17 “Agụụ ụlọ mmadụ ibe gị agụla gị. Agụụ nwunye mmadụ ibe gị,+ ma ọ bụ ohu ya nwoke ma ọ bụ ohu ya nwaanyị ma ọ bụ ehi ya ma ọ bụ ịnyịnya ibu ya ma ọ bụ ihe ọ bụla bụ́ nke mmadụ ibe gị, agụla gị.”+
21 “‘Agụụ nwunye mmadụ ibe gị agụla gị.+ Ka ịchọ ọdịmma onwe gị naanị ghara ime ka ụlọ mmadụ ibe gị, ubi ya ma ọ bụ ohu ya nwoke ma ọ bụ ohu ya nwaanyị, ehi ya ma ọ bụ ịnyịnya ibu ya ma ọ bụ ihe ọ bụla bụ́ nke mmadụ ibe gị, gụọ gị agụụ.’+
15 O wee sị ha: “Ghewenụ anya unu oghe, lezienụ anya ka unu ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla,+ n’ihi na ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.”+
7 Gịnịzi ka anyị ga-ekwu? Iwu ahụ ọ̀ bụ mmehie?+ Tụfịakwa! N’ezie, agaraghị m ama ihe bụ́ mmehie+ ma a sị na ọ bụghị n’ihi Iwu ahụ; dị ka ihe atụ, agaraghị m ama ihe bụ́ anyaukwu+ ma a sị na Iwu ahụ ekwughị, sị: “Enwela anyaukwu.”+
14 Ha nwere anya jupụtara n’ịkwa iko,+ ha enweghị ike isepụ aka ná mmehie,+ ha na-aratakwa mkpụrụ obi ndị na-akwụsighị ike. Ha nwere obi a zụrụ azụ n’anyaukwu.+ Ha bụ ụmụ a bụrụ ọnụ.+