21 Lee nnọọ ka obodo nke kwesịrị ntụkwasị obi+ si ghọọ nwaanyị akwụna!+ Ikpe ziri ezi jupụtaburu n’ime ya;+ ezi omume bibu n’ime ya,+ ma ugbu a, ọ bụ ndị na-egbu ọchụ bi na ya.+
5Gaanụ jegharịa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem ka unu lee, mata, chọọkwa n’ámá ya dị iche iche ma ọ̀ dị onye unu pụrụ ịhụ,+ ma è nwere onye na-eme ihe ziri ezi,+ onye ọ bụla nke na-achọ ikwesị ntụkwasị obi,+ m ga-agbagharakwa obodo a.
7 Dị ka olulu mmiri si echekwa mmiri nke dị n’ime ya, otú ahụ ka o si chekwaa ihe ọjọọ ya. A na-anụ mkpọtụ ime ihe ike na ibukọrọ ihe ndị mmadụ n’ime ya;+ ọrịa na ihe otiti dị n’ihu m mgbe niile.