Abụ Ọma
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụbọ akwara kpọọ ya. Maskil.* Abụ Devid.
55 Chineke, biko, ṅaa ntị n’ekpere m.+
Elegharala arịrịọ m na-arịọ ka i meere m ebere anya.*+
Ihe m na-eche na-eme ka obi ghara izu m ike.+
Isi na-agba m ghara ghara
3 N’ihi ihe onye iro m na-ekwu
Nakwa n’ihi nsogbu onye ajọ omume na-enye m.
N’ihi na ha na-ekonye m nsogbu n’isi,
Ha bukwaara m iwe n’obi.+
5 Ezigbo egwu ejidela m,
M na-amakwa jijiji.
6 M nọ na-asị: “A sị nnọọ na m nwere nku ka nduru,
M gaara efepụ gaa biri n’ebe obi ga-eru m ala.
7 M gaara efega n’ebe dị anya.+
M gaara aga biri n’ala ịkpa.+ (Sila)
8 M gaara agbaba n’ebe m ga-anọ
Zere nsogbu ndị yiri oké ifufe nke na-efesi ike.”
9 Jehova, biko, megharịa ha anya, kụghasịakwa atụmatụ ha,*+
N’ihi na ahụla m na ihe juru n’obodo a bụ tigbuo zọgbuo na esemokwu.
10 Ha na-aga elu mgbidi obodo a gburugburu n’ehihie nakwa n’abalị.
Ihe ọjọọ na nsogbu juru n’obodo a.+
11 Ihe ọjọọ na-eme n’ebe niile n’obodo a.
E nweghị mgbe a na-anaghị emegbu ndị mmadụ ma na-aghọ ha aghụghọ n’ámá ya.+
12 Ọ bụghị onye iro na-akparị m.+
A sị na ọ bụ ya, m gaara edi ya.
Ọ bụghị onye iro na-emegide m.
A sị na ọ bụ ya, m gaara ezo ka ọ ghara ịhụ m.
14 Mụ na gị bụbu ezigbo enyi.
Anyị na ìgwè mmadụ na-esobu abanye n’ụlọ Chineke.
Ka ha banye n’ili* ná ndụ.
N’ihi na ihe ọjọọ juru n’ebe ha bi, jukwa ha n’obi.
18 Ọ ga-anapụta m,* meekwa ka ndị na-emegide m kwụsị ịlụso m ọgụ,
N’ihi na ọtụtụ ìgwè mmadụ na-alụso m ọgụ.+
Ndị na-anaghị atụ egwu Chineke+
Agaghị ekwe agbanwe.
20 Ọ* lụsola ndị ya na ha dị ná mma ọgụ.+
Okwu ya dị nro karịa mmanụ,
Ma ha yiri mma agha a mịpụtara amịpụta.+
22 Bunye Jehova ibu na-anyịgbu gị.+
Ọ ga-enyere gị aka.+
E nweghị mgbe ọ ga-ahapụ onye ezi omume ka ọ daa.*+
23 Ma Chineke, ị ga-eme ka ndị ahụ ikpe ọbara mara na ndị na-aghọ aghụghọ banye n’ili.+
Ha agaghị anọru ọkara ndụ ha.+
Ma m ga-atụkwasị gị obi.