17 “Agụụ ụlọ mmadụ ibe gị agụla gị. Agụụ nwunye mmadụ ibe gị,+ ma ọ bụ ohu ya nwoke ma ọ bụ ohu ya nwaanyị ma ọ bụ ehi ya ma ọ bụ ịnyịnya ibu ya ma ọ bụ ihe ọ bụla bụ́ nke mmadụ ibe gị, agụla gị.”+
2 Ehab wee gwa Nebọt, sị: “Nye+ m ubi vaịn gị,+ ka m jiri ya mere ubi+ akwụkwọ nri,+ n’ihi na ọ dị nso n’ụlọ m; ka m nye gị ubi vaịn ka ya mma n’ọnọdụ ya. Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọ dị gị mma,+ m ga-enye gị ego ka ọ bụrụ ọnụ ahịa ya.”
11 Biko, nyeghachinụ ha taa ala ha,+ ubi vaịn ha, ubi oliv ha na ụlọ ha, na otu ụzọ n’ụzọ otu narị nke ego na ọka, mmanya ọhụrụ na mmanụ unu na-anara ha dị ka ọmụrụ nwa.”
29 Ndị ala ahụ akpawo nkata irigbu mmadụ,+ ha apụnarawo mmadụ ihe,+ megbuo onye nọ n’ahụhụ na ogbenye,+ ha erigbuwokwa onye mbịarambịa n’ekpeghị ya ikpe ziri ezi.’+