Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w09 2/1 p. 8
  • Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere M?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere M?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Ọchịchị n’Ógbè Ndị Bụ Mmụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Atagbu Onwe Ha n’Ahụhụ?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Gịnị Mere Ihe Ọjọọ Ji Eme, Ndị Mmadụ Ana-atakwa Ahụhụ?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
w09 2/1 p. 8

Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere M?

Ihe ndị mmadụ na-azakarị:

▪ “Chineke akarịala ichewe banyere nsogbu m.”

▪ “Echeghị m na ọ na-eche banyere m.”

Olee ihe Jizọs kwuru?

▪ “A na-ere nza ise mkpụrụ ego abụọ nke ga-azụtali naanị ihe dị nta, ka ọ́ bụghị ya? Ma a dịghị echefu otu n’ime ha n’ihu Chineke. Ma a gụwo ọbụna ntutu isi niile unu ọnụ. Unu atụla egwu; unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.” (Luk 12:6, 7) O doro anya na Jizọs kụziri na Chineke na-eche banyere anyị.

▪ “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla, sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyi?’ N’ihi na ihe a niile bụ ihe ndị mba ọzọ na-achụsi ike. N’ihi na Nna unu nke eluigwe maara na ihe a niile dị unu mkpa.” (Matiu 6:31, 32) Jizọs kweere na Chineke maara mkpa onye ọ bụla n’ime anyị.

BAỊBỤL kwuru hoo haa na Chineke na-eche banyere anyị. (Abụ Ọma 55:22; 1 Pita 5:7) Ọ bụrụ otú ahụ, oleezi ihe mere anyị ji atagbu onwe anyị n’ahụhụ taa? Ọ bụrụ na Chineke hụrụ anyị n’anya, ọ bụrụkwa na ọ bụ ya kacha ike, olee ihe mere na o mebeghị ka ahụhụ kwụsị?

Ọtụtụ ndị amaghị azịza ya, nke bụ́ na ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu na-achị ajọ ụwa a. Mgbe Setan na-anwa Jizọs ọnwụnwa, o gosiri ya alaeze niile nke ụwa ma sị ya: “M ga-enye gị ikike a niile na ebube ha, n’ihi na e nyefewo ha n’aka m, ọ bụkwa onye ọ bụla m chọrọ ka m na-enye ya.”—Luk 4:5-7.

Ònye mere Setan onye na-achị ụwa? Mgbe nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, rubeere Setan isi ma gbakụta Chineke azụ, ihe ọ pụtara bụ na ha họọrọ ka Setan chịwa ha. Kemgbe ahụ ha nupụrụ isi, Jehova Chineke ji ndidi gba nkịtị ka o doo anya na ọchịchị Setan achịtaghị ájá. Jehova adịghị amanye ụmụ mmadụ ka ha fee ya, kama o meela ka anyị nwee ohere ịlọghachikwuru ya.—Ndị Rom 5:10.

Ebe Chineke na-eche banyere anyị, o mere ndokwa ka Jizọs napụta anyị, ka Setan ghara ịchị anyị. N’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-eme “ka ọ ghara ịdị bụ́ onye ahụ nke nwere ikike ịkpata ọnwụ, ya bụ, Ekwensu.” (Ndị Hibru 2:14) Ọ ga-esi otú ahụ “bibie ọrụ Ekwensu.”—1 Jọn 3:8.

A ga-eme ka ụwa a ghọọ paradaịs. N’oge ahụ, Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya [ndị mmadụ], ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”—Mkpughe 21:4, 5.a

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe mere Chineke ji kwe ka nhụjuanya dịrị, gụọ isi nke 11 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 8]

A ga-eme ka ụwa a ghọọ paradaịs

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya