8 Mgbe ọ bụla m na-ekwu okwu, m na-eti mkpu. Ọ bụ ime ihe ike na ibukọrọ ihe mmadụ ka m na-eti ná mkpu.+ N’ihi na okwu Jehova ghọrọ ihe na-ewetara m nkọcha na mkparị ogologo ụbọchị dum.+
2 Agụụ inweta ubi agụwo ha, ha anarawokwa ha n’ike;+ agụụ inweta ụlọ agụwo ha, ha ewegharawokwa ha; ha erigbuwo nwoke na ezinụlọ ya,+ rigbuo nwoke ma weghara ihe nketa ya.+