gosi na e kwesịrị ijiworị ezi uche na ebere tinye Iwu Mosis ahụ n’ọrụ?
11 Kama ịtụkwasịkwu iwu nduzi n’elu Iwu Mosis, Jisọs gosiri otú ndị Juu kwesịrị isiworị na-etinye Iwu ahụ n’ọrụ eri oge—n’ezi uche na ebere. Cheta, dị ka ihe atụ, mgbe nwanyị na-arịa oruru ọbara bịakwutere ya. Dị ka Iwu Mosis si kwuo, onye ọ bụla nwanyị ahụ metụrụ aka ga-aghọ onye na-adịghị ọcha, ya mere o kwesịghị n’ezie iso ìgwè mmadụ na-emekọ! (Levitikọs 15:25-27) Ma ọ na-achọsi ike ka a gwọọ ya nke na ọ gabigara n’etiti ìgwè mmadụ ahụ wee metụ uwe Jisọs aka. Oruru ọbara ahụ kwụsịrị ozugbo. Ọ̀ baara ya mba maka imebi Iwu ahụ? Ee e; kama nke ahụ, ọ ghọtara ajọ ọnọdụ ya wee gosipụta ụkpụrụ kachasịnụ n’Iwu ahụ—ịhụnanya. N’ọmịiko ọ sịrị ya: “Nwa m nwanyị, okwukwe gị azọpụtawo gị; laa n’udo, si n’ajọ ọrịa gị nwee ahụ dị ike.”—Mak 5:25-34.
Iwu Kraịst Ọ̀ Na-enye Ohere Mmadụ Ime Otú Masịrị Ya?
12. (a) Gịnị mere na anyị ekwesịghị iche na Kraịst na-enye mmadụ ohere ime otú masịrị ya? (b) Gịnị na-egosi na imepụta ọtụtụ iwu na-eduje n’imepụta ọtụtụ ụzọ isi zere iwu?
12 Ànyị kwesịziri ikwubi na n’ihi na iwu Kraịst bụ nke “inwe onwe,” na ọ na-enye ohere mmadụ ime otú masịrị ya, ebe ndị Farisii, ji ọdịnala ha nile a na-edeghị ede, ma ọ dịghị ihe ọzọ kpaara àgwà ndị mmadụ ókè n’ụzọ siri ike? Ee e. Usoro iwu ndị e nwere taa na-egosi ọtụtụ mgbe na ka a na-enwekwu iwu, otú a ka ndị mmadụ na-achọtakwu ụzọ isi zere ha.a N’oge Jisọs, ịba ụba nke iwu ndị Farisii kpaliri ịchọ ụzọ isi zere ha, ịrụ ọrụ ndị ịhụnanya na-adịghị na ha iji mezuo iwu, na ịzụlite ọdịdị ezi omume onwe onye a na-ahụ anya iji zochie ịrụ arụ dị n’ime.—Matiu 23:23, 24.
-
-
Ibi Ndụ Kwekọrọ n’Iwu KraịstỤlọ Nche—1996 | Septemba 1
-
-
Ibi Ndụ Kwekọrọ n’Iwu Kraịst
“Na-eburịtanụ ibu na-anyị ibe unu, na-edebezukwanụ iwu Kraịst n’ụzọ dị otú a.”—NDỊ GALETIA 6:2.
1. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na iwu Kraịst bụ ikike dị ukwuu maka ime ihe ọma taa?
NA Rwanda, Ndịàmà Jehova bụ́ ndị Hutu na ndị Tutsi tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ iji chebe ibe ha pụọ n’ogbugbu ndị agbụrụ ọzọ nke tiwapụrụ n’ala ahụ na nso nso a. Ndịàmà Jehova nọ na Kobe, Japan, bụ́ ndị ndị ezinụlọ ha nwụrụ n’ala ọma jijiji ahụ bibiri oké ihe bụ ndị mfu ha metụtara nke ukwuu. Ma, ha mere ihe ozugbo iji napụta ndị ọzọ o metụtara. Ee, ihe atụ na-ekpo obi ọkụ ndị sitere gburugburu ụwa na-egosi na iwu Kraịst dị irè taa. Ọ bụ ike dị ukwuu nke na-akpali ime ihe ọma.
2. Olee otú Krisendọm na-esighị ghọta isi ihe nke iwu Kraịst, oleekwa otú anyị pụrụ isi debezuo iwu ahụ?
2 N’otu mgbe ahụ, a na-emezu otu amụma Bible banyere “mgbe ikpeazụ” ndị a dị oké egwu. Ọtụtụ ndị nwere “ụdị nke nsọpụrụ Chineke” ma ha “agọwo ike ya.” (2 Timoti 3:1, 5) Karịsịa n’ime Krisendọm, ọtụtụ mgbe okpukpe bụ ihe imezu iwu, ọ bụghị ihe si n’obi. Nke ahụ ọ̀ bụ n’ihi na o sibigara ike ókè ibi ndụ kwekọrọ n’iwu Kraịst? Ee e. Jisọs agaghị enye anyị iwu a na-apụghị ịgbaso. Krisendọm aghọtaghị nnọọ isi ihe nke iwu ahụ. Ọ ṅaghị ntị n’okwu ndị a sitere n’ike mmụọ nsọ: “Na-eburịtanụ ibu na-anyị ibe unu, na-edebezukwanụ iwu Kraịst n’ụzọ dị otú a.” (Ndị Galetia 6:2) Anyị ‘na-edebezu iwu Kraịst’ site n’iburịta ibu na-anyị ibe anyị, ọ bụghị site n’iṅomi ndị Farisii na ịtụkwasị ihe n’ibu ụmụnna anyị n’ụzọ na-ezighị ezi.
3. (a) Gịnị bụ ụfọdụ n’ime iwu ndị so n’iwu Kraịst? (b) N’ihi gịnị ka ọ na-agaghị eji zie ezie ikwubi na ọgbakọ ndị Kraịst ekwesịghị inwe ụkpụrụ nduzi ọ bụla ma e wezụga iwu ndị Kraịst nyere n’onwe ya?
3 Iwu Kraịst na-agụnye iwu nile Kraịst Jisọs nyere—ma ọ bụ ime nkwusa na izi ihe, ime ka anya dị ọcha ma na-elegide otu ebe, ịrụ ọrụ n’ịnọgide na-eso onye agbata obi anyị na-adị n’udo, ma ọ bụ iwepụ adịghị ọcha n’ime ọgbakọ. (Matiu 5:27-30; 18:15-17; 28:19, 20; Mkpughe 2:14-16) N’ezie, iwu ji ndị Kraịst idebe iwu nile dị n’ime Bible ndị e nyere ụmụazụ Kraịst. E nwekwara ihe ndị ọzọ. Nzukọ Jehova, nakwa ọgbakọ nke ọ bụla, aghaghị iguzobe iwu na usoro ndị dị mkpa nke isi eme ihe iji chekwaa ezi ịdị n’usoro. (1 Ndị Kọrint 14:33, 40) Leenụ, ndị Kraịst apụghị ọbụna izukọta ọnụ ma ọ bụrụ na ha enweghị ụkpụru nduzi banyere mgbe, ebe, na ụzọ isi duzie nzukọ ndị dị otú ahụ! (Ndị Hibru 10:24, 25) Ikwenyere ụkpụrụ nduzi ezi uche dị na ha nke ndị e nyere ikike n’ime ọgbakọ guzobere bụkwa otu akụkụ nke idebezu iwu Kraịst.—Ndị Hibru 13:17.
4. Gịnị bụ ikike na-akpali ofufe dị ọcha?
4 Ka o sina dị, ezi ndị Kraịst adịghị ekwe ka ofufe ha ghọọ usoro iwu na-enweghị isi. Ha adịghị ejere Jehova ozi nanị n’ihi na otu onye ma ọ bụ nzukọ na-agwa ha ka ha mee otú ahụ. Kama nke ahụ, ike na-akpali ofufe ha bụ ịhụnanya. Pọl dere, sị: “Ịhụnanya Kraịst na-erugide anyị.” (2 Ndị Kọrint 5:14, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Jisọs nyere ụmụazụ ya iwu ịhụ ibe ha n’anya. (Jọn 15:12, 13) Ịhụnanya nke iji onwe onye achụ àjà bụ ebe ndabere nke iwu Kraịst, ọ na-arụgidekwa ma ọ bụ na-akpali ezi ndị Kraịst n’ebe nile, ma n’ime ezinụlọ ma n’ime ọgbakọ. Ka anyị hụ ụzọ o si eme ya.
N’ime Ezinụlọ
5. (a) Olee otú ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi debezuo iwu Kraịst n’ebe obibi? (b) Gịnị ka ụmụaka chọrọ site n’aka ndị mụrụ ha, ihe mgbochi ndị dịkwa aṅaa ka ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ na-aghaghị imeri iji nye ya?
5 Pọl onyeozi dere, sị: “Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu n’anya, dị ka Kraịst anyị hụkwara nzukọ Ya n’anya, rarakwa Onwe ya nye n’ihi ya.” (Ndị Efesọs 5:25) Mgbe di ṅomiri Kraịst ma jiri ịhụnanya na nghọta mesoo nwunye ya, ọ na-emezu akụkụ dị mkpa nke iwu Kraịst. Ọzọkwa, Jisọs gosipụtara mmetụta ịhụnanya n’ebe ụmụaka nọ n’ezoghị ya ezo, na-ekuru ha n’aka ya, na-ebikwasị ha aka ya abụọ, ma na-agọzi ha. (Mak 10:16) Ndị nne na nna na-edebe iwu Kraịst na-egosikwa mmetụta ịhụnanya n’ebe ụmụ ha nọ. N’eziokwu, e nwere ndị nne na nna ọ bụụrụ ihe ịma aka iṅomi ihe nlereanya Jisọs n’akụkụ a. Dị ka e si mụọ ha, ụfọdụ adịghị egosipụta mmetụta ha. Ndị mụrụ ụmụ, unu ekwela ka ihe ndị dị otú ahụ gbochie unu igosi ụmụ unu ịhụnanya unu nwere n’ebe ha nọ! O zughị ezu bụ gị ịmara na ị hụrụ ụmụ gị n’anya. Ha aghaghị ịmatakwa ya. Ha agaghịkwa amata ya nanị ma ị chọtara ụzọ isi gosipụta ịhụnanya gị.—Tụlee Mak 1:11.
6. (a) Ụkpụrụ nduzi nke ndị mụrụ ụmụ hà dị ụmụaka mkpa, gịnị mere i ji zaa otú ahụ? (b) Olee ihe kpatara ụkpụrụ nduzi ndị dị n’ezinụlọ ndị ọ dị mkpa ka ụmụaka ghọta? (ch) Ihe ize ndụ ndị dị aṅaa ka a na-ezere mgbe iwu Kraịst na-achị n’ezinụlọ?
6 N’otu mgbe ahụ, ọ dị mkpa ka a kpaara ụmụaka ókè, nke pụtara na ọ dị ndị mụrụ ha mkpa isetịpụ ụkpụrụ nduzi na mgbe ụfọdụ ịhụ na e debere ụkpụrụ nduzi ndị a site n’inye ahụhụ. (Ndị Hibru 12:7, 9, 11) Ọbụna otú ahụ, a ghaghị iji nwayọọ nwayọọ nyere ụmụaka aka ịhụ ihe kpatara e ji nye ụkpụrụ nduzi ndị a: ndị mụrụ ha hụrụ ha n’anya. Ha aghaghịkwa ịmụta na ịhụnanya bụ ihe kasị mma mere ha ga-eji rubere ndị mụrụ ha isi. (Ndị Efesọs 6:1; Ndị Kọlọsi 3:20; 1 Jọn 5:3) Ihe mgbaru ọsọ nke nne ma ọ bụ nna nwere nghọta bụ ịkụziri ndị na-eto eto iji “uche” ha eme ihe ka ha wee nwee ike imesịa mee mkpebi ziri ezi n’onwe ha. (Ndị Rom 12:1; tụlee 1 Ndị Kọrint 13:11.) N’aka nke ọzọ, ụkpụrụ nduzi ekwesịghị ịdị ọtụtụ gabiga ókè ma ọ bụ inye ahụhụ esie ike gabiga ókè. Pọl na-ekwu, sị: “Ndị bụ nna, akpasula ụmụ unu iwe, ka obi ghara ifu ha.” (Ndị Kọlọsi 3:21; Ndị Efesọs 6:4) Mgbe iwu Kraịst na-achị n’ezinụlọ, ohere adịghị maka ahụhụ e ji iwe a na-achịkwaghị achịkwa nye ma ọ bụ nke e nyere maka okwu njakịrị na-afụ ụfụ n’obi. N’ebe obibi dị otú ahụ, ụmụaka na-enwe mmetụta nke ịnọ ná nchebe na ịbụ ndị e wuliri elu, ọ bụghị ndị e boro ibu dị arọ ma ọ bụ na-akatọ.—Tụlee Abụ Ọma 36:7.
7. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ebe obibi Betel pụrụ isi nye ihe nlereanya mgbe a bịara n’isetịpụ ụkpụrụ nduzi n’ebe obibi?
7 Ụfọdụ ndị jeworo leta ebe obibi Betel gburugburu ụwa na-ekwu na ebe ndị ahụ bụ ezi ihe nlereanya nke inwe nguzozi n’okwu inwe ụkpụrụ nduzi maka ezinụlọ. Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị toruworo ogo mmadụ mejupụtara ya, ụdị ebe ndị ahụ na-arụ nnọọ ọrụ dị ka ezinụlọ dị iche iche.a Ihe a na-arụ na Betel dị ọtụtụ ma chọọ ụkpụrụ nduzi butụrụ ibu—n’ezie karịa ezinụlọ nkịtị. Ka o sina dị, ndị okenye na-edu ndú n’ebe obibi, ụlọ ọrụ, na ebe obibi akwụkwọ nke Betel, na-agbalịsi ike itinye iwu Kraịst n’ọrụ. Ha na-ewere ya dị ka ọrụ ha ọ bụghị nanị ịhazi ọrụ ahụ kamakwa ịkwalite ọganihu ime mmụọ na “ọṅụ Jehova” n’etiti ndị ọrụ ibe ha. (Nehemaịa 8:10) N’ihi ya, ha na-agbalịsi ike ime ihe n’ụzọ dị mma ma na-agba ume, na-agbalịsikwa ike inwe ezi uche. (Ndị Efesọs 4:31, 32) Ka a sịkwa ihe mere e ji mara ezinụlọ Betel dị iche iche maka mmụọ ọṅụ ha!
N’ime Ọgbakọ
8. (a) Gịnị kwesịrị ịbụ ihe mgbaru ọsọ anyị mgbe nile n’ime ọgbakọ? (b) N’ọnọdụ dịgasị aṅaa ka ụfọdụ kwuworo ka e nye ma ọ bụ nwaa imepụta ụkpụrụ nduzi?
8 N’ime ọgbakọ ọ bụkwa ihe mgbaru ọsọ anyị iwuli ibe anyị elu na mmụọ ịhụnanya. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:11) Ya mere ndị Kraịst nile kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara ịtụkwasị ihe n’ibu arọ nke ndị ọzọ site n’iji onwe ha manye ndị ọzọ ịnakwere echiche ha n’okwu ndị metụtara nhọrọ onwe onye. Mgbe ụfọdụ, ụfọdụ na-edegara Watch Tower Society akwụkwọ na-ekwu ka e nye iwu n’okwu ndị dị ka otú ha kwesịrị isi lee ihe nkiri, akwụkwọ, na ọbụna ihe ngwuri egwu ụfọdụ kpọmkwem anya. Ma, e nyeghị Society ikike inyocha ụdị ihe ndị ahụ na inye nkwubi okwu na ha. N’ọnọdụ ka ukwuu, ihe ndị a bụ okwu onye ọ bụla n’otu n’otu ma ọ bụ onye isi ezinụlọ kwesịrị ikpebi, dabere n’ịhụnanya ya maka ụkpụru Bible. Ndị ọzọ yiri ka ha na-agbanwe aro na ụkpụrụ nduzi dị iche iche nke Society ịghọ iwu. Dị ka ihe atụ, ná mbipụta Ụlọ Nche, nke March 15, 1996, e nwere isiokwu mara mma na-agba ndị okenye ume ka ha na-ejechi nleta ọzụzụ atụrụ anya na nke ndị òtù ọgbakọ. Nzube ya ọ̀ bụ iguzobe ụkpụrụ nduzi? Ee e. Ọ bụ ezie na ndị nwere ike ịgbaso aro ndị ahụ na-enweta ọtụtụ uru, ụfọdụ ndị okenye enweghị ike imeli otú ahụ. N’otú aka ahụ, isiokwu bụ́ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ,” ná mbipụta Ụlọ Nche, nke April 1, 1995, dọrọ aka ná ntị megide imebi ịdị ùgwù nke oge baptism site n’imebiga ihe ókè, dị ka ime oké oriri ma ọ bụ ime ngagharị mmeri. Ụfọdụ ewerela ndụmọdụ a e ji nlezianya nye gabiga ókè, ọbụna na-eme iwu na iziga kaadị na-agba ume n’oge a ekwesịghị ekwesị!
9. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị zere ịbụ ndị na-emekarị nkatọ ma na-ekpe ibe anyị ikpe?
9 Tụleekwa na ọ bụrụ na “iwu zuru okè, bụ́ iwu nke inwe onwe” ga na-achị n’etiti anyị, anyị aghaghị ikweta na akọ na uche ndị Kraịst nile abụghị otu. (Jemes 1:25) Ànyị kwesịrị isewe okwu ma ọ bụrụ na ndị mmadụ mere nhọrọ onwe ha ndị na-emebighị ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ? Ee e. Anyị ime otú ahụ ga-akpata nkewa. (1 Ndị Kọrint 1:10) Pọl, mgbe ọ na-adọ anyị aka ná ntị megide ikpe onye Kraịst ibe anyị ikpe, kwuru, sị: “N’ebe Onyenwe ya onwe ya nọ ka ọ na-eguzo ma ọ bụ na-ada. Ma a ga-eme ya ka o guzo; n’ihi na Onyenwe anyị pụrụ ime ya ka o guzo.” (Ndị Rom 14:4) Anyị nọ n’ihe ize ndụ nke ime ihe na-adịghị Chineke mma ma ọ bụrụ na anyị ekwugide ibe anyị n’okwu ndị e kwesịrị ịhapụrụ akọ na uche mmadụ n’otu n’otu.—Jemes 4:10-12.
10. Ole ndị ka e nyere ọrụ iche ọgbakọ nche, oleekwa otú anyị kwesịrị isi kwadoo ha?
10 Ka anyị chetakwa na e kenyere ndị okenye ọrụ iche atụrụ Chineke nche. (Ọrụ 20:28) Ha nọ ya inye aka. Anyị kwesịrị inwere onwe anyị ịbịakwute ha maka okwu ndụmọdụ, n’ihi na ha bụ ndị mmụta Bible, marakwa ihe a tụleworo n’akwụkwọ nke Watch Tower Society. Mgbe ndị okenye hụrụ àgwà nke yiri ka ọ ga-eduje ná mmebi nke ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ, ha na-enye ndụmọdụ dị mkpa n’atụghị egwu. (Ndị Galetia 6:1) Ndị òtù ọgbakọ na-agbaso iwu Kraịst site n’ikwenyere ndị ọzụzụ atụrụ a a hụrụ n’anya, ndị na-edu ndú n’etiti ha.—Ndị Hibru 13:7.
Ndị Okenye Na-etinye Iwu Kraịst n’Ọrụ
11. Olee otú ndị okenye si etinye iwu Kraịst n’ọrụ n’ime ọgbakọ?
11 Ndị okenye nwere oké mmasị idebezu iwu Kraịst n’ime ọgbakọ. Ha na-ebute ụzọ n’ikwusa ozi ọma ahụ, na-ezi ihe site na Bible iji ruo n’obi, dịkwa ka ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya, dị nro, ha na-agwa “ndị dara mbà n’obi” okwu. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Ha na-ezere omume na-abụghị nke ndị Kraịst ndị dị n’ọtụtụ okpukpe Krisendọm. N’eziokwu, ụwa a na-adakpọ n’ike n’ike, dịkwa ka Pọl, ndị okenye pụrụ inwe nchegbu maka ìgwè atụrụ ahụ; ma ha na-enwe nguzozi ka ha na-eme ihe banyere ụdị nchegbu ndị ahụ.—2 Ndị Kọrint 11:28.
12. Mgbe onye Kraịst bịakwutere onye okenye maka enyemaka, olee otú onye okenye ahụ pụrụ isi zaghachi?
12 Dị ka ihe atụ, onye Kraịst nwere ike chọọ ịkpọtụrụ onye okenye banyere otu okwu dị mkpa nke ọ na-adịghị ebe Akwụkwọ Nsọ kwuru maka ya kpọmkwem ma ọ bụ nke chọrọ ịhazi ụkpụrụ dị iche iche nke ndị Kraịst. Ikekwe, e nyewo ya mbuli n’ọkwá n’ụlọ ọrụ nke nwere ụgwọ ọnwa ka buo ibu ma nwee ibu ọrụ ka ukwuu. Ma ọ bụ nna na-ekweghị ekwe nke otu onye Kraịst na-eto eto pụrụ ịdị na-achọ site n’aka nwa ya nwoke ihe ndị pụrụ imetụta ozi ya. N’ụdị ọnọdụ ndị ahụ onye okenye ahụ na-ezere inye echiche onwe onye. Kama nke ahụ, o yiri ka ọ ga-asape Bible ma nyere onye ahụ aka ịtụgharị uche n’ụkpụrụ ndị metụtara okwu ahụ. Ọ pụrụ iji Watch Tower Publications Index, ma ọ bụrụ na ọ dị, wee chọta ihe “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” kwuworo n’isiokwu ahụ n’ime peji Ụlọ Nche na mbipụta ndị ọzọ. (Matiu 24:45) Gịnị ma ọ bụrụ na onye Kraịst ahụ emesịa mee mkpebi na-eyighị onye okenye ahụ ka ihe amamihe dị na ya? Ọ bụrụ na mkpebi ahụ emebighị ụkpụrụ ma ọ bụ iwu Bible kpọmkwem, onye Kraịst ahụ ga-achọpụta na onye okenye ahụ ghọtara ikike onye ahụ nwere ime mkpebi dị otú ahụ, na-amara na “mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha.” Otú ọ dị, onye Kraịst ahụ kwesịrị icheta na “mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi.”—Ndị Galetia 6:5, 7.
13. Kama inye azịza kpọmkwem n’ajụjụ dị iche iche ma ọ bụ inye echiche nke onwe ha, n’ihi gịnị ka ndị okenye ji enyere ndị ọzọ aka ịtụgharị uche n’okwu dị iche iche?
13 Gịnị mere onye okenye ahụ nwere ahụmahụ ji eme ihe otú a? Ma ọ dịghị ihe ọzọ n’ihi ihe abụọ. Nke mbụ, Pọl gwara otu ọgbakọ na ya abụghị ‘onye nwe okwukwe ha.’ (2 Ndị Kọrint 1:24) Onye okenye ahụ, n’inyere nwanna ya aka ịtụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ na ime mkpebi nke ya dabeere n’ezi ihe ọmụma, na-eṅomi omume Pọl. Ọ na-aghọta na e nwere ebe ikike ya jedebere, dị nnọọ ka Jisọs ghọtara na e nwere ebe ikike ya jedebere. (Luk 12:13, 14; Jud 9) N’otu oge ahụ, ndị okenye na-adị njikere inye ndụmọdụ na-enye aka, ọbụna nke siri ike, nke Akwụkwọ Nsọ n’ebe ọ dị mkpa. Nke abụọ, ọ na-azụ onye Kraịst ibe ya. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Nri siri ike bụ nke ndị tozuru okè, ndị a nwaworo nghọta ha n’ihi omume ha na-eme mgbe dum ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ.” (Ndị Hibru 5:14) N’ihi ya, iji ruo ntozu okè, anyị aghaghị iji nghọta anyị mee ihe, ghara ịdị na-adabere mgbe nile n’ebe onye ọzọ nọ inye anyị azịza. Onye okenye ahụ, site n’igosi onye Kraịst ibe ya otú e si atụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ, si n’ụzọ dị otú a na-enyere ya aka inwe ọganihu.
14. Olee otú ndị tozuru okè pụrụ isi gosi na ha tụkwasịrị obi na Jehova?
14 Anyị pụrụ inwe okwukwe na Jehova Chineke site na mmụọ nsọ ya ga-akpali obi nke ndị na-efe ezi ofufe. N’ihi ya, ndị Kraịst tozuru okè na-eru n’obi ụmụnna ha, na-arịọ ha, dị ka Pọl onyeozi mere. (2 Ndị Kọrint 8:8; 10:1; Faịlimọn 8, 9) Pọl maara na ọ bụkarị ndị ajọ omume, ọ bụghị ndị ezi omume, bụ ndị chọrọ iwu sara mbara iji na-agbazi ha. (1 Timoti 1:9) O kwupụtara okwukwe n’ebe ụmụnna ya nọ, ọ bụghị inyo ha enyo ma ọ bụ atụkwasịghị ha obi. Nye otu ọgbakọ, o dere, sị: “Anyị atụkwasịwo obi n’ahụ unu n’ime Onyenwe anyị.” (2 Ndị Tesalọnaịka 3:4) Okwukwe, ntụkwasị obi, na obi ike Pọl mere ihe dị ukwuu n’ezie iji kpalie ndị Kraịst ahụ. Ndị okenye na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị taa nwere ebumnobi yiri nke ahụ. Lee ka ndị ikom a kwesịrị ntụkwasị obi si na-enye ume ọhụrụ, ka ha ji ịhụnanya na-azụ ìgwè atụrụ Chineke!—Aịsaịa 32:1, 2; 1 Pita 5:1-3.
Ibi Ndụ Kwekọrọ n’Iwu Kraịst
15. Olee ajụjụ ụfọdụ anyị pụrụ ịjụ onwe anyị iji hụ ma anyị na-etinye iwu Kraịst n’ọrụ ná mmekọrịta anyị na ụmụnna anyị?
15 Ọ dị anyị nile mkpa inyocha onwe anyị mgbe nile iji hụ ma anyị na-ebi ndụ kwekọrọ n’iwu Kraịst ma na-akwalite ya. (2 Ndị Kọrint 13:5) N’ezie, anyị nile pụrụ irite uru site n’ịjụ, sị: ‘Àna m ewuli elu ka m na-akatọ akatọ? Ènwere m echiche ziri ezi ka m na-emebiga ihe ókè? Àna m echebara ndị ọzọ echiche ka m na-esi ọnwụ n’ihe ndị ruuru m?’ Onye Kraịst adịghị anwa ịtụzi nzọụkwụ ndị nwanna ya kwesịrị ma ọ bụ ndị ọ na-ekwesịghị ịgbaso n’okwu ndị a na-ekwughị banyere ha kpọmkwem n’ime Bible.—Ndị Rom 12:1; 1 Ndị Kọrint 4:6.
16. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị nwere echiche na-ezighị ezi banyere onwe ha aka, si otú a na-edebezu akụkụ dị mkpa n’iwu Kraịst?
16 N’oge ndị a dị oké egwu, ọ dị mkpa ka anyị chọọ ụzọ isi gbarịta ibe anyị ume. (Ndị Hibru 10:24, 25; tụlee Matiu 7:1-5.) Mgbe anyị lere ụmụnna anyị nwoke na nwanyị anya, ọ̀ bụ na ezi àgwà ha adịghị anyị mkpa karịa adịghị ike ha? Nye Jehova, onye ọ bụla dị oké ọnụ ahịa. N’ụzọ dị mwute, ọ bụghị mmadụ nile na-eche otú ahụ, ọbụna banyere onwe ha. Ọtụtụ yiri ka ha na-ahụ nanị mmejọ na ezughị okè nke ha. Iji gbaa ndị dị otú ahụ ume—na ndị ọzọ—ànyị pụrụ ịgbalị ịgwa otu onye ma ọ bụ abụọ okwu ná nzukọ ọ bụla, na-eme ka ha mara ihe mere anyị ji jiri ọnụnọ ha na ụtụ dị mkpa ha na-atụnye n’ọgbakọ kpọrọ ihe? Lee ihe ọṅụ ọ bụ isi otú a belata ibu arọ ha wee si otú a na-edebezu iwu Kraịst!—Ndị Galetia 6:2.
Iwu Kraịst Na-arụ Ọrụ!
17. N’ụzọ dị iche iche dịgasị aṅaa ka ị na-ahụ iwu Kraịst ka ọ na-arụ ọrụ n’ọgbakọ unu?
17 Iwu Kraịst na-arụ ọrụ n’ọgbakọ ndị Kraịst. Anyị na-ahụ ya kwa ụbọchị—mgbe Ndịàmà ibe anyị ji oké mmasị na-ekerịta ozi ọma ahụ, mgbe ha na-akasi ibe ha obi ma na-agba ha ume, mgbe ha na-agbalịsi ike ijere Jehova ozi n’agbanyeghị nsogbu ndị kasị sie ike, mgbe ndị mụrụ ụmụ na-agbalịsi ike ịzụlite ụmụ ha iji obi ọṅụ hụ Jehova n’anya, mgbe ndị nlekọta ji ịhụnanya na ikpo ọkụ na-akụzi Okwu Chineke, na-akpali ìgwè atụrụ ahụ inwe ịnụ ọkụ n’obi na-ere ka ọkụ ijere Jehova ozi ruo mgbe ebighị ebi. (Matiu 28:19, 20; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:11, 14) Mgbe anyị n’otu n’otu na-etinye iwu Kraịst n’ọrụ ná ndụ nke anyị, lee ka obi Jehova si aṅụrị ọṅụ! (Ilu 23:15) Ọ chọrọ ka ndị nile hụrụ iwu ya zuru okè n’anya dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. N’ime Paradaịs na-abịanụ, anyị ga-ahụ oge mgbe ihe a kpọrọ mmadụ zuru okè, oge a na-agaghị enwe ndị na-ada iwu, na oge mgbe a ga-achịkwa ọchịchọ ọ bụla nke obi anyị. Lee nkwụghachi ụgwọ dị ebube ọ bụ maka ibi ndụ kwekọrọ n’iwu Kraịst!
-