Abụ Ọma
Ntụziaka e nyere onye nduzi ụbọ akwara. Maskil. Abụ ọma Devid.
Nchegbu m emewo ka obi ghara izu m ike,+
Ọ dịghị ihe m pụrụ ime ma ọ bụghị inwe nchekasị,
3 N’ihi ihe onye iro na-ekwu, n’ihi nsogbu onye ajọ omume na-enye.+
N’ihi na ha na-eme ka ihe ọjọọ bịakwasị m,+
Ha jikwa iwe na-ebuso m iro.+
9 Jehova, biko, mee ka ha nwee mgbagwoju anya, kewaa ire ha,+
N’ihi na ahụwo m ime ihe ike na esemokwu n’obodo a.+
10 Ha na-aga ije n’elu mgbidi ya, na-agba ya gburugburu ehihie na abalị;+
Ihe ọjọọ na nsogbu dịkwa n’ime ya.+
12 N’ihi na ọ bụghị onye iro kọchara m;+
A sị na ọ bụ ya, m gaara edi ya.
Ọ bụghị onye kpọrọ m oké asị buliri onwe ya elu megide m;+
A sị na ọ bụ ya, m gaara ezo ka ọ ghara ịhụ m.+
13 Kama ọ bụ gị, mmadụ efu nke mụ na ya hà,+
Onye m maara, bụ́ onye mụ na ya ma,+
14 N’ihi na mụ na gị bụbu ezigbo enyi;+
Anyị na-esobu ìgwè mmadụ abanye n’ụlọ Chineke.+
17 N’anyasị, n’ụtụtụ nakwa n’ehihie, naanị ihe m na-eme bụ ichegbu onwe m na ibe ákwá,+
Ọ na-anụkwa olu m.+
18 Ọ ga-anapụta mkpụrụ obi m n’ọgụ a na-alụso m, ọ ga-emekwa ka mkpụrụ obi m nọrọ n’udo,+
N’ihi na ha abịawo n’ìgwè imegide m.+
19 Chineke ga-anụ olu m wee za ha,+
Ee, Onye ahụ nke nọ n’ocheeze kemgbe oge gara aga ga-anụ wee za ha+—Sila—
Bụ́ ndị na-adịghị eme mgbanwe,+
Ndị na-adịghịkwa atụ egwu Chineke.+
21 Okwu ọnụ ya dị nro karịa mmiri ara ehi rahụrụ arahụ,+
Ma obi ya bụ ọgụ ọgụ.+
Okwu ya dị nro karịa mmanụ,+
Ma ha bụ mma agha a mịpụtara amịpụta.+